Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Dara Anyị ná Ntị Ka Egwú Dị Ụtọ

Ọ Dara Anyị ná Ntị Ka Egwú Dị Ụtọ

Akwụkwọ Ozi Si Madagaska

Ọ Dara Anyị ná Ntị Ka Egwú Dị Ụtọ

MỤ NA DI M na-aga Madagaska, bụ́ ebe ọhụrụ e zigara anyị ka anyị gaa kwusaa ozi ọma. Anya mmiri juru anyị anya mgbe ndị enyi anyị na ndị ezinụlọ anyị na-asị anyị gaa nke ọma. Ọ bụ eziokwu na anyị amaghị otú ebe ahụ anyị na-aga ga-adị, obi siri anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka.

Anyị agaghị echefu ụbọchị mbụ anyị gara ọmụmụ ihe n’ebe ọhụrụ a anyị gara. Ọ dị anyị ka nwanna na-eduzi ọmụmụ ihe Ụlọ Nche ọ̀ na-agụ egwú, ndị na-ege ntị ana-ekwe ekwe. Ebe ọ bụ na anyị amaghị asụsụ mba ahụ, ihe ndị mmadụ na-ekwu na-ada anyị ná ntị ka egwú dị ụtọ. Ọ ga-ewe anyị ezigbo oge tupu anyị aghọtawa ihe ha na-ekwu.

Otu ụbọchị, mgbe a na-amụ Ụlọ Nche, onye na-eduzi ọmụmụ ihe jụrụ ajụjụ na-adịghị n’Ụlọ Nche a na-amụ, aghọtara m ihe ọ jụrụ ozugbo, ma amaghị m mgbe m ji zaa ya n’atụlighị aka elu. Ndị nọ m nso nụrụ ihe m zara. Ọchị tọwara m, ma ekpuchiri m aka n’ọnụ ozugbo ka m ghara ịchịpụta ya achịpụta. Ihere mere m, ma obi dịkwa m ụtọ na aghọtawala m asụsụ ahụ!

Ebe m bụ onye na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ, o kwesịrị ịbụ m ga na-akụziri ndị ọzọ ihe n’ozi ọma, ma ọ dịzi m ka ọ̀ bụ m ka ndị ọzọ na-enyere aka. Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị bi ebe ahụ ji obiọma na-akụziri m otú m ga-esi na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ha na-agwa m ihe m ga-ekwu na amaokwu Baịbụl ndị m ga-agụ.

Otu ụbọchị mgbe m nọ n’ozi ọma, otu nwatakịrị bidoro iti mkpu, na-asị, “Vazaha! Vazaha!” N’asụsụ ndị Madagaska, ihe ọ pụtara bụ “onye mbịarambịa.” Mụ na nwanna nwaanyị mụ na ya so gasiwere ike ka ụmụaka ndị ọzọ ghara iso ya tiri mkpu sowe anyị n’azụ. Ma otu nwatakịrị ọzọ baara nke ahụ na-eti mkpu mba, sị ya: “Ọ bụghị onye mbịarambịa, ọ na-asụ asụsụ anyị!” Onye ahụ mụ na ya so gwara m ihe ha kwuru n’ihi na ha na-ekwu ya ọsọ ọsọ nke na aghọtaghị m ihe ha na-ekwu. Ma, ihe a ha kwuru tọrọ m ụtọ. Ihe ọ pụtara bụ na asụtawala m asụsụ ndị Madagaska.

E nweela oge ndị ọ dị m ka e nweghị ndị mụ na ha ga-ekwurịta okwu. N’oge ndị ahụ, a na-enwekarị nwata na-eji ihu ọchị abịa jide m aka. Otú ha si abịa ejide m aka na-agba m ume n’ihi na ọ na-eme ka m ghọta na ha ji m kpọrọ ihe n’agbanyeghị na mụ na ha enweghị ike ịkparịta ụka nke ọma. Ụmụaka ndị nọ n’ọgbakọ anyị bụ nnọọ ngọzi si n’aka Jehova. Otu obere nwanna nwaanyị aha ya bụ Hasina ghọrọ onye na-asụgharịrị m okwu. Mgbe ọ na-enweghị onye ghọtara ihe m na-ekwu, o yiri ka ọ̀ bụ ya na-aghọta ya. Ọtụtụ mgbe, mụ na ndị enyi m nọ n’ọgbakọ kparịtawa ụka, ọ na-enyere m aka akọwara ha ihe m chọrọ ikwu.

O nwere mgbe a chọrọ isi n’ọgbakọ mụ na di m nọ kepụta ọgbakọ ọzọ. Nke a pụtara na onye nwere ndị ha na ya na-amụ Baịbụl, ya abụrụ na ndị ahụ bi n’ebe ọgbakọ ọhụrụ ahụ na-aga ozi ọma, onye ahụ ga-agwa onye nọ n’ọgbakọ ọhụrụ ahụ ka ọ mụwara ndị ahụ Baịbụl. Otu nwanna nwaanyị gwara m ka m mụwara otu onye ọ na-amụrụ Baịbụl ihe. Agwara m ya na agaghị m amụliri onye ahụ ihe n’ihi na amụtachabeghị m asụsụ ha, ma o siri ọnwụ. Ọ gwara m na Jehova ga-enyere m aka. O ji nnọọ olu ọma na obiọma gwa m na n’oge na-adịghị anya, m ga-enwe ike iji asụsụ ha na-akụziri ndị ọzọ ihe otú m si chọọ. Ihe ahụ ọ gwara m gbara m nnọọ ume.

Kemgbe ahụ, onye ahụ ọ gwara m mụwara Baịbụl na-eme nnọọ nke ọma. Otu ụbọchị, mgbe m nọ n’ihu ụlọ anyị, anụrụ m ka onye ahụ m na-amụrụ Baịbụl kpọrọ aha m. Ya na di ya na-aga idebanye aha n’akwụkwọ na ha bụ di na nwunye otú iwu gọọmenti kwuru. Di ya ebidola ịmụ Baịbụl, e nwekwara ọtụtụ ihe ha abụọ kpebirila ime, otu n’ime ha bụ ime baptizim. Obi tọrọ m ụtọ, n’agbanyeghị na m maara na ọ bụghị anyị na-eme ka mmadụ bịa fee Chineke kama ọ bụ Jehova.

Anyị amụtala ọtụtụ ihe n’ebe ọhụrụ a anyị bịara ikwusa ozi ọma. Ọ bụ eziokwu na agụụ ndị enyi anyị na ndị ezinụlọ anyị na-agụ anyị, anyị ewerela ụmụnna ndị anyị na ha nọ ugbu a ka ndị ezinụlọ anyị. Ọtụtụ mgbe, anyị na-akọrọ ụmụnna ndị anyị na ha nọ ugbu a banyere ndị ezinụlọ anyị, nke a emeekwala ka ọtụtụ n’ime ha na-ajụkarị anyị otú ha mere. Anyị nwere olileanya na otu ụbọchị, ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị hapụrụ na ndị nke anyị na ha bi ebe a ga-ahụ ibe ha.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu ka na-ada m ná ntị ka egwú. Ma ugbu a, aghọtawala m ihe ha na-ekwu. Ana m atụ anya mgbe asụsụ ha ga na-aga m were were n’ọnụ, ọ bụghị ikwu ya otu otu. Jizọs sịrị: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na echi ga-enwe nchegbu nke ya.” (Matiu 6:34) N’ihi ihe a Jizọs kwuru, anyị ga-eji ndidi na-amụta ya obere obere. Ka ọ dịgodị, m ga-ejisi ike na-amụ asụsụ a ka m nwee ike mụta ịsụ ya otú ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwaanyị bi na Madagaska ebe a si asụ ya.

[Foto dị na peeji nke 25]

Mgbe mụ na Hasina na-ezi ozi ọma