Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”

“Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”

Bịaruo Chineke nso

“Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”

LEGODỊ anya n’ihe a e sere ebe a. Ị̀ hụrụ otú ahụ́ si ruo nwa atụrụ ahụ onye ọzụzụ atụrụ ahụ ku ala? N’Abụ Ọma nke 23, Baịbụl ji otú onye ọzụzụ atụrụ si elekọta atụrụ ya gosi otú Jehova si eji ịhụnanya elekọta ndị na-efe ya. Jehova chọrọ ka obi ruo anyị ala otú o si eru ndị na-efe ya ala, bụ́ ndị nwere ike iji obi ike kwuo ihe ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru, nke bụ́: “Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ.” *Amaokwu nke 1.

Devid, bụ́ onye dere abụ ọma a, na-azụ atụrụ mgbe ọ bụ nwata. Ọ maara ihe bụ́ mkpa atụrụ, marakwa ọrụ onye ọzụzụ atụrụ. Ọ bụ Devid, bụ́ onye Chineke lekọtara, dere abụ ọma ahụ a kpọrọ “abụ ọma nke na-emesi obi ike ma ọ bụ nke na-eme ka a tụkwasị Chineke obi.” Aha Chineke, bụ́ Jehova, dị ma n’amaokwu nke mbụ ma na nke ikpeazụ nke abụ ọma ahụ. (Amaokwu nke 16) Amaokwu ndị nke ọzọ kwuru ụzọ atọ Jehova si elekọta ndị ya otú onye ọzụzụ atụrụ si elekọta atụrụ ya.—Abụ Ọma 100:3.

Jehova na-edu atụrụ ya. Ọ bụrụ na atụrụ enweghị onye na-azụ ya, ọ ga-efu ụzọ. Otú ahụkwa ka anyị ga-efu ụzọ ma ọ bụrụ na anyị enweghị onye ga-enyere anyị aka ịma ezigbo ụzọ anyị ga-eso ná ndụ. (Jeremaya 10:23) Devid kwuru na Jehova na-eduga ndị ya “n’ebe ịta nri nke ahịhịa jupụtara” nakwa “n’ebe izu ike nke mmiri jupụtara.” Ọ na-edu ha “n’ụzọ ezi omume.” (Amaokwu nke 23) Ihe ndị a e kwuru banyere ịzụ atụrụ na-eme ka obi sie anyị ike na anyị nwere ike ịtụkwasị Chineke obi. Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe Chineke gwara anyị na Baịbụl, anyị ga-enwe obi ụtọ ná ndụ, ahụ́ ga-erukwa anyị ala.

Jehova na-echebe atụrụ ya. Ọ bụrụ na onye ọzụzụ atụrụ anọghị, ụjọ na-ejide atụrụ, ha anaghịkwa ama ihe ha ga-eme eme. Jehova gwara ndị ya na ha ekwesịghị ịtụ egwu, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ha na-eje “ije na ndagwurugwu gbara oké ọchịchịrị,” ya bụ, oge o yiri ka ihe ọ̀ kacha siere ha ike ná ndụ. (Amaokwu nke 4) Jehova na-elekọta ha, ọ dịkwa njikere inyere ha aka mgbe ọ bụla. Ọ na-enye ndị na-efe ya amamihe na ike ha ga-eji die ọnwụnwa ndị na-abịara ha.—Ndị Filipaị 4:13; Jems 1:2-5.

Jehova na-enye atụrụ ya nri. Atụrụ anaghị eji aka ha achọtara onwe ha nri. Ọ bụ onye na-azụ ha na-achọtara ha nri. Nri ime mmụọ dị anyị mkpa, ọ bụkwa naanị Chineke ga-enyere anyị aka inweta ya. (Matiu 5:3) Obi dị anyị ụtọ na Jehova na-emesapụ aka, ọ na-edozi tebụl ọtụtụ ihe oriri jupụtara n’ihu ndị ohu ya. (Amaokwu nke 5) Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, dị ka magazin a ị na-agụ, socha ná nri ime mmụọ ndị na-enyere anyị aka ịma ihe mere anyị ji dị ndụ na ihe Chineke zubere imere anyị.

Obi ruru Devid ala n’ihi na ọ maara na ọ bụrụ na ya anọrọ Jehova nso, bụ́ Onye bi n’eluigwe nke na-azụ ya dị ka atụrụ, ọ ga-eji ịhụnanya lekọta ya “ụbọchị niile nke ndụ [ya].” (Amaokwu nke 6) Ị̀ chọrọ ka obi ruo gị ala otú ahụ? Ọ bụrụ na ị chọrọ, gbalịa ka ị mụta otú ị ga-esi bịaruo Jehova nso. I mee otú ahụ, ahụ́ ga-eru gị ala ka Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu ahụ na-edu gị, na-echebe gị, ma na-enye gị nri, dị ka ọ na-emere ndị na-erubere ya isi.—Aịzaya 40:11.

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Mee:

Job isi nke 38Abụ Ọma nke 25

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Nsụgharị Baịbụl ụfọdụ edeghị aha Chineke, bụ́ Jehova, n’amaokwu a. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma ihe kpatara ya, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 195-197. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.