Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Mụta Ihe N’okwu Chineke

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Isiokwu a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla, ọ ga-egosikwa gị ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ga-aza gị ajụjụ ndị ahụ. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Gịnị bụ Alaeze Chineke?

Alaeze Chineke bụ ọchịchị ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa. Ọ ga-anọchi ọchịchị niile e nwere n’ụwa ma mee ka uche Chineke mezuo n’eluigwe nakwa n’ụwa. N’ihi ya, Alaeze Chineke bụ ezigbo ọchịchị nke ga-egboro ụmụ mmadụ mkpa ha niile.—Gụọ Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10.

Alaeze ọ bụla nwere eze na-achị ya. Jehova họpụtara Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ka ọ bụrụ Eze nke Alaeze Ya.—Gụọ Luk 1:30-33.

2. Gịnị mere Jizọs ji bụrụ Onye Ọchịchị kacha mma?

Ihe mere Ọkpara Chineke ji bụrụ Eze kacha mma bụ na ọ dị obiọma, ọ naghị akwado ihe ọjọọ, ọ dịkwa ike, ọ ga-ejikwa ike ahụ nyere ndị mmadụ aka. (Matiu 11:28-30) Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ laghachiri n’eluigwe ma nọdụ ala n’aka nri Jehova, na-eche ka e chie ya eze. (Ndị Hibru 10:12, 13) E mechaa, Chineke enye ya ikike ka o si n’eluigwe chiwa.—Gụọ Daniel 7:13, 14.

3. Olee ndị ha na Jizọs ga-eso chịa?

Jizọs na ndị a kpọrọ “ndị nsọ,” bụ́ ndị Chineke họọrọ, ga-eso chịa n’eluigwe. (Daniel 7:27) Ndị mbụ a họọrọ ka ha soro ná ndị nsọ a bụ ndịozi Jizọs ndị rubeere Chineke isi. Kemgbe ahụ, Jehova ka na-ahọrọ ndị nwoke na ndị nwaanyị ndị na-erubere Chineke isi ka ha soro ná ndị nsọ ahụ. Otú ahụ Jizọs ghọrọ mmụọ mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, ndị nsọ ahụ na-aghọkwa mmụọ ma a kpọlite ha n’ọnwụ.—Gụọ Jọn 14:1-3; 1 Ndị Kọrịnt 15:42-45.

Ọ̀ bụ mmadụ ole ga-aga eluigwe? Jizọs kpọrọ ndị ahụ ga-aga eluigwe “ìgwè atụrụ nta.” (Luk 12:32) Ha niile ga-adị otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ, ọ bụkwa ha na Jizọs ga-achị ụwa.—Gụọ Mkpughe 5:9, 10; 14:1.

4. Olee mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị?

Jizọs ghọrọ Eze n’afọ 1914. * Obere oge ọ ghọchara eze, ọ chụdara Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa. (Mkpughe 12:7-10, 12) Kemgbe ahụ, nsogbu ụmụ mmadụ na-enwe akakwuola nnọọ njọ. Agha, ala ọma jijiji, ụkọ nri, ọrịa na-efe efe, na mmebi iwu so n’ihe ndị na-egosi na anyị nọzi n’oge ikpeazụ. (2 Timoti 3:1-5) Onye ọ bụla nke chọrọ irite uru n’ihe ndị Alaeze Chineke ga-emere ndị mmadụ kwesịrị ịmụ otú ọ ga-esi ghọọ onye na-eso ụzọ Eze ahụ, bụ́ Jizọs.—Gụọ Luk 21:7, 10, 11, 31, 34, 35.

5. Gịnị ka Alaeze Chineke ga-eme ugbu a nakwa n’ọdịnihu?

Ozi ọma Alaeze Chineke bụ́ nke a na-ekwusa n’ụwa niile, na-enyere ọtụtụ nde mmadụ ndị si ná mba niile n’ụwa aka ịmụta ihe ndị Chineke chọrọ ha n’aka. (Matiu 24:14) Mgbe Alaeze ahụ ga-ebibi ndị ajọ omume niile nọ n’ụwa ugbu a, ọ ga-echebe “oké ìgwè mmadụ” bụ́ ndị na-akwado ọchịchị Jizọs.—Gụọ Mkpughe 7:9, 10, 13-17.

Mgbe Jizọs ga-amalite ịchị ụwa, Alaeze ya ga-achị otu puku afọ ma jiri nwayọọ nwayọọ mee ka ụwa ghọọ paradaịs. Mgbe otu puku afọ ahụ gwụrụ, Jizọs ga-enyefe Alaeze ahụ n’aka Nna ya. (1 Ndị Kọrịnt 15:24-26) Ò nwere onye ị maara ị ga-achọ ịkọrọ banyere Alaeze Chineke?—Gụọ Abụ Ọma 37:10, 11, 29.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ihe a kọrọ n’isiokwu a, gụọ GỊnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 8 na isi nke 9 nke akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Ị chọọ ịghọtakwu otú amụma Baịbụl si gosi na ọ bụ n’afọ 1914 ka Jizọs ghọrọ eze, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 215-218. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.