Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ka Anyị Soro Ndị Ọzọ Na-aṅụrị Ọṅụ!

Ka Anyị Soro Ndị Ọzọ Na-aṅụrị Ọṅụ!

Ka Anyị Soro Ndị Ọzọ Na-aṅụrị Ọṅụ!

Ọ NA-ESIRI ọtụtụ ndị ike taa inwe obi ụtọ na ịṅụrị ọṅụ. Ọ na-esikwara ha ike ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị ga-eme ka ha nwee obi ụtọ. Ihe ndị na-eme n’ụwa taa, karịchaa n’ebe ndị mepere emepe, emeela ka ọtụtụ ndị na-akpa iche.

Alberto Oliverio, bụ́ prọfesọ mụrụ banyere otú ndị mmadụ si akpa àgwà, kwuru na owu na-ama ọtụtụ ndị, nakwa na otú ihe si aga n’ebe ndị mepere emepe na-eme ka ọtụtụ ndị na-achọ ịnọrọ onwe ha. O kwuru na n’ihi nke a, ọtụtụ ndị anaghị achọ ịma banyere ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ, ndị agbata obi ha, ma ọ bụkwanụ ndị ha na-azụ ihe. Obi na-amalitekwa ịjọ ndị dị otú a njọ.

Ma, ụmụnna anyị anaghị achọ ime otú ahụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile.” (1 Tesa. 5:16) E nwere ọtụtụ ihe mere anyị kwesịrị iji na-enwe ọṅụ, sorokwa ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ. Anyị na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na anyị na-efe Jehova Chineke, Onye Kasị Ihe Niile Elu; anyị amụtala eziokwu ndị dị na Baịbụl; anyị nwere olileanya na a ga-azọpụta anyị, anyị adịrị ndụ ebighị ebi; anyị nwekwara ike inyere ndị ọzọ aka ka ha nweta ngọzi ndị a anyịnwa na-atụ anya ha.—Ọma 106:4, 5; Jere. 15:16; Rom 12:12.

Inwe ọṅụ na iso ndị ọzọ aṅụrị ọṅụ so n’ihe e ji ama ezigbo Ndị Kraịst. Ọ bụ ya mere o kwesịghị iju anyị anya na Pọl degaara ụmụnna ndị nọ na Filipaị akwụkwọ ozi, sị: “Enwere m obi ụtọ, esokwa m unu niile na-aṅụrị ọṅụ. Ma n’otu ụzọ ahụ, unu onwe unu, na-enwekwanụ ọṅụ, sorokwanụ m na-aṅụrị ọṅụ.” (Fil. 2:17, 18) N’agbanyeghị na ihe Pọl kwuru ebe a ebughị ibu, o kwuru ugboro abụọ banyere mmadụ iso ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ.

Ndị Kraịst kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara ịkpa iche. Onye ọ bụla nke na-akpa iche agaghị enwe ike iso ụmụnna ya na-aṅụrị ọnụ. Ugbu a, olee otú anyị ga-esi na-eme ihe Pọl gwara anyị ka anyị na-eme, ya bụ, ka anyị na ụmụnna anyị ‘na-aṅụrị ọṅụ n’ime Onyenwe anyị?’—Fil. 3:1.

Soro Ụmụnna Gị Na-aṅụrị Ọṅụ

Mgbe Pọl degaara ụmụnna ndị nọ na Filipaị akwụkwọ ozi, o nwere ike ịbụ na a tụrụ ya mkpọrọ na Rom n’ihi ikwusa ozi ọma. (Fil. 1:7; 4:22) Ma, mkpọrọ a tụrụ ya emeghị ka ọ kwụsị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Kama ime otú ahụ, ọ ṅụrịrị ọṅụ n’ihi na o ji ndụ ya niile na-ejere Jehova ozi, otú ahụ ndị na-achụrụ Jehova “àjà ihe ọṅụṅụ” si awụsịrị ya mmanya niile ha bu. (Fil. 2:17) Ihe a Pọl mere gosiri na ihe na-eme ka mmadụ na-aṅụrị ọṅụ abụghị otú ihe si dịrị ya. N’agbanyeghị na Pọl nọ n’ụlọ mkpọrọ, o kwuru, sị: “M ga na-aṅụrị ọṅụ.”—Fil. 1:18.

Ọ bụ Pọl hiwere ọgbakọ ahụ dị na Filipaị, ihe banyere ụmụnna nọ n’ọgbakọ ahụ na-emetụkwa ya nnọọ n’obi. Ọ ma na ọ bụrụ na ya na-akọrọ ha ọṅụ ya na-enweta n’ozi Jehova na ọ ga na-agba ha ume. Ọ bụ ya mere o ji dee, sị: “Ma achọrọ m ka unu mara, ụmụnna m, na ihe mere m emewo ka ozi ọma na-aga n’ihu kama ime ka ọ ghara ịga n’ihu, nke mere na Ndị Nche Eze niile na ndị niile ọzọ amarawo nke ọma banyere agbụ e kere m n’ihi Kraịst.” (Fil. 1:12, 13) Ịkọrọ ụmụnna ya ihe ndị a na-agba ume bụ otu n’ime ụzọ ndị Pọl si enwe ọṅụ, na-esokwa ha na-aṅụrị ọṅụ. O dokwara anya na ndị ahụ ọ kọọrọ ihe ndị ahụ sokwa ya ṅụrịa ọṅụ. Nke a pụtara na ha ekwesịghị ikwe ka ọnụnọ Pọl nọ n’ụlọ mkpọrọ mee ka obi daa ha mbà, kama ha kwesịrị iṅomi Pọl. (Fil. 1:14; 3:17) Ụmụnna ndị ahụ nọ na-etinye Pọl n’ekpere, na-emekwara ya ihe ọ bụla ha nwere ike imere ya iji nyere ya aka.—Fil. 1:19; 4:14-16.

Ànyị na-aṅụrị ọṅụ otú ahụ Pọl ṅụrịrị? Ànyị na-agba mbọ na-echeta ihe ọma ndị na-eme ná ndụ anyị nakwa ihe ọma ndị na-eme n’ozi anyị? Anyị na ụmụnna anyị nọrọ, ọ ga-adị mma ka anyị na-akọ ihe ndị na-eme anyị obi ụtọ n’ozi ọma anyị na-ekwusa. Anyị agaghị echere ruo mgbe ihe ndị pụrụ iche mere tupu anyị akọọrọ ha ihe ndị na-emenụ. Anyị nwere ike ịkọrọ ha ihe anyị kwuru iji mee ka mmadụ nwee mmasị ige anyị ntị n’ozi ọma, ma ọ bụ otú anyị si jiri otu amaokwu Baịbụl mee ka onye anyị gara na nke ya ghọta ihe Baịbụl na-akụzi. Ma ọ bụkwanụ, anyị nwere ike kọọrọ ha otú ndị mmadụ si mata na anyị bụ Ndịàmà Jehova n’ebe anyị gara kwusaa ozi ọma, naanị nke ahụ agbaakwara ha àmà. Ịkọrọ ụmụnna anyị ihe ndị a bụ otu n’ime ụzọ ndị anyị ga-esi soro ha na-aṅụrị ọṅụ.

Ọtụtụ ndị na-efe Jehova na-ahapụ ihe ụfọdụ ha na-eme iji nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma. Ndị ọsụ ụzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị na-eje ozi na Betel, ndị ozi ala ọzọ, na ndị na-eje ozi ná mba na-abụghị mba ha na-eme ihe niile ha nwere ike ime n’ozi oge niile, nke ahụ na-enyekwa ha ọṅụ. Ànyị na-eso ndị dị otú ahụ aṅụrị ọṅụ? Ọ bụrụ otú ahụ, ka anyị gosi ụmụnna anyị ndị a anyị hụrụ n’anya, bụ́ ‘ndị ọrụ ibe anyị maka alaeze Chineke,’ na obi dị anyị ụtọ n’ozi ha na-eje. (Kọl. 4:11) Anyị na ha nọrọ n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ ná mgbakọ, anyị nwere ike ịgba ha ume ka ha jisie ike n’ozi ha na-eje. Anyị nwekwara ike iji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ka ha. Anyị nwere ike iwepụta “ohere” kpọọ ha ka ha bịa n’ụlọ anyị ka anyị na ha nọrịa ma rie nri, anyị ejirikwa ohere ahụ gee ntị ka ha na-akọrọ anyị otú ozi ha si aga, na-agwakwa anyị okwu ndị ga-agba anyị ume.—Fil. 4:10.

Soro Ndị Nọ ná Nsogbu Na-aṅụrị Ọṅụ

Pọl diri mkpagbu a kpagburu ya na nsogbu ndị bịara ya, nke ahụ mekwara ka o kpebisie ike ịna-ejere Jehova ozi. (Kọl. 1:24; Jems 1:2, 3) Ọ ma na ụdị nsogbu bịaara ya nwekwara ike ịbịara ụmụnna ndị nọ na Filipaị, nakwa na otú ya si nọsie ike n’akụkụ Jehova ga-agba ha ume. Nke a mere ka o nwee obi ụtọ ma soro ha ṅụrịa ọṅụ. Ọ bụ ya mere o ji dee, sị: “Ọ bụ unu ka e nyere ihe ùgwù ahụ n’ihi Kraịst, ọ bụghị naanị ka unu nwee okwukwe n’ebe ọ nọ, kama ka unu taakwa ahụhụ n’ihi ya. N’ihi na unu na-agba otu mgba ahụ unu hụrụ na m na-agba, nke unu nụkwara ugbu a na m na-agba.”—Fil. 1:29, 30.

Taakwa, a na-emegide Ndị Kraịst n’ihi ozi ọma ha na-ekwusa. E nwere mgbe a na-akụdị anyị ihe, ma ọtụtụ mgbe, ọ naghị adịcha otú ahụ. Dị ka ihe atụ, mmegide ndị ahụ nwere ike ịbụ ebubo ụgha ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ebo anyị, nsogbu ndị ezinụlọ anyị na-enye anyị, ma ọ bụ emo ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị na-akwa anyị. Ma, Jizọs gwara anyị na ihe ndị a ekwesịghị iju anyị anya ma ọ bụkwanụ mee ka anyị daa mbà, kama, ha kwesịrị ime ka anyị na-aṅụrị ọṅụ. Ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu, na-aghagide unu ụgha, na-ekwukwa ụdị ihe ọjọọ niile megide unu n’ihi m. Ṅụrịanụ ọṅụ, nweekwanụ obi ụtọ nke ukwuu, n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe.”—Mat. 5:11, 12.

Ụjọ ekwesịghị ịtụwa anyị ma ọ bụ ahụ́ amawa anyị ririri ma anyị nụ na a na-akpagbu ụmụnna anyị otú kpụ ọkụ n’ọnụ ná mba ụfọdụ. Kama, anyị kwesịrị ịna-aṅụrị ọṅụ na ụmụnna anyị na-edi mkpagbu ndị ahụ. Anyị nwere ike icheta ha n’ekpere, na-arịọ Jehova ka o nyere ha aka idi mkpagbu ahụ ma mee ka okwukwe ha sie ike. (Fil. 1:3, 4) Ọ bụ eziokwu na o nweghị oké ihe anyị nwere ike imere ụmụnna anyị ndị ahụ anyị hụrụ n’anya, anyị nwere ike inyere ụmụnna anyị ndị ihe na-esiri ike n’ọgbakọ anyị aka. Anyị kwesịrị igosi ha na anyị hụrụ ha n’anya ma na-agba ha ume. Anyị nwere ike ịkpọ ha ka ha bịa sonyere anyị mgbe anyị na-enwe Ofufe Ezinụlọ, soro anyị gaa ozi ọma, ma ọ bụkwanụ soro anyị tụrụ ndụ. Anyị ga-esi otú a gosi na anyị chọrọ iso ha na-aṅụrị ọṅụ.

E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ji kwesị iso ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ. Ya enwekwala mgbe anyị ga-achọwa ịkpa iche dị ka ọtụtụ ndị n’ụwa si eme, kama ka anyị soro ụmụnna anyị na-aṅụrị ọṅụ. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, ọ ga-egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya meekwa ka anyị na ha dịrị n’otu, nke ka nke, obi ga-adịkwa anyị ụtọ na anyị so n’òtù ụmụnna na-emekọ ihe ọnụ. (Fil. 2:1, 2) N’ihi ya, ka anyị mee ihe Pọl gbara anyị niile ume ka anyị na-eme. Ọ sịrị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile n’ime Onyenwe anyị. Aga m asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ!”—Fil. 4:4.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 6]

Map ụwa: A natara ikike n’aka Replogle Globes