Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka E Kwesịrị Ịkụziri Ụmụaka?

Gịnị Ka E Kwesịrị Ịkụziri Ụmụaka?

Gịnị Ka E Kwesịrị Ịkụziri Ụmụaka?

“Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie, na iji ya nye ọzụzụ n’ezi omume.”​—2 TIMOTI 3:16.

E KWESỊRỊ ịkụziri ụmụaka eziokwu banyere Chineke. Ebee ka ha ga-esi amụta eziokwu ahụ? Ọ bụ na Baịbụl, bụ́ akwụkwọ okpukpe a kacha agụ n’ụwa.

E nwere ike ikwu na Baịbụl bụ akwụkwọ ozi Chineke detaara ụmụ mmadụ. N’akwụkwọ ozi a, Chineke gwara anyị ụdị onye ọ bụ, gwakwa ụmụ ya niile, ma ndị torola eto ma ụmụaka, otú ha kwesịrị isi na-akpa àgwà. Legodị ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru na ihe ndị anyị na ụmụaka anyị nwere ike ịmụta na ha.

Gịnị ka Chineke chọrọ ka anyị mụta banyere ya?

Ihe Baịbụl kwuru: “Gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.”​—Abụ Ọma 83:18.

Ihe ọ na-akụziri anyị: Chineke dị adị. O nwekwara aha.

Ihe Baịbụl kwuru: “Jehova na-enyocha obi niile, ọ na-amatakwa ihe niile mmadụ na-eche n’echiche. Ọ bụrụ na ị chọọ ya, ọ ga-ekwe ka ị chọta ya.”​—1 Ihe E Mere 28:9.

Ihe ọ na-akụziri anyị: Jehova Chineke hụrụ anyị niile n’anya, ma ụmụaka. (Abụ Ọma 10:14; 146:9) Ọ chọrọ ka anyị mụọ banyere ya.

Ihe Baịbụl kwuru: “Unu emekpala . . . nwa na-enweghị nna ahụ́. Ọ bụrụ na e nwee ka i si mekpaa ya ahụ́, ọ bụrụ na o tikuo m, aghaghị m ịnụ mkpu ákwá ya.”​—Ọpụpụ 22:22-24.

Ihe ọ na-akụziri anyị: Jehova na-ege ntị n’ekpere anyị, ọ sọgodị ya ya bụrụ nke ụmụaka kpere. Anyị nwere ike ịgwa Chineke okwu mgbe niile ma kọọrọ ya ihe ndị anyị na-eche na otú obi dị anyị.

Ihe Baịbụl kwuru: “Ha nwara Chineke ọnwụnwa ugboro ugboro, ha mekwara ihe wutere Onye Nsọ Izrel.”​—Abụ Ọma 78:41.

Ihe ọ na-akụziri anyị: Okwu ọnụ anyị na omume anyị nwere ike ime ka obi tọọ Jehova ụtọ ma ọ bụ jọọ ya njọ, n’ihi ya, anyị kwesịrị iche echiche tupu anyị ekwuo okwu ma ọ bụ mee ihe ọ bụla.

Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ?

Ihe Baịbụl kwuru: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”​—Ọrụ 10:34, 35.

Ihe ọ na-akụziri anyị: Ebe ọ bụ na Chineke na-anabata mmadụ niile, anyị ekwesịghị ịkpọ ndị ọzọ asị maka na akpụkpọ ahụ́ ha ma ọ bụ ihu ha dị iche na nke anyị.

Ihe Baịbụl kwuru: “Dịrịnụ njikere mgbe niile ịzara ọnụ unu n’ihu onye ọ bụla nke na-ajụ unu ihe mere unu ji nwee olileanya ahụ unu nwere, ma jirinụ obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù dị ukwuu na-eme otú ahụ.”​—1 Pita 3:15.

Ihe ọ na-akụziri anyị: Mgbe anyị na ndị ọzọ na-ekwu banyere Chineke, anyị kwesịrị ikwu ya ka ndị ihe ha na-ekwu doro anya, anyị ekwesịghị ikwu ya ka anyị na ha ọ̀ na-ese okwu. Anyị kwesịkwara ịkwanyere ndị okpukpe ọzọ ùgwù.

Olee otú anyị kwesịrị isi mesoo ndị ezinụlọ anyị?

Ihe Baịbụl kwuru: “Ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe niile, n’ihi na nke a na-atọ Onyenwe anyị ụtọ.”​—Ndị Kọlọsi 3:20.

Ihe ọ na-akụziri anyị: Ụmụaka ndị na-erubere ndị mụrụ ha isi na-egosi na ha hụrụ ndị mụrụ ha n’anya, na-egosikwa na ha chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.

Ihe Baịbụl kwuru: “Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ.”​—Ndị Kọlọsi 3:13.

Ihe ọ na-akụziri anyị: Ndị mmadụ, ma ndị ezinụlọ anyị, nwere ike ime ihe ga-ewute anyị mgbe ụfọdụ. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-agbaghara anyị, anyị kwesịrị ịmụta ịgbaghara ndị ọzọ.​—Matiu 6:14, 15.

Gịnị mere anyị ga-eji na-ekwu eziokwu ma na-emere ndị ọzọ ihe ọma?

Ihe Baịbụl kwuru: [Hapụnụ] okwu ụgha, ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.”​—Ndị Efesọs 4:25.

Ihe ọ na-akụziri anyị: Ọ bụrụ na anyị na-ekwu eziokwu, anyị na-eme ka Chineke, na-emekwa ihe na-atọ ya ụtọ. Ọ bụrụ na anyị na-agha ụgha, anyị na-eme ka Ekwensu, bụ́ onye iro Chineke, bụrụkwa “nna ụgha.”​—Jọn 8:44; Taịtọs 1:2.

Ihe Baịbụl kwuru: “Na-emerenụ mmadụ ndị ọzọ ihe ụnụ na-achọ ka ha meere unu.”​—Matiu 7:12, Bible Nsọ Ọhụụ.

Ihe ọ na-akụziri anyị: Anyị kwesịrị ịna-echebara ndị ezinụlọ anyị na ndị ọzọ echiche ma na-enyere ha aka. Ọ bụrụ na anyị na-egosi na ‘ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi,’ ndị ọzọ ga na-emekwara anyị ihe ọma.​—1 Pita 3:8; Luk 6:38.

Ihe ndị a anyị kwuru na-egosi na ihe ndị dị na Baịbụl nwere ike ime ka ụmụaka mụta ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù, imere ha ihe ọma, na ichebara ha echiche. Ma ònye kwesịrị ịkụziri ụmụaka ihe ndị a?