Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere O Ji Yie Ka Ndụ A Anyị Dị Enweghị Isi?

Gịnị Mere O Ji Yie Ka Ndụ A Anyị Dị Enweghị Isi?

Gịnị Mere O Ji Yie Ka Ndụ A Anyị Dị Enweghị Isi?

GỊNỊ mere ị ga-eji kwere na oge na-abịa mgbe ndụ anyị na-agakwaghị abụ ihe na-enweghị isi, nke na-adị naanị ‘ụbọchị ole na ole’ ma “na-agafe ka onyinyo,” dị ka Eze Sọlọmọn si kwuo ya? (Ekliziastis 6:12, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Baịbụl bụ Okwu Chineke e si n’ike mmụọ dee, nke na-anaghịkwa agha ụgha. O kwuru na n’ọdịnihu, ndụ anyị ga-enwe isi.—2 Timoti 3:16, 17.

Baịbụl gwara anyị ihe mere Chineke ji kee ụwa. Ọ gwakwara anyị ihe mere ikpe na-ezighị ezi, mmegbu, na ahụhụ ji jụpụta ụwa. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị ghọta ihe ndị ahụ ọ gwara anyị? Ọ bụ n’ihi na ihe bụ́ isi mere ndị mmadụ ji eche na ndụ enweghị nnọọ isi bụ na ha amaghị, ma ọ bụ na ha achọghị ịma, ihe mere Chineke ji kee ụwa anyị a ma tinye anyị n’ime ya.

Gịnị Mere Chineke Ji Kee Ụwa?

Jehova Chineke * kere ụwa ka ọ bụrụ ọmarịcha ebe obibi maka ụmụ mmadụ, bụ́ ebe ma nwoke ma nwaanyị ga-enwe obi ụtọ, zuo okè ma dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ihe a Akwụkwọ Nsọ kwuru dị iche n’ihe ọtụtụ ndị kweere. Ha na-ekwu na ihe mere Chineke ji kee ụwa bụ ka ọ bụrụ ebe ọ ga-anọ lee ụmụ mmadụ ule iji mara ma hà kwesịrị ịga eluigwe gaa bie ndụ ka mma.—Gụọ igbe bụ́  “Ọ̀ Bụ Mgbe Anyị Hapụrụ Ụwa A Gaa Biri Ebe Ọzọ Ka Ndụ Anyị Ga-enwe Isi?” nke dị na peeji nke 6.

Chineke kere nwoke na nwaanyị n’onyinyo Ya, mee ka ha nwee ike ịna-akpa àgwà ka Ya. (Jenesis 1:26, 27) Mgbe o kere ha, ha zuru okè. O nyere ha ihe niile ga-eme ka ha na-enwe obi ụtọ ná ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ gwakwara ha ka ha mụọ ụmụ ma mee ka ụwa niile ghọọ paradaịs nke mara nnọọ mma ka ogige Iden.—Jenesis 1:28-31; 2:8, 9.

Gịnị Mere na Ụwa Adịghị Otú ahụ Chineke Chọrọ Ya?

O doro anya na o nwere ebe mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ. Ọtụtụ ndị taa anaghị akpa àgwà ka Chineke. Ụwa abụghịkwanụ paradaịs. Gịnị mere? Nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, erubereghị Chineke isi. Ha chọrọ ‘ịdị ka Chineke,’ ka ha na-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ “ihe ọma na ihe ọjọọ.” Ha si otú ahụ nupụrụ Chineke isi otú Setan bụ́ Ekwensu mere.—Jenesis 3:1-6.

N’ihi ya, ihe ọjọọ esighị n’aka Chineke, dị ka ụfọdụ ndị na-ekwu. Ihe ọjọọ malitere mgbe Setan nupụụrụ Chineke isi, e mechaakwa Adam na Iv esoro ya. Isi ahụ nne na nna anyị mbụ nupụụrụ Chineke mere ka ha ghọzie ndị na-ezughị okè, a chụpụkwa ha na Paradaịs ahụ. Ha ji aka ha butere onwe ha na ụmụ ha niile mmehie na ọnwụ. (Jenesis 3:17-19; Ndị Rom 5:12) Ọ bụ ya mere ụwa ji dị otú ọ dị ugbu a, nke mekwaranụ o ji adị ndị mmadụ ka ndụ a anyị dị enweghị isi.

Gịnị Mere na Chineke Egbughị Ndị ahụ Nupụụrụ Ya Isi Ozugbo?

Ụfọdụ ndị nwere ike ịjụ, sị, ‘Gịnị mere na Chineke egbughị Setan na Adam na Iv ma kee ndị ọzọ?’ Ọ bụrụ na Chineke mere otú ahụ ị̀ ga-asị na ọ maara ihe? Ọ bụrụ na ị nụrụ na e nwere onye ọchịchị dị ike, nke na-egbu onye ọ bụla kwuru na ọchịchị ya adịghị mma, olee otú obi ga-adị gị? Ọ̀ bụ na nke ahụ agaghị eme ka ndị mmadụ lewe onye ọchịchị dị otú ahụ anya ọjọọ ma zewe ya ezewe?

Chineke kpebiri na ya agaghị egbu ndị nnupụisi ahụ ozugbo. O gosiri na ọ maara ihe. Iji dozie okwu ahụ a malitere n’Iden otu ugboro, ọ hapụrụ ụmụ mmadụ ka ha chịtụ onwe ha, ebe ọ bụ na ha achọghị ka ọ chịwa ha.

Otú A Ga-esi Wepụ Ihe Ọjọọ Niile

O nwere ihe dị mkpa anyị kwesịrị icheta: Chineke agaghị ekwe ka ihe ọjọọ dịruo ebighị ebi. Ọ hapụtụgodịrị ihe ọjọọ n’ihi na ọ maara na ozugbo e doziri okwu ahụ ndị nnupụisi ahụ welitere, na ya ga-ewepụ nsogbu niile ụmụ mmadụ kpataara onwe ha.

Chineke agbanwebeghị ihe o bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ. Jehova si n’ọnụ Aịzaya onye amụma gwa anyị na ya bụ Onye kere ụwa, “onye na-ekeghị ya n’efu, onye kpụrụ ya ka e biri n’ime ya.” (Aịzaya 45:18) N’oge na-adịghị anya, ọ ga-ebido ime ka ụwa a dịrị otú ọ chọburu ka ọ dịrị. N’oge ahụ, ọ ga-edo anya na ọchịchị Chineke kacha mma, o nweghịzi onye ga-ata Chineke ụta ma o jiri ike ya mezuo uche ya ma gbuo ndị ọjọọ niile. (Aịzaya 55:10, 11) N’ekpere Jizọs Kraịst kụziri, ọ gwara anyị ka anyị rịọ Chineke ka ọ bịa wepụ ihe ọjọọ niile. O kwuru ka anyị rịọ Chineke, sị: “Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:9, 10) Gịnị bụ uche Chineke nke anyị na-arịọ ka o mee?

Uche Chineke Maka Ụwa

Otu n’ime ha bụ na “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa.” (Abụ Ọma 37:9-11, 29; Ilu 2:21, 22) Jizọs Kraịst “ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka, nakwa onye nọ n’ahụhụ.” Ọ ga-azọpụta “ha ná mmegbu nakwa n’ihe ike.” (Abụ Ọma 72:12-14) Agha, ọnwụ, anya mmiri, ihe mgbu, ma ọ bụ ahụhụ agaghịkwa adị ọzọ. (Abụ Ọma 46:9; Mkpughe 21:1-4) A ga-akpọlite ọtụtụ ndị nwụrụ n’oge a Chineke hapụtụgodịrị ka ihe ọjọọ dịrị ka ha wee biwekwa ndụ n’ụwa, a ga-enyekwa ha ohere ife Chineke ma nweta ngọzi ndị a e kwuru okwu ha na ngọzi ndị ọzọ.—Jọn 5:28, 29.

N’eziokwu, Jehova ga-ewepụ nsogbu niile nnupụisi Setan kpatara. Nsogbu niile ahụ ga-agwụ kpamkpam nke na ụmụ mmadụ “ga-echefu ahụhụ niile ha tara n’oge gara aga.” (Aịzaya 65:16-19) Ihe a Baịbụl kwuru ga-emezurịrị. Chineke anaghị agha ụgha. Nkwa niile o kwere na-emezu. Mgbe ahụ, ndụ agaghị abụ ‘ihe efu na ịchụso ifufe.’ (Ekliziastis 2:17) Kama nke ahụ, ndụ ga-adị ụtọ.

Oleekwanụ maka ugbu a? Ịmara ihe Baịbụl na-akụzi na ịghọta ihe mere Chineke ji kee ụwa ò nwere ike ime ka ndụ gị nwee isi ugbu a? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Baịbụl kwuru na Jehova bụ aha Chineke.

[Igbe dị na peeji nke 6]

 Ọ̀ Bụ Mgbe Anyị Hapụrụ Ụwa A Gaa Biri Ebe Ọzọ Ka Ndụ Anyị Ga-enwe Isi?

Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ndị na-amaghị ihe Chineke bu n’obi kee ụwa a na-akụziri ndị mmadụ na anyị ga-ahapụrịrị ụwa a gaa biri ebe ọzọ tupu ndụ anyị enwee isi.

Ụfọdụ ndị kwuru na ‘mkpụrụ obi mmadụ bu ụzọ bie ndụ n’eluigwe tupu ya abanye n’ahụ́ mmadụ.’ (Akwụkwọ bụ́ New Dictionary of Theology) Ndị ọzọ kwuru na ‘a tụrụ mkpụrụ obi mkpọrọ n’ahụ́ mmadụ iji taa ya ahụhụ maka mmehie ndị o mere mgbe ọ nọ n’eluigwe.’—Akwụkwọ bụ́ Cyclopedia of Biblical, Theological, and Ecclesiastical Literature.

Ndị Gris bụ́ ndị ọkà mmụta, dị ka Socrates na Plato, kụziiri ndị mmadụ ihe a: Ọ bụ naanị mgbe mkpụrụ obi si n’ahụ́ mmadụ, bụ́ ebe a kpọchiri ya, pụta ka ọ ga-enwe ike “inwere onwe ya ná mwagharị niile ọ na-awagharị, nzuzu niile ọ na-ezuzu, ụjọ niile ọ na-atụ, na ihe ọjọọ niile ọ na-eme, nakwa ná nsogbu ndị ọzọ na-abịara mmadụ.” Ọ bụzi mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ike “isoro chi dị iche iche e nwere biwe ndụ ebighị ebi.”—Akwụkwọ bụ́ Plato’s Phaedo, 81, A.

Ka e mechara, ndị kpọrọ onwe ha ndị isi chọọchị Ndị Kraịst bidoro kụziwe ihe ahụ ndị ọkà mmụta, bụ́ ndị Gris kụziri, nke bụ́ na “mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ.”—Akwụkwọ bụ́ Christianity—A Global History.

Ka anyị hụgodị ọdịiche dị n’ihe ndị ahụ ha kwuru na ihe atọ Baịbụl na-akụzi:

1. Ihe Chineke bu n’obi kee ụwa bụ ka ụwa bụrụ ebe ụmụ mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị ebe a na-anọ ele ha ule iji mara ndị ruru eru ka ha na Chineke biri n’eluigwe. A sị na Adam na Iv rubeere Chineke isi, ha gaara adị ndụ na paradaịs n’ụwa ebe a ruo ugbu a.—Jenesis 1:27, 28; Abụ Ọma 115:16.

2. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ okpukpe na-akụzi na mmadụ nwere ihe a na-akpọ mkpụrụ obi, bụ́ nke ha sịrị na ọ na-esi n’ahụ́ mmadụ apụ ma mmadụ nwụọ, Baịbụl kwuru ihe dị iche. O kwuru na mmadụ bụ “mkpụrụ obi dị ndụ” nke e ji “ájá si n’ala” kpụọ. (Jenesis 2:7) O nwetụbeghị ebe Baịbụl kwuru na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ. O kwuru na e nwere ike igbu mkpụrụ obi ma ọ bụ na mkpụrụ obi nwere ike ịnwụ, kwụsịzie ịdị ndụ. (Abụ Ọma 146:4; Ekliziastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4, 20) Mmadụ mbụ bụ́ Adam bụ mkpụrụ obi, ọ nwụrụ ma laghachi n’ájá bụ́ ebe e si kee ya. Mgbe ọ nwụrụ, o nweghị ebe ọzọ ọ gara biri.—Jenesis 2:17; 3:19.

3. Ihe ga-eme ka mmadụ dị ndụ ọzọ n’ọdịnihu bụ na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ na paradaịs n’elu ụwa, ọ bụghị maka na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ nke na-aga ebiri ebe ọzọ.—Daniel 12:13; Jọn 11:24-26; Ọrụ 24:15.