Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Weta Akwụkwọ Mpịakọta Ndị ahụ, Karịsịa, Akpụkpọ Anụ Ndị ahụ E Ji Ede Ihe’

‘Weta Akwụkwọ Mpịakọta Ndị ahụ, Karịsịa, Akpụkpọ Anụ Ndị ahụ E Ji Ede Ihe’

‘Weta Akwụkwọ Mpịakọta Ndị ahụ, Karịsịa, Akpụkpọ Anụ Ndị ahụ E Ji Ede Ihe’

IHE a e dere n’isiokwu a ka Pọl onyeozi gwara onye ozi ala ọzọ ibe ya mgbe ọ na-ezi ya ka o wetara ya ihe ụfọdụ e ji ede ihe. Olee ụdị akwụkwọ mpịakọta na akpụkpọ anụ ndị e ji ede ihe Pọl bu n’obi? Gịnị mere o ji kwuo nke a? Oleekwa ihe anyị ga-amụta n’ihe a o kwuru?

Tupu narị afọ mbụ O.A. agaa ọkara, bụ́ mgbe Pọl dere okwu ndị a, ọ ga-abụ na e kere akwụkwọ iri atọ na itoolu dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ụzọ iri abụọ na abụọ ma ọ bụkwanụ ụzọ iri abụọ na anọ. O nwekwara ike ịbụ na ọtụtụ n’ime ha dị n’akwụkwọ mpịakọta dị iche iche. Prọfesọ Alan Millard kwuru na n’agbanyeghị na akwụkwọ mpịakọta ndị a dị ọnụ, ọtụtụ ndị jitụ ego ga-azụtali ya. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ụfọdụ ndị nwere otu. Dị ka ihe atụ, ọnaozi Itiopia e kwuru okwu ya na Baịbụl ji akwụkwọ mpịakọta n’ụgbọ ịnyịnya ya “na-agụpụta akwụkwọ Aịzaya onye amụma.” O ‘nwere ike dị ukwuu n’okpuru Kandesi bụ́ eze nwaanyị ndị Itiopia, na-elekọtakwa akụ̀ ya niile.’ Ọ ga-abụ na o jitụ ego nke na aka ya ruru inwe akwụkwọ ụfọdụ dị n’Akwụkwọ Nsọ.—Ọrụ 8:27, 28.

Pọl gwara Timoti, sị: “Ị bịawa, weta uwe mgbokwasị ahụ m hapụrụ na Troas n’aka Kapọs, wetakwa akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ, karịsịa, akpụkpọ anụ ndị ahụ e ji ede ihe.” (2 Tim. 4:13) Nke a gosiri na Pọl nwere ọtụtụ akwụkwọ. Ma, o doro anya na n’akwụkwọ niile Pọl nwere, ọ bụ Okwu Chineke kacha ya mkpa. E nwere ihe ọkà mmụta Baịbụl bụ́ A. T. Robertson kwuru banyere okwu bụ́ “akpụkpọ anụ ndị ahụ e ji ede ihe” nke dị n’amaokwu ahụ. Ọ sịrị: “Ha nwere ike ịbụ akwụkwọ ndị dị n’Agba Ochie e depụtaghachiri edepụtaghachi, akpụkpọ anụ ndị e ji ede ihe dịkwa oké ọnụ karịa papaịrọs.” Pọl si n’okorobịa ‘gụwa akwụkwọ n’ụkwụ Gameliel,’ bụ́ onye kụziiri ya Iwu Mozis, nakwa onye mmadụ niile na-akwanyere ùgwù. Ka a sịkwa ihe mere Pọl ji nwee Okwu Chineke ndị dị n’akwụkwọ mpịakọta.—Ọrụ 5:34; 22:3.

Ihe Ndị Kraịst Ji Akwụkwọ Mpịakọta Mee

Ma, ọtụtụ ndị enweghị Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’akwụkwọ mpịakọta. Oleezi otú Ndị Kraịst nke oge ahụ ji nwee ike ịma ihe Okwu Chineke kwuru? Akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara Timoti ga-enyere anyị aka ịmata nke a. Pọl dere, sị: “Ruo mgbe m ga-abịa, na-etinyesi mgbalị ike n’ịgụ ihe n’ihu ọha.” (1 Tim. 4:13) Ịgụ ihe n’ihu ọha bụ otu n’ime ihe ndị a na-eme n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Ọ bụ ihe e ji mara ndị Chineke kemgbe oge Mozis.—Ọrụ 13:15; 15:21; 2 Kọr. 3:15.

Ebe Timoti bụ okenye, ọ ‘ga-agbalịsi ike’ ịgụpụta ihe, nke ahụ ga-abakwara ndị na-enweghị Akwụkwọ Nsọ dị n’akwụkwọ mpịakọta uru. N’eziokwu, mgbe a na-agụpụta Okwu Chineke n’ihu ọha, mmadụ niile gere ntị nke ọma ka ha nwee ike ịnụ ihe niile a gụpụtara. Ọ ga-abụkwa na mgbe ndị nne na nna na ụmụ ha laruru n’ụlọ ha, ha kwurịtara ihe ndị a gụpụtara n’ọmụmụ ihe.

Akwụkwọ Mpịakọta Aịzaya nke A Hụrụ n’Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ fọrọ obere ka o ruo mita asaa na ọkara. Akwụkwọ mpịakọta na-anyị arọ n’ihi na a na-etinye ígwè n’isi ya abụọ, nakwa n’ihi na ọ na-enwekarị ihe e ji ekpuchi ya ka ọ ghara imebi. Ọ ga-abụ na ọtụtụ Ndị Kraịst enweghị ike ịna-ebu ọtụtụ akwụkwọ mpịakọta aga ozi ọma. Ọ bụrụgodị na Pọl nwere akwụkwọ mpịakọta ụfọdụ, o nwere ike ọ gaghị enweli ike iburu ha niile na-aga ebe ọ bụla ọ chọrọ ịga. O doro anya na ọ hapụrụ ụfọdụ n’ime ha n’ụlọ enyi ya bụ́ Kapọs, onye bi na Troas.

Olee Ihe Anyị Nwere Ike Ịmụta n’Aka Pọl?

Tupu Pọl, bụ́ onye a tụrụ mkpọrọ nke ugbo abụọ, agwa Timoti ka o wetara ya ihe ndị ahụ, o dere, sị: “Alụwo m ezi ọgụ ahụ, agbawo m ọsọ ahụ ruo n’isi . . . Malite ugbu a gaa n’ihu, e debeere m okpueze ezi omume.” (2 Tim. 4:7, 8) Ọ ga-abụ na o dere ihe a mgbe Nero na-akpagbu Ndị Kraịst n’ihe dị ka n’afọ 65 O.A. Mkpọrọ nke ugbu a a tụrụ Pọl kpụ ọkụ n’ọnụ. Obi ya na-agwakwa ya na a ga-egbu ya. (2 Tim. 1:16; 4:6) Ka a sịkwa ihe mere o ji chọsie ike ka e wetara ya akwụkwọ mpịakọta ya. Ọ bụ eziokwu na obi siri ya ike na ya alụọla ezi ọgụ ahụ ruo n’isi, ọ chọrọ ịna-amụ Okwu Chineke ka ọ na-agba ya ume.

O nwere ike ịbụ na Timoti ka nọ n’Efesọs mgbe ọ natara akwụkwọ ozi Pọl. (1 Tim. 1:3) Ọ bụrụ na onye nọ n’Efesọs si ụzọ Troas na-aga Rom, ọ ga-abụ ihe dị ka otu puku kilomita na narị isii. Pọl gwara Timoti n’akwụkwọ ozi ahụ, sị: “Gbalịsie ike ka ị bịarute tupu oge oyi.” (2 Tim. 4:21) Baịbụl ekwughị ma Timoti ò nwetara ụgbọ mmiri bugara ya Rom n’oge ahụ Pọl chọrọ ka ọ bịa.

Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe Pọl gwara Timoti, nke bụ́ ka o wetara ya “akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ, karịsịa, akpụkpọ anụ ndị ahụ e ji ede ihe”? Ịgụ Okwu Chineke na-agụsi ya agụụ ike, ma n’oge a ihe siiri ya ezigbo ike. Í cheghị na ọ bụ nke a mere o ji nwee ike ịkwụsi ike n’akụkụ Jehova, na-agbakwa ọtụtụ ndị ọzọ ume?

Chineke emeerela onye ọ bụla n’ime anyị ihe pụrụ iche taa, ya bụ, o nyela anyị Baịbụl zuru ezu! Ụfọdụ n’ime anyị nwedịrị ya abụọ ma ọ bụ karịa, nweekwa ndị nke e bipụtara n’oge dị iche iche. Anyị kwesịrị iṅomi Pọl, na-agbalịsi ike ka anyị ghọtakwuo ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu nke ọma. Akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara Timoti bụ nke ikpeazụ n’akwụkwọ ozi iri na anọ e nyere ya ike mmụọ nsọ ide. O dere ihe ahụ ọ rịọrọ Timoti ka o wetara ya ná ngwụcha akwụkwọ ozi ahụ. N’eziokwu, arịrịọ ahụ Pọl rịọrọ Timoti ka ‘o wetara ya akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ, karịsịa, akpụkpọ anụ ndị ahụ e ji ede ihe,’ bụ otu n’ime ihe ikpeazụ ọ chọrọ ka e meere ya.

Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike ịlụ ezi ọgụ nke okwukwe ruo n’isi otú ahụ Pọl mere? Ị̀ chọrọ ịnọgide na-efe Jehova, dịkwa njikere ịna-ekwusa ozi ọma ruo mgbe Onyenwe anyị ga-asị o zuola? Ya bụrụ otú ahụ, ọ ga-adị mma ka i mee ihe Pọl gbara Ndị Kraịst ume ka ha mee. Ọ sịrị: “Na-elezi onwe gị na ozizi gị anya mgbe niile.” Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-amụchi Baịbụl anya. Obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ ndị nwere Baịbụl e biri otú ọ ga-adịrị ha mfe iji ya aga ebe ha chọrọ ịga karịa akwụkwọ mpịakọta.—1 Tim. 4:16.

[Map/Foto ndị dị na peeji nke 18, 19]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Efesọs

Troas

Rom