Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Mụta Ihe N’okwu Chineke

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Isiokwu a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla, ọ ga-egosikwa gị ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ga-aza gị ajụjụ ndị ahụ. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Olee ihe mere anyị ji kwesị irubere Chineke isi?

Anyị kwesịrị irubere Chineke isi n’ihi na ọ bụ ya kere anyị. Jizọs na-erubedịrị Chineke isi mgbe niile. (Jọn 6:38; Mkpughe 4:11) Otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ Chineke n’anya bụ idebe iwu ya.—Gụọ 1 Jọn 5:3.

Iwu niile Jehova Chineke nyere anyị bụ maka ọdịmma anyị. Ha na-akụziri anyị otú kacha mma anyị ga-esi na-ebi ndụ ugbu a, nakwa ihe anyị ga-eme ka anyị wee nweta ngọzi Chineke n’ọdịnihu.—Gụọ Abụ Ọma 19:7, 11; Aịzaya 48:17, 18.

2. Olee otú iwu Chineke si enyere anyị aka inwe ezigbo ahụ́ ike?

Chineke nyere iwu ka anyị ghara ịṅụbiga mmadụ ókè. Ọ bụrụ na anyị edebe iwu a, anyị agaghị arịa ọrịa ọjọọ ma ọ bụ nwee ihe mberede ndị ịṅụ oké mmanya na-akpata. Ịṅụ oké mmanya na-eri mmadụ ahụ́, ọ na-emekwa ka mmadụ mewe omume ọjọọ. (Ilu 23:20, 29, 30) Jehova kwuru na anyị nwere ike ịṅụ mmanya, ma ọ chọghị ka anyị na-aṅụbiga ya ókè.—Gụọ Abụ Ọma 104:15; 1 Ndị Kọrịnt 6:10.

Jehova dọkwara anyị aka ná ntị ka anyị ghara ịna-ekwo ekworo, ịna-ewe iwe ọkụ, ma ọ bụ ịna-akpa àgwà ọjọọ ndị ọzọ bụ́ ndị nwere ike inye anyị nsogbu n’ahụ́. Ọ bụrụ na anyị ejisie ike na-eme ihe Chineke kwuru, ahụ́ ga-esi anyị ike.—Gụọ Ilu 14:30; 22:24, 25.

3. Olee otú iwu Chineke si echebe anyị?

Iwu Chineke kwuru na mmadụ na onye na-abụghị di ya ma ọ bụ nwunye ya inwe mmekọahụ bụ ihe ọjọọ. (Ndị Hibru 13:4) Di na nwunye ndị na-erube isi n’iwu a na-aka ebi n’udo, ha ga-enwekwa ike ịzụ ụmụ ha n’ezinụlọ ebe obi ga-eru ụmụ ha ala. Ma, ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye akwaa iko, o nwere ike ịkpatara ha obi mgbawa, ịlụ ọgụ, ọrịa, mee ka ha gbaa alụkwaghịm, ma ọ bụdị mee ka ọ bụrụ otu onye ga-azụwazi ụmụ ha.—Gụọ Ilu 5:1-9.

Ọ bụrụ na anyị ana-ezere ihe ndị nwere ike ime ka anyị kwaa iko, anyị na Chineke ga na-adị ná mma, anyị agaghịkwa emejọ ndị ọzọ.—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 4:3-6.

4. Olee otú iji ndụ akpọrọ ihe si abara anyị uru?

Ọ bụrụ na onye na-aṅụ sịga ma ọ bụ onye àgwà ọjọọ ọ bụla ọzọ riri ahụ́ abịa ghọta na ya kwesịrị iji ndụ Chineke nyere ya kpọrọ ihe ma kwụsịkwa àgwà ọjọọ ahụ, ahụ́ ga-ebido dịwa ya mma. (2 Ndị Kọrịnt 7:1) Chineke jidị ndụ nwa e bu n’afọ kpọrọ ihe. (Ọpụpụ 21:22, 23) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịkpachara anya gbuo nwa e bu n’afọ. Ndị ji ndụ Chineke nyere anyị kpọrọ ihe na-akpachapụkwa anya mgbe ha na-arụ ọrụ, mgbe ha nọ n’ụlọ, nakwa mgbe ha na-anya ụgbọala, ka ha ghara imerụ onwe ha ma ọ bụ ndị ọzọ ahụ́. (Diuterọnọmi 22:8) Ha anaghịkwa eme egwuregwu ndị nwere ike imerụ ha ahụ́, ma ọ bụ gbuo ha, n’ihi na ha maara na ndụ bụ onyinye si n’aka Chineke.—Gụọ Abụ Ọma 36:9.

5. Olee otú ihe Chineke kwuru banyere ọbara si abara anyị uru?

Ọbara dị nsọ n’ihi na Chineke kwuru na ọ bụ ndụ, ma ọ bụ mkpụrụ obi, nke ihe e kere eke. (Jenesis 9:3, 4) Iwu Chineke, bụ́ nke kwuru na ọbara na ndụ bụ otu ihe, na-abara anyị uru. Olee otú o si abara anyị uru? Ọ bụ n’iwu ahụ ka Chineke gbakwasịrị ụkwụ na-agbaghara anyị mmehie anyị.—Gụọ Levitikọs 17:11-13; Ndị Hibru 9:22.

Ọbara Jizọs bụ ọbara kacha oké ọnụ ahịa n’ihi na Jizọs zuru okè. Mgbe Jizọs chụchara ndụ ya n’àjà maka ụmụ mmadụ, ọ gara gosi Chineke uru nke ọbara ya, bụ́ nke nọchiri anya ndụ ya. (Ndị Hibru 9:12) Ọ bụ ọbara ya mere anyị ji nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.—Gụọ Matiu 26:28; Jọn 3:16.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ihe a kọrọ n’isiokwu a, gụọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 12 na nke 13 nke akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.