Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Ọ̀ ma Gị?

Jehova Ọ̀ ma Gị?

Jehova Ọ̀ ma Gị?

“Jehova maara ndị bụ́ ndị ya.”—2 TIM. 2:19.

1, 2. (a) Olee ihe Jizọs na-anaghị eji egwu egwu? (b) Olee ajụjụ ndị onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya?

E NWERE otu ụbọchị otu onye Farisii bịakwutere Jizọs jụọ ya, sị: “Olee iwu kasị ukwuu n’ime Iwu ahụ?” Jizọs zara ya, sị: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Mat. 22:35-37) Jizọs hụrụ nna ya nke eluigwe n’anya nke ukwuu, o mekwara ihe ahụ ọ gwara onye Farisii ahụ. Otú Jizọs si kwesị ntụkwasị obi ná ndụ ya niile gosikwara na ọ naghị eji ihe banyere ime uche Jehova egwu egwu. Ọ bụ ya mere o ji kwuo obere oge tupu ya anwụọ na Chineke ma na ya ji ikwesi ntụkwasị obi debe iwu Ya. Jizọs si otú a nọgide n’ịhụnanya Jehova.—Jọn 15:10.

2 E nwere ọtụtụ ndị na-ekwu taa na ha hụrụ Chineke n’anya. Anyịnwa sokwa ná ndị na-ekwu otú ahụ. Ma, ajụjụ ndị dị mkpa onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya bụ: ‘Chineke ọ̀ ma m? Olee otú Jehova si ele m anya? Ndị ọzọ hà ma na m bụ nke Jehova?’ (2 Tim. 2:19) Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù na anyị na Ọkaakaa eluigwe na ụwa nwere ike ịdị n’ezigbo mma.

3. Olee ihe mere o ji na-adị ụfọdụ ndị ka ha enweghị ike ịbụ nke Jehova, oleekwa ihe ga-enyere ha aka ịkwụsị ịna-eche otú ahụ?

3 Ma, e nwere ụfọdụ ndị hụrụ Jehova n’anya ọ na-esiri ike ikweta na ha na Jehova nwere ike ịbụ enyi. Ụfọdụ na-eche na o nweghị ihe ha bụ, nke a emeekwala ka obi ghara isicha ha ike na ha nwere ike ịbụ nke Jehova. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova esighị otú ahụ ele anyị anya. (1 Sam. 16:7) Pọl onyeozi gwara ndị Kraịst ibe ya, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ Chineke n’anya, onye a bụ onye Ọ maara.” (1 Kọr. 8:3) Tupu Chineke amara gị, ị ga-eburịrị ụzọ hụ ya n’anya. Chebara ajụjụ ndị a echiche: Olee ihe mere i ji na-amụ Ụlọ Nche a? Olee ihe mere i ji na-agba mbọ ka i jiri obi gị dum, mkpụrụ obi gị dum, uche gị dum, na ike gị dum na-efe Jehova? Ọ bụrụ na ị rarala onwe gị nye Jehova e meekwa gị baptizim, olee ihe mere i ji mee otú ahụ? Baịbụl kwuru na Jehova, bụ́ onye na-enyocha obi, na-adọtara onwe ya ndị a na-achọsi ike. (Gụọ Hegaị 2:7; Jọn 6:44.) N’ihi ya, ọ bụrụ na i kwuo na ị na-efe Jehova n’ihi na ọ dọtara gị, i kwutara ya. Jehova agaghị ahapụ ndị ọ dọtara ma ọ bụrụhaala na ha anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. Ha dị nnọọ oké ọnụ ahịa n’anya ya, ọ hụkwara ha n’anya nke ukwuu.—Ọma 94:14.

4. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịna-ajụ onwe anyị ma Chineke ọ̀ ka ma anyị?

4 Jehova dọtahaala anyị, ihe anyị ga na-echezi kwesịrị ịbụ otú anyị ga-esi nọgide n’ịhụnanya ya. (Gụọ Jud 20, 21.) Cheta na Baịbụl kwuru na anyị nwere ike ịkpafu ma ọ bụ hapụ Chineke. (Hib. 2:1; 3:12, 13) Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi kwuru banyere Haịmeniọs na Faịlitọs obere oge tupu ya ekwuo ihe ahụ dị na 2 Timoti 2:19. Ọ ga-abụ na o nwere mgbe mmadụ abụọ ahụ bụ ndị Jehova, ma ha mechara hapụ eziokwu ahụ. (2 Tim. 2:16-18) Chetakwa na ụfọdụ nọ n’ọgbakọ ndị dị na Galeshia, bụ́ ndị Chineke mabu, anọgideghị n’ọgbakọ, bụ́ ebe na-emebu ka ha na-enwe obi ụtọ. (Gal. 4:9) Ya enwekwala mgbe anyị ga-eji adịm ná mma anyị na Chineke, bụ́ nke dị oké ọnụ ahịa, gwurie egwu.

5. (a) Olee ụfọdụ àgwà ndị na-amasị Chineke? (b) Olee ihe nlereanya ndị anyị ga-atụle?

5 E nwere àgwà ndị na-amasị nnọọ Jehova. (Ọma 15:1-5; 1 Pita 3:4) E nwere ndị Chineke ma n’ihi na ha nwere okwukwe, dịrịkwa umeala n’obi. Ka anyị tụlee banyere ndị ikom abụọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ma hụ otú àgwà ndị ahụ si mee ka ha na Jehova dịrị n’ezigbo mma. Anyị ga-atụlekwa banyere otu nwoke na-ebuli onwe ya elu ma na-eche na Chineke ma ya, bụ́ onye mechara chọpụta na Jehova ajụla ya. Anyị nwere ike isi n’ihe nlereanya ndị a mụta ọtụtụ ihe ga-abara anyị ezigbo uru.

Nna nke Ndị Nwere Okwukwe

6. (a) Olee otú Ebreham si gosi na ya nwere okwukwe ná nkwa ndị Jehova kwere ya? (b) Olee otú o si bụrụ na Jehova ma Ebreham?

6 Ebreham bụ nwoke “nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ.” N’eziokwu, a kpọrọ ya “nna nke ndị niile nwere okwukwe.” (Jen. 15:6; Rom 4:11) Ọ bụ okwukwe ka Ebreham ji hapụ ụlọ ya, ndị enyi ya, na ihe ndị o nwere ma jee biri n’ala dị anya. (Jen. 12:1-4; Hib. 11:8-10) Ka ọtụtụ afọ gachara, Ebreham ka nọ na-enwe okwukwe. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ mgbe ‘ọ chọrọ ịchụ Aịzik nwa ya n’àjà’ nke bụ́ ihe Jehova gwara ya mee. (Hib. 11:17-19) Ebreham gosiri na ya nwere okwukwe ná nkwa ndị Jehova kwere ya, n’ihi ya, Jehova weere ya ka onye pụrụ iche. N’eziokwu, Jehova ma Ebreham. (Gụọ Jenesis 18:19.) Otú Jehova si mara ya abụghị naanị na ọ ma na e nwere onye a na-akpọ Ebreham, o weere Ebreham ka ezigbo enyi ya.—Jems 2:22, 23.

7. Olee ihe anyị na-ekwesịghị ichefu banyere nkwa ọ bụla Jehova kwere, oleekwa otú Ebreham si were nkwa ndị Jehova kwere ya?

7 Otu ihe anyị na-ekwesịghị ichefu bụ na Ebreham enwetaghị ala ahụ e kwere ya ná nkwa mgbe ọ nọ ndụ. Ọ hụghịkwa mgbe mkpụrụ ya dịrị ka “àjà dị n’ụsọ oké osimiri.” (Jen. 22:17, 18) Ọ bụ eziokwu na nkwa ndị a emezughị n’ihu Ebreham, ọ nọgidere na-enwe okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ. Ọ ma na ihe ọ bụla Chineke kwuru ga-emezurịrị. Otú o sikwa bie ndụ gosiri na o nwere okwukwe na Chineke ga-emezu ihe niile o kwere ná nkwa. (Gụọ Ndị Hibru 11:13.) Jehova ọ̀ ma anyị ka ndị nwere ụdị okwukwe Ebreham nwere?

Onye Na-echere Jehova Na-egosi na Ya Nwere Okwukwe

8. Olee ezigbo ihe ụfọdụ ndị na-atụsi anya ha ike?

8 O nwere ike ịbụ na e nwere ihe ndị anyị na-atụsi anya ha ike. Ihe ndị na-amasịkarị anyị bụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ịmụ ụmụ, na ịnọ n’arịaghị ọrịa, ọ bụkwa otú o kwesịrị ịdị. Ma, o nwere ike otu n’ime ihe ndị a ma ọ bụdị ọtụtụ agaghị eru ọtụtụ ndị aka. Ọ bụrụ na ọ dị anyị otú ahụ, otú anyị si edi ihe ndị a ga-egosi otú okwukwe anyị siruru ike.

9, 10. (a) Olee otú ụfọdụ ndị sirila chọọ inweta ihe ndị ha na-achọsi ike? (b) Obi ò siri gị ike na Chineke ga-emezu nkwa niile o kwere?

9 Ya enwekwala mgbe anyị ga-achọ inweta ihe ndị a n’ụzọ Chineke na-akwadoghị. Ime nke a ga-emebi adịm ná mma anyị na Jehova. Dị ka ihe atụ, e nweela ndị kwetara ka a gwọọ ha otú iwu Jehova na-akwadoghị. E nwekwaala ndị na-arụ ọrụ na-eme ka ha na ezinụlọ ha ghara ịna-ahụ, ma ọ bụkwanụ na-eme ka ha ghara ịna-aga ọmụmụ ihe. Gịnịkwanụ banyere nwanna iso onye na-abụghị nwanna ibe ya na-akpa maka ọlụlụ? Ọ bụrụ na Onye Kraịst ana-eme ụdị ihe a, à ga-asị na ọ chọrọ n’eziokwu ka Jehova mara ya? Olee otú ọ gaara adị Jehova ma a sị na ọ bịara dịwa Ebreham ka Chineke ọ̀ na-egbu oge imezu nkwa ndị o kwere ya? Jehova ọ̀ gaara ama Ebreham ma a sị na Ebreham chọwara iji aka ya mezuo nkwa ndị ahụ Jehova kwere ya, gaa chọrọ otu ebe biri ma meere onwe ya aha na-ewu ewu kama ichere Jehova? (Tụlee Jenesis 11:4.) Ọ̀ gaara na-abụ enyi Jehova?

10 Olee ihe ndị ị na-achọsi ike ka ha mee ná ndụ gị? Okwukwe gị ò siruru ike otú ga-eme ka i nwee ike ichere Jehova, bụ́ onye na-ekwe gị nkwa na ya ga-enye gị ihe ndị kwesịrị ekwesị na-agụ gị? (Ọma 145:16) Dị ka ọ dị n’oge Ebreham, nkwa ụfọdụ Jehova kwere nwere ike ha agaghị emezu ngwa ngwa otú anyị chọrọ. Ma, Jehova chọrọ ka anyị nwee okwukwe yiri nke Ebreham, meekwa ihe gosiri na anyị nwere okwukwe. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ ọ ga-abara anyị ezigbo uru.—Hib. 11:6.

Otú Ịdị Umeala n’Obi Si Dị Iche na Mpako

11. Olee ihe ùgwù ndị ọ ga-abụ na Kora nwere, oleekwa ihe nke ahụ na-egosi banyere otú o si were ofufe Chineke?

11 Ka anyị tụlee ihe banyere Mozis na Kora. Mozis rubeere Jehova isi n’ihe niile ọ chọrọ ka o mee ma Kora emeghị otú ahụ. Ọ bụ ihe onye nke ọ bụla n’ime ha mere mere Jehova ji were ya otú o si were ya. Kora bụ onye Livaị nke si n’ezinụlọ Kohat, o nwekwara ọtụtụ ihe ùgwù. Ọ ga-abụ na ụfọdụ n’ime ha bụ na ọ hụrụ mgbe a napụtara mba Izrel ma mee ka ha si n’Oké Osimiri Uhie gafee, ọ ga-abụkwa na ọ kwadoro ikpe Jehova mara ndị Izrel nupụrụ isi n’Ugwu Saịnaị, sorokwa ná ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ ahụ. (Ọpụ. 32:26-29; Ọnụ Ọgụ. 3:30, 31) Ihe ndị a gosiri na o rubeere Jehova isi ruo ọtụtụ afọ, nke a mekwara ka ọtụtụ ndị Izrel kwanyere ya ùgwù.

12. Dị ka e gosiri n’ihe osise dị na peeji nke 28, olee otú mpako Kora si mee ka Chineke gharazie ịma ya?

12 Ma, tupu mba Izrel eruo Ala Nkwa ahụ, e nwere mgbe Kora chere na otú e si edu ụmụ Izrel adịchaghị mma. Ndị ikom ndị ọzọ dị narị abụọ na iri ise, bú ndị isi ná mba Izrel, dụnyeere Kora ùkwù. Ọ ga-abụrịrị na Kora na ndị ikom ndị ọzọ ahụ chere na o nweghị ihe ga-eme adịm ná mma ha na Jehova. Ha gwara Mozis na Erọn, sị: “O zuworo unu, n’ihi na nzukọ a dum dị nsọ, Jehova nọkwa n’etiti ha.” (Ọnụ Ọgụ. 16:1-3) Ihe a Kora na ndị òtù ya kwuru gosiri na ha chere na Jehova kwụ ha n’azụ, o gosikwara na ha dị mpako. Mozis gwara ha, sị: “Jehova ga-eme ka a mara onye bụ́ nke ya.” (Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 16:5.) Mgbe ọ na-erule n’abalị echi ya, Kora na ndị niile dụnyeere ya ùkwù anwụọla.—Ọnụ Ọgụ. 16:31-35.

13, 14. Olee ụzọ dị iche iche Mozis si gosi na ya dị umeala n’obi?

13 Mozis adịghị ka Kora. “[Ọ] dị nnọọ umeala n’obi karịa mmadụ niile nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụ. 12:3) O ji obi ya niile mee ihe niile Jehova kwuru ka o mee, sikwa otú ahụ gosi na ya dị nwayọọ n’obi nakwa na ya dị umeala n’obi. (Ọpụ. 7:6; 40:16) E nweghị ebe e kwuru na Mozis na-enyokarị otú Jehova kwuru ka e si mee ihe enyo ma ọ bụ na o ji iwe jụ iso ntụziaka Jehova nyere ya. Dị ka ihe atụ, Jehova kwuru ihe niile banyere otú a ga-esi rụọ ụlọikwuu ahụ. O kwuru ụcha eri a ga-eji akpa ákwà ya nakwa anya nko ole a ga-adụnye n’ákwà ụlọikwuu ahụ. (Ọpụ. 26:1-6) Ọ bụrụ na onye nlekọta bụ́ mmadụ ná nzukọ Chineke agwa gị ụmụ irighiri ihe niile ị ga-eme mgbe ọ na-enye gị ntụziaka, o nwere ike iwe gị iwe mgbe ụfọdụ. Ma, Jehova bụ onye nlekọta zuru okè, ọ bụkwa ya na-eji obi ya niile ahọpụta ndị ohu ya ọ tụkwasịrị obi ka ha na-elekọta ndị ọzọ. Mgbe ọ bụla Jehova gwara anyị ụmụ irighiri ihe ndị dị n’ihe ọ chọrọ ka anyị mee, ọ na-abụ maka abamuru anyị. Cheta na iwe abịaghị Mozis maka na Jehova gwara ya ụmụ irighiri ihe niile ọ chọrọ ka o mee. Mozis eweghịkwa ya na Jehova na-eleda ya anya ma ọ bụ na ọ na-egbochi ya iji ọgụgụ isi ya rụọ ọrụ ahụ. Kama ime otú ahụ, Mozis hụrụ na ndị na-arụ ụlọikwuu ahụ “mere nnọọ otú ahụ” Chineke kwuru. (Ọpụ. 39:32) N’eziokwu, Mozis gosiri na ya dị umeala n’obi. Mozis ma na ọ bụ Jehova nwe ọrụ ahụ nakwa na naanị ihe ya bụ bụ ngwá ọrụ Jehova ji na-arụ ọrụ ahụ.

14 Mozis gosikwara na ya dị umeala n’obi mgbe nsogbu ụfọdụ bịara ya. E nwere otu oge Mozis na-ejidelighi onwe ya mgbe ụmụ Izrel na-eme mkpesa. O nyeghị Chineke otuto ruuru ya. N’ihi ya, Jehova gwara ya na ọ bụghị ya ga-eduba mba Izrel n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 20:2-12) Ya na Erọn nwanne ya ediela ntamu ụmụ Izrel tamuru ruo ọtụtụ afọ. Ma, n’ihi otu ihe a Mozis mejọrọ, ọ gaghị enweta ihe ọ tụwara anya ya kemgbe. Olee ihe Mozis mere? Ọ bụ eziokwu na nke ahụ wutere ya, o ji umeala n’obi nabata mkpebi ahụ Jehova mere. Ọ ma na Jehova bụ Chineke nke na-eme ezi omume, ọ naghịkwa ekpe ikpe na-ezighị ezi. (Diut. 3:25-27; 32:4) I cheta Mozis taa, o doro anya na ị na-ekweta na Jehova ma ya.—Gụọ Ọpụpụ 33:12, 13.

Anyị Ga-adị Umeala n’Obi Iji Nwee Ike Irubere Jehova Isi

15. Gịnị ka ihe mpako Kora kpataara ya na-akụziri anyị?

15 Ihe so ekpebi ma Jehova ọ̀ ga-ama anyị ma ọ̀ bụ na ọ gaghị ama anyị bụ ihe anyị na-eme ma a gbanwee otú ihe ụfọdụ si aga ná nzukọ Jehova nakwa otú anyị si ewere mkpebi ndị na-edu ndú n’ọgbakọ na-eme. Kora na ndị òtù ya kewapụrụ onwe ha n’ebe Chineke nọ n’ihi na ha enweghị okwukwe, ha dịkwa mpako, na-eche na o nweghị ihe ga-eme ka ha ghara ịbụ nke Jehova. N’agbanyeghị na Kora chere na ọ bụ agadi nwoke bụ́ Mozis ji aka ya na-echepụta ihe ndị ahụ ọ nọ na-eme, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ Jehova nọ na-edu mba ahụ. Kora aghọtaghị nke a, ọ bụ ya mere o doghị onwe ya n’okpuru ndị Chineke ji na-arụ ọrụ. Ọ gaara akara Kora mma ma a sị na o cheere ka Jehova jiri nwayọọ nwayọọ mee ka ihe dokwuo ya anya ma ọ bụkwanụ ka Jehova jiri aka ya dozie ihe ndị ahụ o chere na ha anaghị aga otú kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ n’eziokwu na ha anaghị aga otú kwesịrị ekwesị. Ọ bụ otú a ka Kora si jiri mpako mebie ozi niile o ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova!

16. Olee otú ịdị umeala n’obi ka Mozis ga-esi mee ka Jehova mara anyị?

16 E nwere ihe dị ezigbo mkpa ihe mere Kora na ndị òtù ya na-akụziri ndị okenye nakwa ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ taa. Anyị ga-adị umeala n’obi iji nwee ike ichere Jehova nakwa iji nwee ike ịna-eme ihe ndị ọ họpụtara ka ha na-edu ndú n’ọgbakọ na-agwa anyị ka anyị mee. Otú anyị si akpa àgwà ọ̀ na-egosi na anyị dị umeala n’obi, dịrịkwa nwayọọ n’obi ka Mozis? Ànyị na-ewere ya na ọ bụ Jehova họpụtara ndị na-edu ndú n’etiti anyị ma na-eme ihe ha na-agwa anyị ka anyị mee? Mgbe ihe gara otú anyị na-atụghị anya ya ànyị na-ejide onwe anyị ma chere Jehova? Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ndị a, anyị ga-abụ ndị Jehova ma. Anyị na ya ga-adị n’ezigbo mma ma anyị dịrị umeala n’obi ma na-erubere ya isi.

Jehova Ma Ndị Bụ́ Ndị nke Ya

17, 18. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-abụ ndị Jehova ma na ha bụ ndị nke ya?

17 Ọ ga-abara anyị uru ma anyị chee echiche banyere ndị Jehova hụrụ n’anya nakwa ndị bụ́ ndị enyi ya. Ebreham na Mozis bụ ndị na-ezughị okè, ha mehiekwara ihe otú anyịnwa si emehie. Ma, Jehova weere ha ka ndị enyi ya na ndị nke ya. Otú Kora sikwa kpaa àgwà gosiri na ọ dị mfe mmadụ ịhapụ Jehova, nke ga-eme ka onye ahụ gharazie ịbụ enyi Jehova. Ọ ga-adị mma ma onye ọ bụla n’ime anyị jụọ onwe ya, sị: ‘Olee otú Jehova si ele m anya? Olee ihe m mụtara n’ihe atụ ndị a si na Baịbụl?’

18 N’eziokwu, Jehova na-ewere ndị na-erubere ya isi ka ndị bụ́ ndị nke ya. Nke a na-akasi anyị obi nke ukwuu. Na-egosi na i nwere okwukwe, na-adịkwu umeala n’obi, na-akpakwukwa àgwà ndị ọzọ ga-eme ka gị na Chineke dịkwuo ná mma. O doro anya na onye ọ bụla Jehova ma nwere ihe ùgwù pụrụ iche. Nke a na-eme ka onye ahụ na-enwe obi ụtọ ugbu a, ọ ga-emekwa ka o nweta ọtụtụ ngọzi ndị magburu onwe ha n’ọdịnihu.—Ọma 37:18.

Ì Chetara?

• Olee otú i nwere ike isi bụrụ nke Jehova?

• Olee otú i nwere ike isi nwee okwukwe ka Ebreham?

• Olee ihe anyị na-amụta n’akụkọ banyere Kora na Mozis?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

Ànyị nwere okwukwe otú Ebreham nwere na Jehova ga-emezu nkwa ya niile?

[Foto dị na peeji nke 28]

Kora achọghị iji obi umeala nabata ntụziaka e nyere ya

[Foto dị na peeji nke 29]

Jehova ọ̀ na-ele gị anya ka onye ji obi umeala na-anabata ntụziaka ndị a na-enye ya?