Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

I Nwere Ike Ịchọta “Ihe Ọmụma Chineke”

I Nwere Ike Ịchọta “Ihe Ọmụma Chineke”

Bịaruo Chineke Nso

I Nwere Ike Ịchọta “Ihe Ọmụma Chineke”

E NWERE akụ̀ dị oké ọnụ ahịa Jehova Chineke debeere anyị, ọ chọkwara ka anyị chọta ya. Akụ̀ a agaghị eme ka anyị baa ọgaranya, kama ọ ga-eme ka anyị nweta ihe ego niile dị n’ụwa na-agaghị azụtali. Ọ ga-eme ka obi ruo anyị ala, ka ihe anyị nwere ju anyị afọ, nakwa ka anyị na-enwe obi ụtọ ná ndụ. Gịnị bụ akụ̀ a a na-ekwu okwu ya? Sọlọmọn, bụ́ eze maara ihe, kọwara ihe akụ̀ ahụ bụ n’Ilu 2:1-6.

Sọlọmọn kwuru na akụ̀ a bụ “ihe ọmụma Chineke,” ya bụ, eziokwu ndị e dere na Baịbụl banyere Chineke nakwa banyere uche ya. (Amaokwu nke 5) E nwere ụzọ dị iche iche akụ̀ ahụ si abara anyị uru.

Ọ na-akụziri anyị ihe ndị bụ́ eziokwu. Baịbụl zara ajụjụ ndị dị ka: Gịnị bụ aha Chineke? (Abụ Ọma 83:18) Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ? (Abụ Ọma 146:3, 4) Olee ihe mere anyị ji biri n’ụwa a? (Jenesis 1:26-28; Abụ Ọma 115:16) Ọ̀ bụ na ịmata azịza ajụjụ ndị a adịghị mkpa karịa ego niile dị n’ụwa?

Ọ na-enye anyị ezigbo ndụmọdụ. Baịbụl na-agwa anyị otú kacha mma anyị ga-esi na-ebi ndụ. Ọ zara ajụjụ ndị dị ka: Olee ihe di na nwunye ga-eme ka ha na-ebi n’udo? (Ndị Efesọs 5:28, 29, 33) Olee otú ị ga-esi zụọ ụmụ gị ka ha baa uru? (Diuterọnọmi 6:5-7; Ndị Efesọs 6:4) Olee otú ị ga-esi na-enwe obi ụtọ ná ndụ? (Matiu 5:3; Luk 11:28) Ọ̀ bụ na i cheghị na ịmata azịza ajụjụ ndị a dị oké mkpa?

Ọ na-akọwara anyị ụdị onye Chineke bụ. Baịbụl bụ ebe bụ́ isi anyị si amụta eziokwu banyere Chineke. Baịbụl zara ajụjụ ndị dị ka: Olee ụdị onye Chineke bụ? (Jọn 1:18; 4:24) Ihe banyere anyị ọ̀ na-emetụ ya n’obi? (1 Pita 5:6, 7) Olee àgwà ya ndị kacha pụta ìhè? (Ọpụpụ 34:6, 7; 1 Jọn 4:8) Ọ̀ bụ na mmadụ ekwesịghị ịkwụ ego ọ bụla a sị ya kwụọ ka o wee mata eziokwu banyere Onye kere anyị?

“Ihe ọmụma Chineke” bụ́ akụ̀ n’eziokwu. Ma, olee otú ị ga-esi achọta ya? Otu ihe ga-enyere gị aka bụ ihe Sọlọmọn kwuru n’Ilu isi nke 2, amaokwu nke 4, bụ́ ebe o ji ihe ọmụma Chineke tụnyere “akụ̀ zoro ezo.” Chebagodịrị ihe a echiche: Akụ̀ dị n’ime ala agaghị anọkata jiri aka ya pụta n’elu ala ka ndị mmadụ were ya. Onye ọ bụla nke chọrọ inweta ya ga-agbarịrị mbọ chọta ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa ihe ọmụma Chineke. Ọ dị n’ime Baịbụl, onye chọrọ ya ga-agbakwa mbọ tupu ya achọta ya.

Sọlọmọn kwuru ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịchọta “ihe ọmụma Chineke.” Ihe o kwuru, nke bụ́ “nabata ihe m na-ekwu” na “jiri obi gị chọọ,” na-egosi na anyị kwesịrị iji obi anyị niile kwere Okwu Chineke. (Amaokwu nke 1 na nke 2) Ihe ndị ọzọ o kwukwara, nke bụ́ “na-akpọku” nakwa “na-achọ,” na-egosi na anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị wee chọta ya. (Amaokwu nke 3 na nke 4) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịchọta akụ̀ a, anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-amụsi Baịbụl ike.—Luk 8:15.

Anyị gosihaala na anyị chọrọ ịchọta akụ̀ ahụ, Jehova ga-enyere anyị aka ka anyị chọta ya. Ilu 2:6 kwuru na “ọ bụ Jehova na-enye amamihe.” Anyị agaghị enwe ike ịmụta eziokwu ndị dị na Baịbụl nke ọma ma ọ bụrụ na Chineke enyereghị anyị aka. (Jọn 6:44; Ọrụ 16:14) Obi sie gị ike na ọ bụrụ na i ji obi gị niile na-amụ Okwu Chineke, ị ga-achọta “ihe ọmụma Chineke,” nke bụ́ akụ̀ ga-akacha baara gị uru ná ndụ.—Ilu 2:10-21. *

Debe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Ọktoba:

Ilu 1-21

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ndịàmà Jehova n’ụwa niile na-aga na nke onye ọ bụla chọrọ ịghọta Baịbụl ka ha na onye ahụ mụọ Baịbụl n’efu. Ọ́ gaghị adị mma ka ị gwa Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ka ha bịa mụwara gị Baịbụl, ma ọ bụ gị ejiri otu n’ime adres dị na peeji nke 4 na magazin a detara anyị akwụkwọ ozi?