E Boro Ya Ebubo Ụgha!
Maka Ndị Na-eto Eto
E Boro Ya Ebubo Ụgha!
JOSEF—AGBA NKE ABỤỌ
Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị a, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere, werekwa ya na ị na-ahụ ka ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.
Ndị a kọrọ akụkọ ha: Josef, Pọtịfa, na nwunye ya
Ihe a kọrọ: A tụrụ Josef mkpọrọ n’agbanyeghị na o nweghị ihe ọjọọ o mere. Ma, Jehova nọnyeere ya.
1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ JENESIS 39:7, 10-23.
Olee ụdị olu i chere nwunye Pọtịfa ji na-agwa di ya okwu mgbe ahụ ọ na-aghagide Josef ụgha?
․․․․․
Kọọ otú i chere ụlọ mkpọrọ ahụ dị.
․․․․․
Olee ihe i chere e mere Josef ozugbo a tụbara ya n’ụlọ mkpọrọ? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Abụ Ọma 105:17, 18.)
․․․․․
2 LEBAKWUO YA ANYA.
A sị na okwukwe Josef esighị ike, olee ihe ọjọọ ọ gaara echewe n’oge ahụ ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Job 30:20, 21.)
․․․․․
Olee otú anyị si mara na Josef ataghị Jehova ụta maka ahụhụ ọ nọ na-ata? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Jenesis 40:8; 41:15, 16.)
․․․․․
Olee àgwà ọma ndị nyeere Josef aka idi mkpọrọ ahụ a tụrụ ya? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Maịka 7:7, Luk 14:11, na Jems 1:4 ma chebara ha echiche.)
․․․․․
Olee ihe mkpọrọ ahụ Josef gara kụziiri ya, oleekwa uru i chere o mechara baara ya ná ndụ? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ․․․․․
3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .
Uru mmadụ na-erite ma ọ tachie obi mgbe ọ nọ n’ahụhụ.
․․․․․
Ihe ndị i nwere ike ịmụta mgbe ị nọ n’ahụhụ. _______
․․․․․
Otú Jehova si enyere ndị ya aka mgbe ọnwụnwa bịaara ha.
․․․․․
ỤZỌ NDỊ ỌZỌ Ị GA-ESI MEE IHE Ị MỤTARA.
Ò nwetụla mgbe ị nọ ná nsogbu nke mere ka obi koro gị n’elu, ya adị gị ka ọ̀ bụ naanị gị nọ? N’oge ahụ, olee otú i chere Jehova si nyere gị aka? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:13 ma chebara ya echiche.)
․․․․․
4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤKWA MAKA GỊNỊ?
․․․․․
Ọ bụrụ na i nweghị baịbụl, gwa ndịàmà jehova ka ha nye gị otu, ma ọ bụ gị agụọ ya n’asụsụ bekee na www.watchtower.org na www.pr418.com