Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Hụrụ Mesaya Ahụ!

Ha Hụrụ Mesaya Ahụ!

Ha Hụrụ Mesaya Ahụ!

“Anyị ahụwo Mesaya ahụ.”—JỌN 1:41.

1. Olee ihe mere Andru ji kwuo, sị: “Anyị ahụwo Mesaya ahụ”?

JỌN ONYE NA-EME BAPTIZIM na mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya nọ. Ka Jizọs na-erute nso, Jọn ji oké olu kwuo, sị: “Lee Nwa Atụrụ Chineke!” Andru na onye ọzọ na-eso ụzọ Jọn sowere Jizọs ozugbo, ha na ya nọkwara ụbọchị ahụ dum. Andru mechara gaa chọta nwanne ya, bụ́ Saịmọn Pita, ma jiri obi ụtọ gwa ya, sị: “Anyị ahụwo Mesaya ahụ.” O dukwaara ya gakwuru Jizọs.—Jọn 1:35-41.

2. Olee uru anyị ga-erite ma anyị tụlekwuo amụma ndị e buru banyere Mesaya ahụ?

2 Ka oge na-aga, Andru, Pita, na ndị ọzọ ga-atụle ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ ma kọọrọ ndị ọzọ na Jizọs onye Nazaret bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa. Ka anyị na-atụlekwu amụma ndị ọzọ e buru banyere Mesaya ahụ, obi ga na-esikwu anyị ike na ihe e dere na Baịbụl bụ eziokwu, okwukwe anyị nwere n’Onye Chineke Tere Mmanụ ga-esikwukwa ike.

“Lee! Eze Gị Na-abịakwute Gị”

3. Olee amụma ndị mezuru mgbe Jizọs banyere na Jeruselem ka eze?

3 Mesaya ahụ ga-abanye na Jeruselem ka eze. Zekaraya buru amụma, sị: “Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị ada bụ́ Zayọn. Tie mkpu mmeri, gị ada bụ́ Jeruselem. Lee! Eze gị na-abịakwute gị. Ọ bụ onye ezi omume, ee, onye a zọpụtara azọpụta; ọ dị umeala n’obi, ọ nọkwa n’elu ịnyịnya ibu, ọbụna anụmanụ tojuru etoju, bụ́ nwa nke nne ịnyịnya ibu.” (Zek. 9:9) Otu ọbụ abụ dere, sị: “Ka Onye na-abịa n’aha Jehova bụrụ onye a gọziri agọzi.” (Ọma 118:26) Ìgwè mmadụ tiri mkpu ọṅụ mgbe Jizọs banyere Jeruselem. O nweghị mgbe Jizọs gwara ìgwè mmadụ ahụ ka ha mee ihe ahụ ha mere. Ihe ha mere bụ kpọmkwem ihe e buru n’amụma. Ka ị na-agụ akụkọ a, were ya na ị nọ ebe ahụ na-anụ mkpu ọṅụ ha na-eti.—Gụọ Matiu 21:4-9.

4. Olee otú ihe e dere n’Abụ Ọma 118:22, 23 si mezuo?

4 Jizọs dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke, n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị agaghị ekwere na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ. Dị ka e buru n’amụma, ndị na-ekwetaghị ihe ndị gosiri na Jizọs bụ Mesaya ahụ ‘ledara Jizọs anya, ọ dịghịkwa ihe ha ji ya kpọrọ.’ (Aịza. 53:3; Mak 9:12) Ma, Chineke nyere otu ọbụ abụ ike mmụọ nsọ ikwu, sị: “Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ aghọwo isi nkuku. Ọ bụ Jehova mere ya.” (Ọma 118:22, 23) Jizọs gwara ndị ndú okpukpe na-emegide ya na amụma a mezuru n’isi ya. Pita kwukwara na amụma a mezuru n’isi Kraịst. (Mak 12:10, 11; Ọrụ 4:8-11) Jizọs ghọrọ “nkume isi nkuku e ji tọọ ntọala” ọgbakọ Ndị Kraịst. N’agbanyeghị na ndị na-amaghị Chineke jụrụ ya, ‘Chineke họọrọ ya, ya adịrịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.’—1 Pita 2:4-6.

A Raara Ya Nye, Gbahapụkwa Ya

5, 6. Olee ihe e buru n’amụma banyere otú a ga-esi rara Mesaya ahụ nye, oleekwa otú nke a si mezuo?

5 E buru amụma na onye na-eso ụzọ Mesaya ahụ ga-eji aghụghọ rara ya nye. Devid buru amụma, sị: “Onye mụ na ya dịkwa ná mma, onye m tụkwasịrị obi, onye na-eri nri m, atụgharịwo megide m.” (Ọma 41:9) A na-ewere na onye ya na mmadụ na-erikọ nri bụ enyi onye ahụ. (Jen. 31:54) N’ihi ya, Judas Iskarịọt gosiri na ya bụ ezigbo onye aghụghọ mgbe ọ raara Jizọs nye ndị iro ya. Jizọs kwuru ihe gosiri na amụma Devid buru na-aga imezu mgbe ọ gwara ndịozi ya banyere onye na-aga ịrara ya nye. Ọ gwara ha, sị: “Adịghị m ekwu banyere unu niile; amaara m ndị m họọrọ. Kama ọ bụ ka e wee mezuo Akwụkwọ Nsọ, nke sịrị, ‘Onye na-eri nri m ebiliwo megide m.’”—Jọn 13:18.

6 Onye ga-arara Mesaya ahụ nye ga-anara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, bụ́ ego ole a na-ere ohu. Matiu kwuru na Judas raara Jizọs nye ma nara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, nakwa na nke a mezuru amụma dị na Zekaraya 11:12, 13. Ma, olee ihe mere Matiu ji kwuo na e buru amụma a “site n’ọnụ Jeremaya onye amụma”? N’oge Matiu nọ ndụ, ọ ga-abụ na a na-ewere akwụkwọ Jeremaya ka nke mbụ n’akwụkwọ ụfọdụ ndị dị na Baịbụl, bụ́ ndị akwụkwọ Zekaraya so na ha. (Tụlee Luk 24:44.) Judas enweghị ihe o ji ego ahụ o nwetara n’ụzọ ọjọọ mee n’ihi na ọ wụsara ya n’ụlọ nsọ ma gaa kwụgbuo onwe ya.—Mat. 26:14-16; 27:3-10.

7. Olee otú ihe e dere na Zekaraya 13:7 si mezuo?

7 Ndị na-eso ụzọ Mesaya ahụ ga-ahapụdị ya gbasasịa. Zekaraya dere, sị: “Gbuo onye ọzụzụ atụrụ, ka ìgwè atụrụ ya wee gbasasịa.” (Zek. 13:7) Na Naịsan 14, 33 O.A., Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu niile ga-asụ ngọngọ n’ihi m n’abalị a, n’ihi na e dere, sị, ‘M ga-egbu onye ọzụzụ atụrụ, ìgwè atụrụ ya ga-agbasasịkwa.’” Nke a bụkwa kpọmkwem ihe merenụ. Matiu dere, sị: “Ndị niile na-eso ụzọ [Jizọs] wee hapụ ya gbaa ọsọ.”—Mat. 26:31, 56.

A Ga-ebo Ya Ebubo, Tiekwa Ya Ihe

8. Olee otú ihe e dere n’Aịzaya 53:8 si mezuo?

8 A ga-ekpe Mesaya ahụ ikpe, maakwa ya ikpe ọnwụ. (Gụọ Aịzaya 53:8.) N’isi ụtụtụ Naịsan 14, ndị niile so na Sanhedrin zukọrọ kee Jizọs agbụ ma nyefee ya n’aka Gọvanọ Pọntiọs Paịlet, bụ́ onye Rom. Ọ jụrụ Jizọs ajụjụ ma chọpụta na o nweghị ihe o mere. Ma, mgbe Paịlet jụrụ ìgwè mmadụ zukọrọnụ ma ọ̀ bụ ya hapụ Jizọs, ha tiri mkpu, sị: “Kpọgide ya n’osisi!” Ha gwakwara ya ka ọ hapụrụ ha onye omempụ bụ́ Barabas kama ịhapụ Jizọs. Ebe Paịlet chọrọ ime ihe dị ha mma, ọ hapụrụ Barabas, gwa ndị agha ya ka ha pịa Jizọs ihe ma nyefee ya n’aka ha ka ha kpọgide ya n’osisi.—Mak 15:1-15.

9. Olee ihe mere n’oge Jizọs bụ́ nke e kwuru n’Abụ Ọma 35:11 na ọ ga-eme?

9 Ndị akaebe ụgha ga-agbagide Mesaya ahụ akaebe. Ọbụ abụ bụ́ Devid sịrị: “Ndị akaebe bụ́ ndị na-eme ihe ike ebiliwo; ha na-ajụ m ihe m na-amaghị.” (Ọma 35:11) Ihe a Devid dere mezuru, “ndị isi nchụàjà na Sanhedrin dum na-achọgharị ihe ha ga-eji gbagide Jizọs akaebe ụgha ka ha wee gbuo ya.” (Mat. 26:59) N’eziokwu, “ọtụtụ ndị nọ na-agbagide ya akaebe ụgha, ma akaebe ha ekwekọrịtaghị.” (Mak 14:56) Ndị iro Jizọs achọghị ịma ma ihe ndị akaebe ahụ na-ekwu hà bụ eziokwu ma ọ bụ na ha abụghị, ihe bụ́ mkpa ha bụ ka e gbuo Jizọs.

10. Kọwaa otú e si mezuo ihe e dere n’Aịzaya 53:7.

10 Mesaya ahụ agaghị aza ndị na-ebo ya ebubo okwu. Aịzaya buru amụma, sị: “Ihe isi ike dakwasịrị ya, o kwekwara ka e mekpaa ya ahụ́; ma o mepeghị ọnụ ya. A kpụụrụ ya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu; dịkwa ka nne atụrụ nke dara ogbi n’ihu ndị na-akpacha ya ajị, otú ahụkwa ka ọ na-emepeghị ọnụ ya.” (Aịza. 53:7) Mgbe “ndị isi nchụàjà na ndị okenye na-ebo [Jizọs] ebubo, ọ zaghị ihe ọ bụla.” Paịlet jụrụ Jizọs, sị: “Ị̀ naghị anụ ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị?” Ma, “ọ zaghị ya ihe ọ bụla, ee e, ọbụna otu mkpụrụ okwu, nke mere na o juru gọvanọ ahụ anya nke ukwuu.” (Mat. 27:12-14) Jizọs ekwujọghị ndị na-ebo ya ebubo.—Rom 12:17-21; 1 Pita 2:23.

11. Olee otú e si mezuo ihe e dere n’Aịzaya 50:6 nakwa na Maịka 5:1?

11 Aịzaya buru amụma na a ga-eti Mesaya ahụ ihe. Onye amụma a dere, sị: “M cheere ndị na-eti ihe azụ m, ọ bụkwa ndị na-efopụ ajị ka m cheere ntì m. Ewepụghị m ihu m iji zere mkparị na ịgbụ m ọnụ mmiri.” (Aịza. 50:6) Maịka buru amụma, sị: “Ha ga-akụ onyeikpe nke Izrel mkpara na ntì.” (Maị. 5:1) Mak dere ihe gosiri na amụma ndị a mezuru. O dere, sị: “Ụfọdụ wee malite ịgbụ [Jizọs] ọnụ mmiri na ikpuchi ihu ya dum na isu ya ọkpọ na ịsị ya: ‘Buo amụma!’ Ndị na-eje ozi n’ụlọikpe mara ya ụra n’ihu wee kpụrụ ya pụọ.” Mak kwuru na ndị agha “na-etikwa ya okporo amị n’isi ma na-agbụ ya ọnụ mmiri, ha na-egbukwa ikpere n’ala [n’ịkwa emo] kpọọrọ ya isiala.” (Mak 14:65; 15:19) Ma, o nweghị ihe Jizọs mere nke e kwesịrị ikwo mee ya ihe ndị a.

O Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ruo Ọnwụ

12. Olee otú Abụ Ọma 22:16 na Aịzaya 53:12 si mezuo n’isi Jizọs?

12 E buru amụma na a ga-akpọgide Mesaya ahụ n’osisi. Ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru, sị: “Nzukọ ndị na-eme ihe ọjọọ agbawo m okirikiri. Ha na-ata m arụ n’aka nakwa n’ụkwụ dị ka ọdụm.” (Ọma 22:16) Mak gwara anyị otú nke a si mezuo, bụ́kwanụ ihe ndị na-agụ Baịbụl maara nke ọma. Ọ sịrị: “Ma ọ bụ oge awa nke atọ [ya bụ, ihe dị ka n’elekere itoolu nke ụtụtụ], ha wee kpọgide ya n’osisi.” (Mak 15:25) E bukwara amụma na a ga-agụnye Mesaya ahụ ná ndị mmehie. Aịzaya dere, sị: “Ọ wụpụụrụ ọnwụ mkpụrụ obi ya, a gụnyekwara ya ná ndị na-emebi iwu.” (Aịza. 53:12) Nke a mezuru mgbe “a kpọgidere [Jizọs] na mmadụ abụọ na-apụnara mmadụ ihe n’osisi, otu onye n’aka nri ya, otu onye n’aka ekpe ya.”—Mat. 27:38.

13. Olee otú Abụ Ọma 22:7, 8 si mezuo n’isi Jizọs?

13 Devid buru amụma na ndị mmadụ ga-ekwujọ Mesaya ahụ. (Gụọ Abụ Ọma 22:7, 8.) E kwujọrọ Jizọs mgbe ọ na-ahụsi anya n’osisi ịta ahụhụ. Matiu dere, sị: “Ndị na-agafe agafe malitere ikwujọ ya, na-efufe isi ha, na-asị: ‘Gị onye ga-akwatu ụlọ nsọ, onye ga-ewukwa ya n’ụbọchị atọ, zọpụta onwe gị! Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, si n’osisi ịta ahụhụ ahụ rịdata!’” Ndị isi nchụàjà, na ndị odeakwụkwọ, na ndị okenye jikwa ya na-eme ihe ọchị, sị: “Ọ zọpụtara ndị ọzọ; ọ pụghị ịzọpụta onwe ya! Ọ bụ Eze Izrel; ya si n’osisi ịta ahụhụ rịdata, anyị ga-ekwerekwa na ya. Ọ tụkwasịrị Chineke obi; Ya napụta ya ugbu a ma ọ bụrụ na ihe ya masịrị Ya, n’ihi na ọ sịrị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke.’” (Mat. 27:39-43) N’agbanyeghị ihe ndị a niile, Jizọs ekwutọgwaraghị ha. Nke a bụụrụ anyị ezigbo ihe nlereanya.

14, 15. Olee otú amụma e buru na a ga-enye Mesaya ahụ mmanya gbara ụka, nakwa na a ga-efe nza maka uwe ya si mezuo?

14 A ga-efe nza maka uwe Mesaya ahụ. Devid dere, sị: “Ha kere uwe m n’etiti onwe ha, ha fekwara nza maka uwe m.” (Ọma 22:18) Ihe a o kwuru mezuru n’ihi na “mgbe [ndị agha Rom] kpọgidere [Jizọs] n’osisi, ha kere uwe elu ya site n’ife nza.”—Mat. 27:35; gụọ Jọn 19:23, 24.

15 A ga-enye Mesaya ahụ mmanya gbara ụka na ihe na-elu ilu. Ọbụ abụ bụ́ Devid dere, sị: “Ha nyere m ahịhịa na-egbu mmadụ ka m taa, ha nwakwara ime ka m ṅụọ mmanya gbara ụka mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ.” (Ọma 69:21) Matiu gwara anyị, sị: “Ha nyere Jizọs mmanya a gwara ihe na-elu ilu ka ọ ṅụọ; ma, mgbe o detụrụ ya ire, o kweghị aṅụ ya. Ka e mechara, “otu onye n’ime ha gbaara ọsọ were ogbo, mikpuo ya n’ime mmanya gbara ụka, dokwasịkwa ya n’okporo amị wee malite inye ya ka ọ ṅụọ.”—Mat. 27:34, 48.

16. Kọwaa otú amụma e buru n’Abụ Ọma 22:1 si mezuo.

16 Ọ ga-adị ka Chineke ọ̀ gbahapụrụ Mesaya ahụ. (Gụọ Abụ Ọma 22:1.) Dị ka e buru n’amụma, “n’oge awa nke itoolu kwa [ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie], Jizọs tiri mkpu n’oké olu, sị: ‘Eli, Eli, lama sabaktani?’ nke pụtara, ma a sụgharịa ya: ‘Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji gbahapụ m?’” (Mak 15:34) Nke a apụtaghị na Jizọs atụkwasịghịzi Nna ya nke eluigwe obi. Otú Chineke si gbahapụ Jizọs bụ na ọ gbara nkịtị ka ndị iro Kraịst gbuo ya. O si otú ahụ nye ohere ka Jizọs gosi ma ọ̀ ga-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ. Mkpu ahụ Jizọs tiri mezuru ihe e dere n’Abụ Ọma 22:1.

17. Olee otú ihe e dere na Zekaraya 12:10 na Abụ Ọma 34:20 si mezuo?

17 A ga-ama Mesaya ahụ ube, ma, ọ dịghị ọkpụkpụ ya a ga-agbaji. Ndị bi na Jeruselem “ga-elegide anya n’Onye ahụ ha mara ube.” (Zek. 12:10) Abụ Ọma 34:20 kwukwara, sị: “Ọ na-eche ọkpụkpụ niile nke onye ahụ nche; e nweghị otu n’ime ha a gbajiri agbaji.” Iji gosi na amụma ndị a mezuru, Jọn onyeozi dere, sị: “Otu n’ime ndị agha ahụ mara [Jizọs] ube n’akụkụ, ozugbo ahụ, ọbara na mmiri gbapụtara. Onye ahụ [ya bụ, Jọn] nke hụrụ ya agbawo àmà, àmà ya bụkwa eziokwu . . . Ihe ndị a mere ka e wee mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, nke sịrị: ‘Ọ dịghị ọkpụkpụ ya a ga-agbaji.’ Ihe ọzọ e dere n’Akwụkwọ Nsọ sịrị: ‘Ha ga-elegide anya n’Onye ahụ ha mara ube.’”—Jọn 19:33-37.

18. Olee otú o si bụrụ na e liri Jizọs n’ebe a na-eli ndị ọgaranya?

18 A ga-eli Mesaya ahụ ebe a na-eli ndị ọgaranya. (Gụọ Aịzaya 53:5, 8, 9.) Ná mgbede Naịsan 14, ‘otu onye Arimatia nke bara ọgaranya, aha ya bụ Josef,’ rịọrọ Paịlet ka o bunye ya ozu Jizọs; Paịlet kwetakwara. Matiu dere, sị: “Josef wee buru ozu ahụ, fụchie ya ákwà linin ọma dị ọcha, liekwa ya n’ili ncheta ọhụrụ ya, nke o gwuru n’oké nkume. Mgbe ọ kwaara nnukwu nkume kwachie ọnụ ụzọ ili ncheta ahụ, ọ lara.”—Mat. 27:57-60.

Toonụ Mesaya ahụ, Onye Bụ́ Eze Anyị!

19. Olee otú ihe e buru n’amụma n’Abụ Ọma 16:10 si mezuo?

19 A ga-akpọlite Mesaya ahụ n’ọnwụ. Devid dere, sị: “[Jehova agaghị] ahapụ mkpụrụ obi m n’ime Shiol.” (Ọma 16:10) Cheedị otú o si ju ndị inyom gara n’ili ebe a dọwara Jizọs anya mgbe ha rutere ma hụ otu mmụọ ozi, bụ́ onye gwara ha, sị: “Ya ejuzila unu anya. Unu na-achọ Jizọs onye Nazaret, bụ́ onye a kpọgidere n’osisi. A kpọlitewo ya, ọ nọghị n’ebe a. Leenụ ebe e liri ya!” (Mak 16:6) Pita onyeozi gwara ìgwè mmadụ ndị gbakọtara na Jeruselem na Pentikọst 33 O.A., sị: “[Devid] hụrụ ya tupu oge eruo ma kwuo okwu banyere mbilite n’ọnwụ Kraịst, na a hapụghị ya n’ime Hedis, anụ ahụ́ ya ereghịkwa ure.” (Ọrụ 2:29-31) Chineke ekweghị ka ahụ́ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ree ure. E nwedịrị ọrụ ebube ọzọ ọ rụrụ. Ọ kpọlitere Jizọs n’ọnwụ ya aghọọ mmụọ.—1 Pita 3:18.

20. Gịnị ka e buru n’amụma banyere Alaeze Mesaya ahụ?

20 Chineke kwuru na Jizọs bụ Ọkpara ya, dị ka e buru n’amụma. (Gụọ Abụ Ọma 2:7; Matiu 3:17.) Ihe ọzọkwa bụ na mgbe Jizọs na-abanye na Jeruselem, ìgwè mmadụ ndị nọ ebe ahụ toro ya, tookwa Alaeze ya. Anyịnwa na-ejikwa obi ụtọ ekwusa banyere ya na ihe ọma ọchịchị ya ga-ewetara anyị. (Mak 11:7-10) N’oge na-adịghị anya, Kraịst ga-ebibi ndị iro ya ka ‘ọ na-agba ịnyịnya n’ihi eziokwu na ịdị umeala n’obi na ezi omume.’ (Ọma 2:8, 9; 45:1-6) Ọchịchị ya ga-emezi ka e nwee udo n’ụwa niile, meekwa ka ụmụ mmadụ nweta ihe ndị na-akpa ha. (Ọma 72:1, 3, 12, 16; Aịza. 9:6, 7) Ọkpara Chineke nke ọ hụrụ n’anya, onye bụ́ Mesaya ahụ, amalitela ịchị n’eluigwe. Ọ bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ na anyị bụ Ndịàmà Jehova nakwa na anyị na-agwa ndị ọzọ eziokwu banyere Mesaya ahụ na Alaeze ya.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee otú e si rara Jizọs nye, oleekwa otú e si gbahapụ ya?

• Olee ihe ụfọdụ e buru n’amụma banyere ọnwụ Jizọs Kraịst?

• Olee ihe mere i ji kwere na Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 13]

Olee amụma ndị mbanye Jizọs banyere na Jeruselem ka eze mezuru?

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Jizọs nwụrụ maka mmehie anyị, ma ugbu a, ọ bụ Eze Bụ́ Mesaya