Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

1 Ọ̀ Bụ Eziokwu na Chineke Bụ Ihe Omimi?

1 Ọ̀ Bụ Eziokwu na Chineke Bụ Ihe Omimi?

1 Ọ̀ Bụ Eziokwu na Chineke Bụ Ihe Omimi?

Ihe ndị mmadụ na-ekwukarị: “Chineke bụ ihe omimi nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta aghọta.”

O nwere ike ịbụ na a kụziiri gị na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu Dị Ngọzi, kụziekwara gị na nke a bụ ihe omimi nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta aghọta.

Ihe Baịbụl na-akụzi: Jizọs kwuru na a ga-agọzi ndị ‘matara onye naanị ya bụ ezi Chineke.’ (Jọn 17:3) Ma, olee otú anyị ga-esi amata Chineke ma ọ bụrụ na ọ bụ ihe omimi? Chineke anaghị ezo onye ọ bụ ezo, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile mata ya.—Jeremaya 31:34.

O doro anya na o nweghị mgbe anyị ga-amatacha ihe niile banyere Chineke. Ọ bụ otú ahụ ka o kwesịrị ịdị n’ihi na echiche ya na ụzọ ya dị elu karịa nke anyị.—Ekliziastis 3:11; Aịzaya 55:8, 9.

Uru ịmata nke bụ́ eziokwu ga-abara gị: Ọ bụrụ na Chineke bụ ihe omimi nke a na-enweghị ike ịghọta aghọta, oleezikwanụ uru mmadụ ịgbawa mbọ ka ọ mata onye ọ bụ bara? Ma, ọ bụghị naanị na Chineke chọrọ ka anyị mata onye ọ bụ, kama ọ chọkwara ka anyị na ya bụrụ enyi. Chineke kpọrọ Ebreham, bụ́ nwoke nwere okwukwe, “enyi m.” Eze Izrel bụ́ Devid dekwara, sị: “Ọ bụ ndị na-atụ egwu Jehova ka ya na ha na-enwe mmekọrịta chiri anya.”Aịzaya 41:8; Abụ Ọma 25:14.

Mmadụ na Chineke inwe mmekọrịta chiri anya ò yiri gị ihe na-agaghị ekwe omume? Mmadụ nwere ike iche otú ahụ, ma legodị ihe Ọrụ 17:27 kwuru: ‘Chineke anọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.’ Olee otú o si bụrụ na ọ nọ anyị nso? Chineke si na Baịbụl na-agwa anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ịmata ya nke ọma. *

Ọ gwara anyị na aha ya bụ Jehova. (Aịzaya 42:8) Ọ kọọrọ anyị otú ya na ndị mmadụ si mekọọ ihe n’oge ndị gara aga ka anyị wee si otú ahụ mara ụdị onye ọ bụ. Nke ka nke bụ na Chineke mere ka anyị mata àgwà ya. Ọ bụ onye “na-eme ebere, na-emekwa amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu.” (Ọpụpụ 34:6) Omume anyị nwere ike iwute ya ma ọ bụ mee ka obi tọọ ya ụtọ. Dị ka ihe atụ, ndị Izrel oge ochie ‘kpasuru ya iwe’ mgbe ha nupụụrụ ya isi, ma ndị rubeere ya isi mere ka obi ya ṅụrịa.—Abụ Ọma 78:40; Ilu 27:11.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru banyere Chineke, gụọ isi nke 1 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

Ọ bụrụ na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu a na-enweghị ike ịghọta aghọta, olee otú anyị ga-esi amata onye ọ bụ?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 4]

Atọ n’Ime Otu c.1500, Flemish School, (16th century)/​H. Shickman Gallery, New York, USA/​The Bridgeman Art Library International