Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-agba Ọsọ Ka I nweta Ihe A na-agbata N’ọsọ

Na-agba Ọsọ Ka I nweta Ihe A na-agbata N’ọsọ

Na-agba Ọsọ Ka I nweta Ihe A na-agbata N’ọsọ

“Na-agbanụ ọsọ n’ụzọ ga-eme ka unu nweta ya.”—1 KỌR. 9:24.

1, 2. (a) Gịnị ka Pọl ji gbaa ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst ume? (b) Gịnị ka a gbara ndị ohu Chineke ume ka ha mee?

N’AKWỤKWỌ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Hibru, o ji ihe atụ dabara nnọọ adaba gbaa Ndị Kraịst ibe ya ume. O chetaara ha na ọ bụghị naanị ha na-agba ọsọ ndụ ahụ. Ha nwere “oké ìgwè ndị àmà” ndị gbara ha gburugburu, bụ́ ndị gbarurula ọsọ ahụ n’isi. Ọ bụrụ na ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst ana-echeta ihe ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie mere nakwa otú ha si gbasie mbọ ike gbaa ọsọ ahụ, nke ahụ ga-eme ka ha nwee ike ijisi ike na-agba ọsọ ndụ ahụ n’adaghị mbà.

2 N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị tụlere banyere ọtụtụ ndị so ‘n’oké ìgwè ndị àmà’ ahụ. Ha niile gosiri na okwukwe siri ike nyeere ha aka ịkwụsi ike n’ebe Chineke nọ, dị ka hà nọ na-agbasi ọsọ ike ka ha gbaruo ya n’isi. Anyị nwere ike ịmụta ihe n’otú ihe si gaara ha nke ọma. Dị ka anyị chọpụtara n’isiokwu ahụ, Pọl nyere ndị ohu Jehova ibe ya, ma anyịnwa, ndụmọdụ, sị: “Ka anyị yipụkwa ihe ọ bụla dị arọ nakwa mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị, ka anyị jirikwa ntachi obi na-agba ọsọ ahụ e debere n’ihu anyị.”—Hib. 12:1.

3. Gịnị ka Pọl chọrọ ka a mụta n’ihe o kwuru banyere ọsọ ndị Grik na-agba?

3 Otu akwụkwọ nke kwuru banyere Ndị Kraịst nọ n’oge Pọl kọwara otú ndị na-agba ọsọ n’oge ahụ si agba ọsọ. (Backgrounds of Early Christianity) Ọ sịrị: “Ndị Grik anaghị eyi uwe emega ahụ́ ma ọ bụ ama aka egwuregwu.” * N’ihi ya, ndị na-agba ọsọ na-eyipụ ihe ọ bụla ga na-anyị ha arọ ma ọ bụ ihe ga-eme ka ha ghara ịna-agba ọsọ nke ọma. Ọ bụ eziokwu na ọtọ ha na-agba agba ọsọ adịghị mma, ihe ha na-ebu n’obi eme nke a bụ inweta ihe a na-agbata ọsọ. Ihe Pọl na-ekwu bụ na ka ndị na-agba ọsọ ndụ a nwee ike inweta ihe a na-agbata n’ọsọ, ọ dị oké mkpa ka ha wepụ ihe ọ bụla nwere ike igbochi ha ịgbaru ọsọ ahụ n’isi. Ndụmọdụ a baara Ndị Kraịst nọ n’oge ahụ ezigbo uru, ọ na-abakwara anyị uru taa. Olee ibu arọ ndị nwere ike igbochi mmadụ inweta ihe a na-agbata n’ọsọ nke ndụ ahụ?

‘Yipụ Ihe Ọ Bụla Dị Arọ’

4. Olee ihe ndị nọ n’oge Noa ji oge ha dum na-eme?

4 Pọl dụrụ anyị ọdụ ka anyị ‘yipụ ihe ọ bụla dị arọ.’ Ihe ndị ahụ a ga-eyipụ bụ ihe niile nwere ike igbochi anyị itinye uche anyị dum na ike anyị dum n’ọsọ nke ndụ ahụ anyị na-agba. Gịnị bụ ihe ndị ahụ nwere ike ịdị anyị arọ? Jizọs nyeere anyị aka ịmata ha. O kwuru okwu banyere oge Noa, onye bụ́ otu n’ime ndị Pọl kpọrọ aha. Ọ sịrị: “Dị nnọọ ka ọ dị n’ụbọchị Noa, otú ahụ ka ọ ga-adịkwa n’ụbọchị Nwa nke mmadụ.” (Luk 17:26) Isi ihe Jizọs na-ekwu okwu ya ebe a bụ mbibi na-abịanụ; ọ na-ekwu banyere otú ndị mmadụ si akpa àgwà. (Gụọ Matiu 24:37-39.) Ọtụtụ ndị nọ n’oge Noa enweghị mmasị na Chineke, ma ya fọdụkwa ịchọwa ime ihe dị ya mma. Gịnị dọpụrụ ha uche? Ọ bụghị ihe pụrụ iche. Ha nọ na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-alụkwa di ma ọ bụ nwunye, bụ́ ihe ndị a na-eme ná ndụ. Jizọs kwuru na ihe bụ nsogbu ha bụ na ‘ha amaghị.’

5. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịgbaru ọsọ ndụ ahụ n’isi?

5 Dị ka Noa na ezinụlọ ya, anyị nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ime kwa ụbọchị. Anyị kwesịrị ịchọta ihe anyị na ndị ezinụlọ anyị ga-eri. Nke a nwere ike iri anyị nnukwu oge, meekwa ka ike na-agwụ anyị. N’oge a ịkpata ego na-esi ezigbo ike, mmadụ nwekwara ike ichegbuwe onwe ya maka otú ọ ga-esi egbo mkpa ya. Ebe anyị bụ́ Ndị Kraịst, e nwere ihe ndị gbasara ofufe Chineke anyị na-ekwesịghị ileghara anya. Anyị kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma, na-akwadebe ọmụmụ ihe, na-aga ọmụmụ ihe, na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye nakwa ofufe ezinụlọ, bụ́ ihe ndị ga-eme ka anyị bịarukwuo Chineke nso. N’agbanyeghị ọrụ zuru Noa ahụ́ n’ozi ọ na-ejere Chineke, “o mere nnọọ otú ahụ.” (Jen. 6:22) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na anyị chọrọ ịgbaru ọsọ ndụ ahụ n’isi, ọ dị oké mkpa ka anyị ghara ibo onwe anyị ibu dị arọ.

6, 7. Olee ndụmọdụ Jizọs nyere anyị nke anyị kwesịrị iburu n’obi?

6 Olee ihe Pọl bu n’obi mgbe o kwuru ka anyị yipụ “ihe ọ bụla dị arọ”? O doro anya na anyị enweghị ike ịhapụ ihe niile anyị kwesịrị ịna-arụ. Ma, buru ihe a Jizọs kwuru n’uche: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla, sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyi?’ N’ihi na ihe a niile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsi ike. N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe a niile dị unu mkpa.” (Mat. 6:31, 32) Ihe Jizọs kwuru ebe a na-egosi na ọ bụrụ na mmadụ akpachaghị anya, ihe ndị na-enweghị ihe ha bụ, dị ka mmadụ ịchọta ihe ọ ga-eri na uwe ọ ga-eyi, nwere ike ịghọrọ onye ahụ ibu arọ ma ọ bụ ihe mkpọbi ụkwụ.

7 Chegodị banyere ihe a Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Nna unu nke eluigwe maara na ihe a niile dị unu mkpa.” Nke a pụtara na Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova ga-enyere anyị aka igbo mkpa anyị. Ma, o doro anya na “ihe a niile” Chineke ga-enye anyị nwere ike ha agaghị abụ ihe ndị na-amasị anyị ma ọ bụ ihe ndị anyị chọrọ. N’agbanyeghị nke ahụ, a gwara anyị ka anyị ghara ichegbu onwe anyị banyere “ihe ndị mba ọzọ na-achụsi ike.” Maka gịnị? Jizọs mechara dụọ ndị na-ege ya ntị ọdụ, sị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka ọnyà.”—Luk 21:34, 35.

8. Gịnị mere o ji kacha mkpa n’oge a ka anyị ‘yipụ ihe ọ bụla dị arọ’?

8 Ebe a ga-agbaru ọsọ ahụ dịzi ezigbo nso. Ọ dị mwute ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka ihe ndị na-adịghị mkpa ghọọrọ anyị ibu arọ, bụ́ nke nwere ike ime ka anyị ghara ịgbaru ọsọ ahụ n’isi mgbe anyị ruwerela ebe anyị ga-agbaru ya! N’ihi ya, Pọl onyeozi dụrụ anyị ọdụ ga-abara anyị uru, sị: “Nsọpụrụ Chineke a, ya na inwe afọ ojuju, bụ ụzọ isi rite uru dị ukwuu.” (1 Tim. 6:6) Ọ bụrụ na anyị emee ihe a Pọl kwuru, ọ ga-enyere anyị ezigbo aka ịgbata ihe a na-agbata n’ọsọ.

“Mmehie ahụ nke Na-ekegidekarị Anyị”

9, 10. (a) Gịnị ka okwu bụ́ “mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị” pụtara? (b) Olee otú ihe nwere ike isi kegide anyị?

9 Ihe ọzọ Pọl kwuru ka anyị yipụ ma e wezụga “ihe ọ bụla dị arọ” bụ “mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị.” Gịnị bụ mmehie ahụ? Ọ bụ naanị n’amaokwu a ka okwu Grik a sụgharịrị “na-ekegidekarị anyị” pụtara na Baịbụl. Albert Barnes, bụ́ ọkà mmụta, kwuru, sị: “Onye na-agba ọsọ agaghị eyi uwe ọ ga-abụ ikuku na-ebugharị ya, ya atụhịa onye ahụ n’ụkwụ, bụ́ nke ga-emekwa ka o siere ya ike ịna-agba ọsọ otú o kwesịrị. Ọ bụkwa otú ahụ ka Onye Kraịst kwesịrị isi hapụ ihe ọ bụla yiri uwe ikuku ga na-ebugharị.” Olee otú ihe nwere ike isi kegide Onye Kraịst, bụ́ nke ga-eme ka ọ daa mbà n’okwukwe?

10 Onye Kraịst anaghị ada mbà n’okwukwe n’otu ntabi anya. O nwere ike iji nwayọọ nwayọọ daa mbà n’amaghịdị ihe na-eme ya. Mgbe Pọl malitere akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru, ọ dọrọ ha aka ná ntị ka ha ghara “ịkpafu” nakwa ka ha ghara “ịmalite inwe ajọ obi nke na-enweghị okwukwe.” (Hib. 2:1; 3:12) Ọ bụrụ na uwe onye na-agba ọsọ atụhịa ya n’ụkwụ, ọ ga-esi ike onye ahụ aghara ịda. Ihe ga-akacha eme ka onye na-agba ọsọ daa bụ ma o yiri uwe a na-ekwesịghị iyi agba ọsọ. Gịnị nwere ike ime ka o yiri uwe nwere ike ịkwada ya? O nwere ike ịbụ n’ihi na o geghị ntị n’ihe a gwara ya na o nwere ike ịkwada ya ma ọ bụ na o chere na o nweghị ihe ga-eme ka ya daa ma ọ bụkwanụ na o kwere ka ihe ụfọdụ dọpụ ya uche. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta na ndụmọdụ Pọl nyere anyị?

11. Gịnị nwere ike ime ka anyị kwụsị inwe okwukwe?

11 Anyị kwesịrị iburu n’obi na o nwere ihe ụfọdụ ọ ga-abụ anyị na-eme anyị ejiri nwayọọ nwayọọ kwụsị inwe okwukwe. Ọkà mmụta ọzọ kwuru na “mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị,” bụ “mmehie nke kacha enweta anyị n’ihi otú ihe si dịrị anyị, àgwà anyị, na ndị anyị na ha na-akpakọrịta.” Ihe ọ na-ekwu bụ na ndị agbata obi anyị, ihe ọjọọ ndị na-abata anyị n’obi, na ndị anyị na ha na-akpakọrịta nwere ike ịkpa ike ọjọọ n’ahụ́ anyị. Ha nwere ike ime ka anyị daa mbà n’okwukwe ma ọ bụdị kwụsị inwe okwukwe.—Mat. 13:3-9.

12. Olee ihe ndị a na-echetara anyị bụ́ ndị anyị kwesịrị iburu n’obi ka anyị ghara ịkwụsị inwe okwukwe?

12 Kemgbe ọtụtụ afọ, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche nọ na-echetara anyị ka anyị kpachara anya n’ihe ndị anyị na-ekiri na ihe ndị anyị na-ege, ya bụ, ihe ndị na-aba anyị n’obi na n’uche. A dọọla anyị aka ná ntị ka anyị ghara ikwe ka ịchụ ego na ihe onwunwe kegide anyị. Ihe ndị na-adọrọ mmasị e ji atụrụ ndụ ma ọ bụ ihe ọgbara ọhụrụ ndị a na-emepụta n’ike n’ike nwere ike ịdọpụ anyị uche. Anyị hiere ezigbo ụzọ ma anyị chee na ndụmọdụ ndị a a na-enye anaghị ekwe anyị megharịa ahụ́, ma ọ bụkwanụ chee na ọ gbasachaghị anyịnwa, kama na e bu ndị ọzọ n’obi nye ndụmọdụ ndị ahụ. Ụwa Setan na-ewepụta ihe ndị nwere ike ikegide anyị otú anyị na-agaghị ama na ha na-ekegide anyị. Ụfọdụ ndị enweghịzi okwukwe n’ihi na ha anaghị ege ntị n’ihe ndị a na-agwa ha ma ọ bụ na ha chere na o nweghị ihe ga-eme ka ha kwụsị inwe okwukwe, ma ọ bụkwanụ na ha chere na o nweghị ihe ga-adọpụli ha uche. Anyị kwe ka ụdị ihe a mee anyị, o nwere ike anyị agaghị enweta ndụ ebighị ebi anyị na-atụ anya ya.—1 Jọn 2:15-17.

13. Olee otú anyị nwere ike isi zere ihe ndị nwere ike ime ka anyị ghara ịgbaru ọsọ ahụ n’isi?

13 Kwa ụbọchị, anyị na-ahụ ndị na-agba mbọ ime ka anyị chụwa ọtụtụ ihe ụwa niile na-achụ, nakwa ka anyị chewe echiche ka ha. (Gụọ Ndị Efesọs 2:1, 2.) Ma, ọ bụ anyịnwa ga-akacha eme ka ihe ndị ahụ dọpụ anyị uche ma ọ bụ ghara ịdọpụ anyị uche. “Ikuku” Pọl na-ekwu okwu ya ebe a bụ nke nwere ike igbu mmadụ. Anyị kwesịrị ịnọ ná nche mgbe niile ka anyị ghara ikuru ikuku a, anyị agharazie iku ume nke ọma, ma ọ bụkwanụ kwụsịchaa iku ume, nke ga-eme ka anyị ghara ịgbaru ọsọ ahụ n’isi. Gịnị ga-enyere anyị aka ịgbaru ọsọ ahụ n’isi? Ọ bụ iso otú Jizọs si gbaruo ọsọ ndụ ahụ n’isi. Jizọs bụ onye kacha mma anyị kwesịrị iso. (Hib. 12:2) Ihe ọzọ ga-enyekwara anyị aka bụ iso ihe nlereanya Pọl. O kwuru na ya so ná Ndị Kraịst na-agba ọsọ ahụ, ọ gbakwara ụmụnna ya ume ka ha ṅomie ya.—1 Kọr. 11:1; Fil. 3:14.

Otú Ị Ga-esi Enweta Ihe ahụ A Na-agbata n’Ọsọ

14. Olee otú Pọl si lee ọsọ ndụ o so gbaa anya?

14 Olee otú Pọl si lee ọsọ ndụ yanwa so gbaa anya? Mgbe ikpeazụ ọ gwara ndị okenye nọ n’Efesọs okwu, ọ sịrị: “Ọ dịghị ihe m ji mkpụrụ obi m kpọrọ, ma ọ bụrụhaala na m ga-agbacha ọsọ m ma jezuo ozi ahụ m natara n’aka Onyenwe anyị Jizọs.” (Ọrụ 20:24) Ọ dị njikere ịhapụ ihe ọ bụla o nwere, ma ndụ ya, iji nwee ike ịgbaru ọsọ ahụ n’isi. Pọl weere na o nweghị uru ihe niile ọ rụrụ n’ihi ozi ọma ahụ bara ma ọ bụrụ na ọ gbarughị ọsọ ahụ n’isi. Ma, obi esibigaghị ya ike ókè nke na o chewere na o nweghị ihe nwere ike ime ka ọ ghara ịgbaru ọsọ ahụ n’isi. (Gụọ Ndị Filipaị 3:12, 13.) Ọ bụ naanị mgbe ọ na-aga ịnwụ ka obi kara ya ikwu, sị: “Alụwo m ezi ọgụ ahụ, agbawo m ọsọ ahụ ruo n’isi, edebewo m okwukwe ahụ.”—2 Tim. 4:7.

15. Olee otú Pọl si gbaa ndị ya na ha so agba ọsọ ahụ ume?

15 Ihe ọzọkwa bụ na Pọl chọsiri ike ka Ndị Kraịst ibe ya gbaruo ọsọ ahụ n’isi ghara ịkwụsị n’ụzọ. Dị ka ihe atụ, ọ gbara Ndị Kraịst nọ na Filipaị ume ka ha na-arụsi ọrụ ike iji nweta nzọpụta. Ọ gwara ha na ha kwesịrị ‘ịna-ejidesi okwu nke ndụ ike.’ Ọ sịkwara: “Ka m wee nwee ihe ga-eme ka m nwee aṅụrị n’ụbọchị Kraịst, na agbaghị m ọsọ n’efu ma ọ bụ rụsie ọrụ ike n’efu.” (Fil. 2:16) Ọ gwakwara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt, sị: “Na-agbanụ ọsọ n’ụzọ ga-eme ka unu nweta [ihe a na-agbata n’ọsọ].”—1 Kọr. 9:24.

16. Gịnị mere ihe anyị ga-agbata n’ọsọ kwesịrị iji dịrị anyị n’uche?

16 N’ọsọ a ga-agbaru ebe tere ezigbo aka, dị ka ọsọ maratọn, anaghị ahụ ebe a ga-agbaru ya ná mmalite. Ma, n’oge niile onye na-agba ọsọ ahụ na-agba ya, ọ na-eburu n’obi ịgbaru ya n’isi. Ebe ọ ga-agbaru na-aka adị ya n’obi ma ya mara na oge eruwela mgbe ọ ga-enweta ihe a na-agbata n’ọsọ. Otú ahụ ka o kwesịrị ịdị anyịnwa n’ọsọ ndụ ahụ. Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe anyị ga-agbata n’ọsọ pụọ anyị n’uche. Nke ahụ ga-enyere anyị aka inweta ya.

17. Olee otú okwukwe si gbasa ilekwasị anya n’ihe a ga-agbata n’ọsọ nke ndụ ahụ?

17 Pọl dere, sị: “Okwukwe bụ atụmanya e ji n’aka na ihe ndị a na-ele anya ha ga-emezu, ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-adịghị ahụ anya dị adị n’ezie.” (Hib. 11:1) Ebreham na Sera dị njikere ịhapụ ebe ahụ́ ruru ha ala gaa biri ka “ndị bịara abịa na ndị bi nwa oge n’ala ahụ.” Gịnị nyeere ha aka? “Ha hụrụ [mmezu nke nkwa Chineke] n’ebe dị anya.” Mozis jụrụ “ịnụ ụtọ mmehie ruo nwa oge,” jụkwa “akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa nke Ijipt.” Olee ihe mere ka okwukwe ya sie ike ma mee ka ọ kata obi jụ ihe ndị a? O “legidere anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ya.” (Hib. 11:8-13, 24-26) Ka a sịkwa ihe mere Pọl ji kwuo na ọ bụ “n’okwukwe” ka onye ọ bụla n’ime ndị ọ kpọrọ aha mere ihe o mere. Okwukwe nyeere ha aka idi ọnwụnwa ndị bịaara ha na ileghara ihe isi ike ndị ha nwere anya ma lekwasị anya n’ihe Chineke na-emere ha nakwa ihe ndị ọ ka ga-eme.

18. Gịnị ka anyị ga-eme iji yipụ “mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị”?

18 Ọ bụrụ na anyị ana-echeta ndị ikom na ndị inyom ndị a nwere okwukwe, bụ́ ndị a kpọrọ aha ná Ndị Hibru isi 11, na-emekwa ka ha, anyị ga-enwe okwukwe, nweekwa ike iyipụ “mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị.” (Hib. 12:1) Anyị ga “na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.” Anyị ga-eme ya ma ọ bụrụ na anyị na ndị nwere okwukwe ana-ezukọta.—Hib. 10:24.

19. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịnọgide na-agba ọsọ ahụ ugbu a?

19 Ọ fọrọ obere ka anyị gbaruo ọsọ ahụ n’isi. E nwere ike ịsị na anyị na-ahụzi ebe ahụ anyị ga-agbaru. Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe, Jehova enyekwara anyị aka, anyịnwa ga-enwekwa ike ‘iyipụ ihe ọ bụla dị arọ nakwa mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị.’ N’eziokwu, anyị ga-agbali ọsọ ahụ otú anyị ga-agbata ihe a na-agbata n’ọsọ, ya bụ, ọtụtụ ngọzi Jehova bụ́ Chineke anyị na Nna anyị kwere ná nkwa.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ụdị ihe a na-agbakasị ndị Juu oge ochie ahụ́. Dị ka akwụkwọ Makabii nke abụọ nke apọkrịfa si kwuo, nke a wetara nnukwu nsogbu mgbe Jasịn, bụ́ nnukwu ụkọchukwu na-ejighị okpukpe kpọrọ ihe, mere atụmatụ iwu ama egwuregwu na Jeruselem n’ihi na ọ chọrọ ka ndị ọzọ mewe ka ndị Grik.—2 Makabii 4:7-17.

Ì Chetara?

• Gịnị ka anyị ga-eme iji yipụ “ihe ọ bụla dị arọ”?

• Gịnị nwere ike ime ka Onye Kraịst kwụsị inwe okwukwe?

• Gịnị mere anyị ji kwesị ilekwasị anya n’ihe a na-agbata n’ọsọ nke ndụ ahụ?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Gịnị bụ “mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị,” oleekwa otú o nwere ike isi kegide anyị?