Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Di na Nwunye—Mụtanụ Ile Ihe Anya Otú Chineke Si Ele Ihe Anya

Di na Nwunye—Mụtanụ Ile Ihe Anya Otú Chineke Si Ele Ihe Anya

Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ N’ezinụlọ

Di na Nwunye—Mụtanụ Ile Ihe Anya Otú Chineke Si Ele Ihe Anya

Fred *: “Mgbe mụ na nwunye m, bụ́ Lea, lụrụ ọhụrụ, agwara m ya na anyị ga na-amụkọ Baịbụl ọnụ. M mere ihe niile m nwere ike ime ka obi ya dịrị n’ihe anyị na-amụ. Ma, ahụ́ anaghị eru ya ala ma anyị mụwa ihe. M jụọ ya ajụjụ, naanị ihe ọ na-aza bụ ee ma ọ bụ ee e. Ọ bụghị otú a ka m chere nwaanyị kwesịrị isi na-eme ma ya na di ya mụwa Baịbụl.”

Lea: “Adị m afọ iri na asatọ mgbe mụ na di m, bụ́ Fred, lụrụ. Anyị na-amụkọ Baịbụl ọnụ mgbe niile. Ma mgbe ọ bụla anyị na-amụ ihe, ihe Fred na-eme bụ ịgwa m ebe m na-anaghị emeta na ihe m kwesịrị ime ka m wee bụrụkwuo ezigbo nwaanyị. Ihe a ọ na-eme bịara na-ewe m ezigbo iwe!”

OLEE ihe i chere bụ́ nsogbu Fred na Lea? Ha abụọ bucha ihe ọma n’obi. Ha hụrụ Chineke n’anya. Ha abụọ makwaara na ọ dị mkpa ka ha na-amụkọ Baịbụl ọnụ. Ma kama nke a ga-enyere ha aka, o yiri ka ọ̀ na-achọzi ịkpatara ha nsogbu. Ha na-amụkọ Baịbụl ọnụ, ma ha anaghị ele ihe anya otú Chineke si ele ihe anya.

Gịnị ka mmadụ ile ihe anya otú Chineke si ele ihe anya pụtara? Gịnị mere o ji dị mkpa ka di na nwunye mụta ile ihe anya otú Chineke si ele ihe anya? Olee ihe ndị nwere ike ime ka o siere ha ike ịmụta ime otú ahụ, oleekwa ihe ga-enyere ha aka ka ha mụta ya.

Gịnị Ka Mmadụ Ile Ihe Anya Otú Chineke Si Ele Ihe Anya Pụtara?

Baịbụl gosiri na e nwere ụzọ dị iche iche ụmụ mmadụ si ele ihe anya. (Jud 18, 19) Dị ka ihe atụ, Pọl, bụ́ onye so dee Baịbụl, gosiri na onye na-ele ihe anya otú Chineke si ele ihe anya dị iche n’onye na-ele ihe anya otú mmadụ nkịtị si ele ya. Pọl kwuru na ndị na-ele ihe anya otú mmadụ nkịtị si ele ihe anya na-achọkarị naanị ọdịmma onwe ha. Ha na-eme ihe dị mma n’anya onwe ha kama ịgbalị ka ha na-eme ihe Chineke kwuru.—1 Ndị Kọrịnt 2:14; Ndị Galeshia 5:19, 20.

Ma ndị na-ele ihe anya otú Chineke si ele ihe anya ejighị ihe Chineke kwuru egwuri egwu. Ha na-ewere Jehova Chineke ka enyi ha, na-agbalịkwa ka ha na-akpa àgwà ka ya. (Ndị Efesọs 5:1) Ọ bụ nke a mere ha ji ahụ ndị ọzọ n’anya, na-emere ndị mmadụ ebere, na-emekwara ha ihe ọma. (Ọpụpụ 34:6) Ha na-erubekwara Chineke isi ọ sọgodị ya ya bụrụ na ọ dịrịghị ha mfe ime ya. (Abụ Ọma 15:1, 4) E nwere otu nwoke bi na Kanada nke aha ya bụ Darren. Nwoke a lụrụ nwaanyị kemgbe afọ iri atọ na ise. Ọ sịrị: “Echere m na onye na-ele ihe anya otú Chineke si ele ihe anya bụ onye na-echebara okwu ọnụ ya na omume ya echiche mgbe niile iji hụ na o meghị ihe ga-eme ka ya na Chineke ghara ịbụkwa enyi.” Nwunye ya, bụ́ Jane, kwukwara, sị: “Echere m na nwaanyị ọ bụla nke na-ele ihe anya otú Chineke si ele ihe anya bụ nwaanyị nke na-agbalịsi ike ka àgwà ọ na-akpa kwa ụbọchị gosi na o nwere mmụọ nsọ Chineke.”—Ndị Galeshia 5:22, 23.

Ma nke a apụtaghị na mmadụ ga-alụrịrị di ma ọ bụ nwunye tupu ya amalite ile ihe anya otú Chineke si ele ihe anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl kwuru na onye ọ bụla kwesịrị ịmụta banyere Chineke ma na-akpa àgwà ka ya.—Ọrụ 17:26, 27.

Gịnị Mere O Ji Kwesị Ekwesị Ka Di na Nwunye Na-eme Ihe Ha Na-amụta n’Okwu Chineke?

Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka di na nwunye gbaa mbọ mụta ile ihe anya otú Chineke si ele ihe anya? Ka anyị lebagodị anya n’ihe atụ a: E nwere mmadụ abụọ nwe otu ubi. Ha chọkwara ịkụ akwụkwọ nri n’ubi ha ahụ. Otu onye chọrọ ka a kụọ ya ná mbido afọ, ma onye nke ọzọ chere na ọ ka mma ịkụ ya ma afọ gamitụ. Otu onye chọrọ ka e tinye ya fatịlaịza, ma onye nke ọzọ kwuru na a gaghị eme ya eme. Otu onye chọrọ ịga na-arụ ọrụ n’ubi ahụ kwa ụbọchị, ma onye nke ọzọ chọrọ ịna-ele n’anya n’anya n’arụghị ọrụ ọ bụla. Ihe a kụrụ n’ubi ahụ nwere ike ito, ma ọ gaghị emecha nke ọma otú ọ gaara eme ma a sị na ha abụọ nwere otu olu ma gbakọọ aka rụọ ọrụ n’ubi ahụ.

Di na nwunye dị ka mmadụ abụọ ahụ. Ọ bụrụ na ọ bụ naanị otu onye na-eme ihe ọ na-amụta n’Okwu Chineke, ha nwere ike ịna-ebitụ n’udo. (1 Pita 3:1, 2) Ma, ihe ga-akara ha nnọọ mma ma ọ bụrụ na ha abụọ na-eme ihe Chineke kwuru ma na-agbalịsi ike inyere ibe ha aka n’ife Chineke! Sọlọmọn, bụ́ eze maara ihe, dere, sị: “Abụọ dị mma karịa otu.” N’ihi gịnị? “N’ihi na ha nwere ezi ụgwọ ọrụ maka ịrụsi ọrụ ike ha. N’ihi na ọ bụrụ na otu n’ime ha adaa, onye nke ọzọ pụrụ ikulite ibe ya.”—Ekliziastis 4:9, 10.

O nwere ike ịbụ na ọ na-agụ gị agụụ ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-eme ihe unu na-amụta n’Okwu Chineke. Ma, na ọ na-agụ gị agụụ abụghị ebe okwu biri. Ka anyị leba anya n’ihe abụọ nwere ike ime ka ime ihe unu na-amụta n’Okwu Chineke siere unu ike nakwa ihe ga-enyere unu aka ime ya.

NKE MBỤ: Anyị anaghị enwe ohere. Otu nwaanyị aha ya bụ Suzana, bụ́ onye lụrụ di ọhụrụ, sịrị: “Di m na-abịa n’ebe m na-arụ ọrụ eburu m ma ọ kụọ elekere asaa nke abalị. Anyị laruo, ọrụ niile dị n’ụlọ ana-eche anyị. Ọ naghị adịrị anyị mfe; ahụ́ anyị na-agwa anyị gaa zuo ike, ma obi anyị na-agwa anyị na anyị kwesịrị iwepụta oge mụọ Okwu Chineke.”

Ihe nwere ike inyere unu aka: Na-enyerenụ ibe unu aka, chọtakwanụ oge ga-adabara unu abụọ ịmụkọ Okwu Chineke ọnụ. Suzana kwukwara, sị: “Mụ na di m kpebiri na anyị ga na-eteta n’oge gụkọọ Baịbụl ọnụ ma kwurịta ihe anyị mụtara tupu anyị agawa ọrụ. Di m na-enyekwara m aka n’ọrụ ụlọ ka m nwee ike nwee ohere mụ na ya ga-eji na-anọrị.” Olee uru unu ga-erite ma unu mee nke a? Di Suzana, bụ́ Edwin, sịrị: “Achọpụtala m na mgbe ọ bụla mụ na nwunye m na-amụchi Okwu Chineke anya, ọ na-adịrị anyị mfe idozi nsogbu ndị na-abịara anyị, ọ na-emekwa ka anyị ghara ịna-echegbukarị onwe anyị.”

E wezụga iwepụta oge unu ga-eji na-akparịta ụka n’ụbọchị, ọ dịkwa mkpa ka unu na-ekpekọ ekpere ọnụ kwa ụbọchị. Olee otú nke a ga-esi enyere unu aka? Otu nwoke aha ya bụ Robert, bụ́ onye lụrụ nwaanyị kemgbe afọ iri na isii, sịrị: “Obere oge gara aga, mụ na nwunye m nwere ezigbo nghọtahie. Ma, anyị jisiri ike na-ekpekọ ekpere ọnụ n’abalị ọ bụla, na-akọrọ Chineke nsogbu anyị. Echere m na ọ bụ ekpere ahụ anyị na-ekpekọ ọnụ nyeere anyị aka idozi nsogbu anyị ma biwekwa n’udo.”

MEGODỊNỤ IHE A: N’abalị ọ bụla, na-ewepụtanụ nkeji ole na ole kwurịta ihe ọma ndị meere unu n’ụbọchị bụ́ ndị unu kwesịrị ikele Chineke maka ha. Na-ekwurịtakwanụ nsogbu ndị unu nwere, nke ka nke, ndị nke unu chọrọ ka Chineke nyere unu aka na ha. Onye nke ọ bụla n’ime unu ekwesịghị iji oge ahụ ekwu ebe ibe ya na-anaghị emeta. Kama nke ahụ, mgbe unu na-ekpekọ ekpere ọnụ, naanị ihe unu ga-agwa Chineke bụ ihe ndị unu abụọ kwesịrị ịrụ ọrụ na ha. N’echi ya, gbalịanụ ka unu mee ihe ndị ahụ unu kpere n’ekpere.

NKE ABỤỌ: Di m ma ọ bụ nwunye m ka m nwee isi akwụkwọ. Tony sịrị: “Ike ịnọ otu ebe na-agụ akwụkwọ anaghị adị m.” Nwunye ya, bụ́ Nneka, sịrị: “Ịgụ akwụkwọ na-atọgbu m atọgbu, ọ na-amasịkwa m ịkọrọ onye ọzọ ihe ndị m gụtara. Ọ na-adị m mgbe ụfọdụ ka ahụ́ anaghị eru di m ala ma mụ na ya kwuwe ihe ndị anyị mụtara na Baịbụl.”

Ihe nwere ike inyere unu aka: Na-enyere di gị ma ọ bụ nwunye gị aka, ọ bụghị ịtawa ya ụta ma ọ bụ gị na ya ịmawa aka. Jaa ya mma n’ebe ndị ọ na-eme nke ọma. Tony kwukwara, sị: “Ahụ́ anaghị erucha m ala mgbe ụfọdụ n’ihi otú o si enu nwunye m enu n’obi ka mụ na ya na-ekwurịta ihe ndị gbasara Baịbụl. Ná mbụ, anaghị m achọcha ka mụ na ya na-ekwurịta ihe ndị ahụ. Ma, Nneka nyeere m aka. Ugbu a, anyị na-ekwurịtakarịzi ihe ndị gbasara Baịbụl, achọpụtakwala m na o nweghị ihe kwesịrị ime ka ahụ́ ghara ịna-eru m ala. Mụ na ya ikwurịta ihe anyị mụtara na Baịbụl na-atọzi m ụtọ. Nke a emeela ka ahụ́ na-eru anyị ala, anyị ana-ebikwa n’udo.”

Ọtụtụ ndị di na nwunye achọpụtala na iwepụta oge kwa izu maka ịgụ na ịmụ Baịbụl emeela ka ha na-adịkwu ná mma. Ma burunụ nke a n’obi: Mgbe unu na-ekwurịta ihe unu gụtara n’Akwụkwọ Nsọ, onye nke ọ bụla kwuo otú ọ ga-esi eme ihe ọ mụtara, ọ bụghị otú onye nke ọzọ kwesịrị isi eme ya. (Ndị Galeshia 6:4) Ọ bụrụ na o nwere ihe na-esere unu, unu ekwurịtala ya n’oge ahụ unu na-amụ Baịbụl, kwuonụ ya n’oge ọzọ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

Chebagodịrị nke a echiche: Ọ bụrụ na gị na ndị ezinụlọ gị na-eri nri, ọ̀ bụ mgbe ahụ ka ị ga-ehichawa ọnyá na-esi ísì? Mbanụ. Ọ ga-eme ka afọ machie onye ọ bụla. Jizọs ji ịmụ Okwu Chineke na ime ihe Chineke chọrọ tụnyere iri nri. (Matiu 4:4; Jọn 4:34) Ọ bụrụ na ị na-ekwu ihe na-akpasu di gị ma ọ bụ nwunye gị iwe mgbe ọ bụla unu mụwara Baịbụl, i nwere ike ime ka ọ ghara inwekwa mmasị n’ịmụ Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na unu kwesịrị ikwurịta nsogbu ndị unu nwere. Ma, ọ ka mma ikwurịta ha mgbe kwesịrị ekwesị.—Ilu 10:19; 15:23.

MEGODỊ IHE A: Dee àgwà abụọ ma ọ bụ atọ di gị ma ọ bụ nwunye gị nwere bụ́ ndị kacha amasị gị. Mgbe ọzọ unu na-amụ Baịbụl, ya abụrụ na ihe unu na-amụ gbasara àgwà ndị ahụ, jaa ya mma, gwakwa ya na obi dị gị ụtọ na o nwere àgwà ndị ahụ.

Ị Ga-aghọrọ Mkpụrụ Ị Kụrụ

Ọ bụrụ na unu abụọ na-agbalị ime ihe unu na-amụta n’Okwu Chineke, unu ga na-ebi n’udo ma na-enwe obi ụtọ. N’eziokwu, Okwu Chineke kwuru hoo haa na “mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa.”—Ndị Galeshia 6:7.

Fred na Lea, bụ́ ndị e kwuru okwu ha ná mbido isiokwu a, mechara ghọta na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. O ruola afọ iri anọ na ise ha lụrụ, ha achọpụtakwala na ọ bụrụ na di na nwunye ejisie ike na-eme ihe ha na-amụta n’Okwu Chineke, ọ na-abara ha uru. Fred sịrị: “M na-atabu nwunye m ụta na ọ bụ ya mere na anyị anaghị ekwurịta okwu nke ọma. Ma ka oge na-aga, achọpụtara m na mụnwa kwesịkwara ịgbalị ka anyị na-ekwurịta okwu nke ọma.” Lea sịrị: “Ihe nyeere anyị aka n’oge ahụ bụ na anyị abụọ hụrụ Jehova Chineke n’anya. Kemgbe anyị lụrụ, anyị na-amụchi Baịbụl anya, na-ekpekọkwa ekpere ọnụ. Ka m na-ahụ ka di m na-agbakwu mbọ na-eme ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl, ọ na-adịkwuru m mfe ịhụ ya n’anya.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Aha a a kpọrọ ha abụghị ezigbo aha ha.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .

▪ Olee mgbe ikpeazụ mụ na di m ma ọ bụ nwunye m kpekọrọ ekpere ọnụ?

▪ Olee ihe m nwere ike ime iji nyere di m ma ọ bụ nwunye m aka ịna-ekwu ihe dị ya n’obi ma anyị mụwa Baịbụl?