Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

N’oge Jizọs nọ n’ụwa, olee otú ndị isi okpukpe ndị Juu si ele ndị nkịtị anya?

N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ndị ọnụ na-eru n’okwu n’Izrel na ndị isi okpukpe ndị Juu na-eleda ndị na-agụghị akwụkwọ ma ọ bụ ndị na-agụghị oké akwụkwọ anya. Baịbụl sịrị na ndị Farisii kwuru, sị: “Ìgwè mmadụ a nke na-amaghị Iwu ahụ bụ ndị a bụrụ ọnụ.”—Jọn 7:49.

Akwụkwọ ndị ọzọ kwuru na ndị ọnụ na-eru n’okwu n’Izrel na-akpọ ndị na-agụghị akwụkwọ ʽam ha·ʼaʹrets, ma ọ bụ “ndị ala.” Tupu Jizọs abịa n’ụwa, ọ bụ ʽam ha·ʼaʹrets ka a na-akpọ ụmụ amaala obodo, ma onye ukwu ma onye nta, ma ogbenye ma ọgaranya. Ọ bụghịkwa mkparị.—Jenesis 23:7; 2 Ndị Eze 23:35; Ezikiel 22:29.

Ma n’oge Jizọs nọ n’ụwa, okwu ahụ aghọziela ihe a na-akpọ ndị e weere na ha amaghị Iwu Mozis ma ọ bụ ndị na-anaghị edebe iwu niile ndị rabaị ji aka ha chepụta. Akwụkwọ iwu ndị Juu a na-akpọ Mishnah gwara ndị mmadụ ka ha ghara ịnọbọ chi n’ụlọ ndị ʽam ha·ʼaʹrets. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Talmudic Sages kwuru ihe otu ọkà mmụta bụ́ Rabaị Meir kụziiri ndị mmadụ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na nwoke ekwere ka nwa ya nwaanyị lụọ am ha’aretz, o yiri ka ò kere nwa ya nwaanyị ahụ agbụ ma tọgbọ ya n’ihu ọdụm, ọdụm ahụ azọọ ya ụkwụ tupu o riwe anụ ya.” Akwụkwọ okpukpe ndị Juu sịrị na otu rabaị kwuru na “a gaghị akpọlite ndị na-agụghị akwụkwọ n’ọnwụ.”

Na Baịbụl, gịnị ka aha ahụ bụ́ Siza na-anọchi anya ya?

Siza bụ aha nna otu onye Rom a na-akpọ Gaius Julius Caesar (Siza), bụ́ onye ghọrọ eze ukwu Rom n’afọ 46 Tupu Oge Anyị. Ndị ọzọ chịrị Rom mgbe ọ chịchara zakwara Siza. A kpọrọ aha mmadụ atọ n’ime ha na Baịbụl. Ha bụ Ọgọstọs, Taịbiriọs, na Klọdiọs.—Luk 2:1; 3:1; Ọrụ 11:28.

N’afọ 14 Oge Anyị, Taịbiriọs ghọrọ eze ukwu Rom. Ọ bụkwa ya na-achị n’oge Jizọs jere ozi n’ụwa. N’ihi ya, ọ bụ ya bụ Siza na-achịnụ mgbe Jizọs zara ajụjụ a jụrụ ya banyere ịtụ ụtụ isi, bụ́ mgbe Jizọs sịrị: “Kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.” (Mak 12:17) O doro anya na Siza Jizọs na-ekwu okwu ya abụghị naanị Taịbiriọs. Kama, okwu ahụ bụ́ “Siza” na-anọchi anya onye na-achị obodo.

N’ihe dị ka afọ 58 O.A., mgbe a chọrọ ikpe Pọl onyeozi ikpe mkpegbu, ebe ọ bụ na ọ bụ nwa amaala Rom, o kwuru na ya chọrọ ka e wega ikpe ya n’ihu Siza. (Ọrụ 25:8-11) Mgbe Pọl kwuru nke a, ihe ọ na-ekwu abụghị na ọ ga-abụrịrị Nero, bụ́ eze na-achị Rom mgbe ahụ, ga-ekpe ya ikpe, kama ọ na-ekwu ka e wega ikpe ya n’ụlọikpe kacha elu e nwere na Rom.

A bịaziri na-akpọ ndị niile chiri Rom Siza nke na mgbe onye ikpeazụ si n’ezinụlọ Siza chịchara Rom, a kpọwakwara ndị ọzọ chịrị Rom Siza.

[Foto dị na peeji nke 29]

Mkpụrụ ego dinarịọs e ji ọlaọcha kpụọ nke e sere Taịbiriọs na ya