Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ na-ekwe Ka Jehova Bụrụ Òkè Gị?

Ị̀ na-ekwe Ka Jehova Bụrụ Òkè Gị?

Ị̀ na-ekwe Ka Jehova Bụrụ Òkè Gị?

“Burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.”—MAT. 6:33.

1, 2. (a) Olee ndị bụ “Izrel nke Chineke” e kwuru okwu ha ná Ndị Galeshia 6:16? (b) Olee ndị bụ “ebo iri na abụọ nke Izrel” e kwuru okwu ha na Matiu 19:28?

GỊNỊ na-agbata gị n’uche mgbe ị gụtara aha ahụ bụ́ Izrel na Baịbụl? Ihe na-agbata gị n’uche ọ̀ bụ nwa Aịzik bụ́ Jekọb, bụ́ onye a gụgharịrị Izrel? Ka ọ̀ bụ ụmụ ya, ya bụ, mba Izrel oge ochie? Gịnịkwanụ na-agbata gị n’uche ma ị nụ Izrel ime mmụọ? Mgbe ọ bụla e kwuru banyere Izrel ime mmụọ, ihe ọ na-apụtakarị bụ “Izrel nke Chineke,” ya bụ, ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ka ha bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. Ha dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. (Gal. 6:16; Mkpu. 7:4; 21:12) Ma, e nwere otú ọzọ pụrụ iche e si kwuo okwu ebo iri na abụọ nke Izrel na Matiu 19:28.

2 Jizọs sịrị: “Mgbe a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ, mgbe Nwa nke mmadụ ga-anọdụ ala n’ocheeze ya dị ebube, unu onwe unu ndị sowooro m ga-anọdụkwa ala n’ocheeze iri na abụọ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.” N’amaokwu a, “ebo iri na abụọ nke Izrel” bụ ndị ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị e tere mmanụ, ga-ekpe ikpe. Ha ga-adịkwa ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs. Ọrụ ịchụàjà otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-arụ ga-abara ha uru.

3, 4. Olee ezigbo ihe anyị na-amụta n’aka ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi?

3 Dị ka ndị nchụàjà na ndị Livaị mere n’oge ochie, ndị e tere mmanụ taa na-ewere ozi ha na-ejere Jehova ka ihe ùgwù. (Ọnụ Ọgụ. 18:20) Ndị e tere mmanụ anaghị atụ anya ka e nye ha ebe ụfọdụ n’ụwa ka ha bụrụ ihe nketa ha. Kama nke ahụ, ha na-atụ anya na ha na Jizọs Kraịst ga-abụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. Mkpughe 4:10, 11 gosiri na ndị e tere mmanụ ga-anọgide na-ejere Jehova ozi n’eluigwe.—Ezik. 44:28.

4 Ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa na-ebi ndụ otú na-egosi na Jehova bụ òkè ha. Ihe kacha ha mkpa bụ ozi ha na-ejere Chineke. Ha nwere okwukwe n’àjà mgbapụta Kraịst chụrụ ma na-esochi Kraịst anya, si otú a na-eme ka ‘òkù a kpọrọ ha na nhọrọ a họọrọ ha bụrụ ihe ha ji n’aka.’ (2 Pita 1:10) Otú ihe si dịrị onye ọ bụla n’ime ha nakwa ihe onye ọ bụla n’ime ha ga-emeli dị iche iche. N’agbanyeghị nke a, ha anaghị akụdo ihe ndị a aka ghara ịrụsi ọrụ ike n’ozi ha na-ejere Chineke. Kama nke ahụ, ha na-ebute ozi ha na-ejere Chineke ụzọ ma na-eme ihe niile ha nwere ike ime. Ha bụụrụ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs ezigbo ihe nlereanya.

5. Olee otú Ndị Kraịst niile nwere ike isi mee Jehova òkè ha, oleekwa ihe mere nke ahụ nwere ike iji sie ike?

5 Ma ànyị nwere olileanya ịga eluigwe ma ọ bụ nke ibi n’ụwa, anyị ‘ga-ajụrịrị onwe anyị ma bulie osisi ịta ahụhụ anyị, na-eso Kraịst mgbe niile.’ (Mat. 16:24) Ọtụtụ nde mmadụ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs na-efe Chineke ma na-eso Kraịst mgbe niile. Ha na-eme ihe niile ha nwere ike ime n’ozi Jehova. Ọtụtụ ndị ahapụla ọtụtụ ihe ndị na-ewekọrọ oge ha ka ha nwee ike ịrụ ọrụ ịsụ ụzọ. Ndị ọzọ na-arụ ọrụ ịsụ ụzọ inyeaka ọnwa ole na ole n’afọ. E nwekwara ụfọdụ ndị na-agaghị arụli ọrụ ịsụ ụzọ ma ha na-agbasi mbọ ike n’ozi ha na-ejere Jehova. Ndị dị otú a dị ka Meri, onye na-atụ egwu Chineke, bụ́ onye wụsara Jizọs mmanụ na-esi ísì ụtọ. Jizọs kwuru, sị: “O meere m ihe ọma. . . . O mere ihe o nwere ike ime.” (Mak 14:6-8) O nwere ike ọ gaghị adịrị anyị mfe ime ihe niile anyị nwere ike ime n’ihi na anyị bi n’ụwa Setan na-achị. Ma, anyị na-agbasi mbọ ike ijere Jehova ozi, na-atụkwasịkwa ya obi. Ka anyị tụlee ụzọ anọ anyị si eme nke a.

Ibu Ụzọ Na-achọ Alaeze Chineke

6. (a) Olee otú ndị mmadụ si egosi na òkè ha dị naanị ná ndụ a? (b) Olee ihe mere o ji ka mma ile ihe anya otú Devid si lee ya?

6 Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume Chineke. Ndị nọ n’ụwa na-ebu ụzọ achọ ọdịmma onwe ha nke mere ka ha bụrụ “ndị mmadụ nọ n’usoro ihe a, bụ́ ndị òkè ha dị ná ndụ a.” (Gụọ Abụ Ọma 17:1, 13-15.) Ọtụtụ ndị anaghị eche banyere Onye kere ha, ihe bụ́ mkpa ha bụ otú ha ga-esi na-enweta ihe ha ga-eji na-ekpori ndụ, nwee ezinụlọ, ma hapụrụ ezinụlọ ha ihe nketa ma hanwa nwụọ. Òkè ha dị naanị ná ndụ a. Ma, ihe bụ́ mkpa Devid bụ imere onwe ya “ezi aha” n’ebe Jehova nọ, bụ́kwanụ ihe nwa ya kwuru na onye ọ bụla kwesịrị ime. (Ekli. 7:1) Dị ka Esaf mere, Devid chọpụtara na imete Jehova enyi ka nnọọ mkpa karịa ibute ọdịmma onwe ya ụzọ ná ndụ. Obi tọrọ ya ụtọ na ya na Chineke so jee ije. N’oge anyị a, ọtụtụ Ndị Kraịst ebutela ozi ha na-ejere Chineke ụzọ karịa ọrụ ego ha.

7. Olee otú e si gọzie otu nwanna nwoke n’ihi na o butere Alaeze Chineke ụzọ?

7 Tụlee ihe banyere Jean-Claude, bụ́ onye bi na Sentral Afrịkan Rịpọblik. Ọ bụ okenye lụrụ nwaanyị, o nwekwara ụmụ atọ. Inweta ọrụ na-esi ike n’obodo ahụ, ọtụtụ ndị bi ebe ahụ dịkwa njikere ime ihe ọ bụla a sịrị ha mee ka a ghara ịchụ ha n’ọrụ. Otu ụbọchị, manịja ebe Jean-Claude na-arụ ọrụ gwara ya na ọ ga na-arụzi ọrụ abalị, malite mgbe o ji ọkara gafee elekere isi nke mgbede. O kwuru na ọ ga na-arụ ọrụ a ụbọchị asaa niile dị n’izu. Jean-Claude gwara ya na e wezụga na ya ga na-enye ezinụlọ ya ihe na-akpa ha, na ya kwesịkwara inyere ha aka ka ha na Chineke na-adị ná mma. Ọ gwakwara ya na ya nwere ọrụ ya na-arụ n’ọgbakọ. Gịnị ka manịja ahụ gwara ya? Ọ gwara ya, sị: “Ọ bụrụ na ọ dabara gị gị enweta ọrụ, ị ga-echefurịrị ihe niile ọzọ, ma nwunye gị, ma ụmụ gị, ma nsogbu gị. Ị ga-ejirịrị oge gị niile na-arụ ọrụ gị. Olee nke ị họọrọ: okpukpe gị ka ọ bụ ọrụ gị?” Olee ihe ị gaara eme ma ọ bụrụ gị? Jean-Claude ghọtara na ọ bụrụ na a chụọ ya n’ọrụ, Chineke ga-elekọta ya. Ọ ka ga-enwe ọtụtụ ihe ọ ga na-arụ n’ozi Chineke, Jehova ga-egbokwara ezinụlọ ya mkpa ha. Ya mere, ọ gara ọmụmụ ihe ọzọ e nwere n’etiti izu. Mgbe ọ lọtara, o jikeere ịga ọrụ, ma ọ maghị ma à ga-achụ ya n’ọrụ ma ọ̀ bụ na a gaghị achụ ya. Ka ọ nọ na-eche nke a, a kpọrọ ya n’ekwe ntị gwa ya na a chụọla manịja ahụ n’ọrụ, ma a chụghị nwanna Jean-Claude.

8, 9. Olee otú anyị nwere ike isi were Jehova ka òkè anyị otú ndị nchụàjà na ndị Livaị mere?

8 Ụfọdụ ndị ihe mere nwanna a merela nwere ike ịna-eche sị, ‘Olee otú m ga-esi egboro ezinụlọ m mkpa ha?’ (1 Tim. 5:8) Ma ụdị ihe ò metụla gị ma ọ bụ na o metụbeghị gị, o nwere ike i sila n’ihe mere gị kweta na Chineke anaghị agbahapụ ndị weere ya ka òkè ha, nke a mekwara ka i jiri obi gị dum na-ejere ya ozi. Mgbe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ, ọ gwakwara ha, sị: “A ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile,” ndị dị ka ihe oriri, ihe ọṅụṅụ, na ihe a ga-eyi n’ahụ́.—Mat. 6:33.

9 Cheedị banyere ndị Livaị, bụ́ ndị na-eketaghị ala ọ bụla. Ebe ọ bụ na ihe bụ́ mkpa ha bụ ofufe Chineke, ha na-atụkwasị Jehova obi na ọ ga-enye ha ihe ndị na-akpa ha. Jehova gwara ha, sị: “Abụ m òkè [unu].” (Ọnụ Ọgụ. 18:20) Ọ bụ eziokwu na anyị anaghị eje ozi n’ụlọ nsọ nkịtị otú ahụ ndị nchụàjà na ndị Livaị mere, anyị nwere ike iṅomi ha ma tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enye anyị ihe ndị na-akpa anyị. Ka ọgwụgwụ na-erukwu nso ka ọ na-adịkwu mkpa ka anyị tụkwasị Chineke obi na ọ ga-enye anyị ihe ndị na-akpa anyị.—Mkpu. 13:17.

Ibu Ụzọ Na-achọ Ezi Omume Chineke

10, 11. Olee otú ụfọdụ ndị sirila tụkwasị Jehova obi n’ihe banyere ọrụ ha ji akpata ego? Nye ihe atụ.

10 Jizọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘buru ụzọ na-achọ ezi omume Chineke.’ (Mat. 6:33) Nke a pụtara na ọ bụ ihe ziri ezi n’anya Jehova ka ha ga-ewere na o ziri ezi, werekwa ihe na-ezighị ezi n’anya ya ka ihe na-ezighị ezi, ghara iso ihe ndị mmadụ kwuru. (Gụọ Aịzaya 55:8, 9.) I nwere ike icheta na e nwere mgbe ndị ụfọdụ na-akụ ụtaba ma ọ bụ na-ere ya ere. Ụfọdụ nwekwara ndị ha na-akụziri otú e si alụ agha. Ụfọdụ na-emepụta ngwá agha, na-erekwa ha ere. Ma, mgbe ha mụtara eziokwu Baịbụl, ọtụtụ n’ime ha gbanwere ọrụ ha ma mee ihe ndị mere ka ha ruo eruo ka e mee ha baptizim.—Aịza. 2:4; 2 Kọr. 7:1; Gal. 5:14.

11 Andrew bụ otu n’ime ndị mere otú ahụ. Mgbe ya na nwunye ya mụtara banyere Jehova, ha kpebiri ijere ya ozi. Andrew ejighị ọrụ ya egwu egwu, ma o mechara hapụ ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na òtù ọ na-arụrụ ọrụ na-etinye aka n’agha, o kpebisikwara ike ibute ezi omume Chineke ụzọ. Mgbe Andrew kwụsịrị ọrụ ahụ, o nwere ụmụ abụọ, o nweghị ihe o ji akpata ego, ego fọkwara ya n’aka ga-ezuru ya naanị ọnwa ole na ole. O yiri ka à ga-asị na o nweghị ‘ihe nketa.’ Ọ malitere ịchọ ọrụ, ọ tụkwasịkwara Chineke obi na ọ ga-enyere ya aka. Ugbu a, mgbe ọ bụla ha chetara ihe mere n’oge ahụ, ya na ezinụlọ ya na-ekweta n’eziokwu na aka Jehova adịghị mkpụmkpụ. (Aịza. 59:1) Andrew na nwunye ya banyedịrị n’ozi oge niile n’ihi na ha hapụrụ ọtụtụ ihe ndị na-ewekọrọ oge ha. Andrew kwuru, sị: “E nwere mgbe otú anyị ga-esi enweta ego, ụlọ anyị ga-ebi, ihe anyị ga-eme ma anyị rịawa ahụ́ ma ọ bụkwanụ ma anyị mee agadi, na-eche anyị uche. Ma, o nwebeghị mgbe Jehova hapụrụ anyị. . . . Anyị nwere ike ikwu n’eziokwu na ijere Jehova ozi bụ ihe ùgwù kacha enye mmadụ obi ụtọ ná ndụ.” *Ekli. 12:13.

12. Gịnị ka mmadụ kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ibute ezi omume Chineke ụzọ? Kọọ otú ụmụnna nọ n’ógbè unu si mee nke a.

12 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu enwee okwukwe há ka mkpụrụ osisi mọstad, unu ga-asị ugwu a, ‘Si n’ebe a gafee n’ebe nke ọzọ,’ ọ ga-agafe, ọ dịghịkwa ihe na-agaghị ekwe unu omume.” (Mat. 17:20) Ị̀ ka ga-ebu ụzọ na-achọ ezi omume Chineke ma ị chọpụta na ime otú ahụ ga-eme ka ihe siere gị ike? Ọ bụrụ na ị maghị ma ị̀ ga-emeli otú ahụ, jụọ ndị ọzọ gị na ha nọ n’ọgbakọ ka ha gwa gị ihe nyeere ha aka. Ihe ha ga-akọrọ gị banyere otú Jehova si nyere ha aka ga-eme ka okwukwe gị sie ike.

Igosi na Obi Dị Anyị Ụtọ Maka Ihe Niile Jehova Na-emere Anyị

13. Ọ bụrụ na anyị ana-agbasi mbọ ike n’ozi anyị na-ejere Jehova, olee ihe obi ga-esi anyị ike na ọ ga-emere anyị?

13 Ọ bụrụ na i jiri ihe ùgwù i nwere ijere Jehova ozi kpọrọ ihe, ka obi sie gị ike na ọ ga-emere gị ihe o meere ndị Livaị, ya bụ, ọ ga-enye gị ihe ndị na-akpa gị, nyekwara gị aka mee ka gị na ya na-adị ná mma. Tụlee ihe banyere Devid mgbe ọ nọ n’ọgba. Ọ bụ eziokwu na ọ nọ n’ọgba, ọ tụkwasịrị Chineke obi na ọ ga-enye ya ihe ndị na-akpa ya. Anyị nwekwara ike ịtụkwasị Jehova obi ọbụna mgbe ọ dị anyị ka o nweghị onye ga-enyere anyị aka. Cheta na mgbe Esaf batara “ná nnukwu ebe nsọ Chineke,” ọ ghọtara ihe ahụ na-enye ya nsogbu. (Ọma 73:17) Anyịnwa kwesịkwara ịtụkwasị Chineke obi na ọ ga-enyere anyị aka ime ka anyị na ya na-adị ná mma. Ọ bụrụ na anyị emee otú a, anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ na anyị na-ejere Chineke ozi n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị. Anyị ga-esi otú ahụ gosi na anyị kwere ka Jehova bụrụ òkè anyị.

14, 15. Olee ihe anyị kwesịrị ime mgbe a gbanwere otú e sibu akọwa ihe ụfọdụ dị n’Akwụkwọ Nsọ, oleekwa ihe anyị ji kwesị ime otú ahụ?

14 Olee ihe ị na-eme ma Jehova, bụ́ Onye na-akụziri anyị eziokwu, mee ka anyị ghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke,” bụ́ ndị dị na Baịbụl? (1 Kọr. 2:10-13) Pita onyeozi bụụrụ anyị ezigbo ihe nlereanya n’okwu a. O nwere mgbe Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Ọ bụrụ na unu erighị anụ ahụ́ Nwa nke mmadụ, ṅụọkwa ọbara ya, unu enweghị ndụ n’ime onwe unu.” Mgbe o kwuru nke a, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya chere na ihe ọ na-ekwu bụ na ha ga-eri ahụ́ ya nkịtị ma ṅụọ ọbara ya. Ha kwuru, sị: “Okwu a na-awụ akpata oyi; ònye pụrụ ige ntị na ya?” Ma, Pita kwuru, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-alakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.”—Jọn 6:53, 60, 66, 68.

15 Pita aghọtachaghị ihe Jizọs bu n’uche mgbe ọ sịrị na ha ga-eri ahụ́ ya, ṅụọkwa ọbara ya. Ma, obi siri ya ike na Chineke ga-eme ka ha ghọta ya. Mgbe a gbanwere otú e sibu akọwa ihe ụfọdụ dị na Baịbụl, ị̀ na-aghọta na Akwụkwọ Nsọ kwadoro nke a? (Ilu 4:18) Ndị Beria narị afọ mbụ “ji oké ịnụ ọkụ n’obi nabata okwu Chineke, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị.” (Ọrụ 17:11) Ọ bụrụ na i ṅomie ha, ị ga-ejikwu ihe ùgwù i nwere ijere Jehova ozi kpọrọ ihe. Obi ga-adịkwukwa gị ụtọ na ọ bụ òkè gị.

Ịlụ Naanị n’Ime Onyenwe Anyị

16. Olee otú Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike isi gosi na Chineke bụ òkè ha dị ka e dere ná 1 Ndị Kọrịnt 7:39?

16 Otú ọzọ Ndị Kraịst si eburu nzube Chineke n’uche bụ ime ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́ ka anyị lụọ “naanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Kọr. 7:39) Ụfọdụ ndị ekpebiela na kama ha ga-enupụ isi n’ihe a Baịbụl kwuru, ha aghara ịlụ alụ. Chineke na-eji obiọma elekọta ndị dị otú a. Olee ihe Devid mere mgbe owu na-ama ya, ya adịkwa ya ka o nweghị onye ga-enyere ya aka? O kwuru, sị: “M nọ na-awụpụ nchegbu m n’ihu [Chineke] dị ka mmiri. M nọ na-akọ nhụjuanya m n’ihu ya, mgbe ike gwụrụ mmụọ m n’ime m.” (Ọma 142:1-3) Ọ ga-abụkwa na o nwere mgbe owu mara Jeremaya, bụ́ onye ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ n’alụghị nwaanyị. I nwere ike ịgụ banyere ya n’isi nke 8 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị.

17. Olee otú otu nwanna nwaanyị si edi owu na-ama ya mgbe ụfọdụ?

17 Otu nwanna nwaanyị bi n’Amerịka kwuru, sị: “Ọ dịghị mgbe m kpebiri na mụ agaghị alụ di. Adị m njikere ịlụ di ma ọ bụrụ na mụ ahụ onye obi m nabatara. Ma, mama m, onye na-abụghị onye Jehova, na-agwa m ka m lụọ onye ọ bụla bịaara m di. Ajụrụ m ya ma ọ̀ ga-ekwe na o si ya n’aka ma mụ na onye ọ chọrọ ka m lụọ sewe okwu. Ka oge na-aga, ọ hụrụ na m nwere ọrụ na-enye m ego, na-elekọtakwa onwe m nke ọma, hụkwa na obi dị m ụtọ. Ọ kwụsịrị inye m nsogbu.” E nwere mgbe owu na-ama nwanna nwaanyị a. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na owu amawa m, m na-atụkwasị Jehova obi. Ọ hapụtụbeghịkwa m.” Olee ihe nyeere ya aka ịtụkwasị Jehova obi? Ọ sịrị: “Ekpere m na-ekpe mere ka m kweta na Chineke dị adị nakwa na o nweghị mgbe m nọ naanị m. Onye Kasị Ihe Niile Elu na-ege m ntị, gịnịzi mere na agaghị m eji nke ahụ na-akpa nganga, na-aṅụrịkwa ọṅụ?” O kweere na ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́ na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe” bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Agbalịrị m iwepụta oge na-enyere ndị ọzọ aka n’atụghị anya ihe ọ bụla n’aka ha. Mgbe ọ bụla m na-eche ihe m ga-eme iji nyere ndị ọzọ aka, obi na-atọ m ụtọ.” (Ọrụ 20:35) N’eziokwu, Jehova bụ òkè ya, ozi ọ na-ejere Jehova na-enyekwa ya obi ụtọ.

18. Olee otú Jehova nwere ike isi mee ka ị bụrụ òkè ya?

18 N’agbanyeghị otú ihe si dịrị gị, i nwere ike ikwe ka Chineke bụrụ òkè gị. Ọ bụrụ na i mee otú a, ị ga-eso ná ndị ohu ya nwere obi ụtọ. (2 Kọr. 6:16, 17) Nke a ga-eme ka ị bụrụ òkè Jehova, dị ka ndị ohu ya n’oge ochie bụ. (Gụọ Diuterọnọmi 32:9, 10.) Dị nnọọ ka Izrel bụ òkè Chineke n’ime mba niile, i nwekwara ike ịbụ òkè Chineke, ọ ga-ejikwa obiọma na-elekọta gị.—Ọma 17:8.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Gụọ Teta! (Bekee) nke November 2009, peeji nke 12-14.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

Olee otú i nwere ike isi gosi na i kwere ka Jehova bụrụ òkè gị

• ma i buru ụzọ na-achọ Alaeze ya na ezi omume ya?

• ma i jiri nri ime mmụọ ọ na-enye anyị kpọrọ ihe?

• ma ị na-eme ihe o kwuru, nke bụ́ ka anyị lụọ naanị n’ime Onyenwe anyị?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

Jehova ga-abụ òkè anyị ma ọ bụrụ na anyị ebute ozi ya ụzọ ná ndụ anyị

[Foto dị na peeji nke 15]

Ihe nlereanya Jeremaya na-agba anyị ume