Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

3 Ọ̀ Bụ Eziokwu na Chineke Na-ata Ndị Mmadụ Ahụhụ Maka Ihe Ọjọọ Ha Mere?

3 Ọ̀ Bụ Eziokwu na Chineke Na-ata Ndị Mmadụ Ahụhụ Maka Ihe Ọjọọ Ha Mere?

3 Ọ̀ Bụ Eziokwu na Chineke Na-ata Ndị Mmadụ Ahụhụ Maka Ihe Ọjọọ Ha Mere?

Ihe ndị mmadụ na-ekwukarị: “Chineke na-edekọ ihe ọjọọ niile ndị mmadụ na-eme, ọ ga-atụbakwa ndị ajọ omume n’ọkụ ala mmụọ.”

“Chineke na-eji ọdachi ndị na-emere onwe ha ata ndị ajọ omume ahụhụ.”

Ihe Baịbụl na-akụzi: Na 2 Pita 3:9, Baịbụl kwuru na Jehova ‘achọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.’ Kama ịchọwa ebe anyị na-anaghị emeta, ọ na-elekwasị anya n’ebe anyị na-eme nke ọma. “Anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.”—2 Ihe E Mere 16:9.

Baịbụl anaghị akụzi na e nwere ọkụ ala mmụọ. Ịta ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ruo mgbe ebighị ebi abatatụbeghị Chineke n’obi. Ebe ọ bụ na ndụ bụ onyinye si n’aka Chineke, ihe kacha njọ ọ ga-eme ndị ajọ omume bụ igbu ha egbu. (Jeremaya 7:31; Ndị Rom 6:7) Ọ bụghịkwa Chineke na-akpata ọdachi ndị na-emere onwe ha. Ọdachi ndị ahụ bụ ihe ndabara, ha nwekwara ike ịdabara onye ọ bụla, ma onye ezi omume ma onye ajọ omume.—Ekliziastis 9:11.

Uru ịmata nke bụ́ eziokwu ga-abara gị: Anyị ga-abịarukwu Chineke nso ma ọ bụrụ na anyị aghọta na ọ dị “njikere ịgbaghara mmehie” nakwa na ọ naghị ama ụmụ mmadụ ikpe ngwa ngwa. (Abụ Ọma 86:5) Ihe mere anyị ga-eji na-efe Chineke abụghị n’ihi na obi anyị na-ama anyị ikpe maka ihe ọjọọ anyị mere ma ọ bụ n’ihi na anyị achọghị ka Chineke taa anyị ahụhụ. Kama nke ahụ, ihe kwesịrị ime ka anyị nwee okwukwe n’ebe Jehova nọ bụ n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya. Ịhụ Chineke n’anya ga-eme ka anyị gbalịsie ike na-eme ihe na-atọ ya ụtọ mgbe niile.—Matiu 22:36-38; 1 Jọn 5:3.

Ọ bụ eziokwu na Chineke chọrọ ka mmadụ niile mewe ihe ọma, ọ ma na ọtụtụ ndị agaghị eme otú ahụ. Ọ bụrụ na o nweghị ihe o mere ndị kpọchiri ntị na-eme ihe ọjọọ, ihe ọ pụtara bụ na ọ na-eme ka onyeisi ala nke tiri iwu, ma ọ bụrụ na mmadụ adaa iwu ahụ o tiri, o nweghị ihe ọ na-eme onye ahụ. Ihe a onyeisi ala a na-eme ga-eme ka arụrụala na nsogbu ju n’obodo ya. (Ekliziastis 8:11) Ịmara na Chineke agaghị agba nkịtị ka ihe ọjọọ dịrị ruo mgbe ebighị ebi na-eme ka obi sie anyị ike na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Chineke ekwela nkwa iwepụ ndị niile kpọchiri ntị na-eme ihe ọjọọ. Ọ ga-eme nke a ka “ndị dị umeala n’obi” nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ n’ụwa, nke bụ́ otú ọ chọrọ ka ọ dị kemgbe o kere ụwa.—Abụ Ọma 37:10, 11, 29. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú Chineke ga-esi mee ka ụwa a ghọọ paradaịs, gụọ isi nke 3 na nke 8 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Chineke ọ̀ ga-achọ ka anyị na-efe ya n’ihi na anyị achọghị ka ọ taa anyị ahụhụ?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 6]

Ihe e sere ese si n’aka Doré