Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

GỊNỊ mere otu nwoke ịgba chaa chaa riri isi, onye na-ezukwa ohi, ji kwụsị àgwà ọjọọ ọ na-akpa ma gbanwee ndụ ya? Gụọ ihe o kwuru.

“Ihe na-amasịkarị m bụ ịga ebe a na-eji ịnyịnya agba ọsọ.”​—RICHARD STEWART

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1965

ABỤ M ONYE: JAMEIKA

NDỤ M BIRI: ANA M AGBA CHAA CHAA, NA-EZUKWA OHI

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Etolitere m na Kingstin, bụ́ isi obodo Jameika. Ndị mmadụ bijuru ebiju n’ebe ahụ, ọtụtụ n’ime ha bụkwa ndị ogbenye. Ọtụtụ ndị bi n’ebe ahụ enweghị ọrụ, ime mpụ jukwara ebe niile. Òtù ọjọọ dị iche iche e nwere n’ebe ahụ anaghị ekwe ndị mmadụ ṅụrụ mmiri tọgbọ iko. Ọ na-afọ obere ka ọ bụrụ kwa ụbọchị ka m na-anụ ụda égbè.

Mama m gbalịrị ike ya niile igboro mụ na ụmụnne m mkpa anyị. Ọ bụ nwaanyị na-agba mbọ. O tinyere anyị n’ezigbo ụlọ akwụkwọ. Ma ike akwụkwọ adịghị m, ihe na-amasịkarị m bụ ịga ebe a na-eji ịnyịnya agba ọsọ. Ọtụtụ mgbe, m na-ahapụ akwụkwọ gawa ebe ahụ a na-eji ịnyịnya agba ọsọ. O nwedịrị oge ndị m gbara ịnyịnya ndị ahụ.

N’oge na-adịghị anya, chaa chaa a na-agba iji mata ịnyịnya ga-agbakarị ibe ya n’ọsọ bịara rie m isi. Ebiwere m ndụ rụrụ arụ, na-achụkwa ụmụ nwaanyị ka à na-anwụ anwụ. Ana m aṅụ wii wii, na-ejikwa égbè aga ohi ka m wee nweta ego m ga-eji na-ebi ndụ ọjọọ m na-ebi. Enwere m ọtụtụ égbè n’oge ahụ, ma obi dị m ụtọ na o nweghị onye e gburu n’ohi niile m so gaa.

Ndị uwe ojii mechara kpara m aka, ma tụọ m mkpọrọ. Mgbe m si n’ụlọ mkpọrọ pụta, m malitekwara ndụ ọjọọ ahụ m na-ebi. Abịadịrị m kpawa arụ karịa otú m na-akpabu. Ọ bụ eziokwu na onye lee m anya n’ihu, ọ ga-eche na m bụ ezigbo mmadụ, ma abụ m osi ọnwụ, ana m ewe iwe ọkụ, obi fekwara m azụ. Anaghịkwa m echebara ndị ọzọ echiche.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: N’oge ihe ndị a na-eme, mama m na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, ya aghọọkwa Onyeàmà Jehova. Ahụrụ m otú ndụ ya si gbanwee, nke a mekwara ka m chee echiche. Ekpebiri m na m ga-achọpụta ihe mere ndụ mama m ji gbanwee. Nke a mere ka mụ na Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl.

Achọpụtara m na ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi dị iche n’ihe ndị okpukpe ndị ọzọ na-akụzi, chọpụtakwa na ihe niile Ndịàmà Jehova na-akụzi si na Baịbụl. Ọ bụ naanị ha bụ ndị m maara na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ otú ahụ Ndị Kraịst oge gboo mere. (Matiu 28:19; Ọrụ 20:20) Mgbe m hụrụ otú ha si hụ nnọọ ibe ha n’anya, ọ bịara doo m anya na mụ ahụla ndị na-efe Chineke otú Chineke chọrọ.—Jọn 13:35.

Ihe ndị m na-amụta na Baịbụl mere ka m ghọta na m kwesịrị ịgbanwe ọtụtụ ihe ná ndụ m. Achọpụtara m na Jehova Chineke kpọrọ ịkwa iko asị, nakwa na ọ bụrụ na m chọrọ ime ihe ọ na-achọ, m ga-akwụsịrịrị ihe ọjọọ ndị ahụ m na-eme bụ́ ndị na-emebi ahụ́ m. (2 Ndị Kọrịnt 7:1; Ndị Hibru 13:4) O metụrụ m n’ahụ́ mgbe m mụtara na àgwà m na-akpa nwere ike ime ka obi tọọ Jehova ụtọ ma ọ bụ ka ọ jọọ ya njọ. (Ilu 27:11) N’ihi ya, ekpebiri m na m ga-akwụsị ịṅụ wii wii, kwụsị ibu égbè, ma gbalịa ịkpawa ezigbo àgwà. Ihe ndị kacha siere m ike bụ ịkwụsị ịkwa iko na ịgba chaa chaa.

Ná mmalite, achọghị m ka ndị enyi m mara na mụ na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Ma, ihe gbanwere mgbe m gụrụ Matiu 10:33, bụ́ ebe Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-agọnahụ m n’ihu mmadụ, m ga-agọnahụkwa ya n’ihu Nna m nke nọ n’eluigwe.” Ihe a Jizọs kwuru mere ka m gwa ndị enyi m na mụ na Ndịàmà Jehova amụwala Baịbụl. O nyeghị ha ọnụ okwu. Ha ekwetaghị na onye dị ka m ga-achọ ịghọ Onye Kraịst. Ma, agwara m ha na achọghịzi m ibi ụdị ndụ ahụ m na-ebibu.

URU NDỊ M RITERELA: Obi tọgburu mama m atọgbu mgbe ọ hụrụ na ebiwela m ndụ otú Baịbụl kwuru. Obi anaghịzi ekoro ya n’elu na m ga-aga mee ihe na-adịghị mma. Anyị abụọ na-akparịtazi otú anyị si hụ Jehova n’anya, nke bụ́ ihe na-atọ anyị abụọ ụtọ. Mgbe ụfọdụ, m na-echeta ụdị ndụ m biburu, ọ na-esiri m ike ikweta na m mechara gbanwee. Ma, ama m na ọ bụ Chineke nyeere m aka. Akwụsịla m ịchụ nwaanyị, kwụsịkwa ịchụ ego ka à na-anwụ anwụ.

A sị na ebidoghị m mụwa Baịbụl, m gaara anwụla ma ọ bụ nọrọ n’ụlọ mkpọrọ ugbu a. Ma, enweela m ezinụlọ ugbu a, anyị bikwa n’udo. Obi na-atọ m nnọọ ụtọ na mụ na ezigbo nwunye m na nwa anyị nwaanyị, bụ́ nwa na-erube isi, na-efe Jehova Chineke. Ana m ekele Jehova maka otú o si kwe ka m bata n’ọgbakọ Ndị Kraịst bụ́ ebe onye ọ bụla hụrụ ibe ya n’anya. Obi dị m ụtọ na e nwere onye gbara mbọ kụziere m eziokwu dị na Baịbụl. Ọ na-amasịkwa m inyere ndị ọzọ aka ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi. Ana m ekele Jehova Chineke, karịchaa, maka otú o si meere m ebere ma nyere m aka ka m mara onye ọ bụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

‘Amụtara m na otú m si akpa àgwà nwere ike ime ka obi tọọ Jehova ụtọ ma ọ bụ ka ọ jọọ ya njọ’

[Foto dị na peeji nke 11]

Mụ na nwunye m na nwa anyị nwaanyị

[Foto dị na peeji nke 11]

Ahụrụ m otú ndụ mama m si gbanwee