Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ga-eme Ka Ndụ Gị Nwee Isi Ugbu A Nakwa Ruo Ebighị Ebi

Ihe Ga-eme Ka Ndụ Gị Nwee Isi Ugbu A Nakwa Ruo Ebighị Ebi

Ihe Ga-eme Ka Ndụ Gị Nwee Isi Ugbu A Nakwa Ruo Ebighị Ebi

E NWERE ihe ị ga-eme ka ndụ gị nwee isi ugbu a. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ ime ihe ndị Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, kwuru. Ka anyị hụ ụfọdụ n’ime ha.

IHE BAỊBỤL KWURU: Eze Sọlọmọn dere, sị: “Ọ dịghị ihe dịịrị mmadụ mma karịa iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, meekwa ka mkpụrụ obi ya hụ ihe ọma n’ihi ịrụsị ọrụ ike ya.”EKLIZIASTIS 2:24.

E kere anyị ka anyị nwee ike inwe obi ụtọ mgbe anyị na-arụ ọrụ dị mma. Ọ bụrụgodị na ihe siiri anyị ezigbo ike, anyị nwere ike inwe obi ụtọ ná ndụ ma ọ bụrụ na anyị na-arụsi ọrụ ike ma na-akwụwa aka ọtọ n’ihe ndị anyị na-eme.

IHE BAỊBỤL KWURU: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”ỌRỤ 20:35.

Ọtụtụ ndị achọpụtala na ihe na-eme ka ha nwee obi ụtọ nakwa ka ndụ ha nwee isi bụ inyere ndị ọzọ aka, karịchaa n’oge ihe siiri ndị ahụ ike. Sọlọmọn dere, sị: “Ajụla imere ha ihe ọma bụ́ ndị e kwesịrị imere ya, mgbe ọ dị n’ike aka gị ime ya.”—Ilu 3:27.

Weregodị Ralph dị ka ihe atụ. Mgbe ọ lara ezumike nká, o sooro nwunye ya bido ikwusa ozi ọma oge niile. Ha abụọ na-eji ọtụtụ awa akụziri ndị mmadụ Baịbụl n’ọnwa ọ bụla. Ralph sịrị: “Anyị lọta ná mgbede, ike na-agwụ anyị, ma, ọ bụchaghị nká mere ike ji agwụ anyị, kama ọ bụ n’ihi na anyị ji ike anyị jeere Nna anyị nke eluigwe ozi. Ụdị ike ọgwụgwụ a na-atọ anyị ụtọ!” Ya na nwunye ya na-enwe obi ụtọ n’ihi na ha na-enyere ndị ọzọ aka.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.”ILU 17:17.

Ọ bụrụ na mmadụ akọsara onye ọzọ nsogbu ya, ọ na-adịtụrụ ya mfe odidi. Onye Ịngland bụ́ onye edemede, nke aha ya bụ Francis Bacon, dere na onye na-enweghị ezigbo ndị enyi “yiri onye naanị ya nọ n’ala ịkpa.” Inwe ezigbo ndị enyi na ịbụ ezigbo enyi nwere ike ime ka ọ dịrị gị mfe idi nsogbu ụwa; o nwere ike ime ka i nwee obi ụtọ ná ndụ.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.”MATIU 5:3.

Ihe a Jizọs kwuru na-egosi ihe dị mkpa ị ga-eme ka i nwee ike ịnọ ya mgbe Chineke ga-emezu nkwa ndị o kwere. Ihe ahụ dị mkpa bụ ịghọta na i nwere “mkpa ime mmụọ” na ime ihe niile i nwere ike ime iji gboo ya. Otu ihe mere anyị ji dị iche n’ụmụ anụmanụ bụ na ọ na-agụ anyị agụụ ịghọta ihe mere anyị ji dịrị ndụ. Ọ bụ naanị Jehova Chineke ga-enyere anyị aka igbo mkpa ahụ, ọ bụkwa n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl, ka o si egboro anyị ya. Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, Baịbụl kọọrọ anyị ihe mere Chineke ji kee ụwa. Ọ gwara anyị ihe Chineke bu n’obi kee anyị, ihe mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ taa, na ihe Chineke chọrọ n’aka anyị. Ịghọta ihe ndị a Akwụkwọ Nsọ kwuru so n’ihe ndị na-eme ka ndụ anyị nwee isi ma tọwa anyị ụtọ. Ndị na-ewepụta oge na-amụ Baịbụl ma na-eme ihe ndị ha mụtara na-enwe obi ụtọ ná ndụ. Gịnị mere ha ji enwe obi ụtọ? Ọ bụ n’ihi na ịmụ Baịbụl na ime ihe ha na-amụta na ya emeela ka ha na Onye kere ha, bụ́ Jehova ‘Chineke onye obi ụtọ,’ dịkwuo ná mma.—1 Timoti 1:11.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ekwela ka okorobịa nke ị bụ mee ka i chefuo Onye kere gị. Nye ya nsọpụrụ mgbe ị bụ okorobịa tupuu ụbọchị ọjọọ ahụ abịa, mgbe ndụ na-agaghị atọkwa gị ụtọ.”EKLIZIASTIS 12:1, BAỊBỤLỤ NSỌ NKE INTERNATIONAL BIBLE SOCIETY.

Ọ bụ ụmụ okoro na agbọghọ, bụ́ ndị ndụ na-egbu ka mmanya nke na ha amaghị na nsogbu nwere ike ịbịara mmadụ ná ndụ, ka Eze Sọlọmọn nyere ndụmọdụ a. Ma, ndụmọdụ a baara anyị niile uru. Bute Onye kere gị ụzọ ná ndụ gị, ọ bụ nke a ga-eme ka ndụ gị nwee isi. Ebila ụdị ndụ ọtụtụ ndị na-ebi taa nke bụ́: “Ka anyị rie ma ṅụọ, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.” (1 Ndị Kọrịnt 15:32) Dị ka Ekliziastis 8:12 kwuru, ọ bụrụ na i bute Chineke ụzọ ná ndụ gị, ihe ‘ga-adịrị gị mma.’

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Wendi chọpụtara na nke a bụ eziokwu. Ya na nwanne ya nwaanyị mụrụ asụsụ Spanish ka ha nwee ike ịga kwusaa ozi ọma na Dọminikan Ripọblik, bụ́ ebe a chọrọ ndị na-ekwusa ozi ọma. Wendi kwuru, sị: “Anyị hapụrụ ọtụtụ ihe ka anyị nwee ike gaa ebe ahụ, ma ozi ọma anyị kwusara ebe ahụ tọgburu anyị atọgbu. O nweghị ihe m ga-eji tụnyere ọnwa isii anyị nọrọ n’ebe ahụ! Ngọzi ndị anyị nwetara karịrị nnọọ ihe ndị anyị hapụrụ.”

Irubere Chineke Isi Na-eme Ka Ndụ Nwee Isi

Ọ bụrụ na gị na Jehova adịrị ná mma, o nwere ike ime ka ndụ gị nwekwuo isi ma na-atọ gị ụtọ. Olee otú nke a ga-esi mee? Setan mere ka Adam na Iv nupụrụ Chineke isi, o yikwara ka ihe Setan kwuru ọ̀ bụ na o nweghị onye ga-anọgide na-eme ihe Chineke na-achọ ma ọ bụrụ na ihe esiere onye ahụ ike. (Job 1:9-11; 2:4) I nwere ike igosi na ihe ahụ Setan kwuru bụ ụgha! Olee otú ị ga-esi eme ya? Ọ bụ irubere Chineke isi, idebe iwu ya, na igosi na i kwetara na ọ bụ naanị Jehova ruru eru ikpebiri ụmụ mmadụ ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ.—Mkpughe 4:11.

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe Chineke na-achọ, ọ ga-adị mkpa ka anyị die nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị. Nsogbu ndị a hà ga-eme ka ndụ anyị ghara inwe isi? Weregodị ya na e nwere otu onye iro bịara na-ekwutọ ezigbo enyi gị ma ọ bụ nwanne gị. Ọ bụrụ na onye iro ahụ emee ka ihe siere gị ike maka na ị na-agbachitere ezigbo enyi gị ahụ ma ọ bụ nwanne gị ahụ, ọ̀ ga-eme ka ị kwụsị inwe obi ụtọ ná ndụ? Mbanụ! Anyị ga-eji obi ụtọ die nsogbu ọ bụla bịaara anyị mgbe anyị na-agbachitere onye ahụ anyị hụrụ n’anya. Otú ahụ ka irubere Chineke isi dịkwa. Ọ bụrụ na anyị ana-erubere Chineke isi n’agbanyeghị nsogbu ndị anyị na-enwe n’oge a, anyị ga-eme ka obi dị Chineke ụtọ.—Ilu 27:11.

Ndụ Anyị Ga-enwe Isi Ruo Mgbe Ebighị Ebi

Gbalịsie nnọọ ike mụtakwuo banyere Chineke na ihe ndị ọ chọrọ imere anyị. Jizọs Kraịst sịrị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Mgbe Chineke ga-emezu ihe o bu n’obi kee ụwa, ndị na-erubere ya isi ga-enwe ike ibi “ndụ ebighị ebi” na paradaịs n’elu ụwa, nke bụ́ ihe Jehova bu n’obi mgbe o kere ha. Mgbe ahụzi ka ndụ anyị ga-enwe isi ma tọwa anyị ezigbo ụtọ.—Abụ Ọma 145:16.

Gịnị ga-enyere gị aka ịmata Chineke na Jizọs nke ọma? Ọ bụ Baịbụl, bụ́ Okwu Chineke e ji ike mmụọ nso dee. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka e nyere gị aka ịmụ Baịbụl, detara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ ozi. Obi ga-adị ha ụtọ izite onye ga-enyere gị aka ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi.