Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

5 Ọ̀ Bụ Eziokwu na Otú Ọ Bụla Anyị Si Efe Chineke Dị Chineke Mma?

5 Ọ̀ Bụ Eziokwu na Otú Ọ Bụla Anyị Si Efe Chineke Dị Chineke Mma?

5 Ọ̀ Bụ Eziokwu na Otú Ọ Bụla Anyị Si Efe Chineke Dị Chineke Mma?

Ihe ndị mmadụ na-ekwukarị: “Otú ahụ e nwere ọtụtụ ụzọ e nwere ike isi gaa otu ebe, otú ahụkwa ka e nwere ọtụtụ ụzọ e nwere ike isi fee Chineke. Onye ọ bụla ga-eji aka ya chọta ụzọ ọ ga-esi na-efe Chineke.”

Ihe Baịbụl na-akụzi: Onye chọrọ ife Chineke kwesịrị iji obi ya niile na-efe ya, ọ bụghị ife ya n’elu ọnụ ma ọ bụ iji ihu abụọ na-efe ya. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ gwara ndị ndú okpukpe e nwere n’oge ahụ ihe mere Chineke ji jụ ofufe ha. Ọ sịrị ha: “Aịzaya buru amụma n’ụzọ kwesịrị ekwesị banyere unu, unu ndị ihu abụọ, dị ka e dere, sị, ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị nnọọ anya n’ebe m nọ.’” (Mak 7:6) Ma, ọ bụghị naanị mmadụ iji obi ya niile na-efe Chineke ga-eme ka ofufe ya dị Chineke mma.

Jizọs mere ka nke a doo anya mgbe o kwuru ihe kacha mee ka Chineke jụ ofufe ndị ndú okpukpe ahụ na nke ndị òtù ha. Jizọs gwara ha ihe e dere n’Okwu Chineke, sị: “Ọ bụ n’efu ka ha na-efe m ofufe, n’ihi na ozizi ha na-ezi bụ ihe mmadụ nyere n’iwu.” (Mak 7:7) Ihe mere ofufe ha ji bụrụ “n’efu,” ma ọ bụ ihe na-enweghị isi, bụ na ha na-eme ihe okpukpe ha kwuru kama ime ihe Chineke nyere n’iwu.

Kama ikwu na e nwere ọtụtụ ụzọ dị mma mmadụ nwere ike isi fee Chineke, Baịbụl kwuru na e nwere naanị otu ụzọ. Matiu 7:13, 14 sịrị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ ámá dị warara banye; n’ihi na okporo ụzọ nke na-eduba ná mbibi sara mbara ma dị obosara, ndị na-esikwa na ya abanye dị ọtụtụ; ma ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.”

Uru ịmata nke bụ́ eziokwu ga-abara gị: Weregodị ya na ị kwadebere nnọọ nke ọma ma soro gbaa ọsọ maratọn. Mgbe unu gbachara, ya abụrụ gị gbara onye mbụ. Ma, a gwaziri gị na o nweghị ihe a ga-enye gị n’ihi na o nwere iwu ị dara mgbe ị na-agba ọsọ ahụ, ị makwanụghị na e nwere iwu dị otú ahụ. Olee otú obi ga-adị gị? O nwere ike ịdị gị ka ị̀ kwọchara nnọọ aka tiere ọkụkọ akị. Ụdị ihe a ò nwere ike ime anyị n’ofufe anyị na-efe Chineke?

Pọl onyeozi ji ofufe anyị na-efe Chineke tụnyere egwuregwu ịgba ọsọ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla asọọ mpi n’egwuregwu, a dịghị ekpuwe ya okpu mmeri ma ọ bụrụ na ọ sọghị mpi dị ka iwu si dị.” (2 Timoti 2:5) Chineke ga-anabata ofufe anyị naanị mgbe anyị fere ya “dị ka iwu si dị,” ya bụ, otú ọ chọrọ ka anyị si na-efe ya. Ọ bụghị anyị ga-ekpebi otú anyị ga-esi efe Chineke otú ahụ onye na-agba ọsọ nke gbagara ebe sọrọ ya na-agaghị atụwa anya inweta ihe ọ bụla.

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke nabata ofufe anyị, anyị ekwesịghị ikwere ụgha ndị a na-agha banyere Chineke. Jizọs sịrị: “Ndị na-efe ezi ofufe ga-efe Nna m n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:23) Ọ bụ n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl ka anyị ga-esi mụta otú anyị ga-esi efe Chineke.—Jọn 17:17. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ụdị ofufe dị Chineke mma, gụọ isi nke 15 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Okpukpe niile hà na-akụziri ndị mmadụ ka ha na-efe Chineke otú Chineke chọrọ?