Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

À Ghaara Gị Ụgha?

À Ghaara Gị Ụgha?

À Ghaara Gị Ụgha?

OTU n’ime ihe ndị kacha ewute ewute ná ndụ bụ mmadụ ịmata na onye ọ tụkwasịrị obi ghaara ya ụgha. O nwere ike ịdị onye ahụ a ghaara ụgha ka ya àghọọla onye iberiibe, iwe nwekwara ike wewe ya, ma ọ bụdị ya adị ya ka à rafuru ya arafu. Ụgha na-ekewa enyi na enyi, na-etisakwa di na nwunye. A na-ejikwa ụgha egwu ọtụtụ ndị wayo.

Chezienụ otú ọ ga-adị gị ma ị mata na a ghaara gị ụgha banyere Chineke. Ọ bụrụ na i ji obi gị niile na-efe Chineke, ọ ga-ewute gị otú o si wute ndị na-aga chọọchị bụ́ ndị e kwuru okwu ha n’okpuru ebe a:

● “Ọ dị m ka ọ̀ bụ nrafu ka chọọchị m na-ekpe rafuru m.”—DEANNE.

● “Iwe were m. Ọ dị m ka à ghọgburu m aghọgbu, ihe niile m nọ na-atụ anya ha enweghịzi nke nwere isi.”—LUIS.

O nwedịrị ike isiri gị ike ikweta na a ghaara gị ụgha banyere Chineke. Onye kụziiri gị ihe ndị ị ma nwere ike ịbụ onye ị tụkwasịrị obi, na onye ị ma na o nweghị ihe ga-eme ka ọ kpachara anya mee ihe ga-ewute gị. Onye ahụ nwere ike ịbụ nne gị ma ọ bụ nna gị, ụkọchukwu, pastọ, ma ọ bụ ezigbo enyi gị. O nwekwara ike ịbụ kemgbe ị bụ nwata ka a kụziiri gị ihe ndị ahụ. Ma, ọ́ bụghị eziokwu na ihe ọtụtụ ndị kweere nwere ike ịbụ ụgha? Franklin D. Roosevelt, onye bụ́bu onyeisi ala mba Amerịka, kwetara na nke a bụ eziokwu. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “Ụgha agaghị emekata bụrụ eziokwu n’agbanyeghị ugboro ole a ghara ya.”

Olee otú ị ga-esi amata ma à ghaara gị ụgha? N’otu oge, mgbe Jizọs na-ekpe ekpere, ọ gwara Chineke, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) N’eziokwu, ihe niile ga-enyere anyị aka ịmata ihe bụ́ eziokwu na ihe bụ́ ụgha dị n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl.

Í cheghị na ọ ga-adị mma ka ị gụọ isiokwu ndị na-esonụ ka i wee hụ otú Baịbụl si gbaa ụgha ise a na-agha banyere Chineke n’anwụ? Ị ga-ahụ otú eziokwu nwere ike isi gbanwee ndụ gị ma mee ka ọ ka mma.