Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwoke Obi Jehova Nabatara

Nwoke Obi Jehova Nabatara

Nwoke Obi Jehova Nabatara

GỊNỊ na-agbata gị n’obi ma i cheta Devid bụ́ onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl? Ọ̀ bụ otú o si merie onye Filistia gbara ezigbo dimkpa, nke aha ya bụ Golayat? Ọ̀ bụ otú o si gbaga n’ala ịkpa mgbe Eze Sọl chọrọ igbu ya? Ọ̀ bụ mmehie ya na Bat-shiba mere na nsogbu ndị mmehie ahụ kpataara ya? Ka ọ̀ bụ abụ ndị o dere n’ike mmụọ nsọ bụ́ ndị dị n’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Abụ Ọma?

Devid rụụrụ Chineke ọtụtụ ọrụ pụrụ iche, o meriri n’ọtụtụ agha ndị ọ gara, o nwekwara ọtụtụ nsogbu ná ndụ ya. Ma, ihe kacha mee ka anyị nwee mmasị n’ebe ọ nọ bụ ihe Samuel onye amụma kwuru banyere ya. O kwuru na Devid bụ “nwoke obi [Jehova] nabatara.”—1 Samuel 13:14.

Ihe a Samuel kwuru mere mgbe Devid ka bụ nwata. Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ka a kpọọ gị onye obi Jehova nabatara? Ọ bụrụ na ị ga-achọ, olee ihe ndị mere ná ndụ Devid, karịchaa mgbe ọ ka bụ nwata, bụ́ ndị ga-enyere gị aka ịbụ onye obi Jehova nabatara? Ka anyị hụ.

Ezinụlọ Ya na Ọrụ Ya

Jesi bụ nna Devid, bụrụkwa nwa nwa Rut na Boaz. Jesi ji obi ya niile na-efe Jehova. Mgbe Devid, na ụmụnne ya ndị nwoke asaa na ụmụnne ya ndị nwaanyị abụọ ka dị obere, Jesi na-akụziri ha Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel. N’otu n’ime abụ ọma ndị Devid dere, Devid kpọrọ onwe ya nwa ‘ohu nwaanyị’ Jehova. (Abụ Ọma 86:16) Ihe a o kwuru emeela ka ụfọdụ ndị chewe na ọ ga-abụ na mama Devid, bụ́ onye a na-akpọghị aha na Baịbụl, so kụziere ya banyere Chineke. Otu ọkà mmụta kwuru, sị: “O nwere ike ịbụ n’ọnụ [mama] ya ka o bu ụzọ nụ akụkọ ihe ọma niile Chineke meere ụmụ Izrel,” ma akụkọ Rut na Boaz.

Devid bụ obere nwa nke na-azụ atụrụ nna ya mgbe a malitere ịkọ akụkọ ya na Baịbụl. Onye na-azụ atụrụ na-anọ ogologo oge n’ọhịa naanị ya, ma n’ehihie ma n’abalị. Chegodị otú ọ dị Devid mgbe ahụ.

Devid na ụmụnne ya na ndị mụrụ ya bi na Betlehem, nke bụ́ obere obodo dị n’elu ugwu nakwa ná mkpọda ugwu ndị dị na Juda. Ala Betlehem bụ okwute okwute, ọka bali na ọka wit na-emekwa nke ọma na ya. E nwere ọtụtụ ubi mkpụrụ osisi, ubi oliv, na ubi vaịn ná mkpọda ugwu ndị dị n’obodo ahụ. N’oge Devid, a na-anọ n’ala ndị dị n’ugwu, bụ́ ndị a na-ejighị akọ ihe, azụ atụrụ. I si ebe ahụ lepụ anya, ị ga-ahụ ala ịkpa e nwere n’obodo Juda.

Ọrụ ịzụ atụrụ adịghị mfe. E nwere ọtụtụ ihe nwere ike imerụ onye na-arụ ya ahụ́. Otu oge Devid nọ n’ugwu ahụ na-azụ atụrụ, ọdụm bịara buru otu atụrụ ya, anụ ọhịa bea bịakwara buru otu. * Nwa okoro a na-anaghị atụ ụjọ chụrụ anụ ọhịa ndị ahụ ọsọ, gbuo ha ma napụta atụrụ ya n’ọnụ ha. (1 Samuel 17:34-36) O nwere ike ịbụ n’oge a Devid na-azụ atụrụ ka ọ mụtara ịgba èbè. Obodo ndị ebo Benjamin adịghị anya n’obodo Devid. E ji ịgba èbè mara ebo Benjamin, “onye ọ bụla n’ime [ndị agha] ha na-eji nkume agbata ihe há ka otu ntutu isi, ha adịghị agbajọ.” Ọ bụkwa otú a ka Devid si agba èbè.—Ndị Ikpe 20:14-16; 1 Samuel 17:49.

O Ji Oge ahụ Mee Ihe Bara Uru

Onye na-azụ atụrụ na-anọkarị naanị ya, ọ na-anọkarịkwa n’ebe mkpọtụ na-adịghị azụ atụrụ ya. Ma Devid ekweghị ka nke a mee ka ọrụ ahụ gwụ ya ike. Kama nke ahụ, o ji oge ahụ ọ na-anọ n’ebe ụzụ na-adịghị chebara ihe ndị dị mkpa echiche. O yiri ka ihe ndị Devid dere n’abụ ọma ya ọ̀ bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị o chebaara echiche n’oge ahụ ọ bụ nwata. Ọ̀ bụ mgbe ahụ naanị ya nọ ka o chebaara ihe ndị dị n’eluigwe echiche, dị ka anyanwụ, ọnwa, na kpakpando, bụ́ ihe ndị “mkpịsị aka [Jehova] rụrụ”? Ọ̀ bụkwa mgbe ahụ ka o chere echiche ghọta na o nweghị ihe mmadụ bụ ma e were ya tụnyere ihe ndị ọzọ dị n’eluigwe na ụwa? Ọ̀ bụ mgbe ọ nọ n’ọhịa ndị dị na Betlehem ka o chebaara elu ala Chineke kere eke echiche, nakwa atụrụ na ehi, nnụnụ dị iche iche na “anụ ọhịa dị iche iche”?—Abụ Ọma 8:3-9; 19:1-6.

O doro anya na ọrụ ịzụ atụrụ Devid rụrụ mere ka ọ ghọtakwuo otú Jehova si elekọta ndị na-ejere Ya ozi. Ọ bụ ya mere Devid ji bụọ abụ a: “Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ. Ọ dịghị ihe ga-akọ m. Ọ na-eme ka m makpuru n’ebe ịta nri nke ahịhịa jupụtara; ọ na-edu m n’ebe izu ike nke mmiri jupụtara. Ọ bụrụgodị na mụ ejee ije na ndagwurugwu gbara oké ọchịchịrị, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla, n’ihi na ị nọnyeere m; ọ bụ mkpara gị na mkpanaka gị na-akasi m obi.”—Abụ Ọma 23:1, 2, 4.

O nwere ike ihe ị na-eche bụ otú ihe niile a a na-ekwu banyere Devid si gbasa gị. Otu n’ime ihe ndị mere Devid na Jehova ji bụrụ enyi nke na Jehova kpọrọ ya “nwoke obi ya nabatara” bụ na Devid chebaara ihe ndị Jehova kere eke echiche nke ọma, chebakwara ihe ndị ọ ga-eme ka ya Chineke nọgide na-adị ná mma. Ị̀ na-eme ihe ahụ Devid mere?

Ò nwetụla mgbe i kirichara ihe ụfọdụ Chineke kere, ya agụọ gị agụụ ito ya? Ò nwetụla mgbe i chebaara àgwà ọma ndị Jehova nwere na otú o si emeso ndị mmadụ ihe echiche, ya emee gị ka ị hụkwuo Jehova n’anya? Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ito Jehova na-agụ gị agụụ, i kwesịrị ịna-ewepụta oge nọrọ n’ebe mkpọtụ na-adịghị kpee ekpere ma chebara ihe ndị ị na-agụta n’Okwu Chineke na ihe ndị o kere eke echiche. Ichebara ihe ndị ahụ echiche ga-enyere anyị aka ịmara Jehova nke ọma ma si otú ahụ hụkwuo ya n’anya. Ma ụmụaka ma ndị torola eto nwere ike ichebara ihe ndị Chineke kere echiche ma hụkwuo ya n’anya. O doro anya na Devid na Jehova bidoro ịdị ná mma mgbe Devid bụ nwata. Olee otú anyị si mara?

E Tee Devid Mmanụ Ka Ọ Bụrụ Eze

Mgbe Eze Sọl gosiri na ya erukwaghị eru ịbụ eze ndị Chineke, Jehova gwara Samuel onye amụma, sị: “Ruo ole mgbe ka ị ga na-eruru Sọl uju, ebe ọ bụ na mụ onwe m ajụwo ya ka ọ ghara ịbụkwa eze Izrel? Gbajuo mpi gị mmanụ gawa. M ga-edunye gị ka ị gakwuru Jesi onye Betlehem, n’ihi na esiwo m n’etiti ụmụ ya ndị ikom họtara onwe m eze.”—1 Samuel 16:1.

Mgbe onye amụma Chineke rutere Betlehem, ọ gwara Jesi ka ọ kpọkọọ ụmụ ya ndị nwoke. Olee onye nke ọ̀ ga-ete mmanụ ka ọ bụrụ eze? Ozugbo Samuel hụrụ nke diọkpara, bụ́ nwa okorobịa mara mma nke aha ya bụ Elayab, ọ sịrị n’obi ya: ‘Ọ ga-abụrịrị onye a.’ Ma Jehova sịrị Samuel: “Elela anya n’ọdịdị ya na ogo ya, n’ihi na ajụwo m ya. N’ihi na ọ bụghị otú mmadụ si ahụ ihe ka Chineke si ahụ, n’ihi na mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ; ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.” Otú ahụkwa ka Jehova si jụ Abinadab, Shama, na ụmụnne ha anọ ndị ọzọ. Akụkọ ahụ gara n’ihu, sị: “N’ikpeazụ, Samuel sịrị Jesi: ‘Ọ̀ gwụla ndị a bụ ụmụ gị ndị ikom?’ O wee sị: ‘Onye fọrọ ugbu a bụ nke ọdụdụ, lee! ọ na-azụ atụrụ.’”—1 Samuel 16:7, 11.

Ihe ahụ Jesi zara yiri ka ọ̀ na-asị: ‘O nweghị otú ọ ga-esi bụrụ Devid ka ị na-achọ.’ Devid bụ ọdụdụ nwa, o nweghị oké ihe e ji ya kpọrọ n’ezinụlọ ha, ọ bụkwa ya mere e ji nye ya ọrụ ilekọta atụrụ nna ya. Ma, ọ bụ ya ka Chineke họọrọ. Jehova na-ahụ ihe dị mmadụ n’obi, o nwekwara ike ịbụ na ọ hụrụ ihe magburu onwe ya n’obi nwata ahụ. Mgbe Jesi ziri ozi ka Devid bịa, Jehova gwaziri Samuel: “‘Bilie, tee ya mmanụ, n’ihi na ọ bụ onye a!’ Samuel wee were mpi mmanụ ahụ tee ya mmanụ n’etiti ụmụnne ya. Mmụọ Jehova wee malite ịkpa ike n’ahụ́ Devid malite n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu.”—1 Samuel 16:12, 13.

Baịbụl agwaghị anyị afọ ole Devid dị mgbe ihe a mere. Ma, ka obere oge gafere, Elayab, bụ́ diọkpara na ụmụnne ya abụọ ndị na-esote ya, bụ́ Abinadab na Shama, ghọrọ ndị agha Sọl. O nwere ike ịbụ na ụmụnne ha ise ndị nke ọzọ etorubeghị ịga agha. Ọ ga-abụ na ha ise enwebeghị nke ruru afọ iri abụọ, nke bụ́ mgbe ụmụ nwoke ndị Izrel ji abanye agha. (Ọnụ Ọgụgụ 1:3; 1 Samuel 17:13) Nke ọ bụla ọ bụ, Devid ka bụ obere nwa mgbe ahụ Jehova họọrọ ya ka ọ bụrụ eze. N’agbanyeghị na ọ bụ obere nwa, o yiri ka Devid ọ̀ malitelarị iji ihe gbasara ofufe Chineke kpọrọ ihe. O doro anya na ya na Jehova dị n’ezigbo mma, ihe kpatakwara ya bụ na ọ na-echebara ihe ndị ọ maara banyere Chineke echiche.

E kwesịrị inyere ndị na-eto eto n’oge a aka ka ha na-emekwa otu ihe ahụ. Ndị nne na nna, ùnu na-enyerenụ ụmụ unu aka ka ha na-echebara ihe ndị gbasara ofufe Chineke echiche, ka ha na-eto Chineke n’ihi ihe ndị o kere eke, nakwa ka ha na-amụ ihe Baịbụl kwuru banyere Onye kere anyị? (Diuterọnọmi 6:4-9) Unu ndị na-eto eto, ùnu na-amụ Okwu Chineke n’onwe unu? Akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl dị ka magazin Ụlọ Nche na Teta! * ga-enyere unu aka.

Ịkpọ Ụbọ Akwara Doro Ya Anya

Otú ahụ ihe Devid dere n’ọtụtụ abụ ọma ya si agwa anyị ihe ndị Devid mere mgbe ọ na-azụ atụrụ, otú ahụkwa ka ọ dị abụ ndị o ji ha bụọ. Ọ bụ eziokwu na o nweghịzi onye ma otú e si abụ abụ ọma ndị ahụ Devid dere n’ike mmụọ nsọ, otu ihe anyị ma bụ na egwú doro ya anya. Ihe medịrị e ji kpọpụta Devid n’ebe ọ na-azụ atụrụ ka ọ bịa jewere Eze Sọl ozi bụ na ịkpọ ụbọ akwara doro ya anya.—1 Samuel 16:18-23. *

Olee mgbe Devid mụtara ịkpọ ụbọ akwara, oleekwa ebe ọ nọ mụta ya? O nwere ike ịbụ mgbe ọ nọ na-elekọta atụrụ n’ọhịa. O kwesịghịkwa iju anyị anya na Devid bidoro ịbụku Chineke abụ otuto mgbe ọ ka dị obere. A sị ka e kwuwe, ihe mere Jehova ji họrọ ya ma kwuo ka e tee ya mmanụ bụ na o ji obi ya niile na-ejere Chineke ozi ma jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe.

Ihe a kọrọ n’isiokwu a bụ naanị ihe ndị mere ná ndụ Devid mgbe ọ bụ nwata. E nwekwara ọtụtụ ihe mechara mee ná ndụ ya. Ma, ihe Devid kwuru n’otu abụ ọ bụrụ gosiri ụdị ndụ o biri ná ndụ ya niile, ọ ga-abụkwa mgbe ọ dị obere, n’oge ọ na-azụ atụrụ n’ọhịa ndị dị nso na Betlehem, ka ihe ahụ ọ bụrụ n’abụ ahụ mere. Weregodị ya na ị na-ahụ ka Devid na-abụku Jehova abụ ahụ, sị: “Echetawo m oge dị anya gara aga; atụgharịwo m uche n’ọrụ gị dum; eji m obi m dum na-echebara ọrụ aka gị echiche.” (Abụ Ọma 143:5) Abụ ọma a na abụ ọma ndị ọzọ Devid dere na-agwa anyị ihe ndị niile chọrọ ka ha bụrụ ndị obi Jehova nabatara kwesịrị ime.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 E nwere anụ ọhịa bea ndị na-acha nchara nchara ná mba Siria. Ebe a na-ahụkarịbu ha bụ n’Izrel na obodo ndị gbara ya gburugburu. Ha na-ebu ezigbo ibu. Ha na-adị ihe dị ka otu narị kilogram na iri anọ n’arọ, otu n’ime ha nwekwara ike iji aka ya nkịtị kụgbuo mmadụ. O nwere mgbe ọdụm juru eju n’Izrel. Aịzaya 31:4 kwuru na ọ bụrụ na “nwa ọdụm tojuru etoju” anọrọ n’elu anụ ọ dọgburu, a kpọkọtagodị “ndị niile na-azụ atụrụ” ka ha chụpụ ya, ha agaghị achụpụli ya.

^ par. 20 Ọ bụ Ndịàmà Jehova na-ebipụta ha.

^ par. 22 Onye gwara Eze Sọl banyere Devid kwukwara na Devid bụ “ọkà okwu maara ihe na nwoke mara mma, Jehova nọnyekwaara ya.”—1 Samuel 16:18.