Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

GỊNỊ mere otu nwaanyị nke dị afọ iri isii ji kwụsị ife arụsị? Gịnị mere otu onye nkụzi n’okpukpe Shinto ji hapụ okpukpe Shinto ma ghọọ Onye Kraịst? Olee otú otu nwaanyị nke ndị mụrụ ya jụrụ mgbe a mụrụ ya ọhụrụ, di na nwunye ọzọ akpọrọ ya zụwa, si die mwute ọ malitere inwe mgbe ọ matara na ndị mụrụ ya jụrụ ya ajụ? Ka anyị gụọ akụkọ ha.

“Akwụsịla m ịgbara arụsị ohu.”—ABA DANSOU

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1938

ABỤ M ONYE: BENIN

NDỤ M BIRI: ANA M EFE ARỤSỊ

NDỤ M BIRI NA MBỤ: M tolitere na Sochọhuwe, bụ́ otu obodo nta na-adịkarị apịtị apịtị, nke dị nso n’otu ọdọ mmiri. Ndị obodo anyị na-akụ azụ̀, na-azụ ehi, ewu, atụrụ, ézì na ọkụkọ. Ndị mmadụ na-eji ụgbọ mmiri aga ebe ndị ha chọrọ ịga n’ihi na okporo ụzọ adịghị n’ebe ahụ. Ha na-ejikarị osisi na ahịhịa arụ ụlọ, ma e nwekwara ụfọdụ ụlọ ndị e ji brik rụọ. Ọtụtụ ndị bụ ndị ogbenye. Ma, ihe ọjọọ adịchaghị otú ọ dị n’obodo ndị mepere emepe.

Mgbe m dị obere, papa m zigara mụ na nwanne m nwaanyị n’ebe a na-azụ ndị owu mmiri ka anyị nwee ike ghọọ ndị owu mmiri. Mgbe m toro, ọ bụ chi ndị Yoruba a na-akpọ Oduduwa ka m fewere. M rụụrụ chi a ụlọ, m na-ejikarịkwa ji, mmanụ nri, eju, ọkụkọ, nduru, na anụmanụ ndị ọzọ achụrụ ya àjà. Àjà ndị a m na-achụ na-efu m ezigbo ego, mgbe ụfọdụ, ọ na-afọ obere ka o wekọrọchaa ego m niile.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe m malitere ịmụ Baịbụl, m mụtara na ọ bụ Jehova bụ naanị ezi Chineke. M mụtakwara na ọ chọghị ka ụmụ mmadụ na-efe arụsị. (Ọpụpụ 20:4, 5; 1 Ndị Kọrịnt 10:14) M ghọtara ihe m kwesịrị ime. M tụfuru arụsị niile m nwere ma wepụsịa ihe niile e ji efe arụsị dị n’ụlọ m. M kwụsịrị ịjụ arụsị ase, kwụsịkwa iso ndị obodo anyị eme ememme na akwamozu.

Ebe ọ bụ na mụ akarịala afọ isii mgbe ahụ, ọ dịrịghị m mfe ime mgbanwe ndị a. Ndị enyi m, ndị ikwu m, na ndị agbata obi m malitere imegide m na iji m eme ihe ọchị. Ma, m kpegaara Jehova ekpere ka o nye m ike ime ihe dị mma. Ihe e dere n’Ilu 18:10 gbara m ume. Amaokwu ahụ sịrị: “Aha Jehova bụ ụlọ elu siri ike. N’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, e wee chebe ya.”

Ihe ọzọ nyeere m aka bụ ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. N’ọmụmụ ihe ndị ahụ, ha gosiri m na ha hụrụ m n’anya. Otú Ndịàmà Jehova si agbalị ibi ndụ otú Baịbụl kwuru tọrọ m ụtọ. Ihe ndị a m hụrụ mere ka m kwenyesie ike na ọ bụ Ndịàmà Jehova na-efe Chineke otú Chineke chọrọ.

URU NDỊ M RITERELA: Ime ihe Baịbụl kwuru emeela ka mụ na ụmụ m dịkwuo ná mma. Ọ dịkwa ka à napụrụ m ibu na-anyịgbu m. Ana m ejibu ego m niile azụ ihe ndị m ji achụrụ arụsị na-enweghị uru ha na-abara m àjà. Ugbu a, m na-efe Jehova, bụ́ onye ga-egboro anyị mkpa anyị niile kpamkpam. (Mkpughe 21:3, 4) Obi dị m ezigbo ụtọ na anaghịzi m agbara arụsị ohu, kama onye m na-ejere ozi ugbu a bụ Jehova! O meela ka ahụ́ ruo m ala, ọ na-echebekwa m.

“Kemgbe m bụ nwata, anọ m na-achọ Chineke.”—SHINJI SATO

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1951

ABỤ M ONYE: JAPAN

NDỤ M BIRI: ABỤ M ONYE NKỤZI N’OKPUKPE SHINTO

NDỤ M BIRI NA MBỤ: M tolitere n’otu ime obodo dị na Fukuoka Prifekchọ. Nne na nna m ji okpukpe ha kpọrọ ihe; ha malitere mgbe m dị obere kụziwere m ka m na-asọpụrụ chi dị iche iche e nwere n’okpukpe Shinto. N’oge ahụ m bụ nwata, m na-echekarị echiche banyere ihe m ga-eme ka m nweta nzọpụta, ọ na-agụsikwa m agụụ ike inyere ndị nọ ná nsogbu aka. M na-echeta otu oge mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị, onye nkụzi anyị jụrụ ndị klas anyị ihe onye ọ bụla n’ime anyị chọrọ ime ma o too. Ụmụ klas ibe m nwere ihe ndị doro anya ha chọrọ ime ná ndụ, dị ka ịghọ ndị ọkà mmụta sayensị. M kwuru na ihe m chọrọ ime bụ ife Chineke. Mmadụ niile chịrị m ọchị.

Mgbe m gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, m banyere ụlọ akwụkwọ ndị chọrọ ịghọ ndị nkụzi n’okpukpe Shinto. N’oge m nọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, m hụrụ otu onye nkụzi n’okpukpe Shinto nke na-agụkarị otu akwụkwọ mkpo ya dị oji n’oge ọ bụla o nwere ohere. Otu ụbọchị, ọ jụrụ m, sị, “Sato, ị̀ ma akwụkwọ a m na-agụ?” Ebe m hụrụla ihe e dere n’ihu akwụkwọ ahụ, m sịrị ya na ọ bụ “Baịbụl.” Ọ sịrị m, “Onye ọ bụla nke chọrọ ịghọ onye nkụzi n’okpukpe Shinto kwesịrị ịgụ akwụkwọ a.”

M gara zụrụ otu Baịbụl ozugbo. Edebere m Baịbụl ahụ n’ebe m ga na-ahụ ya mgbe niile, m na-ehichakwa ya mgbe niile. Ma, ewepụtaghị m ohere gụọ ya n’ihi na anaghị m enwe efe n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Mgbe m si n’ụlọ akwụkwọ ahụ pụta, aghọrọ m onye nkụzi n’ụlọ okpukpe Shinto, nke bụ́ ọrụ m chọrọ ịrụ kemgbe m bụ nwata.

Ma, ọ dịghị anya mụ achọpụta na ọrụ ahụ adịghị otú m tụrụ anya ya. Ọtụtụ ndị nkụzi ibe m ahụghị ndị ọzọ n’anya, ihe gbasara ndị ọzọ anaghịkwa emetụ ha n’obi. Ọtụtụ n’ime ha enweghịkwa okwukwe. Otu onye n’ime ha, bụ́ onye ka m n’ọkwá, gwadịrị m, sị: “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ ezigbo onye nkụzi, naanị ihe ị ga na-agwa ndị mmadụ bụ ihe ha ga-achọ ịnụ. N’ebe a, anyị anaghị ekwute okwu inwe okwukwe.”

Ihe ahụ ọ gwara m mere ka ike ikpe okpukpe Shinto gwụ m. Ọ bụ eziokwu na m ka na-arụ ọrụ n’ụlọ okpukpe Shinto, amalitere m ileba anya n’okpukpe ndị ọzọ. Ma, o nweghị nke m hụrụ ka mma. Ka m na-elebakwu anya n’okpukpe dị iche iche, ihe ndị m na-ahụ mere ka ike gwụkwuo m. Abịara m chewe na o nweghị okpukpe na-akụzi eziokwu.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: N’afọ 1988, otu onye na-ekpe okpukpe Buda gbara m ume ka m gụọ Baịbụl. Ihe a ọ gwara m mere ka m cheta ihe onye nkụzi ahụ gwara m ọtụtụ afọ gara aga. M mere ihe ahụ ha kwuru. Mgbe m malitere ịgụ Baịbụl, ọ tọwara m ụtọ. Mgbe ụfọdụ, m na-agụ ya n’abalị ruo mgbe anwụ ụtụtụ wara.

Ihe m gụtara na Baịbụl mere ka m kpegara Chineke nke Baịbụl ekpere. Amalitere m ikpe ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe nke dị na Matiu 6:9-13. M na-ekpe ya awa abụọ ọ bụla, ọ sọgodị ya ya bụrụ mgbe m na-arụ ọrụ n’ụlọ okpukpe Shinto.

E nwere ọtụtụ ajụjụ m chọrọ ịjụ n’ihi Baịbụl ahụ m na-agụ. N’oge ahụ, alụọla m nwaanyị, amakwa m na Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl n’ihi na o nweela mgbe ha bịara zie nwunye m ozi ọma. M chọtara otu Onyeàmà Jehova ma jụọ ya ọtụtụ ajụjụ. Otú o si jiri Baịbụl zaa ajụjụ niile m jụrụ ya tọrọ m ụtọ. Ọ gwara Ndịàmà Jehova ndị ọzọ ka ha bịa kụziwere m Baịbụl.

Mgbe obere oge gafere, m malitere ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. N’oge ahụ, amaghị m na ụfọdụ n’ime Ndịàmà Jehova na-abịa ọmụmụ ihe n’ebe ahụ bụ ndị m kparịrị n’oge gara aga. N’agbanyeghị nke ahụ, ha kelere m nke ọma ma mee ka obi ruo m ala.

N’ọmụmụ ihe ndị ahụ, m mụtara na Chineke chọrọ ka ndị bụ́ di na-ahụ ndị ezinụlọ ha n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù. Tupu oge ahụ, anaghị m elebara nwunye m na ụmụ anyị anya n’ihi na m weere ọrụ m ka ihe ka mkpa. M bịara ghọta na m na-ege ndị bịara ife ofufe n’ụlọ okpukpe Shinto ntị nke ọma, ma o nwetụbeghị mgbe m gere nwunye m ntị.

Ka m na-amụkwu Baịbụl, m ghọtara ọtụtụ ihe banyere Jehova bụ́ ndị mere ka m bịarukwuo ya nso. E nwere amaokwu Baịbụl ndị kacha ruo m n’obi. Otu n’ime ha bụ Ndị Rom 10:13, bụ́ ebe kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.” Kemgbe m bụ nwata, anọ m na-achọ Chineke, ma ugbu a, achọtala m ya!

M gaa n’ụlọ okpukpe Shinto, ahụ́ anaghịzi eru m ala. Ná mbido, ihe na-echegbu m bụ ihe ndị mmadụ ga-ekwu ma m hapụ okpukpe Shinto. Ma, m chetara na m gwara onwe m na ọ bụrụ na m chọta ezi Chineke n’okpukpe ọzọ, m ga-ahapụ okpukpe Shinto. N’ihi ya, n’afọ 1989, m kpebiri ime ihe akọnuche m gwara m mee. M hapụrụ okpukpe Shinto ma malite ife Jehova.

Ịhapụ okpukpe Shinto adịrịghị m mfe. Ndị ka m n’ọkwá n’okpukpe ahụ kparịrị m ma gbalịa ime ka m ghara ịpụ. Ma, ihe ka siere m ike ime bụ ịgwa ya ndị mụrụ m. Mgbe m na-aga n’ụlọ ha ịga gwa ha, ezigbo ụjọ jidere m nke na obi kụgidere m kpum kpum gbuwezie m mgbu, ụkwụ nọkwa na-ama m jijiji! M kwụsịrị ọtụtụ ugboro n’ụzọ kpegara Jehova ekpere ka o nye m ike.

Mgbe m rutere n’ụlọ ndị mụrụ m, ụjọ ekweghị m kwuo ihe m ji bịa. Ọtụtụ awa gafere. M kpere ekpere ọtụtụ ugboro, n’ikpeazụ, m kọọrọ papa m ihe niile. M gwara ya na achọtala m ezi Chineke, n’ihi ya, m na-ahapụ okpukpe Shinto ka m nwee ike fee Chineke ahụ. Ihe ahụ m gwara ya enyeghị ya ọnụ okwu, o wutekwara ya. Ndị ikwu m ndị ọzọ bịara n’ebe ahụ ma gbalịa ime ka m gbanwee obi m. Ọ bụghị na m chọrọ ime ihe ga-ewute ndị ezinụlọ anyị, kama m maara na ife Jehova bụ ihe m kwesịrị ime. Ka oge na-aga, ndị ezinụlọ anyị kwụsịrị inye m nsogbu.

Mgbe m hapụchara okpukpe Shinto, nsogbu ọzọ m nwere bụ iwepụ ihe niile banyere okpukpe ahụ n’obi m. O riela m ahụ́. M gbalịsiri ike ichefu ya, ma e nwere ọtụtụ ihe na-eme ka m na-echeta ya.

E nwere ụzọ ihe abụọ nyeere m aka iwepụ ya n’obi m. Nke mbụ bụ na m wepụtasịrị ihe niile dị n’ụlọ m bụ́ ndị gbasara okpukpe Shinto ma kpọọ ha niile ọkụ, ma akwụkwọ ma foto ma ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ dị oké ọnụ. Nke abụọ bụ na m gbalịsiri ike ka mụ na Ndịàmà Jehova na-akpachi anya. Mkpakọrịta mụ na ha nyeere m ezigbo aka. M jizi nwayọọ nwayọọ chefuo ihe niile gbasara okpukpe Shinto.

URU NDỊ M RITERELA: Anaghị m elebara nwunye m na ụmụ m anya nke na ọ na-adị nwunye m ka o nweghị di, na-adịkwa ụmụ m ka ha enweghị nna. Ma mgbe m malitere ilebara ha anya otú Baịbụl gwara ndị bụ́ di ka ha na-eme, mụ na ha bịara dịkwuo ná mma. Ka oge na-aga, nwunye m bịara soro m fewe Jehova. Anyị na nwa anyị nwoke na nwa anyị nwaanyị na di ya na-efekọ Jehova ugbu a.

Mgbe ọ bụla m chetara na ife Chineke na inyere ndị ọzọ aka malitere ịgụ m agụụ mgbe m bụ nwata, obi na-atọ m ụtọ na achọtala m ihe m na-achọ ma chọta ya karịa otú m tụrụ anya ya. Enweghị m ike ikelecha Jehova maka ihe niile o meere m.

“Ama m na o nwere ihe kọrọ ná ndụ m.”—LYNETTE HOUGHTING

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1958

ABỤ M ONYE: SAỤT AFRỊKA

NDỤ M BIRI: M BIRI NDỤ KA ONYE A JỤRỤ AJỤ

NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m na Jemiston, bụ́ obodo a na-egwupụta ọla na ya. Ọtụtụ ndị bi na ya enwechaghị ego, e nwechaghịkwa ndị ọjọọ na ya. Mgbe a mụrụ m, ndị mụrụ m weere na ha agaghị elekọtali m, n’ihi ya, ha kpọgara m ebe ndị ọzọ ga-akpọrọ m. Naanị izu abụọ a mụchara m, otu di na nwunye kpọọrọ m zụwa m ka nwa ha, echekwara m na ha bụ nne na nna m. Ma mgbe m mechara mata na ọ bụghị ha mụrụ m, ọ bịara dịwa m ka m̀ bụ onye a jụrụ ajụ. Ọ bịara na-adị m ka o nweghị ihe jikọrọ mụ na ndị ahụ zụrụ m nakwa na ha anaghị aghọtacha otú obi dị m.

Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na isii, amalitere m ịga n’ụlọ oriri na nkwari, bụ́ ebe mụ na ndị enyi m na-aga agba egwú ma na-ekiri ndị na-agụ egwú. Ebidoro m ṅụwa sịga mgbe m dị afọ iri na asaa. Achọrọ m ịdị gịrịgịrị ka ndị na-aṅụ sịga a na-egosi na tiivi. Mgbe m dị afọ iri na itoolu, amalitere m ọrụ n’obodo Johanisbọg. N’ebe ahụ, mụ na ndị ọjọọ bidoro kpawa. Ọ dịghị anya mụ ebido ikwu okwu rụrụ arụ, ịṅụ sịga mgbe niile, na ịṅụ oké mmanya ná ngwụcha izu.

N’agbanyeghị ihe ndị a m na-eme, ana m eme egwuregwu dị iche iche, dị ka ịgba ọsọ, igwu mmiri, na ịgba bọl ụmụ nwaanyị. Ana m arụsikwa ọrụ ike n’ọrụ m na-arụrụ ụlọ ọrụ na-arụpụta kọmputa nke na aghọrọ m onye a ma ama. N’ihi nke a, enwere m ego, ọtụtụ ndị na-elekwa m anya ka onye ihe niile zuuru. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na obi adịghị m mma, ọ dịkwa m ka ndụ m enweghị isi. N’ime obi m, ama m na o nwere ihe kọrọ ná ndụ m.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe m bidoro ịmụ Baịbụl, amụtara m na Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Amụtakwara m na ihe ndị gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya bụ Okwu ya, bụ́ Baịbụl, nke o nyere anyị. Baịbụl dị ka akwụkwọ ozi Jehova detaara anyị iji na-enyere anyị aka. (Aịzaya 48:17, 18) Aghọtara m na ọ bụrụ na m chọrọ ka ndụmọdụ ndị Jehova na-enye anyị baara m uru, ọ dị mkpa na m ga-agbanwe ọtụtụ ihe ná ndụ m.

Otu ihe dị mkpa m kwesịrị ịgbanwe ná ndụ m bụ ndị mụ na ha na-akpa. M chebaara ihe e dere n’Ilu 13:20 echiche. Ebe ahụ sịrị: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.” Ndụmọdụ a mere ka m hapụ ndị mụ na ha na-akpabu ma meta ndị enyi ọhụrụ ná ndị bụ́ Ndịàmà Jehova.

Ihe kacha siere m ike ime bụ ịkwụsị ịṅụ sịga. Ihe kpatara ya bụ na o riela m ahụ́. Mgbe m ji nwayọọ nwayọọ na-akwụsị ya, enwere m nsogbu ọzọ. M bịara buwe oké ibu! Nke ahụ mere ka onwe m sọwa m oyi, o wekwara m ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri tupu mụ efelata. N’agbanyeghị nke ahụ, ama m na ịkwụsị ịṅụ sịga bụ ihe m kwesịrị ime. Ekpegaara m Jehova ekpere ugboro ugboro ka o nyere m aka ịkwụsị ya.

URU NDỊ M RITERELA: Ugbu a, ahụ́ adịkwuola m mma. Afọ jukwara m n’ihe ndị m nwere. Akwụsịla m ịchụ akụnụba na ịchọ ịbụ onye a ma ama, bụ́ ihe ndị m cheburu na ọ bụ ha ga-eme ka m nwee obi ụtọ. Kama nke ahụ, ihe na-enye m obi ụtọ ugbu a bụ izi ndị mmadụ ozi ọma. Mmadụ atọ n’ime ndị mụ na ha na-arụkọbu ọrụ, bụ́ ndị m ziri ozi ọma, sozi mụ na di m na-ejere Jehova ozi ugbu a. Tupu di na nwunye ahụ zụrụ m anwụọ, eziri m ha ozi ọma, kọọrọ ha nkwa Chineke kwere na Baịbụl, nke bụ́ na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs.

Ịmata onye Jehova bụ emeela ka ọ ghara ịna-adị m ka à jụrụ m ajụ. Jehova akpọbatala m n’ọgbakọ ya nke bụ́ otu ezinụlọ zuru ụwa ọnụ, bụ́ ebe ahụ́ ruru m ala. Ugbu a, enweela m ọtụtụ nne, nna, ụmụnne ndị nwoke na ụmụnne ndị nwaanyị.—Mak 10:29, 30.

[Foto dị na peeji nke 12]

Ndịàmà Jehova gosiri m na ha hụrụ m n’anya

[Foto dị na peeji nke 13]

Ụlọ okpukpe Shinto ebe m na-arụbu ọrụ