Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?

Mụta Ihe N’okwu Chineke

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?

Isiokwu a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla, ọ ga-egosikwa gị ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ga-aza gị ajụjụ ndị ahụ. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Ndị nwụrụ anwụ hà ga-adị ndụ ọzọ?

Mgbe enyi Jizọs bụ́ Lazarọs nwụrụ, ọ nọruola abalị anọ n’ili mgbe Jizọs rutere Betani, bụ́ obodo dị nso na Jeruselem. Jizọs na ụmụnne Lazarọs, bụ́ Mata na Meri, so gaa n’ebe e liri Lazarọs. Ndị mmadụ gbakọtara ebe ahụ ozugbo. Chegodị echiche otú obi si tọọ Mata na Meri ụtọ mgbe Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ.—Gụọ Jọn 11:20-24, 38-44.

Mata kweere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Kemgbe ụwa, ndị ji obi ha niile na-efe Jehova maara na n’ọdịnihu, Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ka ha dịrị ndụ ọzọ n’ụwa a.—Gụọ Job 14:14, 15.

2. Gịnị na-eme ndị mmadụ ma ha nwụọ?

Ọ bụ eziokwu na ike ndụ, ma ọ bụ “mmụọ,” na-eme ka ụmụ mmadụ na anụmanụ na-adị ndụ, anyị abụghị ndị mmụọ yi anụ ahụ́ mmadụ. (Ekliziastis 3:19; Jenesis 7:21, 22) Anyị bụ mmadụ e ji ájá kpụọ. (Jenesis 2:7; 3:19) Mgbe mmadụ nwụrụ, ụbụrụ ya na-akwụsị ịrụ ọrụ, onye ahụ na-akwụsịkwa iche echiche. Ọ bụ ya mere na mgbe a kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ, o nweghị ihe ọ kọọrọ ndị mmadụ na ya mere n’oge ahụ ya nwụrụ n’ihi na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla.—Gụọ Abụ Ọma 146:4; Ekliziastis 9:5, 10.

O doro anya na ndị nwụrụ anwụ enweghị ike ịta ahụhụ. N’ihi ya, ndị na-akụzi na Chineke na-ata ndị nwụrụ anwụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ na-agha ụgha. Ha na-ekwutọ Chineke. Ịta ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ abatatụbeghị Chineke n’obi.—Gụọ Jeremaya 7:31.

3. Ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ hà nwere ike ikwurịta okwu?

Ndị nwụrụ anwụ enweghị ike ikwu okwu. (Abụ Ọma 115:17) Ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ na-agwa ndị mmadụ okwu, na-eme ka ndị ha na-agwa okwu chee na ọ bụ mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ na-agwa ha okwu. (2 Pita 2:4) Jehova nyere iwu ka anyị ghara ịchọwa ụzọ anyị na ndị nwụrụ anwụ ga-esi kwurịta okwu.—Gụọ Diuterọnọmi 18:10, 11.

4. Ole ndị ka a ga-akpọlite n’ọnwụ?

N’ụwa ọhụrụ na-abịanụ, ọtụtụ nde mmadụ ndị nọ n’ili ga-esi n’ọnwụ bilie. A ga-akpọlitedị ụfọdụ ndị ajọ omume n’ọnwụ bụ́ ndị mere ihe ọjọọ n’ihi na ha amaghị iwu Jehova.—Gụọ Luk 23:43; Ọrụ 24:15.

A ga-akụziri ndị a kpọlitere n’ọnwụ eziokwu banyere Chineke nakwa otú ha ga-esi nwee okwukwe na Jizọs ma na-erubere ya isi. (Mkpughe 20:11-13) Ndị mewere ezi ihe n’oge ahụ a kpọlitechara ha n’ọnwụ ga-enwe ike ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ma, ụfọdụ n’ime ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ ga-anọgide na-eme ihe ọjọọ. Mbilite n’ọnwụ nke ha ga-aghọzi “mbilite n’ọnwụ nke ikpe.”—Gụọ Jọn 5:28, 29.

5. Gịnị ka ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ na-akụziri anyị banyere Jehova?

Ihe mere ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ ga-eji nwee isi bụ na Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ nwụchitere anyị ọnwụ. Ihe a Jehova mere gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu.—Gụọ Jọn 3:16; Ndị Rom 6:23.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ihe a kọrọ n’isiokwu a, gụọ GỊnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 6 na nke 7 nke akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 16]

E ji ájá kpụọ Adam