Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Mere Iwu Na-achị Ihe Ndị Dị n’Eluigwe na Ala?

Ònye Mere Iwu Na-achị Ihe Ndị Dị n’Eluigwe na Ala?

Ònye Mere Iwu Na-achị Ihe Ndị Dị n’Eluigwe na Ala?

‘Ị̀ MAARA iwu na-achị ihe ndị dị n’eluigwe?’ (Job 38:33) Chineke jụrụ Job ajụjụ a iji mee ka Job ghọta na o nweghị ihe mmadụ ma ma e were amamihe mmadụ tụnyere nke Chineke. Ì chere na o nwere ebe mmadụ ruru Chineke n’amamihe?

Ụmụ mmadụ amụtala ọtụtụ ihe banyere eluigwe na ala, ma ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị makwa na o nwebeghị ebe ha gara aga. Ọtụtụ mgbe, ihe ọhụrụ ndị ọkà mmụta sayensị na-achọpụta na-eme ka ha ghọta na ihe ndị ha kwuburu banyere otú ihe ndị dị n’eluigwe na ala si arụ ọrụ abụghị eziokwu. Ihe ọhụrụ ndị ha chọpụtarala ò meela ka ọ bụrụ na ndị mmadụ amatala azịza ajụjụ ahụ Chineke jụrụ Job? Ka ihe ndị ha na-achọpụta ọ̀ na-eme ka o doo anya na ọ bụ Jehova mere ihe niile dị n’eluigwe na ụwa?

E nwere ọtụtụ ihe Baịbụl kwuru bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịmata azịza ajụjụ ndị a. Ọ bụ eziokwu na Baịbụl abụghị akwụkwọ sayensị, ma ihe ọ bụla o kwuru banyere eluigwe na ụwa bụ eziokwu. Ọ ka bụ n’oge anyị a ka a chọpụtara na ọtụtụ ihe Baịbụl kwuru ọtụtụ puku afọ gara aga banyere eluigwe na ala bụ eziokwu.

Otú Ụfọdụ Ndị Si Kọwaa Eluigwe na Ala n’Oge Ndị Gara Aga

Iji ghọta nke a, ka anyị lebagodị anya n’ihe mere n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ atọ gara aga, nke bụ́ ihe dị ka otu narị afọ e dechara Agba Ochie ma ọ bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru. N’oge ahụ, Aristotle, onye Gris bụ́ ọkà mmụta, nọ na-akụziri ndị ọkà mmụta ndị ọzọ a ma ama banyere eluigwe na ala. Taa, a ka weere Aristotle ka otu n’ime ndị ọkà mmụta kacha mara ihe dịtụrụla ndụ n’ụwa. (Gụọ  igbe dị na peeji nke 25.) Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica kwuru, sị: “Aristotle bụ ọkà mmụta sayensị mbụ ma nke a na-akọ n’ụwa. . . . Ọkà mmụta sayensị ọ bụla ọzọ kwesịrị ikele ya maka ihe ndị ọ chọpụtara.”

Aristotle sere otú o chere eluigwe na ala dị. N’ihe ahụ o sere, o kwuru na e nwere ihe karịrị okirikiri iri ise a na-anaghị ahụ anya, ndị dị n’ime ibe ha, bụ́ ebe eluigwe na ụwa na kpakpando dị iche iche dị. Ọ sịrị na ụwa dị n’etiti ha. O kwuru na kpakpando niile e nwere dị n’okirikiri ndị dị n’elu elu, ebe planet ndị ọzọ dị n’okirikiri ndị dị nso n’ụwa. O kwukwara na ihe ọ bụla ọzọ na-adịghị n’ụwa anaghị agbanwe agbanwe, ha dị otú ha dị kemgbe ha malitere. Ọtụtụ ndị taa nwere ike ịsị na ihe ndị a o kwuru bụ akụkọ ifo, ma ihe ndị ahụ o kwuru nọ na-ewuru ndị ọkà mmụta ruo ihe dị ka puku afọ abụọ.

Ma, ihe ndị ahụ Aristotle kụziri ọ̀ dabara n’ihe Baịbụl kwuru? Ihe o kwuru na ihe Baịbụl kwuru olee nke a chọpụtara bụ eziokwu? Ka anyị leba anya n’ajụjụ atọ ndị gbasara otú ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa si arụ ọrụ. Azịza ha ga-eme ka anyị nwee okwukwe n’Onye chepụtara Baịbụl, bụ́ Onye mere “ụkpụrụ na-achị eluigwe.”—Job 38:33.

1. Ọ̀ Bụ Eziokwu na Ihe Ndị Dị n’Eluigwe na Ụwa Anaghị Agbanwe Agbanwe?

Aristotle kwuru na ihe ndị dị n’eluigwe anaghị agbanwe agbanwe. O kwuru na kpakpando enweghị ike ibukwu ibu ma ọ bụ kwụsị ịdị adị.

Baịbụl ò kwuru ihe a Aristotle kwuru? Mba; o nweghị kpọmkwem ihe Baịbụl kwuru na nke a. Ma, o nwere ihe atụ mara mma o ji kọwaa otú eluigwe na ụwa dị. Ọ sịrị: “Ọ dị Onye bi n’ebe dị elu karịa ụwa nke dị gburugburu, nke ndị bi n’ime ya dị ka ụkpara, Onye setịrị eluigwe dị ka ákwà dị fere fere, onye gbasara ya dị ka ụlọikwuu a ga-ebi ebi.”—Aịzaya 40:22. *

Ihe Aristotle kwuru na ihe Baịbụl kwuru olee nke bụ́ eziokwu taa? Olee ihe ndị na-amụ banyere mbara igwe n’oge a chọpụtarala banyere eluigwe na ala? N’oge ndị na-adịbeghị anya, o juru ndị na-enyocha mbara igwe anya ịmata na eluigwe na ala na-agbanwe agbanwe. N’eziokwu, o yiri ka ụyọkọ kpakpando ndị e nwere hà na-esi n’ebe ha nọ pụọ ma nyekwuoro ndị ọzọ ohere ịgbasa. O nweghị ọkà mmụta sayensị gaara ekweta n’oge mbụ na ụdị ihe a na-eme eme, e nwegodị, ha ga-adị ole na ole. Taa, ọtụtụ ndị na-amụ banyere mbara igwe kweere na ihe ndị dị n’eluigwe ahaghị otú ha hà ugbu a mgbe ha malitere, kama, ha ji nwayọọ nwayọọ na-agbasa kemgbe ahụ. Nke a pụtara na ndị ọkà mmụta sayensị ekwetaghịzi ihe ahụ Aristotle kụziri.

Oleekwanụ maka ihe ahụ Baịbụl kwuru? Weregodị ya na ị na-ahụ Aịzaya onye amụma ka ọ nọ na-ele anya n’eluigwe nke kpakpando juru ma hụ nnọọ na ọ dị ka ákwà ụlọikwuu a gbasara agbasa. * O nwedịrị ike ịbụ na ọ hụrụ ụyọkọ kpakpando bụ́ Milky Way, ya achọpụta na ọ dị nnọọ ka “ákwà dị fere fere” e setịrị esetị.

Ihe ahụ Aịzaya kwuru na-emekwa ka anyị chee echiche banyere otú ihe ndị dị n’eluigwe dị. Anyị nwere ike icheta otú e si ama ụlọikwuu n’oge Baịbụl; a na-ebupụta ákwà a ga-eji maa ụlọikwuu, tọghee ya ma gbasaa ya, werezie osisi bulie ya elu ka ọ ghọọ ụlọ. Ihe ọzọ ọ na-echetara anyị bụ ebe onye na-ere ahịa welitere ákwà dị fere fere ọ na-ere ere ma gbasaa ya ka onye chọrọ ịzụ ya leruo ya anya. Ná nke ọ bụla n’ihe atụ a, a gbasara ihe fụkọtara ọnụ, ya asazie mbara.

N’eziokwu, anyị anaghị ekwu na ihe a Baịbụl kwuru ebe a na-akụziri anyị otú eluigwe na ala si na-ebuwanye ibu. Ma, ọ̀ bụ na ọ masịghị gị na ihe Baịbụl kọrọ banyere eluigwe na ala dabara nnọọ n’ihe ndị ọkà mmụta sayensị nke oge a chọpụtara? Aịzaya dịrị ndụ ihe karịrị narị afọ atọ tupu a mụọ Aristotle nakwa ọtụtụ puku afọ tupu ndị ọkà mmụta sayensị achọpụta otú ihe ndị dị n’eluigwe si arụ ọrụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe onye amụma ahụ na-abụghị ọkà mmụta sayensị dere ka bụkwa eziokwu. O nweghị mgbe a ga-anọkata chọpụta na ọ bụkwaghị eziokwu otú ahụ a chọpụtara na ihe ahụ Aristotle kụziri abụghị eziokwu.

2. Gịnị Ji Ihe Ndị Dị n’Eluigwe?

Aristotle kwuru na mbara igwe juru n’ọnụ. O kwuru na e nwere ụzọ ihe anọ jupụtara ụwa. Ihe ndị ahụ bụ ala, mmiri, ikuku na ọkụ. Ọ sịrị na e nwere ihe ndị dị okirikiri a na-anaghị ahụ anya, bụ́ ndị na-anaghị emebi emebi, ndị ihe ndị dị n’eluigwe dị n’elu ha. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị kwetara ihe ahụ Aristotle kwuru n’ihi na o yiri ka ọ̀ dabara n’ihe ọtụtụ n’ime ha chere, ya bụ, na ihe ọ bụla dị n’elu ga-enwerịrị ihe ọ dị n’elu ya, ma ọ́ bụghị ya, ihe ahụ ga-ada.

Oleekwanụ ihe Baịbụl kwuru? Baịbụl kọrọ ihe otu onye ezi omume bụ́ Job kwuru. Job kwuru banyere Jehova, sị: “Ọ dịghịkwa ihe o kokwasịrị ụwa na ya.” (Job 26:7) Ọ ga-abụrịrị na Aristotle weere ihe a Job kwuru ka okwu onye iberiibe.

N’ihe dị ka narị afọ atọ gara aga, nke bụ́ ihe dị ka puku afọ atọ Job dịchara ndụ, ndị ọkà mmụta sayensị kwuweziri na ọ bụghị ihe ndị ahụ dị okirikiri ka ihe ndị dị n’eluigwe nọ n’elu ha, kama na ọ bụ ihe ndị dị mmiri mmiri. Ma, ka obere oge gafere, otu ọkà mmụta sayensị a ma ama bụ́ Sir Isaac Newton kwuru nnọọ ihe dị iche n’ihe ahụ ndị ọkà mmụta ndị ọzọ kwuru. Ọ sịrị na e nwere ikike ji ihe ndị dị n’eluigwe. Ihe a Newton kwuru gosiri na ọ ghọtara na ụwa na ihe ndị dị n’eluigwe nọọrọ nnọọ onwe ha, nke bụ́ na ‘ọ dịghị ihe’ e kokwasịrị ha na ya.

Ọtụtụ ndị achọdịghị iji ntị anụ ihe ahụ Newton kwuru. O siiri ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị ike ikweta na o nweghị ezigbo ihe ji kpakpando na ihe ndị ọzọ dị n’eluigwe. Olee otú ọ ga-esi bụrụ na o nweghị ihe nnukwu ụwa anyị a ma ọ bụ ihe ndị dị n’eluigwe nọ n’elu ya? Ụfọdụ ndị chere na o nweghị ike ime eme. Kemgbe oge Aristotle, ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị kweere na ọ ga-enwerịrị ihe eluigwe na ụwa na kpakpando dị iche iche nọ n’elu ya.

O doro anya na Job amaghị otú Chineke si kee ụwa ka o nwee ike ịna-agba anyanwụ gburugburu ma ghara ịda. Oleezi ihe mere o ji kwuo na ‘ọ dịghị ihe’ e kokwasịrị ụwa anyị a na ya?

Ebe ọ bụkwanụ na e kwuola na ọ dịghị ihe e kokwasịrị ụwa na ya, ajụjụ mmadụ ga-ajụzi bụ: Gịnịzi na-eme ka ụwa na ihe ndị ọzọ dị n’eluigwe nwee ike ịnọ ebe ha nọ ma ghara ịda? Legodị ihe Chineke gwara Job. Ọ sịrị ya: “Ị̀ pụrụ ikesi ihe kekọtara ìgwè kpakpando Kaịma ike, ka ị̀ pụrụ ịtọghe ụdọ kekọtara ìgwè kpakpando Kisịl?” (Job 38:31) N’oge niile Job nọ ndụ, ọ na-ahụ otú kpakpando si apụta n’eluigwe kwa abalị ma lakpuokwa mgbe chi foro. * Ma, gịnị mere kpakpando ndị ahụ ji adị ebe ha dị kwa abalị site n’afọ ruo n’afọ? Gịnị ji kpakpando ndị ahụ, na ihe niile ọzọ dị n’eluigwe? O doro anya na mgbe Job chebaara ihe a echiche, o riri ya ọnụ.

Ọ bụrụ na kpakpando nwere ihe ha nọ n’elu ya, ọ gaghị adị mkpa ka e nwee ihe jikọtara ha n’ìgwè n’ìgwè. Ọtụtụ puku afọ agafeela tupu ndị ọkà mmụta sayensị achọpụta na e nwere “ihe” a na-anaghị ahụ anya kekọtara ihe ndị dị n’eluigwe. Isaac Newton na Albert Einstein mechara ghọọ ndị a ma ama n’ihi ihe ndị ha chọpụtara banyere ihe ndị dị n’eluigwe. N’eziokwu, Job amaghị ihe Chineke ji kekọta ihe ndị dị n’eluigwe. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe e si n’ike mmụọ nsọ dee n’akwụkwọ Job ka bụ eziokwu. Ọ dịghị ka ihe ahụ Aristotle, bụ́ onye gụrụ oké akwụkwọ, kwuru. Ò nwere onye ọzọ ga-ama otú ihe ndị dị n’eluigwe si arụ ọrụ karịa Onye kere ihe ndị ahụ?

3. Hà Na-adịru Ebighị Ebi?

Aristotle kwuru na e nwere nnukwu ihe dị iche n’eluigwe na ụwa. Ọ sịrị na ụwa na-agbanwe agbanwe, na ihe ndị dị na ya na-ere ere, na-emebikwa emebi, ebe ihe ndị dị n’eluigwe na-adị otú ha dị, ha anaghịkwa agbanwe agbanwe. Aristotle kwuru na ihe ndị ahụ dị okirikiri na ihe ndị dị n’eluigwe, bụ́ ndị nọ n’elu ha, enweghị ike ịgbanwe agbanwe ma ọ bụ mebie, ma ọ bụkwanụ kwụsị ịdị adị.

Ọ̀ bụ ihe ahụ ka Baịbụl kwuru? Abụ Ọma 102:25-27 kwuru, sị: “Ị tọrọ ntọala ụwa ogologo oge gara aga, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. Ha onwe ha ga-ala n’iyi, ma gị onwe gị ga na-adị ndụ; ha niile ga-akakwa nká dị ka uwe. Ị ga-agbanwe ha dị ka ákwà, oge ha ga-agwụkwa. Ma ị ka bụ onye ị bụ, afọ ndụ gị agaghịkwa agwụ agwụ.”

Cheta na ọbụ abụ a, bụ́ onye dere ihe a n’ihe dị ka narị afọ abụọ tupu a mụọ Aristotle, ejighị ụwa na-atụnyere ihe ndị dị n’eluigwe, ka à ga-asị na ụwa nwere ike imebi emebi ebe kpakpando na-enweghị ike imebi. Kama, ọ na-ekwu na e nwere ọdịiche dị n’eluigwe na ụwa na Chineke bụ́ Onye kere ha. * Abụ ọma a na-ekwu na kpakpando na-emebi emebi ma na-ala n’iyi otú ahụ ihe ndị dị n’ụwa na-emebikwa emebi. Gịnị ka ndị ọkà mmụta sayensị nke oge a chọpụtarala?

Ihe ndị ọkà mmụta sayensị, bụ́ ndị na-amụ banyere ala, chọpụtara na-egosi na ihe Baịbụl kwuru na ihe Aristotle kwuru, nke bụ́ na ihe ndị dị n’ụwa na-emebi emebi, bụ eziokwu. N’eziokwu, mmiri na ihe ndị ọzọ na-erichapụ nkume ndị dị n’ụwa, ebe nkume ndị ọhụrụ na-esi n’ime ala pụta nọchie ndị nke mebirinụ.

Oleekwanụ maka kpakpando? Hà na-emebi emebi, dị ka Baịbụl kwuru, ka hà na-adị otú ha dị ruo mgbe ebighị ebi, dị ka Aristotle kwuru? N’ihe dị ka narị afọ anọ gara aga, ndị Yurop na-amụ banyere ihe ndị dị n’eluigwe bidoro nyowe ihe ahụ Aristotle kwuru enyowe. Ihe mere ha ji nyowe ya enyowe bụ na ha hụrụ ebe otu kpakpando gbawara, gbarie. Ha ahụtụbeghị ụdị ihe ahụ mbụ. Kemgbe ahụ, ndị ọkà mmụta sayensị ahụla ebe kpakpando dị iche iche gbariri ma ọ bụ jiri nwayọọ nwayọọ nyụọ ka ọkụ ma ọ bụdị funyụọ anya. Ma, ndị ọkà mmụta ndị na-enyocha mbara igwe ahụkwala ebe kpakpando ọhụrụ na-apụta. N’ihi ya, otú onye ahụ so dee Baịbụl si kwuo na ihe ndị dị n’eluigwe yiri uwe na-aka nká, nke a na-agbanwekwa agbanwe, dabara nnọọ adaba. * Ọ bụ nnọọ ihe dị ịtụnanya na ọbụ abụ ahụ na-amaghị nke a na-akọ na sayensị nwere ike ide ihe dabara nnọọ n’ihe ndị ọkà mmụta sayensị nke oge a chọpụtara!

Ma i nwere ike ịjụ, sị: ‘Baịbụl ò kwuru na e nwere mgbe ụwa na ihe niile dị n’eluigwe ga-ala n’iyi, ma ọ bụ na ọ ga-adị mkpa ka e kee ndị ọhụrụ ga-anọchi ha?’ Mba, Baịbụl kwuru na ha ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 104:5; 119:90) Ma, ihe ga-eme ka ha dịruo ebighị ebi abụghị na ha enweghị ike imebi emebi, kama ọ bụ n’ihi na Chineke bụ́ onye kere ha kwere nkwa na ya ga-eme ka ha dịruo ebighị ebi. (Abụ Ọma 148:4-6) O kwughị otú ọ ga-esi mee ya. Onye rụrụ ụlọ ya na ezinụlọ ya ga-ebi ga na-elekọta ụlọ ahụ anya ka ọ ghara imebi. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịtụ anya na Onye kere eluigwe na ụwa ga-elekọtakwa ihe ndị o kere eke?

Ònye Ka E Kwesịrị Inye Otuto?

Ihe ndị a anyị lebara anya na ha banyere otú ihe ndị dị n’eluigwe si arụ ọrụ zara ajụjụ a. Ọ bụrụ na anyị echee echiche banyere onye mere ka imeriime kpakpando na ihe ndị ọzọ jupụta n’eluigwe, na otú o si mee ka ha niile dịrị n’ebe ha dị ma ghara ịda, nakwa otú o si na-elekọta ha, ò kwesịghị ime ka anyị na-asọpụrụ ya?

E nwedịrị ike ikwu na ihe ga-akacha mee ka anyị sọpụrụ ya bụ ihe e dere n’Aịzaya 40:26, bụ́ ebe kwuru, sị: ‘Leenụ anya na mbara igwe! Ònye kere kpakpando a niile unu na-ahụ? Ọ bụ Onye ahụ nke na-eme ka ha pụta dị ka ụsụụ ndị agha; ọ maara ọnụ ọgụgụ ha, ọ na-akpọ ha otu n’otu!’ (Bible Nsọ Ọhụụ) E ji kpakpando tụnyere ụsụụ ndị agha. Ọ bụrụ na onyeisi ụsụụ ndị agha enyeghị ndị agha ya ntụziaka, ha ga-aghasa aghasa. Ọ bụrụ na Jehova emeghị iwu na-achị eluigwe na ala na kpakpando na ụyọkọ kpakpando dị iche iche, ha niile ga-adị ghaa ghaa ghaa. E nwere ike ikwu na Jehova dị ka onyeisi ụsụụ ndị agha nke na-eduzi ndị agha ya nke ọma ebe ọ bụ na ọ na-eduzi ijeri kwuru ijeri kpakpando ndị o kere, ọ maara aha nke ọ bụla n’ime ha, marakwa ebe nke ọ bụla n’ime ha dị na ihe na-eme ya!

Otú Jehova si hazie ihe ndị dị n’eluigwe na-enyere anyị aka ịghọta na amamihe ya enweghị atụ. Ò nwere onye ọzọ nwere ike ịhazi ihe ndị o kere eke otú a ma jiri mmụọ nsọ ya mee ka ụmụ mmadụ dee banyere ha ọtụtụ narị afọ, ma ọ bụdị ọtụtụ puku afọ, tupu ndị ọkà mmụta sayensị aghọtawa ha? N’eziokwu, e nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji nye Jehova “otuto na nsọpụrụ.”—Mkpughe 4:11.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ọ dị mma ịmara na Baịbụl sịrị na ụwa dị gburugburu ma ọ bụ okirikiri. Aristotle na ndị Gris ndị ọzọ bụ́ ndị ọkà mmụta n’oge ochie kwuru na ụwa dị okirikiri, ma ihe karịrị puku afọ abụọ gafere tupu ndị ọkà mmụta ndị ọzọ ekweta.

^ par. 13 E nwekwara ọtụtụ ebe ndị ọzọ na Baịbụl e kwuru ụdị ihe a banyere eluigwe.—Job 9:8; Abụ Ọma 104:2; Aịzaya 42:5; 44:24; 51:13; Zekaraya 12:1.

^ par. 22 O nwere ike ịbụ na “ìgwè kpakpando Kaịma” e kwuru okwu ya n’amaokwu a bụ ìgwè kpakpando a na-akpọ Pliyadiz. O nwekwara ike ịbụ na “ìgwè kpakpando Kisịl” bụ ìgwè kpakpando a na-akpọ Orayọn. Ọ na-ewe ọtụtụ puku afọ tupu ìgwè kpakpando agbanwee otú ha dị.

^ par. 27 Ebe ọ bụ na Jehova ji Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, onye bụ́ “ọkà ọrụ” ya, kee ihe niile, e nwekwara ike ikwu na ọ bụ Ọkpara ya ka amaokwu ndị a na-ekwu okwu ya.—Ilu 8:30, 31; Ndị Kọlọsi 1:15-17; Ndị Hibru 1:10.

^ par. 29 N’ihe dị ka otu narị afọ na iri ise gara aga, ọkà mmụta sayensị bụ́ William Thomson, onye a na-akpọkwa Lord Kelvin, chọpụtara na ihe ndị e kere eke na-eji nwayọọ nwayọọ na-emebi ruo mgbe ha ga-akwụsịcha ịrụ ọrụ. Otu ihe mere o ji kwuo ihe ahụ bụ na o chebaara ihe e dere n’Abụ Ọma 102:25-27 echiche.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]

 Ihe Ndị Ọ Chọpụtara Bara Ezigbo Uru

Otu akwụkwọ nke na-akọ banyere ndị a ma ama dịrịla ndụ kwuru, sị: “Aristotle bụ ọkà mmụta sayensị na ọkà ihe ọmụma kachanụ e nwere n’oge gboo.” E nwere ọtụtụ ihe mere e ji kwuo ụdị ihe a banyere nwoke a. Aristotle (onye a mụrụ n’afọ 384, ya anwụọ n’afọ 322 Tupu Oge Anyị), bụ nwa akwụkwọ ọkà mmụta a ma ama bụ́ Plato. Aristotle mechara bụrụ onye nkụzi nke kụziiri Alexander Onye Ukwu ihe mgbe Alexander bụ nwata. Otu akwụkwọ e dere n’oge ochie kwuru na akwụkwọ Aristotle dere ruru otu narị na iri asaa, iri anọ na asaa n’ime ha ka dị ruo taa. O dere ọtụtụ akwụkwọ banyere ihe ndị dị n’eluigwe, ihe ọmụmụ bayọlọji, kemistrị, fiziks, banyere ụmụ anụmanụ, ala, na akparamàgwà ụmụ mmadụ. O nwere ihe ụfọdụ ndị o dere banyere ihe ndị dị ndụ tupu onye ọ bụla ọzọ achọpụta ha. Akwụkwọ ahụ e kwuru okwu ya ná mmalite kwukwara, sị: “Ihe ndị Aristotle chọpụtara baara ọtụtụ ndị bi ná mba ndị mepere anya ezigbo uru.” Ma, akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Otú ndị mmadụ si na-akwanyere Aristotle ùgwù . . . bịaziri yie ka ọ̀ bụ chi.”

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Royal Astronomical Society/Photo Researchers, Inc.

O si n’akwụkwọ bụ́ A General History for Colleges and High Schools, 1900

[Foto dị na peeji nke 26, 27]

E nwere ikike ji ihe ndị dị n’eluigwe

[Ebe E Si Nweta Foto]

NASA and The Hubble Heritage Team (AURA/STScl)

[Foto dị na peeji nke 26, 27]

Ìgwè kpakpando a na-akpọ Pliyadiz

[Foto dị na peeji nke 28]

Ụfọdụ kpakpando na-agbawa, gbarie

[Ebe E Si Nweta Foto]

ESA/Hubble

[Foto dị na peeji nke 28]

Kpakpando ọhụrụ na-apụta mgbe ndị nke ochie gbawachara

[Ebe E Si Nweta Foto]

J. Hester and P. Scowen (AZ State Univ.), NASA

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 24]

© Peter Arnold, Inc./Alamy