Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

4 Ọ̀ Bụ Eziokwu na Ọ Bụ Chineke Na-akpata Mmegbu Dị n’Ụwa?

4 Ọ̀ Bụ Eziokwu na Ọ Bụ Chineke Na-akpata Mmegbu Dị n’Ụwa?

4 Ọ̀ Bụ Eziokwu na Ọ Bụ Chineke Na-akpata Mmegbu Dị n’Ụwa?

Ihe ndị mmadụ na-ekwukarị: “Ọ bụ Chineke na-achị ụwa a, ihe ọ bụla merenụ bụ uche ya. Ebe ọ bụ na ịkpọasị, mmegbu, na ahụhụ juru n’ụwa a, ọ ga-abụrịrị Chineke na-akpata ha.”

Ihe Baịbụl na-akụzi: Ọ bụghị Chineke na-akpata mmegbu dị n’ụwa. Baịbụl kwuru banyere Jehova, sị: “Ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ, n’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi.”—Diuterọnọmi 32:4.

Chineke na-emere mmadụ niile ihe ọma, ma ndị na-ekwesịghịdị ka e meere ha ihe ọma. Dị ka ihe atụ, “ọ na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Matiu 5:45) Otú o si emeso otu agbụrụ ka o si emeso agbụrụ ọzọ. Ọrụ 10:34, 35 sịrị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”

Ònyezi na-akpata mmegbu dị n’ụwa? Ọtụtụ ndị na-emegbu ndị ọzọ, ha achọghị ịna-akpa àgwà ka Chineke bụ́ onye na-ekpe ikpe ziri ezi. (Diuterọnọmi 32:5) Baịbụl gosikwara na Chineke hapụgodịrị onyeiro ya, bụ́ Ekwensu, ka ọ na-achị ụwa. * (1 Jọn 5:19) Ma n’oge na-adịghị anya, Chineke agakwaghị ekwe ka Ekwensu na-achị. O meelarị ndokwa otú ọ ga-esi “bibie ọrụ Ekwensu.”—1 Jọn 3:8.

Uru ịmata nke bụ́ eziokwu ga-abara gị: O nwere ike ihe ndị ị na-anụ banyere mmegbu, nrụrụ aka, na ahụhụ ndị mmadụ na-ata na-eme ka obi na-ajọ gị njọ. Ịmata ebe nsogbu niile a si ga-enyere gị aka ịghọta ihe mere ihe ọjọọ ji ju n’ụwa nakwa ihe mere mbọ niile ụmụ mmadụ na-agba ime ka ihe ka mma ji akụ afọ n’ala. (Abụ Ọma 146:3) Kama ịgbawa mbọ ka i mee ka ụwa ka mma, nke bụ́kwanụ ihe ị na-agaghị emeli, tụkwasị Chineke obi na ọ ga-eme ka ihe dị mma n’ọdịnihu dị ka o kwere ná nkwa.—Mkpughe 21:3, 4.

Ọ bụrụ na anyị amata onye ahụhụ na nsogbu niile juru n’ụwa a si n’aka, nsogbu bịara anyị, ọ ga-edo anyị anya na ọ bụghị Chineke ka o si n’aka. Mmadụ megbuo anyị, anyị nwere ike ịkọsara ya Chineke n’ekpere dị ka Habakọk bụ́ onye na-ejere Chineke ozi mere. Ọ sịrị: “Iwu adịkwaghị irè, a dịghị ekpe ikpe ziri ezi.” (Habakọk 1:4) Chineke abaghịrị Habakọk mba maka ihe a o kwuru. Kama, ọ gwara Habakọk ihe mere ka obi sie ya ike. Ọ gwara ya na ya ewepụtala oge ya ga-akwụsị nsogbu niile, nyekwara Habakọk aka inwe obi ụtọ n’agbanyeghị nsogbu ọ nọ na ya. (Habakọk 2:2-4; 3:17, 18) Ọ bụrụkwa na obi esie gị ike na Chineke ga-edozi nsogbu niile dị n’ụwa a, obi ga-eru gị ala n’agbanyeghị na mmegbu juru ebe niile taa.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata otú Ekwensu si malite ịdị, gụọ isi nke 3 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]

Ọ̀ bụ eziokwu na ọ bụ Chineke na-akpata ahụhụ na mmegbu dị n’ụwa?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 7]

© Sven Torfinn/Panos Pictures