Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee ihe m kwesịrị ime ma e nwee ihe m gụtara na Baịbụl nke na-edoghị m anya ma ọ bụkwanụ ma m chọọ ịma ihe m ga-eme banyere nsogbu m nwere?

Ilu 2:1-5 gbara onye ọ bụla n’ime anyị ume ka ọ ‘na-achọ’ nghọta na ikike ịghọta ihe dị ka ọ̀ na-achọ “akụ̀ zoro ezo.” Nke a pụtara na anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-achọ azịza nke ajụjụ ọ bụla anyị nwere n’ihi ihe anyị gụtara na Baịbụl nakwa ịma ihe anyị ga-eme banyere nsogbu ọ bụla anyị nwere. Olee otú anyị nwere ike isi mee nke a?

N’isiokwu bụ́ “Ụzọ Isi Mee Nnyocha,” bụ́ nke malitere na peeji nke 33 ruo nke 38 n’akwụkwọ bụ́ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, a kọwara otú e si eji ngwá ọrụ ndị “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” wepụtara eme nnyocha. (Mat. 24:45) Na peeji nke 36, a kọwara otú e si eji Watch Tower Publications Index achọ ihe. Mbipụta ya nke ọ bụla nwere isiokwu na amaokwu Akwụkwọ Nsọ dị iche iche e nwere ike iji chọọ ihe. Nke a na-eme ka ọ dịrị mmadụ mfe iji okwu ma ọ bụ amaokwu Baịbụl chọta ihe ọ chọrọ ịchọ. Jiri nwayọọ na ndidi na-achọ ihe dị gị mkpa ị chọrọ ịghọta. Cheta na ị na-achọ “akụ̀ zoro ezo,” bụ́ ihe na-ewe oge nchọta, nke na-achọkwa ka onye na-achọ ya gbasie mbọ ike.

N’eziokwu, e nwere isiokwu ụfọdụ, ma ọ bụ amaokwu Baịbụl ụfọdụ na-enweghị ihe akwụkwọ anyị kwuru banyere ha. O nwekwara ike ịbụ na amaokwu Baịbụl ndị anyị kọwara azaghị ajụjụ ndị i nwere. E nwekwara ụfọdụ akụkọ ndị dị na Baịbụl bụ́ ndị na-edochaghị anya n’ihi na Akwụkwọ Nsọ akọrughị ha ala. N’ihi ya, anyị agaghị achọta azịza nke ajụjụ niile ozugbo. Ọ dịrị otú a, anyị ekwesịghị ịkọwa nkọ n’ihe a na-enwebeghị ihe e kwuru banyere ya n’akwụkwọ anyị, ma ọ́ bụghị ya, anyị ga na-arụ ụka ‘n’ajụjụ ndị a na-emere nnyocha kama ịdị na-ekesa ihe ọ bụla si n’aka Chineke n’ihe banyere okwukwe.’ (1 Tim. 1:4; 2 Tim. 2:23; Taị. 3:9) Ma alaka ụlọ ọrụ anyị ma isi ụlọ ọrụ anyị agaghị azali ajụjụ niile a na-ekwubeghị ihe banyere ha n’akwụkwọ anyị. Obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ na Baịbụl gwara anyị ihe ndị dị mkpa ga-enyere anyị aka ná ndụ. Ma, o nwere ọtụtụ ihe ọ na-ekwughị, bụ́kwanụ nke ga-eme ka anyị nwee ike igosi na anyị nwere okwukwe siri ike na Jehova.—Gụọ peeji nke 185 ruo 187 nke akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso.

Gịnịkwanụ ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na i mechaala ihe niile i nwere ike ime, meekwa nchọnchọ niile i nwere ike ime ma i nwetaghị ihe ị chọrọ? Alala azụ ịgakwuru nwanna ma nke a na-akọ n’ọgbakọ, ikekwe otu n’ime ndị okenye, ka o nyere gị aka. Ha amụọla Baịbụl, mụtakwa ọtụtụ ihe banyere otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-ebi ndụ. Aka ha ga-enyere gị ma i nwee nsogbu ma ọ bụ chọọ ikpebi ihe ị ga-eme ga-abara gị uru, n’ihi na ha nọ gị nso, mara gị, marakwa ihe gị na ya na-alụ. Echefukwala ikpeku Jehova ekpere ma gwa ya nsogbu gị, gwakwa ya ka o jiri mmụọ nsọ ya nyere gị aka n’ihi na “Jehova na-enye amamihe . . . na nghọta.”—Ilu 2:6; Luk 11:13.