Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Gbachiteere Ndị Chineke

Ọ Gbachiteere Ndị Chineke

Ṅomie Okwukwe Ha

Ọ Gbachiteere Ndị Chineke

MGBE Esta banyewere n’ebe eze na-anọ n’obí ya dị na Shushan, o kuuru ume kuda. O nweghị onye batara otú a o si bata nke obi na-agaghị ekoro n’elu. Otú e si chọọ obí eze a mma na-egosi na nwoke a Esta na-aga ịhụ abụghị obere mmadụ. Dị ka ihe atụ, e ji brik ndị na-egbuke egbuke tụọ ọdụm, ndị na-agba ụta, nakwa oké ehi ndị nwere nku n’ahụ́ ụlọ ahụ, chọọkwa ogidi ụlọ ahụ mma. Ụlọ a dị n’akụkụ otu ugwu a na-akpọ Ugwu Zagros nke snoo na-ekpuchikarị elu ya, o chekwara ihu n’otu osimiri na-enwu gbaa nke a na-akpọ osimiri Koaspis. Nwoke a Esta na-aga ịhụ kpọrọ onwe ya “eze ukwu,” ọ bụkwa di Esta.

Nwoke a bụ́ di Esta, onye aha ya bụ Ahazuirọs, abụtụdịghị ụdị onye nwaanyị ọ bụla bụ́ onye Juu ga-echewe echiche ịlụ. * Àgwà ya adịghị ka nke Ebreham, bụ́ nwoke dị umeala n’obi nke gere nwunye ya bụ́ Sera ntị otú Chineke sịrị ya mee. (Jenesis 21:12) Eze ahụ amachaghị Jehova, bụ́ Chineke Esta, ma ọ bụkwanụ Iwu Ya, ma ọ bụrụ na o nwedịrị nke ọ ma ama. Ma, Ahazuirọs ma iwu ndị Peshia nke ọma, ọ makwa na e nwere iwu nke kwuru na Esta ekwesịghị ime ihe a ọ chọrọ ime. Gịnị ka iwu ahụ kwuru? O kwuru na a ga-egbu onye ọ bụla nke bịara n’ihu eze ndị Peshia ma ọ bụrụ na ọ bụghị eze kpọrọ onye ahụ. Eze akpọghị Esta, ma Esta na-aga ịhụ ya. Ka Esta rutewere nso n’ebe eze nwere ike ịnọ n’ocheeze ya hụ ya, o nwere ike ịdị Esta ka ò ji anya ya na-ahụ ọnwụ ya.—Esta 4:11; 5:1.

Gịnị mere Esta ji mewe ihe a nwere ike ịkpatara ya ọnwụ? Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’okwukwe nwaanyị ọma a? Ka anyị burugodị ụzọ chọpụta otú Esta si ghọọ nwunye eze Peshia.

‘Ọ Dị Mma Ile Anya’

Esta bụ nwa mgbei. E nweghị oké ihe e kwuru banyere ndị mụrụ ya na Baịbụl. Ndị mụrụ ya gụrụ ya Hadasa. Hadasa bụ okwu Hibru. Ọ pụtara osisi metụl, bụ́ osisi na-ama ifuru mara mma nke na-acha ọcha. Esta bụ nwata mgbe nne ya na nna ya nwụrụ. N’ihi ya, Mọdekaị bụ́ nwoke obiọma, onye bụ́ nwa nwanne nna Esta, meteere Esta ebere ma kpọrọ ya laa n’ụlọ ya, werezie ya ka nwa ya.—Esta 2:5-7, 15.

Mọdekaị na Esta bi n’isi obodo Alaeze Ukwu Peshia. Ha so ná ndị Juu a dọọrọ n’agha gaa n’ebe ahụ. O yiri ka ihe adịcharaghị Mọdekaị na Esta mfe n’ebe a ha bi n’ihi na ndị obodo ahụ enweghị mmasị n’ebe ha nọ maka na ha na-efe Chineke ma na-edebe Iwu ndị Juu. Ma, o doro anya na Esta bịara hụkwuo nwa nwanne nna ya n’anya n’ihi na ọ na-akụziri ya banyere Jehova, bụ́ Chineke ebere, onye napụtarala ndị ya ná nsogbu ọtụtụ ugboro n’oge gara aga, onye ka ga-anapụtakwa ha. (Levitikọs 26:44, 45) N’eziokwu, Esta na Mọdekaị bịara hụ nnọọ ibe ha n’anya, na-emekwa ka nna na nwa.

O yiri ka Mọdekaị ọ̀ na-arụ ọrụ n’ụlọ eze dị na Shushan. Ya na ndị ọzọ na-ejere eze ozi na-anọkarị n’ọnụ ụzọ ámá ụlọ ahụ. (Esta 2:19, 21; 3:3) Anyị amaghị ihe Esta na-arụ n’oge ọ na-eto, ma o nwere ike ịbụ na ọ na-arụrụ Mọdekaị ọrụ ụlọ. Ọ ga-abụ na ha bi n’ebe ndị ogbenye bi n’obodo ahụ, bụ́ nke dị ma a gafee osimiri ahụ chere ihu n’obí eze. O nwere ike ịbụ na ọ na-amasị ya ịga ahịa e nwere na Shushan, bụ́ ebe ndị na-eji ọlaedo na ọlaọcha akpụ ihe na ndị ahịa ndị ọzọ na-akpọsa ngwá ahịa ha. Esta agaghị echetụdị n’echiche na otu ụbọchị, ihe ọma ndị ahụ ọ na-ahụ ga-ezu ya ahụ́; ọ maghị ihe ọma na-echere ya.

A Chụpụ Nwunye Eze

Otu ụbọchị, nsogbu e nwere n’ụlọ eze ghọọrọ ndị bi na Shushan ihe akụkọ. N’ụbọchị ahụ, Ahazuirọs meere ndị ikom ọnụ na-eru n’okwu n’obodo ya oriri. Vashtaị, bụ́ nwunye ya, na ụmụ nwaanyị ibe ya nọkwa nke ha na-eri oriri. Ahazuirọs kpọrọ nwunye ọma ya ahụ òkù ka ọ bịa, ma Vashtaị jụrụ ịbịa. Ihe a wutere eze ahụ ma menye ya ihere, n’ihi ya, ọ jụrụ ndị ndụmọdụ ya ụdị ahụhụ e kwesịrị ịta Vashtaị. Olee ihe e mechara mee Vashtaị? E wepụrụ ya ka ọ ghara ịbụkwa nwunye eze. Ndị na-ejere eze ozi malitere ịchọgharị ọmarịcha ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke n’ebe niile n’ala ahụ; eze ahụ ga-ahọrọ otu onye n’ime ha ka ọ bụrụzie nwunye ya.—Esta 1:1–2:4.

O nwere ike ịbụ na Mọdekaị na-ele Esta anya mgbe ụfọdụ kwee n’isi, kwuo n’obi ya na nwa nwanne nna ya a etojuola agbọghọ, maakwa mma dị egwu. Ma, nke a ga na-enye ya nsogbu n’obi mgbe ụfọdụ. Baịbụl kwuru, sị: ‘Nwa agbọghọ ahụ mara mma n’ahụ́, dịkwa mma ile anya.’ (Esta 2:7) Mmadụ ịma mma elu ahụ́ dị mma, ma onye mara mma kwesịrị inwe amamihe ma dị umeala n’obi. Ma ọ́ bụghị ya, mma ya nwere ike buwe ya isi, meekwa ka ọ kpawa àgwà ọjọọ. (Ilu 11:22) Ị̀ hụtụla onye ọ dị otú ahụ? Ma, ònye ma ma mma Esta ọ̀ ga-abara ya uru ka ọ̀ ga-emebiri ya ihe? E mechaa anyị ga-ama.

Ndị na-ejere eze ozi hụrụ na Esta mara mma. Ha kpọnaara ya Mọdekaị kpọga ya ná nnukwu obí eze ahụ, ya na ụmụ agbọghọ ndị ọzọ ha chọtara. (Esta 2:8) O doro anya na mkpọpụ a a kpọpụrụ Esta wutere Esta, wutekwa Mọdekaị n’ihi na ha abụọ dị ka nna na nwa. Mọdekaị agaghị achọ ka Esta lụọ onye na-anaghị efe Jehova, ọ sọgodị onye ahụ ya bụrụ eze, ma o nweghị ihe ọ ga-emeli. O doro anya na Esta tọrọ ntị n’ala nụrụ ndụmọdụ niile Mọdekaị nyere ya tupu ha akpọrọ ya pụọ. E nwere ọtụtụ ajụjụ na-agbata ya n’obi mgbe ahụ ha kpọ ya na-aga Shushan bụ́ obí eze. Olee otú ụwa ya ga-adịwazi?

Ihe Ya “Na-amasị Onye Ọ bụla Hụrụ Ya”

Esta anọtụbeghị n’ụdị ebe a a kpọgara ya. O so ‘n’ọtụtụ ụmụ agbọghọ’ ndị e si n’ebe dị iche iche n’Alaeze Ukwu ahụ kpọta. Ọ ga-abụrịrị na asụsụ na àgwà ụmụ agbọghọ ndị ahụ dịcha iche na nke ibe ha. Onye na-elekọta ha bụ otu onye na-arụrụ eze ọrụ nke aha ya bụ Hegaị. A ga-eji otu afọ zuru ezu chọọ ụmụ agbọghọ ahụ mma ma jiri mmanụ otite na-esi ísì ọma hịa ha aka n’ahụ́. (Esta 2:8, 12) O yiri ka nke a ọ̀ ga-eme ka mkpa ụmụ agbọghọ ahụ bụrụ naanị mma elu ahụ́, meekwa ka isi buwe ụfọdụ n’ime ha, nakwa ka onye ọ bụla chọwa otú ọ ga-esi kara ibe ya mma. Oleekwanụ maka Esta?

O nweghị onye ihe gbasara Esta na-echu ụra ka Mọdekaị. Baịbụl gwara anyị na kwa ụbọchị, ọ na-agaru nso n’ụlọ ebe ahụ ụmụ nwaanyị ahụ nọ ma na-agbalị ka ọ mata otú Esta mere. (Esta 2:11) Obi ga na-atọgbu ya atọgbu mgbe ọ bụla ndị na-eje ozi n’ebe ahụ kọtụụrụ ya otú ihe si na-aga. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

Ọ bụ n’ihi na otú Esta si na-akpa àgwà mere ka Hegaị nwee obiọma n’ebe ọ nọ nke na ọ kpọnyere Esta ụmụ agbọghọ asaa na-eje ozi ma kpọfee ya n’ebe kacha mma n’ụlọ ndị inyom ahụ. Baịbụl kwudịrị, sị: “N’oge ahụ niile ihe Esta na-amasị onye ọ bụla hụrụ ya.” (Esta 2:9, 15) Ọ̀ bụ naanị mma ya mere ihe ya ji na-amasị onye ọ bụla? Mba, e nwere ihe ndị ọzọ.

Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru, sị: “Esta emeghị ka a mata obodo o si ma ọ bụ ndị bụ́ ndị ikwu ya, n’ihi na Mọdekaị nyere ya iwu ka ọ ghara ikwu ya.” (Esta 2:10) Mọdekaị gwara Esta ka ọ ghara ịkọrọ onye ọ bụla ọ hụrụ na ya bụ onye Juu; o doro anya na Mọdekaị ahụla na ụfọdụ ndị nọ n’obí eze kpọrọ ndị Juu asị. Obi dị ya ụtọ ịmata ugbu a na n’agbanyeghị na ya na Esta ebighịzi, Esta ka na-erubere ya isi otú ọ na-emebu ma na-egosi na ọ ka ma ihe.

Taa, ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ nwekwara ike ime ka obi na-atọ ndị mụrụ ha ma ọ bụ ndị na-elekọta ha ụtọ. Mgbe ha na ndị mụrụ ha na-anọghị, ya bụrụgodị na ndị ha na ha nọ bụ ndị na-eme omume rụrụ arụ ma ọ bụ ihe ọjọọ ndị ọzọ, ha nwere ike ịnọgidesi ike na-eme ihe dị mma ma ghara ikwe ka e mebie omume ọma ha. Ha mee otú ahụ, ha ga-eme ka obi Nna ha nke eluigwe ṅụrịa dị ka Esta mere.—Ilu 27:11.

Mgbe oge ruru ka a kpọga Esta n’ihu eze, a gwara ya ka o were ihe ọ bụla o chere dị ya mkpa. O nwere ike ịbụ na ihe ahụ a gwara ya were bụ ihe ọ ga-eji chọkwuo onwe ya mma. Ma, o gere ntị na ndụmọdụ Hegaị nyere ya. Ọ rịọghị ka e nyekwuo ya ihe ndị ọzọ n’elu ndị nke e nyere ya. (Esta 2:15) Ọ ga-abụ na ọ ghọtara na ihe ga-eme ka eze nwee mmasị n’ebe ọ nọ abụghị naanị mma ya; ihe ga-aka amasị eze bụ ịdị umeala n’obi. Nke a ọ̀ bụ eziokwu?

Baịbụl kwuru, sị: “Eze wee hụ Esta n’anya karịa ndị inyom ndị ọzọ niile, nke mere ka o nweta ihu ọma ya na obiọma ya karịa ụmụ agbọghọ niile ndị ọzọ na-amaghị nwoke. O wee kee ya ákwà isi a na-eke nwunye eze ma mee ya nwunye eze n’ọnọdụ Vashtaị.” (Esta 2:17) O doro anya na ọ dịrịghị nwa agbọghọ a ọ na-enweghị ka ọ hà ya, bụ́ onye Juu, mfe ịgbanwe otú o si ebi ndụ. Ihe ọ bụzi ugbu a bụ nwunye eze kachanụ e nwere n’ụwa n’oge ahụ! Nke a ò mere ka isi buwe ya, ya adịzie mpako?

Mbanụ! Esta ka nọkwa na-erubere Mọdekaị isi. O nweghị onye ọ gwara na ya bụ onye Juu. Mgbe Mọdekaị chọpụtara na o nwere ndị chọrọ igbu Ahazuirọs, ọ gwara Esta, Esta agaa kọọrọ eze, aka akparazie ndị ọjọọ ahụ. (Esta 2:20-23) Esta gosikwara na ya nwere okwukwe na Chineke ya n’ihi na ọ nọgidere na-adị umeala n’obi ma na-erube isi. O nwechaghị ihe ndị mmadụ ji nrubeisi kpọrọ n’oge a, o sikwara ike ịhụ onye na-erube isi. Ma, ndị nwere ezigbo okwukwe, dị ka Esta nwere, anaghị eji nrubeisi egwuri egwu.

E Lere Okwukwe Esta Ule

Otu nwoke a na-akpọ Heman bịara ghọọ onye a ma ama n’obí eze. Ahazuirọs mere ya osote ya, jirikwa ya mere onye ndụmọdụ ya na onye nke abụọ n’alaeze ahụ. Eze kwudịrị na ọ bụ iwu na onye ọ bụla hụrụ Heman ga-ehulata kpọọrọ ya isiala. (Esta 3:1-4) Ma, iwu ahụ adịghị Mọdekaị mma. Ọ masịrị ya irubere eze isi, ma ọ bụghịzi nke ime ihe eze kwuru ma nupụrụ Chineke isi. Otu ihe dị mkpa kpatara ya bụ na Heman bụ “onye agbụrụ Egag.” Nke a pụtara na ọ bụ onye ezinụlọ Egag, bụ́ eze ndị Amalek, onye Samuel onye amụma Chineke gburu. (1 Samuel 15:33) Ndị Amalek bụ nnọọ ndị ọjọọ nke na ha mere onwe ha ndị iro Jehova na ndị iro ụmụ Izrel. Chineke mara ndị Amalek niile ikpe. * (Diuterọnọmi 25:19) Oleezi otú onye Juu nke ji ofufe Chineke kpọrọ ihe ga-esi akpọrọ onye Amalek ahụ si n’ezinụlọ eze Egag isiala? Mọdekaị agaghị eme ụdị ihe a. Ọ jụwapụrụ isi. Ruokwa taa, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ndị nwere okwukwe ekpebisiela ike irubere Chineke isi n’agbanyeghị na e nwere ike igbu ha. Ha na-eme nnọọ ka ndịozi Jizọs bụ́ ndị sịrị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.

Ihe a were Heman iwe. Ma, ihe ọ chọrọ ime abụghị naanị igbu Mọdekaị, ọ chọkwara igbu ndị niile bụ́ ndị obodo Mọdekaị. Heman gara kọọrọ eze na ndị Juu bụ ndị ọjọọ. Kama ịkpọ ha aha n’ihu eze, o ji akọ gwa eze na ndị ahụ bụ ndị na-abaghị uru ná ndụ, nakwa na ha ‘gbasara ebe niile ma bụrụ ndị nọpụrụ iche n’etiti ndị niile.’ Nke ka njọ bụ na o kwuru na ndị ahụ anaghị erubere iwu eze isi; n’ihi ya, na ha bụ ndị nnupụisi a na-ekwesịghị inwe n’obodo. O kwuru na ya ga-etinyere eze ego buru ibu n’ebe eze na-edebe akụ̀ iji kwụọ ụgwọ ihe a ga-emefu n’igbu ndị Juu niile nọ n’alaeze ahụ. * Ahazuirọs nyere Heman mgbaaka ya ka o were ya bịanye aka n’iwu ọ bụla ọ chọrọ inye iji mezuo ihe o bu n’obi.—Esta 3:5-10.

N’oge na-adịghị anya, ndị ozi malitere iji ịnyịnya na-aga n’ebe dị iche iche n’alaeze ahụ, na-ekwu na a ga-ala ndị Juu n’iyi. Chegodị otú obi ga-adị ndị Juu, bụ́ ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha na Babịlọn laghachi Jeruselem, mgbe ha nụrụ ozi ahụ. Ndị Juu ahụ ka nọgodị na-agbalị iwughachi Jeruselem. Jeruselem enwekwanụghị mgbidi ọ bụla gbara ya gburugburu mgbe ahụ bụ́ nke ga-echebe ndị bi n’ime ya. O nwere ike ịbụ na Mọdekaị chetara ha, chetakwa ndị enyi ya na ndị ikwu ya bi na Shushan mgbe ọ nụrụ ozi ọjọọ ahụ. O wutere ya nke ukwuu nke na ọ dọwara uwe ya, yiri ákwà iru uju ma kpokwasị onwe ya ntụ n’isi ma nọrọ n’etiti obodo ahụ na-eti mkpu ákwá. Ma Heman na eze nọdụrụ ala na-aṅụ mmanya, obi ọjọọ ahụ ọ kpataara ndị Juu na ndị enyi ha bi na Shushan emetụghịkwa ya n’ahụ́.—Esta 3:12–4:1.

Mọdekaị maara na ya ekwesịghị ịgba nkịtị. Ma, oleekwanụ ihe ọ ga-eme? Esta nụrụ na ọ nọ ná mwute ma chịgara ya uwe, ma Mọdekaị ekweghị ka a kasie ya obi. O nwere ike ịbụ na ọ dịla anya o chewere ihe mere Chineke ya, bụ́ Jehova, ji kwe ka a kpọnara ya Esta ọ hụrụ n’anya, kwekwa ka e mee Esta nwunye eze nke na-efe arụsị. O yiri ka ọ̀ ghọtawala ihe kpatara ya. Mọdekaị zigaara Esta bụ́ nwunye eze ozi, rịọ ya ka ọ gaa rịọ Eze arịrịọ “maka ndị ya.”—Esta 4:4-8.

Ọ ga-abụrịrị na ụjọ jidere Esta mgbe ọ nụrụ ozi ahụ. Ọ bụ oge a ka a kacha lee okwukwe ya ule. Ozi o zighachiiri Mọdekaị gosiri na ụjọ ji ya. O chetaara Mọdekaị iwu eze nyere. A ga-egbu onye ọ bụla gara n’ihu eze ma ọ bụrụ na eze akpọghị onye ahụ. Ọ gwụla ma eze ò setịịrị onye ahụ mkpanaka ọlaedo ya ga-eme ka a ghara igbu onye ahụ. Esta ọ̀ ga-atụwa anya na e nwere ike imere ya ebere ma ọ gaa n’ihu eze, karịchaa ma o cheta ihe e mere Vashtaị mgbe Vashtaị jụrụ ịbịa zaa eze òkù? Ọ gwara Mọdekaị na eze akpọbeghị ya ka ya bịa n’ihu ya kemgbe iri ụbọchị atọ. Ọkpụkpọ a ọ na-akpọbeghị Esta mere ka Esta chewe ma ọ̀ ga-abụ na ihe ya adịkwaghị eze a na-ewekarị iwe ọkụ mma. *Esta 4:9-11.

Mọdekaị zighachiiri Esta ozi nke mere ka okwukwe Esta sikwuo ike. Ọ gwara ya na ọ bụrụ na o nweghị ihe o mere, na nzọpụta ga-esi n’ebe ọzọ bịara ndị Juu. Ma olee otú Esta ga-esi chee na a ga-ahapụ igbu ya ma a malite igbu ndị Juu? Ihe Mọdekaị kwuru gosiri na o nwere okwukwe na Jehova. Ọ ma na Jehova agaghị ekwe ka e gbukpọọ ndị Ya, nkwa ndị O kwere agharazie imezu. (Jọshụa 23:14) Mọdekaị jụziri Esta, sị: “Ònye ma ma ọ̀ bụ n’ihi oge dị otú a ka i ji ruo n’ọkwá ịbụ nwunye eze?” (Esta 4:12-14) Mọdekaị tụkwasịrị Chineke ya, bụ́ Jehova, obi kpamkpam. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, Ànyị tụkwasịrị Jehova obi otú ahụ?—Ilu 3:5, 6.

Okwukwe nke Siri Ike Karịa Ụjọ Ọnwụ

Esta maara na oge ya kwesịrị ime ihe eruola. O ziri Mọdekaị ozi ka ọ gwa ndị Juu ibe ya ka ha soro ya buo ọnụ ụbọchị atọ. Okwu Esta ji pịachie ozi ahụ, bụ́ nke ọtụtụ ndị kwughachirila kemgbe ahụ, gosiri na o nwere okwukwe nakwa na obi siri ya ike. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na m ga-anwụ, ka m nwụọ.” (Esta 4:15-17) Ọ ga-abụrịrị na o kpesiri ekpere ike n’ime ụbọchị atọ ahụ karịa otú o kpetụrụla ná ndụ ya niile. Ma n’ikpeazụ, oge ruru ka o mee ihe o bu n’obi. O yiiri uwe ya kacha mma, chọọ onwe ya mma otú ga-eme ka eze nwee mmasị n’ebe ọ nọ. Ọ gawaziri.

Dị ka e kwuru ná mbido isiokwu a, Esta banyere n’obí eze. Ọnụ agaghị akọli otú obi si na-akụ ya kpum kpum na otú o si na-ekpesi ekpere ike n’ime obi ya ka ọ na-aga. O ruru n’ebe Ahazuirọs nwere ike isi n’ocheeze ya hụ ya. O nwere ike ịbụ na Esta lere ya anya n’ihu iji mata otú obi dị ya. Ọ bụrụ na a sịrị Esta cheretụ n’ebe ahụ, ọ ga-adị ya ka ọ̀ dịla anya o guzo ebe ahụ. Ma n’oge na-adịghị anya, di ya hụrụ ya. O jukwara di ya anya, ma ihu ya gosiri na iwe ejighị ya. O setịịrị Esta mkpanaka ọlaedo ya!—Esta 5:1, 2.

Eze anabatala Esta, ma dị njikere ige ya ntị. Esta emeela ihe gosiri na ọ chọrọ ịgbachitere Chineke ya na ndị ya, si otú a gosi ụdị okwukwe ndị niile na-efe Chineke kwesịrị inwe. Ma, ihe a o mere ka bụ mmalite. Olee otú ọ ga-esi mee ka eze kweta na onye ndụmọdụ ya ọ kacha hụ n’anya, bụ́ Heman, bụ onye ọjọọ nke kpara nkata ọjọọ? Olee otú Esta ga-esi eme ka a ghara igbu ndị ya? Anyị ga-eleba anya n’ajụjụ ndị a n’Ụlọ Nche ọzọ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ bụ Ahazuirọs bụ Xerxes nke Mbụ, bụ́ onye malitere ịchị Alaeze Ukwu Peshia n’ihe dị ka afọ 495 Tupu Oge Anyị.

^ par. 24 O nwere ike ịbụ na Heman so ná ndị Amalek ikpeazụ fọrọ ndụ, ebe ọ bụ na e gburu “ndị fọdụrụ” n’ime ha n’oge Eze Hezekaya.—1 Ihe E Mere 4:43.

^ par. 25 Heman kwuru na ya ga-enye eze iri puku talent ọlaọcha, nke bụ́ ọtụtụ nde dọla n’oge a. Ọ bụrụ na ọ bụ Ahazuirọs bụ Xerxes nke Mbụ, ọ ga-abụ ego ole ahụ Heman kwuru na ya ga-enye ya mere o ji nwekwuo mmasị n’ihe ahụ Heman chọrọ ime. Xerxes mefuru ego buru ibu n’agha ọ lụsoro ndị Gris, ndị Gris merikwara ya n’agha ahụ. O nwere ike ịbụ na a lụrụ agha ahụ tupu ya alụọ Esta.

^ par. 28 E ji iwe iwe ọkụ mara Xerxes nke Mbụ. Onye Gris bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, nke aha ya bụ Herodotus, kwuru ihe ụfọdụ gosiri na nke a bụ eziokwu n’ihe o dere banyere agha Xerxes lụsoro ndị Gris. Eze ahụ nyere iwu ka a rụọ àkwà mmiri nke dị ka ụgbọ bụ́ nke ha ga-eji gafee mmiri Helespont. Mgbe oké ifufe mebiri àkwà mmiri ahụ a rụrụ, Xerxes nyere iwu ka e gbupụ ndị rụrụ ya isi, ọ gwakwara ndị agha ya ka ha pịawa mmiri ahụ ụtarị mgbe a na-agụpụta ihe e dere ede ha ji bụọ mmiri ahụ ọnụ. Mgbe otu nwoke nke bara ọgaranya rịọrọ ka nwa ya nwoke ghara iso gaa agha ahụ, Xerxes nyere iwu ka e jiri mma kpọwaa nwa ahụ abụọ ma dewe ya n’ebe ndị mmadụ ga-ahụ ya iji dọọ ndị ọzọ aka ná ntị.

[Foto dị na peeji nke 19]

Mọdekaị nwere ezigbo ihe mere ọ ga-eji jiri nwa agbọghọ a o ji mere nwa na-eme ọnụ

[Foto dị na peeji nke 20]

Esta maara na ịdị umeala n’obi na amamihe bara ezigbo uru karịa mma elu ahụ́

[Foto dị na peeji nke 22, 23]

Esta mere ihe nwere ike ịkpatara ya ọnwụ iji chebe ndị Chineke