Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Gụrụ M Agụụ Ịga Na-eme Egwuregwu N’ebe Dị Iche Iche

Ọ Gụrụ M Agụụ Ịga Na-eme Egwuregwu N’ebe Dị Iche Iche

Ọ Gụrụ M Agụụ Ịga Na-eme Egwuregwu N’ebe Dị Iche Iche

Dị ka Zoya Dimitrova si kọọ

Mgbe m dị afọ iri na ise, emewela m ihe m chọrọ ime ná ndụ. Mụ na ndị na-aga ebe dị iche iche eme egwuregwu na-esozi aga eme egwuregwu n’ebe dị iche iche, obi dịkwa m ụtọ. Ma na Septemba 4, 1970, njinji jiri. Onye mụ ya na-eme egwuregwu tụliri m elu, ma ahụziri m onwe m ka m si n’elu na-adaru ala.

A MỤRỤ M na Disemba 16, 1952. Mụ na ndị mụrụ m na nwanne m nwaanyị bụ́ Sofia bi na Bọlgeria. N’oge ahụ, ọchịchị e nwere na Bọlgeria bụ ọchịchị kọmunist. Ọ bụ ezie na ndị ọchịchị kwere ka okpukpe dị iche iche dịrị ná mba anyị, ma ha na-eme ka ndị mmadụ ghara inwe mmasị n’okpukpe. Ọtụtụ ndị ekweghị na Chineke, ọtụtụ n’ime ndị nke kwere na Chineke anaghị eme ka ndị ọzọ mara ihe ha kweere. Ọ bụ eziokwu na ndị ezinụlọ anyị na-ekwu na ha bụ ndị Ọtọdọks, anyị anaghị aga chọọchị, o nweghịkwa ihe m ma banyere Chineke.

Malite n’oge m bụ nwata, ime ụdị egwuregwu dị iche iche na-atọ m ụtọ, karịchaa ịwụli elu, ịwụfe ihe, na ihe ndị yiri ya. Mgbe m dị afọ iri na atọ, otu nwoke bịara n’ụlọ akwụkwọ anyị na-achọ nwata nwaanyị ha ga-azụ ka o soro ha na-aga eme egwuregwu n’ebe dị iche iche. Onye nkụzi na-akụziri anyị egwuregwu gwara ya ka ọ kpọrọ m. Obi tọrọ m ụtọ mgbe nwoke ahụ buuru m n’ọmarịcha ụgbọala o ji bịa. Anyị gawara ebe ndị ọrụ ha ga-agba m ajụjụ ọnụ ma lee m ule iji mata ma m̀ ruru eru. Enwere m obi ụtọ mgbe ha họọrọ m. Ọ bụ mgbe ahụ ka ha malitere inye m ọzụzụ tara akpụ ruo ihe karịrị afọ abụọ. Ha zụchara m mgbe m dị afọ iri na ise, mụ ebidozie iso ha aga eme egwuregwu n’ebe dị iche iche. Mgbe ahụ m bidoro iso ha, anyị gara ebe dị iche iche na Bọlgerịa, mechazie gaa mba ndị sobu na Sọviet Yuniọn. Anyị gakwara Ọljirịa, Họngarị, na mba a na-akpọbu Yugoslavia.

Arụrụ m ọrụ a na-atọgbu m atọgbu ruo afọ atọ. Ma, ka anyị nọ na-eme egwuregwu n’obodo Titov Veles, nke dị na Masedonia, ihe ọghọm ahụ m kwuburu okwu ya mere. Egwuregwu anyị na-eme bụ nke anyị na-esi n’otu eriri e kere n’elu mafere n’ọzọ. Onye mụ na ya so na-eme egwuregwu na-atụli m elu ma ghọrọ m. Ma, ka ọ tụliri m elu, aghọtalighị m aka ya mgbe m na-alọdata, eriri e kere m dọbikwara. Esizi m n’elu elu ebe ahụ kụọ n’ala. E bugara m ụlọ ọgwụ ozugbo. A chọpụtakwara na aka m, ọgịrịga ole na ole, na ọkpụkpụ azụ m agbajiela. Amaghị m ebe m nọ ruo ụbọchị ole na ole, anaghịkwa m echeta ihe merenụ. Mgbe m nwetara onwe m, achọpụtara m na ahụ́ m akpọnwụọla, site n’úkwù m gbadawa. Ma ebe m ka bụ nwa agbọghọ, obi siri m ike na ọ bụrụ na a waa m ahụ́ ma ọ bụ nye m ụdị ọgwụ ndị ọzọ, m ga-enwe ike ịga ije ọzọ ma ọ bụdị bidokwa mewe egwuregwu ahụ m na-emebu.

A gwọrọ m n’ụlọ ọgwụ dị iche iche ruo afọ abụọ na ọkara n’ihi na obi ka siri m ike na m ga-agbake. N’ikpeazụ, ọ bịara doo m anya na agaghịzi m enwe ike ịgagharị agagharị. Ugbu a, ana m anọzi otu ebe, n’oche ndị ngwọrọ. O nweghị ihe ọzọ m ga-eme ma ọ́ bụghị ịmụta ịnọ otu ebe.

Amalitere M Ndụ Ọhụrụ

Echere m na agaghị m anọli otu ebe n’ihi na ịgagharị agagharị amarala m ahụ́. Ebe m na-enwekwaghị olileanya na ahụ́ ga-adị m mma, ike ụwa gwụrụ m. Ma, n’afọ 1977, otu nwa okorobịa aha ya bụ Stoyan bịara kụọ aka n’ọnụ ụzọ m. Mgbe m chọpụtara na ọ bụ nwanne otu onye mụ na ya na-emekọbu egwuregwu, m gwara ya ka ọ batawa. Mgbe mụ na ya na-akparịta ụka, ọ jụrụ m ma m̀ nwere olileanya na m ga-agbake. Ebe ike ụwa gwụrụla m, agwara m ya na enweghị m olileanya ịgbake. Ọ gwara m na ọ bụ naanị Chineke ga-enyeliri m aka. Ma, eji m iwe sị ya, “Ọ bụrụ na Chineke dị, gịnị mere m ji nọrọ n’ọnọdụ a?”

Otú a ka Stoyan, bụ́ onye ka ghọrọ Onyeàmà Jehova ọhụrụ mgbe ọ nọ n’Amerịka na-eme ụdị egwuregwu ahụ m na-emebu, si jiri obiọma kọwaara m ihe ndị magburu onwe ha Baịbụl kwuru na Chineke ga-eme n’ọdịnihu. Ọ tọrọ m ụtọ ịnụ na ụwa ga-aghọ paradaịs n’oge na-adịghị anya. Nkwa Chineke kwere, nke bụ́ na “ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ” ruru m nnọọ n’obi. (Mkpughe 21:4) Ana m atụsi anya ike mgbe ahụ́ ga-adị m mma! Ekwetara m ozugbo ka Ndịàmà Jehova bịa kụziwere m Baịbụl. Otú a ka m si malite ndụ ọhụrụ. Ugbu a, ahụla m ihe mere m ga-eji nwee ezigbo olileanya!

Ọ na-agụ m agụụ ka Ndịàmà Jehova bịa na-akụziri m Baịbụl kwa izu. Ọ bụ Stoyan malitere ịkụziri m Baịbụl, e mechaa Totka, bụ́ Onyeàmà nwere obiọma, akụziweziere m Baịbụl. O nyeere m aka ịghọta Baịbụl ngwa ngwa, nke mere ka m nyefee Jehova Chineke ndụ m. N’oge ahụ, o nweghị Onyeàmà Jehova nọ n’obodo Sofia nke ruru eru ime m baptizim, n’ihi ya, m cheere ruo mgbe otu nwanna nwoke si Masedonia bịa. Na Septemba 11, 1978, ihe dị ka otu afọ m malitere ịmụ Baịbụl, e mere m baptizim n’ụlọ m. A gbajuru mmiri n’ime ebe m na-anọ asa ahụ́ ma mee m baptizim n’ime ya. Baptizim ahụ e mere m gosiri na mụ aghọọla Onyeàmà Jehova. O mere ka m nwee ezigbo obi ụtọ, meekwa ka ndụ m nwee isi.

Ihe ndị m mụtara na Baịbụl tọrọ m ezigbo ụtọ nke na m na-akọrọ onye ọ bụla bịara n’ụlọ m ihe ọhụrụ ndị m mụtara. O wutere m na o nweghị onye kwetara ihe ndị m na-ekwu. O nwere ike ịbụ na ha chere na ihe ahụ mere m emeela ka isi mebie m.

Emere M Mmehie Dị Njọ

N’oge ihe ndị a na-eme, a naghị ekwe Ndịàmà Jehova fee Chineke otú ha chọrọ na Bọlgeria. Ha dịkwa naanị ole na ole mgbe ahụ. Ebe ọ bụ na e nweghị ebe ha na-ezukọta enwe ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, o nweghị ebe m ga-aga ọmụmụ ihe, e nweghịkwa ọtụtụ Ndị Kraịst ibe m mụ na ha na-akpakọrịta. Ebe m na-anaghị aga ọmụmụ ihe, amaghịkwanụ m na ọ dịghị mma ka mụ na ndị na-anaghị ebi ndụ otú Baịbụl kwuru na-akpachi anya, m mere mmehie dị njọ.

Akọnuche m ekweghị m zuo ike, obi chọrọ ịgbawa m n’ihi na mụ na Jehova Chineke adịkwaghị ná mma. N’agbanyeghị na obi jọrọ m njọ nakwa na ihere ji m, akọọrọ m Jehova otú obi dị m, rịọkwa ya n’ekpere ka ọ gbaghara m. Ndị okenye nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị hụrụ m n’anya, mechara nyere m aka ka mụ na Jehova dịwakwa ná mma, mụ ebidokwa ife Ya ọzọ. Obi dị m ezigbo ụtọ na m ji akọnuche dị ọcha na-efe Jehova, obi dịkwa m ụtọ na m nọ n’ọgbakọ ya dị ọcha!

Obi Adịla M Ụtọ n’Agbanyeghị Nsogbu M

O ruola iri afọ anọ m dara ada ahụ mere m ji kwụsị ime egwuregwu ma na-anọzi naanị n’oche ndị ngwọrọ. Ma, anaghị m anọ ná mwute ma ọ bụ kwawa ụta ma m cheta ya, ka à ga-asị na ndụ m enweghị isi. Baịbụl emeela ka m ghọta na obi ụtọ ahụ m chọrọ ná ndụ, nke m chere na m ga-enweta ma m gawa na-eme egwuregwu n’ebe dị iche iche, agaraghị adịte aka ma ọ bụ baara m ezigbo uru. Ahụla m ka ike ndụ gwụrụ ụfọdụ ndị mụ na ha na-esobu eme egwuregwu. Ma, mụnwa enweela ihe kacha mma ná ndụ, ya bụ, mụ na Onye kere m, bụ́ Jehova Chineke, dị n’ezigbo mma. Nke a emeela ka m nwee obi ụtọ karịrị nke m gaara enweta n’egwuregwu ahụ.

Ihe ọzọkwa bụ na obi dị m ụtọ ịhụ ka ọtụtụ ndị ọzọ mụtarala eziokwu dị na Baịbụl ma nyefee Chineke anyị hụrụ anyị n’anya, bụ́ Jehova, ndụ ha. Mgbe m malitere ịmụ Baịbụl n’afọ 1977, Ndịàmà Jehova e nwere na Bọlgeria dị naanị ole na ole. E nwerughịdị otu narị Ndịàmà Jehova ná mba anyị dum n’oge ọchịchị kọmunist dara n’afọ 1991, bụ́ mgbe gọọmenti mba anyị debara aha ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ. Ọ na-enye m obi ụtọ ịhụ ka Ndịàmà Jehova na-amụba n’ike n’ike. Ha eruola ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu puku mmadụ na narị asatọ ugbu a!

A ka nwere ọrụ dị ukwuu a ga-arụ na Bọlgeria. Ọtụtụ ndị chọrọ ịmụta Okwu Chineke. Ihe gosiri nke a bụ mmadụ ole bịara Ncheta Ọnwụ Kraịst nke afọ 2010. Ha dị puku mmadụ atọ, narị itoolu na iri na anọ. Ọ na-atọgbu m atọgbu n’ihi na nke a na-egosi na Jehova agọziela ọrụ ikwusa ozi ọma na Bọlgeria. Ejila m anya m hụ ka “onye kasị nta” ghọrọ “mba dị ike,” dị ka e buru amụma n’Aịzaya 60:22.

Nnukwu ihe ọzọ merela ná ndụ m nke tọgburu m atọgbu bụ mwepụta e wepụtara Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ ndị Bọlgeria. Nke a mere n’ọnwa Ọgọst 2009, ná Mgbakọ Distrikti “Na-echenụ Nche!” nke e nwere n’obodo Sofia. Baịbụl a e wepụtara n’asụsụ anyị tọrọ m ezigbo ụtọ! O doro m anya na ọ ga-enyekwuru ọtụtụ ndị Bọlgeria aka ịmụta ihe Baịbụl na-ekwu.

Ọ bụ eziokwu na nsogbu m anaghị ekwe m gaa kwusaa ozi ọma nke Alaeze Chineke otú m chọrọ, izi ndị agbata obi m na onye ọ bụla bịara n’ụlọ m ozi ọma na-atọ m ezigbo ụtọ. E nwere otu ụbọchị m nọ na veranda ụlọ m hụ otu onye agbata obi m ka ọ na-agafe, mụ akpọọ ya. Ọ batara n’ụlọ m, ezikwara m ya ozi ọma, ya ekweta ịmụ Baịbụl ozugbo ahụ. Obi tọgburu m atọgbu mgbe e mechara mee ya baptizim, ya aghọzie Onye Kraịst ibe m. Enyerela m mmadụ anọ aka ife Jehova.

Aga m asị na ihe kacha enye m obi ụtọ ma na-agba m ume bụ ịgachi ọmụmụ ihe Ndị Kraịst anya. E nwere ike karịrị narị ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị n’ọgbakọ anyị, ọ dịkwa ka anyị niile ọ̀ bụ otu ezinụlọ. Ọ na-esiri m ike ịga ọmụmụ ihe n’ihi na ná mba anyị, enweghị ụgbọala pụrụ iche e ji ebu ndị agadi na ndị nwere nkwarụ. Ma ana m ekele Chineke maka otú otu nwanna bụ́ nwa okorobịa si na-enyere m aka. N’ụbọchị ọ bụla anyị na-aga ọmụmụ ihe, ọ na-eji ụgbọala ya bịa n’ụlọ m ma si n’ụlọ m buba m n’ụgbọala ya, anyị ruokwa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ya esi n’ụgbọala ya buba m n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ihe a ka ọ na-emekwa ma a gbasaa. Ana m ekele Jehova maka ime ka m soro ná ndị na-efe ya, bụ́ ndị hụrụ ibe ha n’anya otú a.

Ọ bụ eziokwu na ihe agaghị otú m tụrụ anya na ọ ga-aga mgbe m bụ nwata, ma ife Jehova emeela ka m nwee ezigbo obi ụtọ ugbu a, meekwa ka m nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Nkwa ahụ Chineke kwere nke bụ́ na mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs, “onye ngwọrọ ga-awụli elu dị ka oké ele” na-atọgbu m atọgbu. (Aịzaya 35:6) Ana m atụsi anya ike ụbọchị m ga-esi n’oche ndị ngwọrọ m wụlie elu. Mgbe ahụ, ahụ́ ga-adị m mma, gbasiekwa m ike.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 30]

“Ihe kacha enye m obi ụtọ ma na-agba m ume bụ ịgachi ọmụmụ ihe Ndị Kraịst anya”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 31]

“Nnukwu ihe merela ná ndụ m nke tọgburu m atọgbu bụ mwepụta e wepụtara Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ ndị Bọlgeria”

[Foto dị na peeji nke 29]

Ebidoro m ime egwuregwu n’oge m dị afọ iri na ise