Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olivétan “Onye Nsụgharị Na-adịghị Mpako” nke Sụgharịrị Baịbụl n’Asụsụ French

Olivétan “Onye Nsụgharị Na-adịghị Mpako” nke Sụgharịrị Baịbụl n’Asụsụ French

Olivétan “Onye Nsụgharị Na-adịghị Mpako” nke Sụgharịrị Baịbụl n’Asụsụ French

Otu ụbọchị na Septemba 13, 1540, ndị uwe ojii nọ na-achọ ihe n’ụlọ otu nwoke aha ya bụ Collin Pellenc. N’otu ọnụ ụlọ zoro ezo, ha chọtara ụfọdụ akwụkwọ ha weere na ha bụ akwụkwọ ọjọọ, otu n’ime ha bụ otu nnukwu akwụkwọ. Ihe e dere na peeji nke abụọ ya bụ: “P. Robert Olivetanus, onye nsụgharị na-adịghị mpako.” Akwụkwọ ahụ bụ Baịbụl ndị òtù Waldo! A nwụchiri Collin Pellenc, kpee ya ikpe maka ịjụ nkụzi Chọọchị Katọlik ma kpọọ ya ọkụ ná ndụ.

N’OGE ahụ na Frans, nakwa ná mba ndị ọzọ dị na Yurop, Chọọchị Katọlik nọ na-achụgharị ndị niile hapụrụ Chọọchị Katọlik maka na chọọchị ahụ ekweghị agbanwe ihe ụfọdụ ha na-eme. Ihe mere ha ji na-achụgharị ha bụ ka ha kwụsị ha ịkụziri ndị mmadụ ihe ha kpọrọ ozizi ọjọọ. Otu n’ime ndị ha nọ na-achụgharị bụ Guillaume Farel, bụ́ nwoke na-anaghị atụ egwu. Nwoke a kpebisiri ike na ya ga-eme ka ndị niile na-asụ asụsụ French nabata ihe Martin Luther na-akụzi. Martin Luther bụ otu n’ime ndị mbụ hapụrụ Chọọchị Katọlik. Farel bụ onye Dọfine, nke dị n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ Frans, ọ makwaara na otu ihe na-eme ka ndị mmadụ gbanwee echiche ha bụ ihe ha gụtara n’akwụkwọ. Ihe ga-enyere ya aka imezu ihe ahụ o bu n’obi bụ ibipụta Baịbụl nakwa ụmụ obere akwụkwọ ndị na-akọwa Baịbụl. Ma, ònye ga-eweta ego a ga-eji bipụta ha? O kwuru na ya ga-agakwuru ndị òtù Waldo, bụ́ ndị okpukpe nọọrọ onwe ha, ndị ọrụ ha bụ ikwusa ozi ọma?

Nnọkọ E Nwere na Shanforan

Tupu mgbe ahụ, n’etiti ọnwa Septemba 1532, ndị pastọ ndị òtù Waldo nwere nnọkọ na Shanforan, bụ́ obere obodo dị nso na Turin, ná mba Ịtali. Kemgbe ọtụtụ afọ, okwu na-adabara ndị òtù Waldo na ndị isi ndị ahụ hapụrụ Chọọchị Katọlik. N’ihi ya, ha kpọrọ Farel na ọtụtụ ndị ọzọ ka ha bịa nnọkọ ahụ. Ndị òtù Waldo chọrọ ịmata ma ihe hanwa na-akụzi ò kwekọrọ n’ihe Luther na ndị òtù ya na-akụzi. *

Ná nnọkọ ahụ, ihe Farel kwuru ruru ndị òtù Waldo n’obi. Ndị pastọ ndị òtù Waldo gosiri Farel Baịbụl ochie ndị ha ji aka ha sụgharịa n’olu obodo ha. Mgbe Farel hụrụ ya, ọ gwara ha ihe mere ha ji kweta iweta ego a ga-eji bipụta Baịbụl n’asụsụ French. Baịbụl a a chọrọ ịsụgharị ga-adị iche na nke otu nwoke aha ya bụ Lefèvre d’Étaples sụgharịrị n’afọ 1523. Nwoke ahụ si n’asụsụ Latịn sụgharịa nke ya, ma a ga-esi n’asụsụ Hibru na asụsụ Grik sụgharịa nke a. Ma, ònye ga-enweli ike ime nke a?

Farel ma onye ga-emeli ya. Aha onye ahụ bụ Pierre Robert. Ma, aha e ji mara ya bụ Olivétan. * Ọ bụ nwa okorobịa bụ́ onye nkụzi, onye a mụrụ n’ebe a na-akpọ Pikadi nke dị n’ebe ugwu Frans. Olivétan bụ onye ikwu John Calvin. Olivétan so ná ndị mbụ ahụ hapụrụ Chọọchị Katọlik, ọ bụkwa nwoke e nwere ike ịtụkwasị obi. O biri ọtụtụ afọ n’obodo Strasbọg, bụ́ ebe ọ nọ mụọ asụsụ ndị e ji dee Baịbụl.

Olivétan gbagara Swizaland, otú Farel na ọtụtụ ndị ọzọ mere, ka a ghara igbu ya. Ndị enyi ya rịọrọ ya ka o kweta ịsụgharị Baịbụl ahụ. Ọ jụrụ ọtụtụ ugboro, ma o mechara kweta “isi n’asụsụ Hibru na asụsụ Grik sụgharịa Baịbụl ahụ n’asụsụ French.” Ndị òtù Waldo wetakwara nnukwu ego maka ibipụta Baịbụl ahụ. Ha wetara ihe karịrị ọkara ego ole a ga-eji ebipụta Baịbụl ahụ.

Nnụnụ Ubé Ya Na-anaghị Atọ Ụtọ na nke Ubé Ya Na-atọ Ụtọ

Ná mbido afọ 1534, Olivétan gara biri naanị ya n’otu ugwu, bụ́ ebe ọ nọ malite ọrụ ya. Naanị ihe ya na ya nọ ebe ahụ bụ akwụkwọ ndị na-enyere ya aka n’ọrụ ahụ. O kwuru na akwụkwọ ndị ahụ bụ ndị nkụzi ya. O nwere ọtụtụ akwụkwọ ndị bara uru n’ọ́bá akwụkwọ ya. Ọkà mmụta ọ bụla nke nwere ụdị akwụkwọ ndị ahụ n’oge a ga-eji ha na-eme ọnụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ Baịbụl ndị e nwere n’asụsụ Siriak, Grik, na Latịn nakwa akwụkwọ dị iche iche ndị rabaị dere, na akwụkwọ ndị na-akọwa asụsụ ndị Kaldia. Nke ka nke bụ na Olivétan nwere Baịbụl e dere n’asụsụ Hibru mbụ e ji dee Baịbụl, bụ́ nke ọ na-adịbeghị anya e bipụtara ya n’obodo Venis.

Mgbe Olivétan na-asụgharị Agba Ọhụrụ, ọ bụ Baịbụl ahụ Lefèvre d’Étaples sụgharịrị ka o leere anya sụgharịa nke ya, ma o nwetakwara ihe ụfọdụ na Baịbụl e nwere n’asụsụ Grik bụ́ nke otu ọkà mmụta aha ya bụ Erasmus dere. Olivétan asụgharịghị ọtụtụ okwu otú Chọọchị Katọlik si ekwu ha. Dị ka ihe atụ, kama ide “bishọp,” o dere “onye nlekọta,” kama ide “chọọchị,” o dere “ọgbakọ.”

Mgbe Olivétan bidoro ịsụgharị “Agba Ochie,” o kpebisiri ike na ya ga-asụgharị ya otú e si dee ya n’asụsụ Hibru mbụ e ji dee Baịbụl, n’etinyeghị ya nnu na ose. O ji egwuregwu kwuo na i si n’asụsụ Hibru sụgharịa Baịbụl n’asụsụ French dị ka ‘ịkụziri nnụnụ ubé ya na-atọ ụtọ ka ọ mụta ibe ubé ka nnụnụ ubé ya na-anaghị atọ ụtọ.’

Olivétan hụrụ aha Chineke ọtụtụ puku ugboro na Baịbụl e dere n’asụsụ Hibru mbụ e ji dee Baịbụl bụ́ nke o ji na-asụgharị Baịbụl ya. Ọ hụrụ na e ji mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ a na-akpọ Tetragramatọn dee ya. Ọ sụgharịrị aha ahụ “Onye Na-adịru Ebighị Ebi,” ọtụtụ ndị ọzọ bụ́ ndị Protestant mechakwara soro ya sụgharịa aha Chineke otú ahụ n’asụsụ French. Ma, o nwekwara ọtụtụ ebe ndị Olivétan sụgharịrị aha Chineke Jehova. Otu n’ime ha bụ n’Ọpụpụ 6:3.

O juru onye ọ bụla anya mgbe Olivétan sụgharịchara Baịbụl ahụ na Febụwarị 12, 1535. O were ya naanị otu afọ! Ma, ebe o kwuru na “ọ dịla anya ya buwere ibu a [ịsụgharị Baịbụl] naanị ya,” o doro anya na ihe o mere n’agbata afọ 1534 na afọ 1535 bụ ịrụchapụ ọrụ o ji nwayọọ nwayọọ na-arụ kemgbe. Nwoke a dị umeala n’obi kwuru, sị: “Emeela m ike m niile.” Naanị ihe fọziri bụ ibipụta Baịbụl French mbụ a e si n’Akwụkwọ Nsọ Hibru na Grik mbụ sụgharịa.

Baịbụl ahụ Eruo n’Ụlọ Obibi Akwụkwọ Pirot

Farel nwere otu enyi nwoke nke na-ebi akwụkwọ. Ọ na-ebiri ndị ahụ hapụrụ Chọọchị Katọlik akwụkwọ. Aha nwoke a bụ Pierre de Wingle, ma aha e ji mara ya bụ Pirot Picard. Mgbe Chọọchị Katọlik nyegidere Pirot Picard nsogbu, ọ gbapụrụ na Liyọn gaa biri na Niushatel, nke dị na Swizaland, n’afọ 1533. O ji ego ndị òtù Waldo wetara malite ibipụta ọtụtụ akwụkwọ ndị a sị na ha bụ akwụkwọ ndị nnupụisi. Dị ka ihe atụ, ọ bụ n’ụlọ ọrụ ya ka a nọ bipụta mpempe akwụkwọ e ji mee ka ndị mmadụ mara na Chọọchị Katọlik ji mas ha na-edo arụ arụrụala. Ụfọdụ n’ime mpempe akwụkwọ ahụ mechara ruo n’ụlọ eze ndị Frans n’oge ahụ. Aha eze ahụ bụ Eze Francis nke Mbụ, ọ bụkwa onye Katọlik.

Ugbu a, Pierre de Wingle enwetala akwụkwọ ọzọ ọ ga-ebi. Ọ bụ Baịbụl ahụ Olivétan sụgharịrị! Ka e nwee ike ibipụta Baịbụl ahụ ọsọ ọsọ, mmadụ anọ ma ọ bụ ise rụrụ ọrụ n’otu ígwè obibi akwụkwọ, mmadụ anọ ma ọ bụ ise ọzọ arụọ n’ọzọ. N’ikpeazụ, “n’abalị anọ n’ọnwa Jun n’afọ 1535,” Pierre de Wingle bịanyere aka na peeji ebe onye biri akwụkwọ na-abịanye aka iji kwuo na ya e bichaala Baịbụl Olivétan. N’otu n’ime peeji dị ná mbido Baịbụl ahụ, Olivétan kwuru na ndị ya bu n’obi sụgharịa Baịbụl ahụ bụ Ndị Kraịst ọ na-enweghị ka ọ hà ha bụ́ ndị ‘ọdịnala na-enweghị isi e boro ha na-anyịgbu.’

Baịbụl ahụ mara ezigbo mma mgbe e bichara ya. Ihe kpatara ya bụ ụdị mkpụrụ akwụkwọ e ji bie ya. Peeji nke ọ bụla dị kọlụm abụọ abụọ. E kewakwara ya n’isi isi nakwa na paragraf na paragraf. N’akụkụ peeji nke ọ bụla, e dere ihe ndị nwere ike inyere onye na-agụ ya aka ịghọta ihe ọ na-agụ. Ihe ndị ahụ e dere gosiri na onye sụgharịrị Baịbụl ahụ ma nke a na-akọ. E nwekwara ihe ndị ọzọ e tinyere na Baịbụl ahụ, dị ka okwu mmeghe, uri, na ihe ndị ọzọ e dere n’azụ ya. Na peeji ikpeazụ ya, e nwere ihe e dere nke kwuru, sị, ‘ndị òtù Waldo, bụ́ ndị na-ekwusa Ozi Ọma, chọrọ ka ọhaneze nweta Baịbụl ọma a.’

Baịbụl ahụ Mara Ezigbo Mma . . . ma, Ọ Gaghị Ahịa

Ọ bụ ezie na o nwere mgbe e kwuru okwu ọjọọ banyere Baịbụl ahụ Olivétan sụgharịrị, ma taa, ndị niile gụrụla ya kweere na otú o si sụgharịa ya enweghị atụ. Ọ bụkwa Baịbụl ahụ ka ndị ọzọ sụgharịrị Baịbụl ndị Protestant n’ime narị afọ atọ sochirinụ leere anya sụgharịa nke ha.

N’agbanyeghị na ọ bụ ihe dị ka otu puku ka e bipụtara Baịbụl ahụ Olivétan sụgharịrị, ọ gaghị ahịa. Otu ihe kpatara nke a bụ na n’oge ahụ, e nweghị ụzọ dị mma e nwere ike isi mee ka o ruo ndị mmadụ aka, nke ọzọ abụrụ na asụsụ French nọ na-agbanwe n’ike n’ike n’oge ahụ. Ihe ọzọkwa bụ na Baịbụl ahụ buru oké ibu, ọ dị kilogram ise n’arọ. Ọ ga-esiri onye na-aga ebe dị iche iche ekwusa ozi ọma ike ibu ya na-agagharị, siekwara onye chọrọ izoro ezoro na-agụ ya ike.

Ọ bụ eziokwu na a kọrọ ná mmalite isiokwu a na a hụrụ Baịbụl ahụ Olivétan sụgharịrị n’ụlọ Collin Pellenc na Frans, ọ gaghị ahịa. N’afọ 1670, mgbe ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ otu narị afọ na afọ iri ise a sụgharịrị ya, a ka nwere otu n’ime ya a na-erebeghị n’otu ebe a na-ere akwụkwọ n’obodo Jeneva.

“Onye Na-enweghị Aha, nke Na-enweghịkwa Obodo”

Ozugbo e bipụtachara Baịbụl ahụ, Olivétan miri ala. O dezigharịrị ihe na Baịbụl ahụ, ma n’Agba Ọhụrụ ya ma n’Agba Ochie. Ma, ọ bụghị ezigbo aha ya ka ọ zara mgbe o mere nke a. Ọ nọkwa na-akụzi nkụzi, bụ́ ọrụ ọzọ na-atọgbu ya atọgbu. Ebe ọ bụ na o nwere mmasị n’inyere ndị ọzọ aka, o dezigharịrị otu akwụkwọ o bipụtara maka ụmụaka. Akwụkwọ ahụ na-akụziri ụmụaka asụsụ French nakwa otú ha kwesịrị isi na-akpa àgwà. Ọ bụ n’Akwụkwọ Nsọ ka o si weta ihe ndị o dere n’akwụkwọ ahụ. Otu n’ime aha ndị na-abụghị ezigbo aha ya ọ zara bụ Belisem de Belimakom, nke pụtara “Onye Na-enweghị Aha, nke Na-enweghịkwa Obodo.”

Olivétan nwụrụ n’afọ 1538, mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri atọ na ise, o nwekwara ike ịbụ na Rom ka ọ nọ nwụọ. Ọ bụ mmadụ ole na ole taa maara ọrụ ọma nwa okorobịa a, bụ́ ọkà mmụta nke si n’obodo Pikadi, rụrụ iji hụ na ndị mmadụ nwetara Baịbụl n’asụsụ French. Aha ya gbara na naanị akwụkwọ ọkọwa okwu ole na ole, ma ọ bụrụdị na o nwere nke ọ gbara na ya. Ma, o yiri ka ọ̀ bụ otú ahụ ka “onye nsụgharị ahụ na-adịghị mpako,” bụ́ Louys Robert, onye e ji Olivétan mara, chọrọ ya!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú ndị òtù Waldo si sorozie ndị Protestant, gụọ Ụlọ Nche March 15, 2002, peeji nke 20-23.

^ par. 7 Aha a gụrụ Olivétan mgbe a mụrụ ya bụ Louys Robert, ma ọ gụgharịrị onwe ya Pierre. Ọ ga-abụ n’ihi nnukwu mmanụ oliv o ji mụọ ọkụ mgbe ọ na-asụgharị Baịbụl mere e ji kpọwa ya Olivétan.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 18]

Archives de la Ville de Neuchâtel, Suisse/​Foto: Stefano Iori

[Ebe E Si Nweta Foto Ndị Dị na peeji nke 19]

Foto dị n’aka ekpe : Alain Leprince - La Piscine-musée, Roubaix/​Courtesy of the former Bouchard Museum, Paris

Nke dị n’etiti na nke dị n’aka nri: Société de l’Histoire du Protestantisme Français, Paris

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 20]

Société de l’Histoire du Protestantisme Français, Paris