Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ ga-ege Ntị N’ịdọ Aka Ná ntị Doro Anya Jehova Na-enye Anyị?

Ị̀ ga-ege Ntị N’ịdọ Aka Ná ntị Doro Anya Jehova Na-enye Anyị?

Ị̀ ga-ege Ntị N’ịdọ Aka Ná ntị Doro Anya Jehova Na-enye Anyị?

“Lekwa ụzọ. Jeenụ ije na ya.”—AỊZA. 30:21.

1, 2. Gịnị ka Setan kpebisiri ike ime anyị, oleekwa otú Okwu Chineke si enyere anyị aka?

ỌBỤRỤ na ụzọ saịn bọọdụ kwuru na mmadụ ga-esi gaa ebe ọ chọrọ ịga abụghị ụzọ e si aga ebe ahụ, o nwere ike ime ka onye ahụ fuo ụzọ, ma ọ bụdị mee ka ọ baa ná nsogbu. Were ya na otu enyi gị gwara gị na e nwere onye arụrụala gara degharịa ihe e dere n’otu saịn bọọdụ iji mee ka ndị na-amaghị ụzọ fuo ụzọ. Ọ̀ bụ na ị gaghị ege ya ntị?

2 N’eziokwu, Setan bụ ajọ onye iro nke kpebisiri ike idufu anyị. (Mkpu. 12:9) Ihe ndị ahụ niile anyị kwuru okwu ha n’isiokwu bu nke a ụzọ, bụ́ ndị nwere ike ime ka anyị baa ná nsogbu, si ya n’aka. Ọ chọkwara iji ha mee ka anyị hapụ ụzọ ahụ na-eduga ná ndụ ebighị ebi tinye isi ebe ọzọ. (Mat. 7:13, 14) Obi dị anyị ụtọ na Chineke anyị, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya, na-adọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ikwe ka Setan duhie anyị. Ugbu a, ka anyị tụlee ihe atọ ọzọ Setan nwere ike iji duhie anyị. Ka anyị na-atụle otú Okwu Chineke si enyere anyị aka ka a ghara iduhie anyị, anyị nwere ike iwere ya na Jehova so anyị n’azụ na-agwa anyị ụzọ anyị kwesịrị iso, sị: “Lekwa ụzọ. Jeenụ ije na ya.” (Aịza. 30:21) Ọ bụrụ na anyị echebara ịdọ aka ná ntị doro anya Jehova na-enye anyị echiche, anyị ga-ekpebisikwu ike ige ya ntị.

Esola “Ndị Ozizi Ụgha”

3, 4. (a) Olee otú ndị ozizi ụgha si dị ka olulu mmiri nke mmiri na-adịghị? (b) Olee ebe ndị ozizi ụgha na-esikarị apụta, oleekwa ihe ha chọrọ?

3 Ka e were ya na i si n’ọzara na-aga ebe ị chọrọ ịga. Ka ị na-aga, gị ahụ otu olulu mmiri dị n’ebe dị anya ma gawa ebe ahụ ọ dị. Obi gị bụ na i ruo ebe ahụ, ị ga-ahụ mmiri ị ga-eji tajụọ akpịrị. Ma mgbe i ruru, gị achọpụta na mmiri adịghị n’olulu mmiri ahụ. Iwe ga-eju gị obi. Anyị nwere ike ikwu na eziokwu nke Okwu Chineke dị ka mmiri, ebe ndị ozizi ụgha dị ka olulu mmiri nke mmiri na-adịghị. Onye ọ bụla nke na-agakwuru ha ka o nweta eziokwu nke Okwu Chineke ga-agba aka alọta. Jehova si n’ọnụ Pọl onyeozi na Pita onyeozi na-adọ anyị aka ná ntị banyere ndị ozizi ụgha. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 20:29, 30; 2 Pita 2:1-3.) Ole ndị bụ ndị ozizi ụgha a? Ihe Pọl na Pita ji ike mmụọ nsọ kwuo mere ka anyị mara ebe ndị ozizi ụgha na-esi apụta na otú ha nwere ike isi duhie anyị.

4 Pọl gwara ndị okenye nọ n’ọgbakọ dị n’Efesọs, sị: “Ndị ikom ga-esikwa n’etiti unu onwe unu bilie, na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ.” Pita degakwaara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ ozi, sị: “A ga-enwekwa ndị ozizi ụgha n’etiti unu.” N’ihi ya, olee ebe ndị ozizi ụgha na-esi apụta? Ha nwere ike isi n’ọgbakọ. Ndị nke a si n’ọgbakọ bụ ndị si n’ezi ofufe dapụ. Gịnị ka ha chọrọ? Ịhapụ ọgbakọ Jehova ezurughị ha. Pọl kwuru na ihe bụ mkpa ha bụ ‘ịdọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.’ Kama ndị a si n’ezi ofufe dapụ ga-apụ n’èzí gaa chọrọ ndị ga na-eso ụzọ ha, ha na-achọ ndị na-eso ụzọ Kraịst ha ga-adọrọ pụọ. Dị ka “anụ ọhịa wolf agụụ ji” na-eme, ọ na-agụsi ndị ozizi ụgha agụụ ike iripịa ndị nọ n’ọgbakọ, karịchaa ndị nke chere na ihe ha na-akụzi bụ eziokwu. Ha na-anwa ime ka ndị nọ n’ọgbakọ gharazie inwe okwukwe nakwa ka ha soro ha pụọ n’eziokwu ahụ.—Mat. 7:15; 2 Tim. 2:18.

5. Olee otú ndị ozizi ụgha nwere ike isi duhie anyị?

5 Olee otú ndị ozizi ụgha nwere ike isi duhie anyị? Ha na-eji ụzọ aghụghọ eme ya. Ndị si n’ezi ofufe dapụ ‘na-eji nwayọọ ewebata’ ozizi ụgha n’ọgbakọ otú ndị na-agba ahịa iwu si ebubata ngwá ahịa ha na nzuzo. Ha na-eji “okwu nrafu” agbalị iduhie ndị nọ n’ọgbakọ otú ahụ ndị ọjọọ si agbalị iji satifiketi adịgboroja nweta ọrụ. Ha na-agbasa ‘ozizi ha na-eduhie eduhie,’ ‘na-agbagọkwa ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ’ iji kwado ihe ha na-akụzi. (2 Pita 2:1, 3, 13; 3:16) O doro anya na ndị si n’ezi ofufe dapụ anaghị echere anyị echiche ọma. Ọ bụrụ na anyị esoro ha, anyị ga-ahapụ ụzọ ahụ nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi ma tinye isi ebe ọzọ.

6. Olee ndụmọdụ doro anya Baịbụl na-enye anyị banyere ndị ozizi ụgha?

6 Gịnị ka anyị ga-eme ka ndị ozizi ụgha ghara iduhie anyị? Ihe Baịbụl kwuru ka anyị mee doro anya. (Gụọ Ndị Rom 16:17; 2 Jọn 9-11.) Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘na-eze ha eze.’ Ihe nke a pụtara bụ ka anyị wezụga onwe anyị n’ebe ha nọ. Ndụmọdụ a si na Baịbụl doro nnọọ anya. Were ya na otu dọkịta gwara gị ka ị na-eze otu onye bu ọrịa na-efe efe, nke nwere ike igbu mmadụ, eze. O doro anya na ị ga-aghọta ihe dọkịta ahụ na-ekwu, ị ga-ekpebisikwa ike ime ihe ahụ ọ gwara gị. Nke bụ́ eziokwu bụ na ozizi ndị si n’ezi ofufe dapụ ‘na-agba ha ara,’ ha na-achọkwa ka ndị ọzọ na-eme ka ha. (1 Tim. 6:3, 4) Jehova, bụ́ Ọgwọ Ọrịa Kachanụ, gwara anyị ka anyị na-eze ha eze. Anyị ghọtara ihe o kwuru, ma ànyị ekpebisiela ike ige ntị n’ihe niile ọ na-agwa anyị?

7, 8. (a) Olee ihe ndị anyị na-ekwesịghị ime ka anyị nwee ike izere ndị ozizi ụgha? (b) Gịnị mere i ji kpebisie ike na ị gaghị eso ndị ozizi ụgha?

7 Olee ihe ndị anyị na-ekwesịghị ime ka anyị nwee ike izere ndị ozizi ụgha? Anyị ekwesịghị ịnabata ha n’ụlọ anyị ma ọ bụ kelee ha. Anyị ekwesịghịkwa ịgụ akwụkwọ ha, ma ọ bụ kirie ihe ndị ha na-eme na tiivi, ma ọ bụ gaa ebe ndị ha na-edebe ihe n’Ịntanet, ma ọ bụkwanụ gaa n’Ịntanet dee ihe anyị chere banyere ihe ha dere n’Ịntanet. Gịnị mere anyị ji kwesị ikpebisi ike na anyị agaghị eme ihe ndị a? Ọ bụ n’ihi na anyị hụrụ “Chineke nke eziokwu” n’anya, anyị achọghịkwa ige ntị n’ozizi ndị gbagọrọ agbagọ, bụ́ ndị na-emegide eziokwu nke Okwu Chineke. (Ọma 31:5; Jọn 17:17) Anyị hụkwara nzukọ Jehova n’anya. Ọ bụ ebe anyị nọ mụta eziokwu ndị na-enye anyị obi ụtọ, ndị dị ka, aha Jehova na ihe ọ pụtara, nzube Chineke maka ụwa, ihe bụ́ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, na olileanya mbilite n’ọnwụ. Ị̀ ga-echetali otú obi dị gị mgbe mbụ ị mụtara eziokwu ndị a na eziokwu ndị ọzọ bara ezigbo uru? Oleezi ihe mere ị ga-eji kwe ka ndị na-ekwutọ nzukọ Jehova mee ka i soro ha na-ekwutọ ebe ị nọ mụta eziokwu ndị a niile?—Jọn 6:66-69.

8 Ihe ọ sọkwara ndị ozizi ụgha ha kwuo, anyị agaghị eso ha! O nweghị ihe kwesịrị ime ka anyị gewe ndị dị ka olulu mmiri nke mmiri na-adịghị ntị. Kama igewe ha ntị, ka anyị kpebisie ike iguzosi ike n’ebe Jehova nọ na ịnọsi ike ná nzukọ nke nọ kemgbe ụwa na-enye anyị mmiri dị ọcha si n’Okwu Chineke, bụ́ nke na-eme ka anyị nwee ume.—Aịza. 55:1-3; Mat. 24:45-47.

Esola ‘Akụkọ Ụgha’

9, 10. Olee aka na ná ntị Pọl dọrọ Timoti banyere “akụkọ ụgha,” oleekwa ihe ọ ga-abụ na Pọl bu n’obi? (Kọwaakwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

9 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdịrị mmadụ mfe ịchọpụta na ụzọ saịn bọọdụ kwuru e si aga ebe ọ chọrọ ịga abụghị ụzọ e si aga ebe ahụ. Mgbe ụfọdụkwa, ọ gaghị adị mfe ịchọpụta ya. Otú ahụkwa ka ụzọ ndị Setan nwere ike isi duhie anyị dị; ụfọdụ na-adị mfe nchọpụta, ebe ndị ọzọ na-esi ike. Pọl onyeozi na-adọ anyị aka ná ntị banyere otu n’ime ụzọ ndị Setan nwere ike isi ghọgbuo anyị, ya bụ, ‘akụkọ ụgha.’ (Gụọ 1 Timoti 1:3, 4.) Ọ bụrụ na anyị amata ihe bụ akụkọ ụgha na otú anyị nwere ike isi ghara ige ya, ọ ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịhapụ ụzọ ahụ nke na-eduga ná ndụ, tinye isi ebe ọzọ.

10 N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara Timoti, akụkọ ụgha so n’ihe ndị ọ dọrọ ya aka ná ntị ka o zere. Timoti bụ okenye ọgbakọ ọrụ ya bụ idebe ọgbakọ ọcha na inyere ndị kwere ekwe ibe ya aka ịna-ekwesị ntụkwasị obi. (1 Tim. 1:18, 19) Okwu Grik a sụgharịrị ka ọ bụrụ akụkọ ụgha Pọl kpọrọ aha ebe a nwere ike ịpụta akụkọ ifo ma ọ bụ akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme. Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru na akụkọ ụgha a kpọrọ aha ebe a bụ “akụkọ (okpukpe) na-emeghị eme.” O nwere ike ịbụ na ihe Pọl bu n’obi bụ ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị okpukpe na-akụzi, bụ́ ndị ha ji akụkọ ndị e tinyere nnu na ose akwado. * Naanị ihe akụkọ ndị ahụ na-eme bụ ‘ibute ajụjụ ndị a na-emere nnyocha,’ ya bụ, ha na-akpata ajụjụ ndị na-adịghị mkpa a na-ekwo eme nnyocha na-enweghị isi. Akụkọ ụgha so n’ihe ndị onye isi nduhie bụ́ Setan na-eji eduhie ndị mmadụ. Setan na-eji akụkọ ụgha ndị okpukpe na-akọ na akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme eduhie ndị na-amụghị anya. Ndụmọdụ Pọl nyere ebe a doro anya, ya bụ, egekwala akụkọ ụgha!

11. Olee otú Setan si were aghụghọ jiri okpukpe ụgha na-eduhie ndị mmadụ, oleekwa ihe ọ ga-abụ anyị mee, Setan aghara inweta anyị?

11 Olee ụfọdụ akụkọ ụgha ndị nwere ike iduhie ndị na-amụghị anya? Anyị nwere ike ịsị na “akụkọ ụgha” bụ ozizi ụgha ọ bụla okpukpe na-ezi, ma ọ bụ akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme, bụ́ nke nwere ike ime ka anyị “ghara ịnụ eziokwu ahụ.” (2 Tim. 4:3, 4) Setan, bụ́ onye na-eme ka ọ̀ bụ “mmụọ ozi nke ìhè,” ewerela aghụghọ jiri okpukpe ụgha na-eduhie ndị mmadụ. (2 Kọr. 11:14) Okpukpe dị iche iche nke Krisendọm, bụ́ ndị na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst, na-ezi ozizi ndị dị ka, Atọ n’Ime Otu, ọkụ ala mmụọ, nakwa na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Ozizi ndị a bụcha akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme na ụgha chara acha. Krisendọm na-ekwukwa ka a na-eme ememme ndị dị ka, Krismas na Ista, bụ́ ndị yiri ka o nweghị ihe ha mere, ma nke bụ́ eziokwu bụ na ha si n’aka ndị ọgọ mmụọ. Ọ bụrụ na anyị emee ihe Chineke gwara anyị, ya bụ, isi n’etiti ndị na-akụzi ihe ndị a kewapụ onwe anyị, ‘kwụsịkwa imetụ ihe na-adịghị ọcha aka,’ a gaghị ejili akụkọ ụgha duhie anyị.—2 Kọr. 6:14-17.

12, 13. (a) Olee ụgha ndị Setan nwere ike iji duhie anyị, oleekwanụ ihe bụ́ eziokwu ná nke ọ bụla n’ime ha? (b) Olee ihe anyị ga-eme ka Setan ghara iji akụkọ ụgha ya duhie anyị?

12 E nwere ụgha ndị ọzọ Setan nwere ike iji duhie anyị ma ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya. Ka anyị tụlee atọ n’ime ha. Nke mbụ bụ: I nwere ike ime ihe ọ bụla masịrị gị; ọ dị gị n’aka ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. A na-anụkarị ụdị ihe a na redio, tiivi, nakwa na fim. Ụdị echiche a adabaghị n’ihe Chineke nyere anyị n’iwu, ọ na-emekwa ka anyị chọọ ịkpawa àgwà otú masịrị anyị. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ naanị Chineke ga-agwa anyị otú anyị ga-esi na-akpa àgwà ihe agaziere anyị ná ndụ. (Jere. 10:23) Nke abụọ bụ: Chineke agaghị etinye aka n’ihe na-eme n’ụwa. Ọ bụrụ na anyị eburu ụdị ihe a n’obi na-ebi ndụ a baa taa, a nwụọ echi, ọ ga-eme ka anyị bụrụ “ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ.” (2 Pita 1:8) Nke bụ́ eziokwu bụ na ụbọchị Jehova ji ọsọ na-eru nso, anyị kwesịkwara ịna-atụsi anya ya ike. (Mat. 24:44) Nke atọ bụ: Chineke anaghị eche banyere gị. Ọ bụrụ na anyị ekwere ụgha a Setan na-agha, o nwere ike ime ka anyị kwụsị ife Jehova, na-eche na o nweghị ihe anyị ga-eme ka ọ hụ anyị n’anya. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova hụrụ onye ọ bụla na-efe ya n’anya, jirikwa ya kpọrọ ihe.—Mat. 10:29-31.

13 Anyị ga-anọrịrị ná nche, ma ọ́ bụghị ya, echiche na àgwà e ji mara ụwa Setan nwere ike iyi anyị ka hà dị mma. Ma, echefula na Setan bụ aka ochie n’iduhie ndị mmadụ. Setan nwere ike iji “akụkọ ụgha [ma ọ bụ, “akụkọ ifo,” Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik] e ji akọ chepụta” duhie anyị, ọ gwụkwala ma ànyị gere ntị na ndụmọdụ ndị dị n’Okwu Chineke.—2 Pita 1:16.

Esola “Setan”

14. Gịnị ka Pọl gwara ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, bụ́ ndị na-akatabeghị ahụ́, oleekwa ihe mere anyị niile ji kwesị ige ntị na ndụmọdụ ahụ?

14 Ka e were ya na e nwere saịn bọọdụ e dere: “Si Ụzọ A ma Ị Chọọ Iso Setan.” O doro anya na o nweghị Onye Kraịst ga-ekwe etinye isi n’ụzọ ahụ. Ma, Pọl gwara anyị na e nwere ọtụtụ ụzọ Ndị Kraịst raara onwe ha nye Jehova nwere ike isi ‘tụgharịa soro Setan.’ (Gụọ 1 Timoti 5:11-15.) Ọ bụ eziokwu na e nwere ‘ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, bụ́ ndị na-akatabeghị ahụ́,’ ndị Pọl na-agwa okwu ebe a, ihe o kwuru gbasara anyị niile. O nwere ike ụmụ nwaanyị ndị ahụ ọ gwara okwu na narị afọ mbụ echeghị na ha na-eso Setan, ma omume ha gosiri na ọ bụ ihe ha na-eme. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị ghara isodị Setan n’amaghị ama? Ka anyị tụlee ihe Pọl kwuru banyere ịgba asịrị.

15. Gịnị ka Setan chọrọ ime, oleekwa otú Pọl si mee ka anyị mata aghụghọ Setan?

15 Setan chọrọ ka anyị kwụsị ikwu banyere ihe anyị kweere, ya bụ, ka anyị kwụsị ikwusa ozi ọma. (Mkpu. 12:17) Ọ bụ nke a mere o ji anwa ime ka anyị chụwa ihe ndị ga-eri oge anyị ma ọ bụ ihe ndị ga-akpata nkewa n’etiti anyị. Legodị otú Pọl si mee ka anyị mata aghụghọ Setan. Aghụghọ nke mbụ: “Ịnọ nkịtị, na-epiogharị n’ụlọ dị iche iche.” N’oge anyị a e nwere ekwe ntị na kọmputa, ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike iji nnukwu oge na-ezipụ ozi ndị na-adịghị mkpa ma ọ bụdị ndị na-abụghị eziokwu, bụ́kwa ndị ga-ewe ndị ọzọ oge iji gụọ ha. Nke abụọ: ‘Ịgba asịrị.’ Mmadụ nwere ike ịnọ ebe ọ na-agba asịrị kwutọwa onye o ji agba asịrị, bụ́kwanụ nke na-akpatakarị esemokwu. (Ilu 26:20) Ma ndị nkwutọ hà ma ma ọ bụ na ha amaghị, ha na-eme ka Setan bụ́ Ekwensu. * Nke atọ: ‘Mmadụ itinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ya.’ Ọ dịghị anyị n’aka ịgwa ndị ọzọ otú ha ga-esi na-eme ihe ndị dịịrị ha. Àgwà ọjọọ ndị a, bụ́ ndị na-akpata nsogbu, nwere ike ime ka anyị kwụsị ọrụ Chineke nyere anyị, nke bụ́ ikwusa ozi ọma Alaeze ya. Anyị kwụsịhaala ịrụ ọrụ a Jehova nyere anyị, anyị na-esozi Setan. Mmadụ ga-enwerịrị onye ọ kwụ n’akụkụ ya.—Mat. 12:30.

16. Olee ndụmọdụ ndị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ‘ịtụgharị soro Setan’?

16 Ọ bụrụ na anyị emee ihe Baịbụl dụrụ anyị ọdụ ka anyị mee, ọ ga-eme ka anyị ghara ‘ịtụgharị soro Setan.’ Ka anyị tụlee ụfọdụ ndụmọdụ bara uru Pọl nyere anyị. Nke mbụ: Nwee ‘ọtụtụ ihe ị ga na-arụ n’ọrụ Onyenwe anyị.’ (1 Kọr. 15:58) Ọ bụrụ na anyị ana-arụchi ọrụ ndị gbasara Alaeze Chineke anya, ọ ga-eme ka anyị ghara ịbanye ná nsogbu ndị ịnọ nkịtị nwere ike ịkpatara anyị, meekwa ka anyị ghara ịna-achụ ihe ndị ga na-ewekọrọ oge anyị. (Mat. 6:33) Nke abụọ: Na-ekwu “okwu dị mma maka iwuli elu.” (Efe. 4:29) Kpebisie ike na ị gaghị na-ege asịrị nakwa na ị gaghị na-agba asịrị. * Na-atụkwasị ụmụnna gị obi, na-akwanyekwara ha ùgwù. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị a, ọ ga-adịrị anyị mfe ịna-ekwu okwu na-ewuli elu ọ bụghị nke na-akụda mmụọ. Nke atọ: ‘Kpebie ilekwasị anya n’ihe ị na-eme.’ (1 Tesa. 4:11) Gosi ndị ọzọ na i nwere mmasị n’ebe ha nọ, ma ka ị na-eme ya, na-akwanyere ha ùgwù, etinyela anya n’ihe ndị dịịrị ha ị na-ekwesịghị ịma. Chetakwa na a bịa n’ihe onye ọzọ kwesịrị iji aka ya kpebie ihe ọ ga-eme, anyị ekwesịghị isiwe ọnwụ ka o mee ihe anyị chere.—Gal. 6:5.

17. (a) Olee ihe mere Jehova ji gwa anyị ihe ndị anyị na-ekwesịghị iso? (b) Gịnị ka i kpebisiri ike ime?

17 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova mere ka ihe ndị anyị na-ekwesịghị iso doo anyị anya. Ma, echefula na ihe mere Jehova ji nye anyị ndụmọdụ ndị anyị tụlere n’isiokwu a na nke bu ya ụzọ bụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Ọ chọghị ka Setan duhie anyị ma mee ka anyị hụsie anya. Ọ bụ eziokwu na ụzọ Jehova chọrọ ka anyị soro dị mkpagide, ọ bụ naanị ya ka anyị ga-eso nweta ndụ ebighị ebi. (Mat. 7:14) Ka anyị kpebisie ike na anyị ga-ege Jehova ntị ma mee ihe doro anya ọ dụrụ anyị ọdụ ka anyị mee, nke bụ́: “Lekwa ụzọ. Jeenụ ije na ya.”—Aịza. 30:21.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Dị ka ihe atụ, ihe juru n’akwụkwọ Tobit, ma ọ bụ Tobias, bụ́ nke ụfọdụ ndị chere na o so n’akwụkwọ ndị dị na Baịbụl, bụ nkwenkwe ụgha na akụkọ banyere anwansi ndị a na-akọ n’oge Pọl ka hà bụ eziokwu. E dere ya ihe dị ka na narị afọ nke atọ tupu Kraịst abịa n’ụwa.—Gụọ Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peeji nke122.

^ par. 15 Okwu Grik a sụgharịrị ka ọ bụrụ “ekwensu” bụ di·aʹbo·los, nke pụtara “onye nkwutọ.” Nke a bụ utu aha ọzọ e ji mara Setan, bụ́ onye nkwutọ mbụ e nwere.—Jọn 8:44; Mkpu. 12:9, 10.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

Olee otú ị ga-esi gosi na ị na-ege ntị n’ịdọ aka ná ntị ndị dị n’amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị a?

2 Pita 2:1-3

1 Timoti 1:3, 4

1 Timoti 5:11-15

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 19]

Ábụ́bà Ifufe Busasịrị

  Otu akụkọ mgbe ochie ndị Juu na-akọ gosiri ihe ọjọọ ịgba asịrị na-akpata. A kọọla akụkọ a n’ụzọ dị iche iche, ma ihe akụkọ ahụ na-ekwu bụ:

N’otu obodo, e nwere otu onye nọ na-agagharị na-ekwutọ otu nwoke maara ihe. Onye asịrị ahụ mechara kwaa mmakwaara ma gakwuru nwoke ahụ maara ihe rịọ ya ka ọ gbaghara ya. O kwere nwoke ahụ nkwa na ya ga-eme ihe ọ bụla ọ gwara ya mee ka o nwee ike gbaghara ya. Nwoke ahụ maara ihe gwara ya otu ihe ọ ga-emere ya. Ọ gwara onye asịrị ahụ ka o were pilo ábụ́bà ọkụkọ juru n’ime ya, chawaa ya, ma wụlie ábụ́bà ndị ahụ elu mgbe ifufe na-efe ka ifufe busasịa ha. Ọ bụ eziokwu na nke a gbara onye asịrị ahụ gharịị, o mere ihe a gwara ya ma gaghachi na nke nwoke ahụ maara ihe ma jụọ ya, sị:

“Ugbu a, ị̀ gbagharala m”?

Nwoke ahụ maara ihe azaa ya, sị: “Burugodị ụzọ gaa tụtụkọtachaa ábụ́bà ahụ niile.”

Onye asịrị ahụ ajụọ ya, sị: “Oleekwanụ otú m ga-esi eme ya ebe ifufe busasịrịla ha”?

Nwoke ahụ maara ihe asị ya: “Otú ahụ ọ ga-esi sie ike ịtụtụkọtacha ábụ́bà ahụ niile ka ọ ga-esikwa sie ike imezi ihe asịrị ị gbara mebiri.”

Ihe akụkọ a na-akụzi doro anya. Anyị enweghị ike ịgbanwe ihe anyị kwuru ma anyị kwuhaala ya, ọ na-esikwa ike imezi ihe okwu anyị kwuru mebiri. Ọ bụrụ na ịgba asịrị agụwa anyị, ka anyị cheta na ihe anyị na-achọ ime bụ ịwụli ábụ́bà elu ka ifufe busasịa ha.

[Foto dị na peeji nke 16]

Olee otú ụfọdụ ndị nwere ike isi kpọbata ndị si n’ezi ofufe dapụ n’ụlọ ha?