Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Anyị Nwere Ike Iji Na-enwe Ofufe Ezinụlọ na Ọmụmụ Ihe Onwe Onye

Ihe Ndị Anyị Nwere Ike Iji Na-enwe Ofufe Ezinụlọ na Ọmụmụ Ihe Onwe Onye

Ihe Ndị Anyị Nwere Ike Iji Na-enwe Ofufe Ezinụlọ na Ọmụmụ Ihe Onwe Onye

NÁ MMALITE afọ 2009, a hazigharịrị otú ọgbakọ Ndịàmà Jehova e nwere n’ụwa niile si amụ ihe n’izu ọ bụla. E bukọtaziri ọmụmụ ihe abụọ a na-enwe n’etiti izu ọnụ ma gbaa ụmụnna niile ume ka ha jiri mgbede ụbọchị ahụ a na-ejibu aga Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-enwe ofufe ezinụlọ ma ọ bụ ọmụmụ ihe onwe onye. Ị̀ na-eji mgbede a enwe ofufe ezinụlọ ma ọ bụ ọmụmụ ihe onwe onye? Ọ̀ na-abara gị uru?

Nsogbu ụfọdụ ndị bụ ịma ihe ha ga na-amụ n’ofufe ezinụlọ ha. O nweghị ezinụlọ Òtù Na-achị Isi na-agwa akwụkwọ ha ga na-amụ n’ofufe ezinụlọ ha. Ebe ọ bụ na ọnọdụ ezinụlọ niile abụghị otu, ihe onye isi ezinụlọ ọ bụla ga-eme bụ ịmata ihe dị ezinụlọ ya mkpa nakwa ụdị ihe ha ga na-amụ ya ana-enyere ha aka. Ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwekwara ike ikpebi ihe ha ga na-amụ ya abaara ha ezigbo uru.

Ụfọdụ na-eji oge ofufe ezinụlọ ha akwadebe ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe. Ma, ọ bụghị naanị ịkwadebe ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe ka anyị nwere ike ịna-eme n’ofufe ezinụlọ anyị. Ezinụlọ ụfọdụ na-eji oge ofufe ezinụlọ ha agụ Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ anyị dị iche iche. Ezinụlọ ndị ọzọ na-eji akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl eme ihe nkiri, nke a na-akakwa abara ụmụaka uru. N’ihi ya, ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga-adị mma ka ofufe ezinụlọ anyị na-adị ka ọmụmụ ihe a na-enwe n’ọgbakọ, ya bụ, a gụọ paragraf a jụọ ajụjụ. Ọ bụrụ na ahụ́ eruo onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ anyị ala mgbe anyị na-enwe ofufe ezinụlọ, ọ ga-eme ka ọ dịrị ha mfe ikwu ihe dị ha n’obi. Nke a ga-emekwa ka ọ dịrị onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ mfe ikwu ihe ndị ga-abara ezinụlọ uru, meekwa ka ofufe ezinụlọ na-atọ onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ụtọ.

Otu nna nke nwere ụmụ atọ kwuru otú ha si enwe ofufe ezinụlọ ha. Aha nwa ya nwaanyị bụ Kaitlyn, aha ụmụ ya ndị nwoke abụọ bụ David na Michael. Kaitlyn dị afọ iri na ise, David adịrị afọ iri na atọ, ebe Michael dị afọ asaa. Ihe ha na-ejikarị enwe ofufe ezinụlọ ha bụ ọgụgụ Baịbụl dịịrị izu. Onye nke ọ bụla n’ime ha na-ebu ụzọ gụọ ebe a ga-agụ n’ọgụgụ Baịbụl dịịrị izu. Kaitlyn, David na Michael ahọrọzie amaokwu Baịbụl ndị ha ga-eji eme nchọnchọ. E mechazie ha agwa ndị mụrụ ha ihe ndị ha mụtara. Michael na-esekarị ihe ndị ọ mụtara ese ma ọ bụkwanụ dee ha edee. Mgbe ụfọdụ, David na Kaitlyn na-ede banyere otu akụkọ a kọrọ na Baịbụl dị ka à ga-asị na ha na-ahụ ka ihe ndị a kọrọ n’akụkọ ahụ na-eme. Dị ka ihe atụ, e nwere otu izu anyị gụrụ akụkọ dị na Jenesis isi iri anọ banyere otú Josef si kọwaara ndị ohu Fero nrọ ha. Kaitlyn deziri akụkọ ahụ dị ka à ga-asị na ọ bụ onye mkpọrọ nke nọ mgbe ihe ahụ na-eme.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọnọdụ ezinụlọ niile abụghị otu. Ihe otu ezinụlọ ji enwe ofufe ezinụlọ ha nwere ike ọ gaghị adabara ezinụlọ ọzọ, ihe otu onye jikwa enwe ọmụmụ ihe onwe onye nwere ike ọ gaghị adabara onye ọzọ. E depụtara ihe ụfọdụ e nwere ike iji na-enwe ofufe ezinụlọ ma ọ bụkwanụ ọmụmụ ihe onwe onye n’igbe dị na peeji nke 7. I nwekwara ike ichepụta ihe ndị ọzọ unu nwere ike iji na-enwe ofufe ezinụlọ ma ọ bụ ọmụmụ ihe onwe onye.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6, 7]

Maka ezinụlọ ndị nwere ndị na-eto eto:

• Gụọnụ akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, kwurịtakwanụ ihe unu gụrụ.

• Mgbe unu na-agụ Baịbụl, gụọnụ ya ka ùnu bụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. (Lee Ụlọ Nche nke May 15, 1996, peeji nke 14, paragraf nke 17-18.)

• Kwurịtanụ ihe mgbaru ọsọ dị iche iche, ma ndị nke ga-ewetụ oge tupu eruo ha ma ndị nke e nwere ike iru ngwa ngwa.

• Unu nọtụ, unu ekirie vidio ndị nzukọ a wepụtara, kwurịtakwa ihe ndị unu kiriri.

• Tụleenụ isiokwu bụ́: “Maka Ndị Na-eto Eto,” nke na-agba n’Ụlọ Nche nke ọhaneze.

Maka ndị di na nwunye na-enweghị ụmụ:

• Kwurịtanụ ihe ndị dị n’isi nke 1, 3, 11-16 nke akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ.

• Kwurịtanụ ihe ndị unu chọpụtara mgbe unu mere nchọnchọ n’ihe ndị unu gụtara n’ọgụgụ Baịbụl.

• Kwadebenụ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ ma ọ bụ Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche.

• Kwurịtanụ otú unu nwere ike isi wepụtakwuo oge na-aga ozi ọma.

Maka ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ndị ndị ezinụlọ ha na-abụghị ndị Jehova:

• Mụọ akwụkwọ ọhụrụ ndị i nwetara ná mgbakọ distrikti.

• Gụọ Yearbook (akwụkwọ mgbaafọ), ma nke afọ a, ma ndị nke afọ gara aga.

• Mee nchọnchọ n’otú ị ga-esi aza ajụjụ ndị a na-ajụkarị n’ókèala unu.

• Kwadebe otú ị ga-esi ezi ozi ọma nakwa otú ị ga-esi enyefe magazin.

Maka ezinụlọ ndị nwere obere ụmụaka:

• Jirinụ akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl mee ihe nkiri.

• Jirinụ akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl na-eme gwam gwam gwam, dị ka ndị nke ahụ na-adịkarị na peeji nke 30 ma ọ bụ nke 31 na Teta!

• Unu nọtụ unu achọta ihe ọhụrụ ga-atọ ụtọ unu ga-eme mgbe unu na-enwe ofufe ezinụlọ. (Lee isiokwu bụ́ “Mbọ Ọ Bụla A Gbara Maka Ya Efughị Ọhịa!” nke dị n’Ụlọ Nche nke Febụwarị 15, 2011, peeji nke 11.)

• Tụleenụ isiokwu bụ́ “Kụziere Ụmụ Gị Ihe,” nke na-agba n’Ụlọ Nche nke ọhaneze.