Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Ga-esi Merie Ọnwụnwa

Otú Ị Ga-esi Merie Ọnwụnwa

Maka Ndị Na-eto Eto

Otú Ị Ga-esi Merie Ọnwụnwa

JOSEF—AGBA NKE MBỤ

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị a, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere, werekwa ya na ị na-ahụ ka ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

Ndị a kọrọ akụkọ ha: Josef na nwunye Pọtịfa

Ihe a kọrọ: Josef ekweghị ka nwunye Pọtịfa rata ya ka ya na ya kwaa iko.

1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ JENESIS 39:1-12.

Kọọ otú i chere ụlọ Pọtịfa bururu n’ibu na otú ọ maruru ná mma.

․․․․․

Olee otú i chere Josef dị n’ile anya? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụgharịa amaokwu nke 6.)

․․․․․

Olee otú i chere obi dị Josef mgbe ọ na-agwa nwunye Pọtịfa ihe e dere n’amaokwu nke 8 na nke 9?

․․․․․

2 LEBAKWUO YA ANYA.

Gịnị gaara eme ka Josef mee ihe ahụ nwunye Pọtịfa chọrọ ka o mee? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Ndị Filipaị 2:12, ma cheta ebe Josef nọ n’oge ahụ? Dị ka ihe atụ, ebee ka ndị ezinụlọ Josef na ndị ọzọ na-efe Jehova nọ mgbe ahụ?)

․․․․․

Ebe ọ bụ na n’oge ahụ, e nwebeghị iwu Chineke nke sịrị ‘Akwala iko,’ olee ihe i chere mere Josef ji kwuo na ọ bụrụ na ya na nwaanyị ahụ akwaa iko, na ya emehiela Chineke? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ ebe ndị a n’Akwụkwọ Nsọ ma chebara ha echiche: Jenesis 2:24; 12:17, 18; Ndị Rom 2:14, 15; nakwa Ndị Hibru 5:14.)

․․․․․

3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .

Otú mmadụ ijide onwe onye ga-esi eme ka ọ ghara ire ùgwù ya?

․․․․․

Uru ndị na-erubere iwu Chineke isi na-erite.

․․․․․

Ihe mere o ji dị mkpa ka ị zụọ “ikike nghọta” gị. (Ndị Hibru 5:14)

․․․․․

ỤZỌ NDỊ ỌZỌ Ị GA-ESI MEE IHE Ị MỤTARA.

Ná ndụ gị, olee ebe ndị i chere na i kwesịrị ịkpacharakwu anya ka ihe ọ bụla ghara ime ka ị kwaa iko? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ ebe ndị a ma chebara ha echiche: Job 31:1; Abụ Ọma 119:37; Ndị Efesọs 5:3, 4.

․․․․․

4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤKWA MAKA GỊNỊ?

․․․․․

Ọ bụrụ na i nweghị Baịbụl, gwa Ndịàmà Jehova ka ha nye gị otu, ma ọ bụ gị agụọ ya n’asụsụ bekee na www.watchtower.org na www.pr418.com