Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Bụ Òkè M

Jehova Bụ Òkè M

Jehova Bụ Òkè M

“Abụ m òkè gị na ihe nketa gị n’etiti ụmụ Izrel.”​—ỌNỤ ỌGỤ. 18:20.

1, 2. (a) Olee ihe dabaara ndị Livaị mgbe e keere ụmụ Izrel ala? (b) Olee nkwa Jehova kwere ndị Livaị?

MGBE ụmụ Izrel merichara ọtụtụ mba ndị dị n’Ala Nkwa ahụ, Jọshụa malitere ikere ha ala ndị dị na ya. Ya na Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Elieza na ndị isi nke ebo dị iche iche so kee ala ndị ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 34:13-29) Ma ndị Livaị agaghị eketa ala ka ebo ndị ọzọ. (Jọsh. 14:1-5) Olee ihe mere e kenyeghị ebo Livaị ala, ma ọ bụ òkè, n’Ala Nkwa ahụ? È chefuru ha echefu?

2 Ihe Jehova gwara ndị Livaị zara ajụjụ ndị a. Ihe ọ gwara ha gosiri na e chefughị ha echefu. Ọ sịrị: “Abụ m òkè [unu] na ihe nketa [unu] n’etiti ụmụ Izrel.” (Ọnụ Ọgụ. 18:20) N’eziokwu, ihe a Jehova gwara ndị Livaị sị, “Abụ m òkè [unu],” kwesịrị ime ka obi sie ha ike. Olee otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ na Jehova agwa gị na ya bụ òkè gị? Ikekwe, ihe mbụ ị ga-eme bụ ichewe, sị: ‘Ọ̀ bụ mụnwa ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile gwara ụdị ihe a?’ I nwekwara ike ichewe sị, ‘Jehova ọ̀ ga-abụli òkè Onye Kraịst na-ezughị okè taa?’ Ajụjụ ndị a gbasara gị na ndị ị hụrụ n’anya. N’ihi ya, ka anyị chọpụta ihe ihe a Chineke kwuru pụtara. Ọ bụrụ na anyị achọpụta ihe ọ pụtara, anyị ga-enwe ike ịghọta otú Jehova nwere ike isi bụrụ òkè Ndị Kraịst taa. Nke ka mkpa bụ na o nwere ike ịbụ òkè gị, ma ì nwere olileanya ịga eluigwe ma ọ̀ bụ ịdị ndụ n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs.

Jehova Na-enye Ndị Livaị Ihe Ndị Dị Ha Mkpa

3. Olee ihe mere Chineke ji họpụta ndị Livaị ka ha rụwara ya ọrụ?

3 Tupu Jehova enye ụmụ Izrel Iwu ahụ, ọ bụ ndị isi ezinụlọ bụ ndị nchụàjà nke ezinụlọ ha dị iche iche. Mgbe Chineke nyere ha Iwu ahụ, ọ họọrọ ụfọdụ ndị Livaị ka ha bụrụ ndị nchụàjà, họrọkwa ndị Livaị ndị ọzọ ka ha na-enyere ha aka. Olee otú o si mee nke a? Mgbe Chineke bibiri nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt, o doro nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Izrel nsọ, dowe ha iche ka ha bụrụ nke ya. Ma, Chineke mechara gbanwee nke ahụ. Ọ sịrị: “M na-akpọrọ ndị Livaị . . . n’ọnọdụ ụmụ niile e bu ụzọ mụọ n’etiti ụmụ Izrel.” Ebe ọ bụ na ụmụ e bu ụzọ mụọ n’Izrel karịrị ọnụ ọgụgụ ndị Livaị, a ga-akwụ ụgwọ iji gbapụta ndị nke ha ji karịa ndị Livaị. (Ọnụ Ọgụ. 3:11-13, 41, 46, 47) Nke a meziri ka ndị Livaị nwee ike ịrụrụ Chineke Izrel ọrụ o nyere ha.

4, 5. (a) Olee otú Chineke si bụrụ òkè ndị Livaị? (b) Olee otú Chineke si nye ndị Livaị ihe ndị dị ha mkpa?

4 Olee otú Jehova si bụrụ òkè ndị Livaị mgbe ọ họpụtara ha ka ha jewere ya ozi? Jehova kwuru na otú ya ga-esi bụrụ òkè ha bụ na ha agaghị eketa ala, kama na ya ga-enye ha ihe ùgwù ije ozi pụrụ iche. “Ọrụ nchụàjà Jehova” bụ ihe nketa ha. (Jọsh. 18:7) Ihe e dere n’amaokwu bu Ọnụ Ọgụgụ 18:20 ụzọ na amaokwu ndị sochiri ya na-egosi na ọrụ a emeghị ka ha daa ogbenye. (Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 18:19, 21, 24.) A ga na-enye ndị Livaị “otu ụzọ n’ụzọ iri ọ bụla n’Izrel ka ọ bụrụ ihe nketa maka ozi ha na-eje.” Nke a pụtara na e kee ihe ọ bụla ụmụ Izrel kọtara n’ubi ha ụzọ iri, keekwa anụ ụlọ ha ụzọ iri, ha ga-enye ndị Livaị otu ụzọ. Ndị Livaị na-esizi n’ihe e nyere ha nye otu ụzọ n’ụzọ iri, ya bụ, “nke kasị mma n’ime ya,” iji kwado ndị nchụàjà. * (Ọnụ Ọgụ. 18:25-29) A na-enyekwa ndị nchụàjà “onyinye niile dị nsọ” ụmụ Izrel wetaara Chineke n’ebe a na-anọ efe ya ofufe. N’ihi ya, ndị nchụàjà nwere ezigbo ihe mere ha ga-eji kwere na Jehova ga-enye ha ihe ndị dị ha mkpa.

5 O yiri ka è nwere otu ụzọ n’ụzọ iri ọzọ e kwuru n’Iwu Mozis ka a na-enye, bụ́ nke ezinụlọ ọ bụla n’Izrel ji enweta ihe ha ga-eri na ihe ha ga-aṅụ ma ha gaa nzukọ ndị dị nsọ ha na-enwe kwa afọ. (Diut. 14:22-27) Ma, e nwere ihe ọzọ e ji otu ụzọ n’ụzọ iri a eme. Ndị Izrel na-eme ememme afọ Izu Ike n’afọ asaa ọ bụla. Ná ngwụcha nke afọ nke atọ na afọ nke isii, ha na-enye onyinye a maka ndị ogbenye na ndị Livaị. Olee ihe mere ndị Livaị ji soro ná ndị a na-enye onyinye a? Ọ bụ n’ihi na ha “enweghị òkè ma ọ bụ ihe nketa” n’Izrel.—Diut. 14:28, 29.

6. Ọ bụ eziokwu na e kenyeghị ebo ndị Livaị ala n’Izrel, olee ebe ha ga-ebi?

6 I nwere ike ịna-eche sị, ‘Ọ bụrụ na e kenyeghị ndị Livaị ala, ebee ka ha ga-ebi?’ Chineke nyere ha ebe ha ga-ebi. O nyere ha obodo iri anọ na asatọ na ala ebe anụ ụlọ ha ga na-ata ahịhịa. Obodo mgbaba isii so na ya. (Ọnụ Ọgụ. 35:6-8) N’ihi ya, ndị Livaị nwere ebe ha ga-ebi mgbe ha na-anaghị eje ozi n’ebe nsọ Chineke. Jehova nyere ndị wepụtara onwe ha na-ejere ya ozi ihe ndị dị ha mkpa. Otú ndị Livaị ga-esi egosi na Jehova bụ òkè ha bụ ma ha tụkwasị ya obi na ọ ga-enye ha ihe ndị dị ha mkpa.

7. Olee ihe ndị Livaị ga-eme ka Jehova wee bụrụ òkè ha?

7 Iwu ahụ enweghị ihe o kwuru a ga-eme onye Izrel ọ bụla na-enyeghị otu ụzọ n’ụzọ iri. Mgbe ndị Izrel na-enyeghị otu ụzọ n’ụzọ iri, ndị nchụàjà na ndị Livaị tara ahụhụ ya. Ụdị ihe a mere n’oge Nehemaya. Nke a mere ka ndị Livaị kọwa ọrụ n’ubi ha ma hapụ ozi ha na-ejere Jehova. (Gụọ Nehemaya 13:10.) Ọ bụ naanị mgbe ndị Izrel mere ihe Jehova kwuru ka ebo Livaị na-enweta ihe ndị dị ha mkpa. Ndị nchụàjà na ndị Livaị kwesịkwara ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga-enye ha ihe ndị dị ha mkpa.

Ndị Jehova Bụ Òkè Ha n’Otu n’Otu

8. Kọwaa nsogbu Esaf, bụ́ onye Livaị, nwere.

8 Jehova bụ òkè ebo Livaị dum. Ma, e nwekwara ụfọdụ ndị Livaị kwuru, sị: “Jehova bụ òkè m.” Ha kwuru nke a iji gosi na ha na Chineke dị ná mma nakwa na ha tụkwasịrị ya obi. (Ákwá 3:24) Otu n’ime ndị Livaị kwutụrụla nke a bụ otu onye na-abụ abụ ma na-ede uri. Anyị ga-akpọ ya Esaf, ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịbụ otu onye n’ime ndị si n’ezinụlọ Esaf, bụ́ onye Livaị nke na-edu ndị na-abụ abụ n’oge Eze Devid na-achị. (1 Ihe 6:31-43) Anyị gụtara n’Abụ Ọma nke 73 na Esaf (ma ọ bụ onye si n’ezinụlọ ya) aghọtaghị ihe mere ihe ji agara ndị mmebi iwu nke ọma. Ọ malitere inwere ha anyaụfụ. O rudịrị ya na nke ikwu, sị: “Ọ bụ n’efu ka m meworo ka obi m dị ọcha, kwọọkwa aka m iji gosi na aka m dị ọcha.” O jighịzi ihe ùgwù o nwere kpọrọ ihe; o chetaghịzi na Jehova bụ òkè ya. Ihe ndị a nyegidere ya nsogbu “ruo mgbe [ọ] batara ná nnukwu ebe nsọ Chineke.”—Ọma 73:2, 3, 12, 13, 17.

9, 10. Olee ihe mere Esaf ji nwee ike ikwu na Chineke bụ ‘òkè ya ruo mgbe ebighị ebi’?

9 Mgbe Esaf ruru n’ebe nsọ Chineke, ọ malitere ile ihe anya otú Chineke si ele ya. O nwere ike ịbụ na ụdị ihe a mere ya emetụla gị. Ma eleghị anya, e nwetụla mgbe ị kwụsịrị iji ofufe Chineke kpọrọ ihe ruo na nke ichewe banyere ihe onwunwe ndị ị gaara enwe ma a sị na ị naghị efe Chineke. Ma, ka ị na-amụ Okwu Chineke ma na-aga ọmụmụ ihe, ị maliteghachiri ile ihe anya otú Jehova si ele ya. Esaf ghọtara ihe ga-emecha mee ndị na-emebi iwu. O chetara ihe ọma niile ọ na-enweta n’ihi na ọ na-efe Jehova. O mechara kwuo na Jehova ga-ejide ya n’aka nri ya ma na-edu ya. Nke a mere ka Esaf gwa Jehova, sị: “Ọ dịghị ihe ọzọ na-enye m obi ụtọ n’ụwa ma e wezụga gị.” (Ọma 73:23, 25) Ọ kpọziri Chineke òkè ya. (Gụọ Abụ Ọma 73:26.) Ọ bụ eziokwu na ‘anụ ahụ́ ọbụ abụ ahụ na obi ya nwere ike ịda mbà,’ Chineke ga-abụ ‘òkè ya ruo mgbe ebighị ebi.’ Obi siri ọbụ abụ ahụ ike na Jehova ga-echeta na ya na ya bụ enyi. Ọ gaghị echefu ozi o ji obi ya niile jeere ya. (Ekli. 7:1) O doro anya na nke a ga-eme ka obi sighachi Esaf ike. Ọ bụrụ abụ, sị: “Ma mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma. Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ka m ji mere ebe mgbaba.”—Ọma 73:28.

10 Mgbe Esaf kwuru na Jehova bụ òkè ya, ọ naghị ekwu banyere ihe onwunwe ndị ọ na-enweta n’ihi na ọ bụ onye Livaị. Ihe ọ na-ekwu bụ ihe ùgwù o nwere ijere Jehova ozi na adịm ná mma ya na Jehova, ya bụ, otú ya na Onye Kasị Ihe Niile Elu si bụrụ enyi. (Jems 2:21-23) Ọ bụrụ na ọbụ abụ ahụ chọrọ ka ya na Jehova nọgide na-adị ná mma, o kwesịrị inwe okwukwe na ya, tụkwasịkwa ya obi. Obi kwesịrị isi Esaf ike na ọ bụrụ na o mee ihe Chineke na-achọ, ihe ga-adịrị ya mma. Gịnwa nwekwara ike ịtụkwasị Onye Pụrụ Ime Ihe Niile obi.

11. Olee ihe Jeremaya jụrụ Jehova, oleekwa otú o si zaa ya?

11 Jeremaya onye amụma bụ onye Livaị ọzọ kwuru na Jehova bụ òkè ya. Ka anyị tụlee ihe o bu n’obi kwuo nke ahụ. Jeremaya biri n’Anatọt, bụ́ otu n’ime obodo ndị e nyere ndị Livaị, nke dị nso na Jeruselem. (Jere. 1:1) E nwere mgbe Jeremaya jụrụ Jehova ihe mere ihe ji na-agaziri ndị ajọ omume ebe ndị ezi omume na-ata ahụhụ. (Jere. 12:1) Mgbe ọ hụrụ ihe na-eme na Jeruselem na Juda, ọ malitere ‘ime mkpesa’ n’ihi ihe ọ hụrụ. Jeremaya ma na Jehova bụ onye ezi omume. Ihe Jehova mechara gwa Jeremaya ka o buo n’amụma na otú Jehova si mezuo amụma ahụ mere ka obi jụrụ Jeremaya. Amụma ahụ mezuru n’eziokwu. ‘Mkpụrụ obi ndị rubeere Jehova isi bụụrụ ha ihe nkwata,’ ebe ndị ajọ omume ihe na-agaziri nwụrụ n’ihi na ha emeghị ihe a gwara ha.—Jere. 21:9.

12, 13. (a) Gịnị mere Jeremaya ji kwuo, sị: “Jehova bụ òkè m,” oleekwa ihe o kpebiri ime? (b) Olee ihe mere ebo niile nke Izrel ji kwesị ichere?

12 Mgbe Jeremaya lere anya n’obodo ya ma hụ otú o si tọgbọrọ n’efu, ọ dị ya ka ọ̀ na-ejegharị n’ọchịchịrị. Ọ dị ya ka Jehova ò mere ‘ka ọ nọdụ ka ndị nwụrụ kemgbe.’ (Ákwá 1:1, 16; 3:6) Jeremaya gwara ndị Izrel na-enupụrụ Chineke isi ka ha laghachikwuru Nna ha nke eluigwe, ma omume ọjọọ ha ruru n’ókè nke na Chineke kwere ka e bibie Jeruselem na Juda. Nke ahụ wutere Jeremaya nke ukwuu n’agbanyeghị na ọ bụghị ya ka o si n’aka. Ka ihe a niile na-eme Jeremaya, o chetara ebere niile nke Chineke. O kwuru, sị: “Anyị anwụchabeghị.” O kwukwara na ebere Jehova na-adị ọhụrụ kwa ụtụtụ. O kwuziri, sị: “Jehova bụ ókè m.” Ọ nọgidere bụrụ onye amụma Jehova.—Gụọ Abụ Ákwá 3:22-24.

13 Ndị Izrel agaghị enwe ebe obibi ruo afọ iri asaa. Obodo ha ga-atọgbọrọ n’efu. (Jere. 25:11) Ma, ihe Jeremaya kwuru, nke bụ́: “Jehova bụ óké m,” gosiri na obi siri ya ike na Chineke ga-emere ha ebere. Nke a mekwara ka o nwee ike ‘ichere.’ Ebo niile nke Izrel enweghị ihe nketa, n’ihi ya, ha kwesịrị ichere otú Jeremaya si chere. Ọ bụ naanị Jehova ga-eme ka ihe ha na-atụ anya ya mezuo. Mgbe afọ iri asaa gachara, Chineke mere ka ha laghachi n’obodo ha, ha amaliteghachikwa ijere ya ozi n’ebe ahụ.—2 Ihe 36:20-23.

E Nwere Ndị Ọzọ Jehova Nwere Ike Ịbụ Òkè Ha

14, 15. E wezụga ndị Livaị, olee ndị ọzọ kwere ka Jehova bụrụ òkè ha, gịnịkwa mere ha ji mee otú ahụ?

14 Esaf na Jeremaya si n’ebo Livaị, ma ọ̀ bụ naanị ndị Livaị nwere ihe ùgwù ijere Jehova ozi? Mbanụ! Mgbe Devid, bụ́ onye ga-emecha chịa Izrel, bụ nwa okorobịa, ọ kpọrọ Chineke “òkè [ya] n’ala ndị dị ndụ.” (Gụọ Abụ Ọma 142:1, 5.) Devid anọghị n’obí eze mgbe ọ rọrọ abụ a, ọ nọghịdị n’ụlọ. Ọ nọ n’ọgba, na-ezogharị ka ndị iro ya ghara ịkpara ya aka. E nwere ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ugboro abụọ Devid zoro n’ọgba, otu n’ime ọgba ndị ahụ dị nso n’Adọlam nke ọzọ adịrị n’ọzara En-gidaị. Ọ ga-abụ na ọ nọ n’otu n’ime ọgba ndị a rọọ Abụ Ọma nke 142.

15 Ya bụrụ otú ahụ, ọ bụ Eze Sọl nọ na-achụgharị Devid, na-achọ igbu ya. Devid gbabara n’ọgba nke siri ike ọbụba. (1 Sam. 22:1, 4) Mgbe Devid nọ n’ebe ahụ dịbara n’ime, o nwere ike ịdị ya ka o nweghị enyi ga-echebe ya. (Ọma 142:4) Ọ bụ mgbe ahụ ka Devid kpọkuru Chineke ka o nyere ya aka.

16, 17. (a) Olee ihe mere o ji dị Devid ka o nweghị onye ga-enyere ya aka? (b) Ònye ka Devid nwere ike ịgakwuru ka o nyere ya aka?

16 Mgbe Devid rọrọ Abụ Ọma nke 142, o nwere ike ọ nụla ihe mere Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Ahimelek, bụ́ onye nyeere ya aka n’amaghị ama, mgbe Devid nọ na-agbapụ n’ihu Sọl. Eze Sọl, bụ́ onye na-enwere Devid anyaụfụ, nyere iwu ka e gbuo Ahimelek na ndị ezinụlọ ya niile. (1 Sam. 22:11, 18, 19) Ọ dị Devid ka ọ̀ bụ ya kpatara ọnwụ ha. Ọ dị ya ka ọ̀ bụ ya gburu onye nchụàjà ahụ nyeere ya aka. Ọ bụrụ gị bụ Devid, ọ̀ gaara adị gị otú ahụ ọ dị ya? Ihe ọzọ na-enye Devid nsogbu bụ na o zubeghị ike kemgbe Sọl na-achụgharị ya.

17 Obere oge nke a mechara, Samuel onye amụma, bụ́ onye tere Devid mmanụ iji gosi na ọ ga-abụ eze n’ọdịnihu, anwụọ. (1 Sam. 25:1) Nke a nwere ike imekwa ka ọ dị Devid ka o nweghịzi onye ga-enyere ya aka. Ma, Devid ma onye ọ ga-agakwuru ka o nyere ya aka. Ọ bụ Jehova. E nyeghị Devid ụdị ọrụ e nyere ndị Livaị, ma e teela ya mmanụ ka ọ rụọ ọrụ ọzọ dị iche, ya bụ, ka ọ bụrụ eze Izrel n’ọdịnihu. (1 Sam. 16:1, 13) Nke a mere Devid ji kpekuo Jehova ekpere ma gwa ya otú obi dị ya, ọ nọgidekwara na-atụkwasị Chineke obi. Jehova nwekwara ike ịbụ òkè gị. I kwesịkwara ịtụkwasị ya obi ka ị na-agbasi mbọ ike na-eme ihe niile i nwere ike ime n’ozi ya.

18. Olee otú ndị anyị tụlere ihe banyere ha n’isiokwu a si gosi na Jehova bụ òkè ha?

18 Olee otú o si bụrụ na Jehova bụ òkè ndị anyị tụlere ihe banyere ha n’isiokwu a? Ọ bụ n’ihi na o nyere ha ọrụ ha ga-arụ. Ha tụkwasịrị Chineke obi na ọ ga-egboro ndị na-ejere ya ozi mkpa ha. Ma ndị Livaị ma ndị si n’ebo ndị ọzọ n’Izrel, dị ka Devid, nwere ike ikwe ka Chineke bụrụ òkè ha. Olee otú gịnwa nwere ike isi kwe ka Jehova bụrụ òkè gị? Anyị ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú e si egboro ndị nchụàjà mkpa ha, gụọ Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peeji nke 684.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Olee otú o si bụrụ na Jehova bụ òkè ndị Livaị?

• Olee ihe Esaf, Jeremaya, na Devid mere iji gosi na Jehova bụ òkè ha?

• Olee ihe i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka Chineke bụrụ òkè gị?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Ndị Livaị eketaghị ala. Kama nke ahụ, Jehova bụ òkè ha, n’ihi na ha nwere ihe ùgwù pụrụ iche nke bụ́ ijere ya ozi

[Foto dị na peeji nke 7]

Olee otú o si bụrụ na Jehova bụ òkè ndị nchụàjà na ndị Livaị?

[Foto dị na peeji nke 9]

Olee ihe nyeere Esaf aka ka ọ ghara ịkwụsị iwere Jehova ka òkè ya?