Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Na-akwanyerenụ Ndị Na-arụsi Ọrụ Ike N’etiti Unu Ùgwù’

‘Na-akwanyerenụ Ndị Na-arụsi Ọrụ Ike N’etiti Unu Ùgwù’

‘Na-akwanyerenụ Ndị Na-arụsi Ọrụ Ike N’etiti Unu Ùgwù’

‘Na-akwanyerenụ ndị na-arụsi ọrụ ike n’etiti unu ùgwù, bụ́ ndị na-elekọta unu n’ime Onyenwe anyị ma na-adụ unu ọdụ.’—1 TESA. 5:12.

1, 2. (a) Olee otú ihe si kwụrụ n’ọgbakọ Tesalonaịka mgbe Pọl degaara ha akwụkwọ ozi mbụ? (b) Gịnị ka Pọl gbara ndị Tesalonaịka ume ka ha mee?

WERE ya na ị nọ n’ọgbakọ Tesalonaịka e nwere na narị afọ mbụ, nke so n’ọgbakọ mbụ ndị e hiwere na Yurop. Pọl onyeozi ewepụtala ezigbo oge gbaa ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ahụ ume. Ọ ga-abụ na ọ họpụtara ndị okenye ndị ga na-edu ndú n’ọgbakọ ahụ, dị ka ọ dị n’ọgbakọ ndị ọzọ. (Ọrụ 14:23) Ma mgbe e hiwechara ọgbakọ ahụ, ndị Juu kpọkọtara ìgwè mmadụ ka ha chụpụ Pọl na Saịlas n’obodo ahụ. Ọ ga-abụ na Ndị Kraịst ndị fọrọ n’obodo ahụ chere na a gbahapụla ha, o nwedịrị ike ịbụ na ha chịzi obi n’aka.

2 Dị ka o nwere ike ime onye ọ bụla, mgbe Pọl kwapụrụ n’obodo Tesalonaịka, ihe banyere ọgbakọ ahụ e hiwere ọhụrụ nọ na-echu ya ụra. Ọ gbara mbọ ịlọghachi, ma ‘Setan nọchiiri ya ụzọ.’ N’ihi ya, o zigara Timoti ka ọ gbaa ọgbakọ ahụ ume. (1 Tesa. 2:18; 3:2) Mgbe Timoti kọọrọ Pọl akụkọ ọma banyere ọgbakọ ahụ, nke a mere ka Pọl degara ndị Tesalonaịka akwụkwọ ozi. Otu n’ime ihe Pọl gbara ha ume ime bụ ka ha ‘na-akwanyere ndị na-elekọta ha ùgwù.’—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:12, 13.

3. Olee ihe mere ọgbakọ Tesalonaịka ji kwesị ịsọpụrụ ndị okenye ha nke ukwuu n’ụzọ pụrụ iche?

3 Ndị okenye ndị na-edu ndú n’ọgbakọ Tesalonaịka abụghị aka ochie ka Pọl na ndị ya na ha so na-eje ozi ala ọzọ; ha anọtebeghịkwa aka n’ọgbakọ ka ndị okenye nọ na Jeruselem. A sị kwuwe, o rubeghịdị otu afọ e hiwere ọgbakọ ahụ! N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ihe mere ndị nọ n’ọgbakọ ahụ kwesịrị iji na-egosi na obi dị ha ụtọ na ha nwere ndị okenye, bụ́ ndị “na-arụsi ọrụ ike,” “na-elekọta” ọgbakọ, ‘na-adụkwa ụmụnna ọdụ.’ N’eziokwu, e nwere ezigbo ihe mere ha ga-eji ‘jiri ịhụnanya na-asọpụrụ ndị okenye nke ukwuu n’ụzọ pụrụ iche.’ Mgbe Pọl kwuchara nke a, ọ dụziri ọdụ, sị: “Ka unu na ibe unu na-adị n’udo.” A sị na ị nọ n’ọgbakọ ahụ dị na Tesalonaịka, ị̀ gaara egosi na obi dị gị ezigbo ụtọ maka ọrụ ndị okenye na-arụ n’ọgbakọ? Olee otú i si ele “onyinye n’ụdị mmadụ,” nke Chineke si n’aka Kraịst nye ọgbakọ ya, anya?—Efe. 4:8.

“Ndị Na-arụsi Ọrụ Ike”

4, 5. Gịnị mere ọrụ ndị okenye rụrụ n’oge Pọl jere ozi, nke bụ́ ịkụziri ndị nọ n’ọgbakọ ihe, ji bụrụ ọrụ siri ike n’oge ahụ, oleekwa ihe mere o ji bụrụ ọrụ siri ike taa?

4 Olee otú ndị okenye nọ na Tesalonaịka si ‘rụsie ọrụ ike’ mgbe ha dupụchara Pọl na Saịlas, ha agawa Beria? O doro anya na ha ji Akwụkwọ Nsọ kụziere ndị nọ n’ọgbakọ ihe otú Pọl mere. I nwere ike ịna-eche ma Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka hà ji Okwu Chineke kpọrọ ihe. A sị kwuwe, Baịbụl sịrị na ndị Beria “nwere ezi obi karịa ndị bi na Tesalonaịka, . . . na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị.” (Ọrụ 17:11) Ma, ndị a sị na ndị Beria ka mma bụ ndị Juu nọ na Tesalonaịka, ọ bụghị Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka. Ndị ghọrọ ndị kwere ekwe ‘nabatara okwu Chineke, ọ bụghị dị ka okwu ụmụ mmadụ, kama, dị ka okwu Chineke.’ (1 Tesa. 2:13) Ọ ga-abụrịrị na ndị okenye nọ n’ọgbakọ ahụ rụsiri ọrụ ike iji kụziere ha okwu Chineke.

5 Taa, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche na-enye ìgwè atụrụ Chineke “nri ha n’oge kwesịrị ekwesị.” (Mat. 24:45) Ndị okenye na-eso ntụziaka ohu a. Ha na-arụsi ọrụ ike iji hụ na ha kụziiri ụmụnna ha okwu Chineke. E nwere ike ndị nọ n’ọgbakọ nwere ọtụtụ akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl nakwa ihe ndị e ji eme nchọnchọ, ndị dị ka, Watch Tower Publications Index na Watchtower Library nke dị na CD-ROM, n’asụsụ ụfọdụ. Ma, ndị okenye na-eji ọtụtụ awa akwadebe ihe omume ha nwere iji hụ na okwu ndị ha ga-ekwu ga-agba ụmụnna ha ume, meekwa ka okwukwe ha sikwuo ike. Ì chetụla banyere oge ọ na-ewe ndị okenye iji kwadebe ihe omume ha nwere n’ọmụmụ ihe na ná mgbakọ?

6, 7. (a) Olee otú Pọl si ghọọrọ ndị okenye nọ na Tesalonaịka ezigbo ihe nlereanya? (b) Gịnị nwere ike ime ka o siere ndị okenye ike taa iṅomi Pọl?

6 Ndị okenye nọ na Tesalonaịka chetara otú dị mma Pọl si zụọ ìgwè atụrụ Chineke. Ihe o mere o ji gaa n’ụlọ ndị mmadụ abụghị ka o mezuo iwu. Dị ka anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, Pọl ‘ghọrọ onye dị nwayọọ, dị ka mgbe nne nke na-enye nwa ara na-elekọta ụmụ ya.’ (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8.) Ọ dịdị njikere ‘inye mkpụrụ obi ya’! Ndị okenye kwesịrị iṅomi ya n’otú ha si azụ atụrụ.

7 Ndị Kraịst, bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ taa, na-eṅomi Pọl ma ọ bụrụ na ha na-elekọta ìgwè atụrụ Chineke nke ọma. O nwere atụrụ ụfọdụ ọ na-esitụ ike imete ha mma. N’agbanyeghị nke a, ndị okenye na-egosi na ha ghọtara nsogbu ha ma gbalịa ịchọpụta “ihe ọma” ndị ha na-eme. (Ilu 16:20) N’eziokwu, ebe ọ bụ na ndị okenye ezughị okè, o nwere ike isiri ha ike ịchọpụta ebe nwanna nke ọ bụla na-eme nke ọma. Ma, ka ha na-agbalịsi ike ịdị nwayọọ n’ebe mmadụ niile nọ, é kwesịghị ịja ha mma n’otú ha si agba mbọ ịzụ atụrụ otú onyeisi ha bụ́ Kraịst chọrọ?

8, 9. Olee ụzọ ụfọdụ ndị okenye si ‘eche mkpụrụ obi anyị nche’?

8 Anyị niile nwere ihe mere anyị ga-eji ‘na-anọ n’okpuru’ ndị okenye. Dị ka Pọl dere, ‘ha na-eche mkpụrụ obi anyị nche.’ (Hib. 13:17) Nke a na-echetara anyị onye ọzụzụ atụrụ nke na-amụ anya abalị ka o nwee ike ichebe ìgwè atụrụ ya. N’otu aka ahụ, ndị okenye nwere ike ịmụ anya abalị taa ebe ha na-egbo mkpa ndị ahụ́ na-adịghị ma ọ bụ ndị nwere ihe na-enye ha nsogbu n’obi ma ọ bụkwanụ ndị na-arịa ọrịa ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, a kpọtetụla ụmụnna ndị so na Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ n’ụra ka ha nwee ike ịga hụ ndị ọrịa chọrọ enyemaka ngwa ngwa. N’eziokwu, obi na-adị anyị ụtọ ma ha bịa nyere anyị aka mgbe anyị nwere nsogbu.

9 Ndị okenye ndị so ná Ndị Na-enyere Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze Aka na ndị na-enyere ndị nwere ọdachi aka na-agba mbọ igboro ụmụnna anyị mkpa ha. Ha kwesịrị ka anyị jiri obi anyị dum na-akwado ha. Tụlee otú e si nyere ndị ọdachi dakwasịrị aka mgbe ajọ ifufe kpara mkpamkpa na Mianmaa n’afọ 2008. Ụmụnna ndị bịara inye aka si ụzọ ajọ ifufe ahụ mebichara, nke ozu jukwara, gaa Ọgbakọ Botịngọn nke dị n’Irewọdi Delta, bụ́ ebe ajọ ifufe ahụ kacha kpaa aka ọjọọ. Mgbe ụmụnna hụrụ na onye bụ́bu onye nlekọta sekit ha so ná ndị mbụ bịara inyere ha aka, ha tiri mkpu, sị: “Lekwa onye nlekọta sekit anyị! Jehova azọpụtala anyị!” Ị̀ na-egosi na obi dị gị ụtọ na ndị okenye na-arụsi ọrụ ike ehihie na abalị? A na-ahọpụta ụfọdụ ndị okenye ka ha soro na kọmitii ndị ga-eleba anya n’okwu ikpe ụfọdụ ndị tara akpụ. Ndị okenye ndị a anaghị eji ọrụ ndị ha rụrụ etu ọnụ; ma ndị ha nyeere aka na-enwe obi ụtọ n’eziokwu.—Mat. 6:2-4.

10. Olee ọrụ ndị okenye na-arụ bụ́ ndị anyị na-adịchaghị ahụ?

10 Ọtụtụ ndị okenye taa nwere ọtụtụ ihe ha na-ede n’akwụkwọ. Dị ka ihe atụ, onye na-ahaziri òtù ndị okenye ọrụ na-ede aha ndị ga-eme ihe omume ndị a na-eme kwa izu. Odeakwụkwọ ọgbakọ na-edekọ akụkọ ozi ọgbakọ kwa ọnwa, nakwa kwa afọ. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ na-echebara ihe omume ndị ọ na-eke echiche iji mara onye kwesịrị ime nke ọ bụla. A na-agụzigharị akụkọ ndekọ ego ọgbakọ n’ọnwa atọ ọ bụla. Ndị okenye na-agụ akwụkwọ ozi ndị si n’alaka ụlọ ọrụ ma na-eme ihe a gwara ha, bụ́ nke na-eme ka anyị dị “n’otu n’okwukwe.” (Efe. 4:3, 13) Otú ndị okenye ndị a si arụsi ọrụ ike na-eme ka “e mee ihe niile n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro.”—1 Kọr. 14:40.

“Ndị Na-elekọta Unu”

11, 12. Ole ndị na-elekọta ọgbakọ, oleekwa otú ha si elekọta ya?

11 Pọl kwuru na ndị okenye ndị na-arụsi ọrụ ike na Tesalonaịka bụ ndị “na-elekọta” ọgbakọ ahụ. (1 Tesa. 5:12) Ị̀ chọpụtara na Pọl kwukwara na ndị okenye ahụ bụ ndị “na-arụsi ọrụ ike?” Ihe ọ na-ekwu okwu ya ebe a abụghị otu onye nke “na-elekọta” ọgbakọ, kama ọ bụ ndị okenye niile nọ n’ọgbakọ ahụ. Taa, ọtụtụ ndị okenye na-ezi ihe n’ọgbakọ. Mgbanwe a gbanwere aha bụ́ “onyeisi oche ndị nlekọta” n’oge na-adịbeghị anya ka ọ bụrụzie “onye na-ahaziri òtù ndị okenye ọrụ,” na-eme ka anyị na-ele ndị okenye niile anya dị ka ndị na-arụkọ ọrụ ọnụ.

12 Izi ihe n’ọgbakọ abụghị naanị otú e si ‘elekọta’ ọgbakọ. E dekwara okwu bụ́ ‘ilekọta’ na 1 Timoti 3:4. Pọl kwuru na onye na-elekọta ọgbakọ kwesịrị ịbụ “onye na-elekọta ezinụlọ ya nke ọma, onye nwere ụmụ na-edo onwe ha n’okpuru ya, ndị na-eji ihe akpọrọ ihe.” O doro anya na n’amaokwu a, okwu bụ́ ‘ilekọta’ apụtaghị naanị na onye nlekọta ahụ ga-ezi ụmụ ya ihe kamakwa, ọ ga-eduzi ezinụlọ ya, hụkwa na ‘ụmụ ya na-edo onwe ha n’okpuru ya.’ N’otu aka ahụ, ndị okenye na-edu ndú n’ọgbakọ, na-enyere onye ọ bụla aka ido onwe ya n’okpuru Jehova.—1 Tim. 3:5.

13. Mgbe ndị okenye na-enwe nzukọ, olee ihe nwere ike ime ka o wee ha oge ikpebi ihe a ga-eme?

13 Ka ndị okenye nwee ike ilekọta atụrụ Chineke nke ọma, ha na-ekwurịta otú ha ga-esi egbo mkpa ọgbakọ. E nwere ike ikpebi ihe ngwa ngwa ma ọ bụrụ naanị otu okenye ga-ekpebi ihe niile a ga-eme. Ma, ndị okenye nke oge a na-eme ka òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ. Ha na-eji nwayọọ ekwurịta ihe a ga-eme, na-ahụkwa na Akwụkwọ Nsọ kwadoro mkpebi ọ bụla ha mere. Ihe bụ mkpa ha bụ ịhụ na e gboro mkpa ọgbakọ otú Akwụkwọ Nsọ kwuru ka e si mee ya. Ha ga-akacha eme nke a ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ha akwadebe akwadebe tupu ha abịa nzukọ ha. Okenye nke ọ bụla kwesịrị ịchọpụta ihe Akwụkwọ Nsọ na ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, kwuru banyere ihe ha na-aga ikwurịta. N’eziokwu, ime ihe ndị a na-ewe ezigbo oge. Ọ bụrụ na ha enweghị otu olu, dị ka mgbe òtù na-achị isi na-ekwurịta okwu banyere ibi úgwù na narị afọ mbụ, ha nwere ike iwepụtakwu oge mee nchọnchọ iji hụ na ihe ha ga-ekwekọrịta ime bụ ihe Akwụkwọ Nsọ kwadoro.—Ọrụ 15:2, 6, 7, 12-14, 28.

14. Obi ọ̀ na-adị gị ụtọ ma ndị okenye jiri otu obi na-arụkọ ọrụ? Gịnị mere obi ji adị gị otú ahụ?

14 Olee ihe nwere ike ime ma otu okenye siwe ọnwụ ka e mee ihe o kwuru ma ọ bụkwanụ na-agbasi mbọ ike ka ndị okenye ndị ọzọ kweta ihe o kwuru? Ma ọ bụkwanụ, gịnị nwere ike ime ma e nwee onye na-akpata nkewa n’ọgbakọ, dị ka Dayọtrefis mere na narị afọ mbụ? (3 Jọn 9, 10) Ndị niile nọ n’ọgbakọ ga-ata ahụhụ ya. Ebe Setan gbalịrị ịkpata ọgba aghara n’ọgbakọ e nwere na narị afọ mbụ, o doro anya na ọ ga-achọkwa ịkpata ọgba aghara n’ọgbakọ taa. O nwere ike iji ụfọdụ ndị na-achọ naanị uru nke aka ha, dị ka ndị na-achọ ịnọ n’isi, kpata ọgba aghara n’ọgbakọ. N’ihi ya, ndị okenye kwesịrị ịdị umeala n’obi, na-ejikwa otu obi arụkọ ọrụ ọnụ. N’eziokwu, anyị ji ndị okenye dị umeala n’obi, bụ́ ndị ji otu obi arụkọ ọrụ, eme ọnụ.

‘Ndị Na-adụ Unu Ọdụ’

15. Olee ihe ndị okenye na-ebu n’obi adụ nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị ọdụ?

15 Pọl kwuziri otu ọrụ siri ike ma dị ezigbo mkpa ndị okenye na-arụ, ya bụ, ịdụ atụrụ Chineke ọdụ. N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ọ bụ naanị n’akwụkwọ ndị nke Pọl dere ka a hụrụ okwu Grik a sụgharịrị ka ọ bụrụ “dụọ ọdụ.” O nwere ike ịpụta ndụmọdụ siri ike, ma ọ pụtaghị iwesa mmadụ iwe. (Ọrụ 20:31; 2 Tesa. 3:15) Dị ka ihe atụ, Pọl degaara ndị Kọrịnt akwụkwọ ozi, sị: “Ana m ede ihe ndị a, ọ bụghị iji menye unu ihere, kama iji dụọ unu ọdụ dị ka ụmụ m m hụrụ n’anya.” (1 Kọr. 4:14) Ihe mere o ji na-adụ ndị ọzọ ọdụ bụ n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya.

16. Gịnị ka ndị okenye kwesịrị iburu n’obi mgbe ha na-adụ ndị ọzọ ọdụ?

16 Ndị okenye ga-eburu n’uche na ha kwesịrị ichebara otú ha si adụ ndị ọzọ ọdụ echiche. Ha ga na-agbalị ime ka Pọl, ya bụ, ha ga-enwe obiọma, hụ ndị ọzọ n’anya, ma na-enyere ha aka. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:11, 12.) N’agbanyeghị nke ahụ, ndị okenye ‘na-ejidesi okwu ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi ike ka ha wee nwee ike iji ozizi na-enye ezi ndụ na-adụsi ndị mmadụ ọdụ ike.’—Taị. 1:5-9.

17, 18. Gịnị ka i kwesịrị iburu n’obi ma ọ bụrụ na okenye adụọ gị ọdụ?

17 N’eziokwu, ndị okenye ezughị okè, ha nwekwara ike ikwu ihe ha ga-emecha kwaara ụta. (1 Eze 8:46; Jems 3:8) Ndị okenye makwaara na ịnara ndụmọdụ anaghị ‘enyecha ụmụnna ha ọṅụ, kama ọ na-ewute ha.’ (Hib. 12:11) N’ihi ya, tupu okenye enye mmadụ ndụmọdụ, o nwere ike ichebara ya echiche, kpeekwa ekpere banyere ya. Ọ bụrụ na okenye a dụọ gị ọdụ, ị̀ na-aghọta na ọ hụrụ gị n’anya?

18 Ka ewere ya na ị na-arịa ọrịa ị na-amaghị isi ya, otu dọkịta achọpụta ihe na-arịa gị, ma ya esiere gị ike ikwere na ọ bụ ihe na-arịa gị. Ị̀ ga-ewesawa dọkịta ahụ iwe? Mbanụ! Ọ bụrụgodị na o kwuo na a ga-awa gị ahụ́, o yikarịrị ka ị̀ ga-ekwe, n’ihi na i chere na ọ ga-abara gị uru. A sịgodị na otú dọkịta ahụ si gwa gị ihe na-arịa gị adịghị gị mma n’obi, ị̀ ga-ekwe ka nke ahụ gbochie gị ime ihe o kwuru? O nwere ike, ị gaghị ekwe. N’otu aka ahụ, ekwela ka otú e si dụọ gị ọdụ gbochie gị ige ndị Jehova na Jizọs họpụtara ntị. Ha nwere ike isi n’aka ndị a mee ka ị mata otú ị ga-esi nwee ọganihu n’ọgbakọ nakwa otú gị na Jehova ga-esi na-adịkwu ná mma.

Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ na Jehova Nyere Anyị Ndị Okenye

19, 20. Olee otú i nwere ike isi gosi na obi dị gị ụtọ na e nyere gị “onyinye n’ụdị mmadụ”?

19 Gịnị ka ị ga-eme ma e nye gị onyinye e kwo gị mee? Ị̀ ga-eji onyinye ahụ mee ihe bara uru, si otú ahụ gosi na obi dị gị ụtọ maka ya? Jehova si n’aka Jizọs Kraịst nye gị “onyinye n’ụdị mmadụ.” Otu n’ime ụzọ ndị ị ga-esi gosi na obi dị gị ụtọ maka onyinye a bụ ige ntị nke ọma mgbe ndị okenye na-eme ihe omume ma na-agba mbọ ime ihe ha kwuru. Otú ọzọ i nwekwara ike isi gosi na obi dị gị ụtọ bụ ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe otú ndị ọzọ ga-erite uru. Na-akwado ọrụ ndị okenye na-ebute ụzọ na ha, dị ka ikwusa ozi ọma. Ọ bụrụ na ndụmọdụ otu okenye nyere gị baara gị uru, í cheghị na ọ ga-adị mma ma ị gwa ya? Í cheghịkwa na ọ ga-adị mma ma i gosi ndị ezinụlọ ndị okenye na obi dị gị ụtọ maka otú ha si akwado ha? Cheta na ọ bụ oge okenye na ndị ezinụlọ ya gaara eji nọrịa ka o ji arụsi ọrụ ọgbakọ ike.

20 N’eziokwu, anyị nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji gosi na obi dị anyị ụtọ na Jehova nyere anyị ndị okenye, bụ́ ndị na-arụsi ọrụ ike n’etiti anyị, ndị na-elekọta anyị, nakwa ndị na-adụ anyị ọdụ. O doro anya na ndị okenye bụ “onyinye n’ụdị mmadụ,” nke Jehova nyere anyị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya.

Ì Chetara?

• Olee ihe ndị mere obi ji kwesị ịdị Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka ụtọ maka inwe ndị na-edu ndú n’etiti ha?

• Olee otú ndị okenye ọgbakọ unu si arụsi ọrụ ike n’ihi gị?

• Olee otú otú ndị okenye si elekọta gị si abara gị uru?

• Gịnị ka i kwesịrị iburu n’obi ma okenye dụọ gị ọdụ?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 27]

Obi ọ̀ dị gị ụtọ n’ọtụtụ ụzọ ndị okenye si azụ ọgbakọ?