Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Mgbe E Bibiri Jeruselem Oge Ochie?—Agba nke Abụọ

Olee Mgbe E Bibiri Jeruselem Oge Ochie?—Agba nke Abụọ

Olee Mgbe E Bibiri Jeruselem Oge Ochie?​—Agba nke Abụọ

Gịnị n’Ezie ka Ihe Ndị E Dere n’Ụrọ n’Oge Ochie Na-egosi?

Isiokwu a bụ nke abụọ n’ime isiokwu abụọ e kwuru ga-agba n’Ụlọ Nche. Ha abụọ lebara anya n’ajụjụ ụfọdụ ndị ọkà mmụta jụrụla banyere oge mbụ e bibiri Jeruselem oge ochie. E mere ezigbo nnyocha dee ha abụọ iji zaa ajụjụ ndị na-agbagwoju ụfọdụ ndị anya, e sikwa na Baịbụl zaa ajụjụ ndị ahụ.

Ihe Ndị A Bụ Isi Ihe Ndị E Kwuru n’Agba nke Mbụ:

▪ Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru na ọ bụ n’afọ 587 T.O.A. * ka e bibiri Jeruselem.

▪ Ihe ndị a kọrọ na Baịbụl gosiri na ọ bụ n’afọ 607 T.O.A. ka e bibiri ya.

▪ Ebe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke oge a gbakwasịrị ụkwụ na-ekwu na ọ bụ n’afọ 587 T.O.A. ka e bibiri Jeruselem bụ n’ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke oge gboo dere nakwa n’ihe Ptolemy dere.

▪ Ihe ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke oge gboo dere abụghị eziokwu, e nwekwara ebe ihe ndị e dere n’ụrọ na ihe ndị ha dere na-abụghị otu. *

NA BAỊBỤL, Chineke si n’ọnụ Jeremaya kwuo na ndị Juu a dọọrọ n’agha gaa Babịlọn ga-anọ n’ebe ahụ “ruo mgbe afọ iri asaa zuru.” Olee mgbe a hapụrụ ha ka ha lawa? Ọ bụ “n’afọ mbụ nke ọchịchị Saịrọs eze Peshia.” (2 Ihe E Mere 36:21, 22) Ma ihe e dere na Baịbụl ma ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme dere gosiri na ndị Juu kwụsịrị ịgba ohu na Babịlọn mgbe Saịrọs meriri Babịlọn ma hapụ ndị Juu ka ha lawa. Ha laghachiri Jeruselem n’afọ 537 T.O.A. Ebe ọ bụ na Baịbụl kwuru hoo haa na ndị Juu nọrọ afọ iri asaa na Babịlọn, ọ ga-abụrịrị n’afọ 607 T.O.A. ka a dọọrọ ha n’agha laa Babịlọn.

Ma, ọtụtụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na ọ bụ n’afọ 587 T.O.A. ka e bibiri Jeruselem. Nke a pụtara na ha na-ekwu na ọ bụ naanị afọ iri ise ka ndị Juu nọrọ na Babịlọn. Gịnị ka ha gbakwasịrị ụkwụ na ya na-ekwu otú ahụ? Ọ bụ n’ihe ndị e dere n’ụrọ n’oge ochie bụ́ nke kọrọ banyere Nebukadneza nke Abụọ nakwa banyere ndị eze ndị chịrị mgbe ọ chịchara.Ndị dere ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ e dere n’ụrọ bụ ndị dịrị ndụ mgbe e bibiri Jeruselem ma ọ bụ obere oge e bibichara ya. Ma, otú ha si gbakọọ oge nweta afọ 587 T.O.A. ọ̀ bụ otú e kwesịrị isi gbakọọ ya? Gịnị n’eziokwu ka ihe ndị ahụ e dere n’ụrọ na-egosi?

Iji mata azịza nke ajụjụ ndị a, ka anyị leba anya n’ihe atọ ndị ọkà mmụta na-agbakwasịkarị ụkwụ na ha ekwu ihe ndị ha na-ekwu: (1) Ihe ndị Babịlọn dere n’ụrọ, (2) ihe ndị e dere n’ụrọ banyere azụmahịa, na (3) ihe ndị na-enyocha mbara igwe dere n’ụrọ.

Ihe ndị Babịlọn dere n’ụrọ.

Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ ụrọ dị iche iche ndị Babịlọn dere ihe ndị dị mkpa mere n’obodo ha.2

Gịnị ka ndị ọkachamara kwuru banyere ụrọ ndị ahụ? Otu nwoke nke ma nke a na-akọ n’ihe banyere ihe ndị e dere n’ụrọ, onye aha ya bụ R. H. Sack, kwuru na ihe ndị ahụ ndị Babịlọn dere ekwuchaghị ihe niile dị mkpa mere na Babịlọn. * O kwuru na ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwesịrị inyocha “ihe ndị ọzọ . . . iji chọpụta ihe merenụ n’eziokwu.”

Gịnị ka ụrọ ndị ahụ na-egosi? E nwere ihe ndị dị mkpa ndị Babịlọn na-edenyeghị n’ihe ndị ha dere.3 (Gụọ  igbe dị n’okpuru.) Ajụjụ bụzi, Ebe ọ bụ na ihe ndị Babịlọn dere ezughị ezu, ihe ndị a gbakwasịrị ụkwụ na ha dee hà ga-abụcha eziokwu?

Ihe ndị e dere n’ụrọ banyere azụmahịa.

Gịnị ka ọ bụ? Ọtụtụ n’ime ihe ndị e dere n’ụrọ banyere azụmahịa n’oge ndị Babịlọn na-achị ụwa bụ risit ndị kọrọ otú ndị eze dị iche iche si zụọ ahịa. N’ụrọ nke ọ bụla, a na-ede ụbọchị, ọnwa, na afọ nke eze a na-ekwu okwu ya na-achị. Dị ka ihe atụ, e dere n’otu ụrọ na e nwere ahịa a zụrụ “n’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa Naịsan, n’afọ nke iri na otu nke ọchịchị eze Babịlọn bụ́ Nebukadreza [onye a na-akpọkwa Nebukadneza nke Abụọ].”4

Ọ bụrụ na eze anwụọ ma ọ bụ a chụtuo ya, eze ọzọ na-arịgoro. A naghị agụnyere eze ọhụrụ ahụ ọnwa ole ọ bụla ọ chịrị tupu oge a ga-echi ya eze ná mbido afọ ọhụrụ. *Ihe nke a pụtara bụ na ọ bụrụ na eze anwụọ ma ọ bụ a chụtuo ya, eze ọzọ na-arịgoro ozugbo, ọ naghị echere ka a banye n’afọ ọhụrụ bụ́ mgbe a ga-echi ya eze. N’ihi ya, ihe e kwesịrị ide n’ụrọ ndị e dere n’oge eze ọhụrụ malitere ịchị kwesịrị ịbụ ihe ndị mere n’ọnwa ole ọ chịrị tupu a banye afọ ọhụrụ.

Gịnị ka ndị ọkachamara kwuru banyere ụrọ ndị ahụ? R. H. Sack lebara anya n’ihe e dere n’ọtụtụ ụrọ ndị kọrọ otú ndị eze Babịlọn ndị ahụ si zụọ ahịa. N’afọ 1972, Sack dere na ihe e dere n’ụrọ ọhụrụ ndị e wegara n’Ebe A Na-edebe Ihe Mgbe Ochie na Briten ‘dị nnọọ iche’ n’ihe ndị e dere n’ụrọ ndị dịbu adị, bụ́ ndị kọrọ banyere oge Nebukadneza nke Abụọ chịrị na oge nwa ya nwoke bụ́ Amel-Marduk (onye a na-akpọkwa Ivil-merodak) chịrị.6 Gịnị mere o ji kwuo otú ahụ? Sack ma na ụrọ ndị nke dịbu adị kwuru na Nebukadneza nke Abụọ ka nọ na-achị n’ọnwa nke isii nke afọ ikpeazụ ọ chịrị (ya bụ, afọ nke iri anọ na atọ nke ọchịchị ya). Ma ụrọ ndị ọhụrụ a, bụ́ ndị e dere n’afọ Amel-Marduk malitere ịchị, kọrọ ihe ndị Amel-Marduk mere n’ọnwa nke anọ na nke ise nke afọ ahụ e kwukwara na ọ bụ afọ ikpeazụ Nebukadneza chịrị.7 O doro anya na ihe ụrọ ndị nke mbụ ahụ kwuru na ihe ndị nke ọhụrụ a na-ekwu abụghị otu.

Gịnị ka ụrọ ndị ahụ na-egosi? E nwekwara ihe ndị ọzọ dị iche a hụrụ. Dị ka ihe atụ, ihe e dere n’ụrọ ndị ahụ gosiri na Nebukadneza nke Abụọ ka nọ na-achị n’ọnwa nke iri nke afọ ikpeazụ ọ chịrị, nke bụ́ mgbe onye e kwuru na ọ nọchiri ya chịrịla ọnwa isii.8 A hụkwara ụdị ihe a n’ihe e dere banyere oge Amel-Marduk kwụsịrị ịchị na oge Neriglissar, bụ́ onye a sịrị nọchiri ya, malitere ịchị.9

Gịnị ka ọdịiche ndị a na-egosi? Dị ka anyị kwuburu, ihe ndị ahụ dị mkpa ndị Babịlọn na-edenyeghị n’ihe ndị ha dere na-egosi na e nwere ike inwe afọ ndị a na-akọghị ihe ndị mere na ha.10 Ọ̀ ga-abụ na e nwere ndị eze ndị chịrị n’afọ ndị ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, ihe ọ pụtara bụ na e kwesịrị ịgbakwụnyekwu afọ n’afọ ole e kwuru na ndị eze ahụ chịrị Babịlọn. N’ihi ya, ma ihe ndị Babịlọn dere n’ụrọ ma ụrọ ndị nke kọrọ banyere azụmahịa enweghị nke a ga-agbakwasịli ụkwụ na ya kwuo hoo haa na ọ bụ n’afọ 587 T.O.A. ka e bibiri Jeruselem. *

Ihe ndị na-enyocha mbara igwe dere n’ụrọ.

Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ ụrọ ndị e dere ebe anyanwụ, ọnwa, kpakpando na ihe ndị ọzọ dị n’eluigwe dị n’oge dị iche iche, nakwa aha eze na-achị mgbe ahụ na afọ ọ na-achị. Dị ka ihe atụ, ihe ndị na-enyocha mbara igwe dere, bụ́ nke dị n’okpuru ebe a, gosiri na e nwere mgbe ọchịchịrị kpuchiri ọnwa n’ọnwa mbụ nke afọ mbụ nke ọchịchị eze bụ́ Mukin-zeri.11

Gịnị ka ndị ọkachamara kwuru banyere ụrọ ndị ahụ? Ndị ọkachamara kwetara na ndị Babịlọn nwere nnọọ ọtụtụ ihe ndị ha dekọrọ bụ́ ndị na-enyere ha aka ịmata mgbe ọchịchịrị nwere ike ikpuchi ọnwa.12

Ma, ndị Babịlọn hà nwere ike iji ihe ndị ahụ ha dekọrọ mata mgbe ọchịchịrị kpuchiri ọnwa n’oge ndị gara aga? Prọfesọ John Steele kwuru, sị: ‘O yiri ka ọ̀ bụ otú ahụ ka ha si mata ụfọdụ oge ọchịchịrị kpuchiri ọnwa.’13 Prọfesọ David Brown kweere na ụfọdụ oge ndị na-enyocha mbara igwe kwuru na ọchịchịrị ga-ekpuchi ọnwa mechara bụrụ oge o kpuchiri ya. Ma o kwukwara na o nwere ike ịbụ ndị odeakwụkwọ ndị dịrị ndụ ọtụtụ narị afọ mgbe ihe ndị ahụ mecharala ji aka ha gbakọta ụfọdụ n’ime oge ndị ahụ.14 Ọ bụrụ na ha gbakọrọ ihe ndị a mgbe ha mecharala eme, mmadụ ò kwesịrị ikwere na oge ndị ha kwuru na ihe ndị ahụ mere bụ mgbe ha mere n’eziokwu ma ọ bụrụ na e nweghị ihe ndị ọzọ gosiri na ọ bụ mgbe ahụ ka ha mere?

Ọ bụrụgodị na ọchịchịrị kpuchiri ọnwa n’oge ha kwuru, nke a ọ̀ pụtara na ihe niile e kwuru na o mere n’oge ahụ mere n’oge ahụ n’eziokwu? Mba. Ọkà mmụta bụ́ R. J. van der Spek kwuru, sị: “Ndị dere ihe ndị ahụ bụ ndị na-agụ kpakpando, ha abụghị ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme.” O kwuru na e jighị n’aka na ihe ndị e dere n’ụrọ ndị ahụ, bụ́ ndị a sịrị na ha mere, mere eme n’eziokwu. N’ihi ya, o kwuru na ‘ọ bụghị ihe niile mmadụ gụtara na ha ka ọ ga-ekwere.’15

Gịnị ka ụrọ ndị ahụ na-egosi? Ka anyị lebagodị anya n’ihe e dere n’otu ụrọ a na-akpọ VAT 4956. Ahịrịokwu mbụ e dere n’ụrọ ahụ bụ: “Afọ nke iri atọ na asaa nke ọchịchị eze Babịlọn, bụ́ Nebukadneza.”16 Ihe ọzọ e deziri na ya bụ ebe ọnwa, kpakpando na ihe ndị ọzọ dị n’eluigwe dị n’oge ahụ. E dekwara otu oge ọchịchịrị kpuchiri ọnwa. Ndị ọkà mmụta kwuru na ọ bụ n’afọ 568/567 T.O.A. ka a hụrụ ihe ndị ahụ, nke pụtara na ha na-ekwu na Nebukadneza nke Abụọ bibiri Jeruselem n’afọ 587 T.O.A., bụ́ afọ nke iri na asatọ nke ọchịchị ya. Ma ọ̀ bụ naanị n’afọ 568/567 T.O.A. ka ihe ndị ahụ mere?

E dekwara n’ụrọ ahụ na ọchịchịrị kpuchiri ọnwa n’abalị iri na ise n’ọnwa Simanu, bụ́ ọnwa nke atọ na kalenda ndị Babịlọn. N’eziokwu, ọchịchịrị kpuchiri ọnwa n’abalị iri na ise n’ọnwa Simanu nke bụ́ abalị anọ n’ọnwa Julaị n’afọ 568 T.O.A. (na kalenda a na-akpọ kalenda Julian). Ma, e nwekwara mgbe ọchịchịrị kpuchiri ọnwa n’abalị iri na ise n’ọnwa Julaị n’afọ 588 T.O.A.,17 nke bụ́ afọ iri abụọ tupu nke ahụ mere n’afọ 568 T.O.A.

Ọ bụrụ na afọ 588 T.O.A. bụ afọ nke iri atọ na asaa nke ọchịchị Nebukadneza nke Abụọ, ihe ọ pụtara bụ na afọ nke iri na asatọ nke ọchịchị ya bụ afọ 607 T.O.A., nke bụ́kwanụ afọ Baịbụl gosiri na e biri Jeruselem. (Lee  oge ndị e depụtara n’okpuru.) Ma è nwere ihe ọzọ e dere n’ụrọ ahụ bụ́ VAT 4956 nke na-akwado na ọ bụ n’afọ 607 T.O.A. ka e bibiri Jeruselem?

E wezụga oge a e kwuru na ọchịchịrị kpuchiri ọnwa, e dekwara n’ụrọ ahụ na e nwere ugboro iri na atọ a hụrụ ọnwa nakwa ugboro iri na ise a hụrụ ihe ndị ọzọ dị n’eluigwe. Ihe ndị a e dere kọwara ebe ọnwa dị n’oge dị iche iche nakwa ebe kpakpando ma ọ bụ ìgwè kpakpando dị iche iche dịkwa n’oge ndị ahụ.18 N’ụrọ ahụ, e dekwara nkebi oge asatọ nke dị malite mgbe anyanwụ wara ruo mgbe ọ dara na malite mgbe ọnwa pụtara ruo mgbe ọ lakpuru.18a

Ebe ọ bụ na a na-agbakọtali ebe ọnwa dị mgbe ọ bụla a chọrọ ịmata ebe ọ dị, ndị ọkà mmụta enyochaala nnọọ ugboro iri na atọ ahụ e dere n’ụrọ bụ́ VAT 4956 na a hụrụ ọnwa n’eluigwe. Ha ji ọkpọka kọmputa leba anya n’oge ndị ahụ e kwuru na a hụrụ ọnwa ka ha mara ma ọ̀ nọkwa n’ebe ndị e kwuru na ọ nọ.19 Gịnị ka ha chọpụtara? Ugboro iri na atọ ahụ a sịrị na a hụrụ ọnwa adabachaghị n’afọ 568/567 T.O.A., ma ha iri na atọ dabachara n’afọ 588/587 T.O.A., nke bụ́ afọ iri abụọ tupu afọ 568/567 T.O.A.

Otu n’ime oge ndị ihe ha chọpụtara dabara n’afọ 588 T.O.A. karịa ka ọ dabara n’afọ 568 T.O.A. ka e sere na peeji ndị a. E sere otu ụrọ, kọwaakwa ihe ndị e dere na ya. N’ahịrị nke atọ n’ụrọ ahụ, e nwere ebe e kwuru na ọnwa nọ “n’abalị ụbọchị nke itoolu [n’ọnwa Nisanu].” Ma, ndị ọkà mmụta ndị bu ụzọ kwuo na ọ bụ n’afọ 568 T.O.A. ka ọnwa nọ n’ebe ahụ, kwukwara na n’afọ ahụ, ọnwa nọ n’ebe ahụ “n’ụbọchị nke asatọ n’ọnwa Nisanu, ọ bụghị n’ụbọchị nke itoolu.” Iji mee ka e kweta na ọ bụ n’afọ 568 T.O.A. ka ihe e dere n’ụrọ ahụ mere, ha kwuziri na odeakwụkwọ dere ihe ahụ dehiere ihe o dere, na o dere “ụbọchị nke itoolu” kama ide “ụbọchị nke asatọ.”20 Ma ihe e dere n’ahịrị nke atọ n’ụrọ ahụ dabara nnọọ n’ụbọchị nke itoolu nke ọnwa Nisanu n’afọ 588 T.O.A.21

N’eziokwu, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ihe niile e dere n’ụrọ ahụ bụ́ VAT 4956 mechara n’afọ 588 T.O.A. bụ́ nke gosiri na afọ 588 T.O.A. bụ afọ nke iri atọ na asaa nke ọchịchị Nebukadneza nke Abụọ. N’ihi ya, ihe ndị e dere n’ụrọ ahụ kwadoro na ọ bụ n’afọ 607 T.O.A. ka e bibiri Jeruselem, nke bụ́kwanụ afọ Baịbụl gosiri na e bibiri ya.

Gịnị Mere Anyị Ga-eji Kwere Ihe Baịbụl Kwuru?

N’oge a, ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na ọ bụ n’afọ 587 T.O.A. ka e bibiri Jeruselem. Ma, Jeremaya na Daniel, bụ́ ndị so dee Baịbụl, kwuru hoo haa na ọ bụ afọ iri asaa ka ndị Juu nọrọ n’ebe a dọọrọ ha n’agha, ọ bụghị afọ iri ise. (Jeremaya 25:1, 2, 11; 29:10; Daniel 9:2) Ihe ndị ahụ ha kwuru gosiri nnọọ na ọ bụ n’afọ 607 T.O.A. ka e bibiri Jeruselem. Ihe ndị a anyị lebara anya na ha gosiri na ọ bụghị naanị Baịbụl kwadoro na ọ bụ n’afọ ahụ.

E nweela ọtụtụ mgbe ndị ọkachamara kwuru na ha echeghị na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ma, mgbe e nyochara ọtụtụ ihe ndị ọzọ, ọ na-edo anya na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. * Ndị kweere ihe Baịbụl kwuru nwere ihe kara ha obi ha ji kwere ya. Ihe kara ha obi bụ na ha achọpụtala na ihe ndị Baịbụl kọrọ mere eme n’eziokwu, chọpụtakwa na ihe Baịbụl kwuru dabara n’ihe ndị sayensị chọpụtarala, nakwa na amụma ndị e buru na ya na-emezu. Ọ bụ ihe ndị a niile mere ha ji kwere n’eziokwu na Baịbụl bụ Okwu Chineke nke e ji ike mmụọ nsọ Chineke dee. (2 Timoti 3:16) Í cheghị na ọ dị mma ka ị gụọ Baịbụl ka i wee hụ na ihe ndị a bụ eziokwu? I nwekwara ike ikweta na Baịbụl bụ nnọọ Okwu Chineke.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 T.O.A. pụtara Tupu Oge Anyị.

^ par. 14 Ihe ị ga-eburu n’uche: O nweghị onye nke ọ bụla n’ime ndị ọkachamara e dere ihe ha kwuru n’isiokwu a nke kwetara na ọ bụ n’afọ 607 T.O.A. ka e biri Jeruselem.

^ par. 18 Ọ bụ n’ọnwa Naịsan ka ndị Babịlọn ji echi eze ọhụrụ. Ọ bụrụ na eze anwụọ, eze ọzọ na-anọchi, ma a gaghị agụnyere eze ọhụrụ ahụ ọnwa ole ọ bụla ọ chịrị tupu oge a ga-echi ya eze n’ọnwa Naịsan, bụ́ ọnwa mbụ ndị Babịlọn.

^ par. 21 E nwere ụrọ ndị kọrọ banyere ahịa ndị a zụrụ n’afọ niile ndị eze ahụ nọ na-achị Babịlọn. Ọ bụrụ na a gbakọọ afọ niile ha chịrị, ma malite mgbe eze nke ikpeazụ, bụ́ Nabonidus, chịrị, gụrụ afọ ndị ahụ ruo mgbe eze Babịlọn nke bibiri Jeruselem chịrị, ọ ga-apụta na e bibiri Jeruselem n’afọ 587 T.O.A. Ma, naanị mgbe ịgbakọ ya otú a ga-adaba bụ ma ọ bụrụ na eze nke ọ bụla bidoro ịchị ozugbo eze bu ya ụzọ chịchara n’enweghị ọnwa ma ọ bụ afọ a na-enweghị eze.

^ par. 36 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ihe ndị gosiri na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu, gụọ isi nke 4 na isi nke 5 nke akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Igbe/Chaatị dị na peeji nke 23]

 (Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

AKỤKỌ NDỊ BABỊLỌN DERE N’ỤRỌ EZUGHỊ EZU

N’ime afọ iri asatọ na asatọ a sịrị na ndị Babịlọn chịrị ụwa, ọ bụ naanị afọ iri atọ na ise ka ndị Babịlọn kọrọ ihe ndị mere na ha.

AFỌ NDỊ A NA-AKỌGHỊ IHE MERE NA HA

AFỌ NDỊ A KỌRỌ IHE MERE NA HA

BM 21901 BM 21946 BM 35382

↓ ↓ ↓ ↓

OGE NDỊ BABỊLỌN NA-ACHỊ ỤWA OGE NDỊ PESHIA CHỊWARA

Nabopolassar Nebukadneza nke Abụọ Amel-Marduk Nabonidus

Neriglissar Labashi-Marduk

↑ ↑ ↑

BM 25127 BM 22047 BM 25124

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

BM 21901 and BM 35382: Photograph taken by courtesy of the British Museum; BM 21946: Copyright British Museum; BM 22047, 25124, 25127: © The Trustees of the British Museum

[Igbe/Foto dị na peeji nke 24]

IHE NDỊ NA-ENYOCHA MBARA IGWE DERE N’ỤRỌ A KPỌRỌ BM 32238

N’ụrọ a, e dere oge dị iche iche ọchịchịrị kpuchiri ọnwa. Ma, ọ bụ mgbe nke ikpeazụ n’ime ha mecharala ka e dere ha. Nke ikpeazụ ahụ mekwaranụ ihe dị ka narị afọ anọ mgbe nke mbụ mechara. Ebe ọ bụ na odeakwụkwọ nke dere ihe ndị a ejighị anya ya hụ mgbe ha niile mere, ọ ga-abụ na o ji aka ya gbakọta oge ndị nke mbụ mere. Ọ bụrụ na e nweghị ihe ndị ọzọ gosiri na ihe niile o dere mere n’oge o kwuru na ha mere, mmadụ ekwesịghị ịgbakwasị ụkwụ na ha kwuo oge ihe dị iche iche mere.

[Ebe E Si Nweta Foto]

© The Trustees of the British Museum

[Okwu nkọwa dị na peeji nke 26, 27]

GỊNỊ N’EZIE KA E DERE N’ỤRỌ BỤ́ VAT 4956?

Gịnị mere o ji bụrụ okwu? Ahịrị nke atọ n’ụrọ a sịrị na “n’abalị ụbọchị nke itoolu” n’ọnwa mbụ (ya bụ, Nisanu/Naịsan), “ọnwa nọ otu kubit n’ihu kpakpando a na-akpọ ß Virginis.” Ma n’afọ 1915, ndị ọkà mmụta abụọ bụ́ Neugebauer na Weidner dere n’akwụkwọ ha na ‘ọnwa nọ otu kubit n’ihu kpakpando a n’ụbọchị nke asatọ n’ọnwa Naịsan, ọ bụghị n’ụbọchị nke itoolu.’ Ha dere nke a mgbe ha na-ede banyere afọ 568 T.O.A. (bụ́ afọ na-egosi na ọ bụ n’afọ 587 T.O.A. ka e bibiri Jeruselem). Ma, ebe ọnwa nọ n’ụbọchị nke itoolu n’ọnwa Naịsan dabara nnọọ n’afọ 588 T.O.A., bụ́ nke gosiri na ọ bụ n’afọ 607 T.O.A. ka e bibiri Jeruselem.

Ò kwesịrị ịbụ n’ụbọchị nke itoolu ka ọ̀ bụ n’ụbọchị nke asatọ?

(1) Foto a dị ebe a gosiri ebe ndị Babịlọn dere “itoolu.”

(2) Mgbe Neugebauer na Weidner na-asụgharị ihe e dere n’ụrọ a, ha gbanwere “itoolu” ahụ dee ya “asatọ.”

(3) Ọ bụ naanị n’ala ala peeji ihe ahụ ha dere ka ha dere na ihe e dere n’ụrọ ahụ bụ “itoolu.”

(4) Ha dekwara ya “asatọ” na nke ha sụgharịrị n’asụsụ Jaman.

(5) N’afọ 1988, ndị ọkà mmụta bụ́ Sachs na Hunger bipụtara ihe e dere n’ụrọ ahụ otú ọ dị, deekwa “itoolu” ahụ.

(6) Ma, mgbe ha sụgharịrị ihe e dere n’ụrọ ahụ n’asụsụ Bekee, ha dekwara “asatọ” otú ahụ ndị ọzọ dere, sị na ihe e kwesịrị ide n’ụrọ ahụ bụ “asatọ,” ọ bụghị “itoolu.”

[Ebe E Si Nweta Foto]

bpk / Vorderasiatisches Museum, SMB / Olaf M. Teßmer

[Okwu nkọwa dị na peeji nke 28]

Ebe A Kọwakwuru Ihe Ụfọdụ n’Isiokwu A Bụ́ “Olee Mgbe E Bibiri Jeruselem Oge Ochie?—Agba nke Abụọ”

1. Otú ndị odeakwụkwọ oge oche si ede ihe n’ụrọ bụ na ha na-eji ihe dị ka osisi pịrị ọnụ akanye ihe n’ụrọ mgbe ụrọ na-akpọbeghị akpọ.

2. Akwụkwọ bụ́ Assyrian and Babylonian Chronicles, nke A. K. Grayson dere, peeji nke 8. E bipụtara nke mbụ ya n’afọ 1975, bigharịa ya n’afọ 2000.

3. Ndị Babịlọn malitere ịchị ụwa na narị afọ nke asaa T.O.A., ya bụ, mgbe ndị eze si Kaldia bidoro chịwa. Eze mbụ n’ime ha bụ Nabopolassar, nna Nebukadneza nke Abụọ. Onye ikpeazụ chịrị bụ Nabonidus, onye eze ndị Peshia bụ́ Saịrọs naghaara ọchịchị n’afọ 539 T.O.A.

4. Akwụkwọ bụ́ Neo-Babylonian Business and Administrative Documents, nke Ellen Whitley Moore dere, peeji nke 33. E bipụtara ya n’afọ 1935.

5. Akwụkwọ bụ́ Archimedes, Volume 4, New Studies in the History and Philosophy of Science and Technology, “Observations and Predictions of Eclipse Times by Early Astronomers,” nke John M. Steele dere, peeji nke 36. E bipụtara ya n’afọ 2000.

6. Akwụkwọ bụ́ Amel-Marduk 562-560 B.C.—A Study Based on Cuneiform, Old Testament, Greek, Latin and Rabbinical Sources. With Plates, nke Ronald H. Sack dere, peeji nke 3. E bipụtara ya n’afọ 1972.

7. Mgbe e dere ihe dị n’ụrọ bụ́ BM 80920 na nke bụ́ BM 58872 bụ n’ọnwa nke anọ na nke ise nke afọ Ivil-merodak malitere ịchị. Sack bipụtara ihe e dere n’ụrọ ndị ahụ n’akwụkwọ bụ́ Amel-Marduk 562-560 B.C.—A Study Based on Cuneiform, Old Testament, Greek, Latin and Rabbinical Sources. With Plates, peeji nke 3, 90, 106.

8. Mgbe e dere ihe dị n’ụrọ dị n’Ebe A Na-edebe Ihe Mgbe Ochie na Briten (bụ́ ụrọ a na-akpọ BM 55806) bụ n’ọnwa nke iri, n’afọ nke iri anọ na atọ nke ọchịchị Nebukadneza nke Abụọ.

9. Mgbe e dere ihe dị n’ụrọ bụ́ BM 75106 na nke bụ́ BM 61325 bụ n’ọnwa nke asaa na ọnwa nke iri nke afọ a sịrị na ọ bụ afọ ikpeazụ (ya bụ, afọ nke abụọ) nke ọchịchị Ivil-merodak. Ma, mgbe e dere ihe dị n’ụrọ bụ́ BM 75489 bụ n’ọnwa nke abụọ nke afọ Neriglissar, bụ́ eze a sịrị nọchiri ya, malitere ịchị.—Catalogue of the Babylonian Tablets in the British Museum, Nke 8, (Ụrọ nke Atọ) nke Erle Leichty, J. J. Finkelstein, na C.B.F. Walker dere, peeji nke 25, 35. E bipụtara ya n’afọ 1988.

Akwụkwọ bụ́ Catalogue of the Babylonian Tablets in the British Museum, Nke 7, (Ụrọ nke Abụọ) nke Erle Leichty na A. K. Grayson dere, peeji nke 36. E bipụtara ya n’afọ 1987.

Akwụkwọ bụ́ Neriglissar—King of Babylon, nke Ronald H. Sack dere, peeji nke 232. E bipụtara ya n’afọ 1994. Ọnwa e dere n’ụrọ ahụ bụ Ajaru (nke bụ́ ọnwa nke abụọ).

10. Ka anyị weregodị eze bụ́ Neriglissar mee ihe atụ. E dere n’ụrọ na ọ bụ “nwa Bêl-shum-ishkun,” bụ́ ‘eze Babịlọn.’ Otu ihe ọzọ e dere kpọrọ Bêl-shum-ishkun “nwa eze, onye maara ihe.” N’asụsụ ndị Babịlọn, okwu bụ́ rubû, nke pụtara “nwa eze,” pụtakwara ‘eze ma ọ bụ onye na-achị achị.’ Ebe ọ bụ na e nwere oge a na-akọghị ihe ndị mere na ha n’agbata oge Amel-Marduk chịrị na oge Neriglissar, bụ́ onye a sịrị nọchiri ya, chịrị, ọ̀ ga-abụ na Bêl-shum-ishkun, bụ́ onye a kpọrọ “eze Babịlọn,” chịrị n’agbata ha abụọ? Prọfesọ R. P. Dougherty kwuru na “e nwere nnọọ ihe ndị gosiri na Neriglissar bụ nwa eze.”—Akwụkwọ bụ́ Nabonidus and Belshazzar—A Study of the Closing Events of the Neo-Babylonian Empire, nke Raymond P. Dougherty dere, peeji nke 61. E bipụtara ya n’afọ 1929.

11. Akwụkwọ bụ́ Astronomical Diaries and Related Texts From Babylonia, Nke 5, nke Hermann Hunger dezigharịrị, peeji nke 2-3. E bipụtara ya n’afọ 2001.

12. Akwụkwọ bụ́ Journal of Cuneiform Studies, Nke 2, Nọmba nke 4, 1948, “A Classification of the Babylonian Astronomical Tablets of the Seleucid Period,” nke A. Sachs dere, peeji nke 282-283.

13. Akwụkwọ bụ́ Astronomical Diaries and Related Texts From Babylonia, Nke 5, peeji nke 391.

14. Akwụkwọ bụ́ Mesopotamian Planetary Astronomy-Astrology, nke David Brown dere, peeji nke 164, 201-202. E bipụtara ya n’afọ 2000.

15. Akwụkwọ bụ́ Bibliotheca Orientalis, L N° 1/2, Januari-Maart, 1993, “The Astronomical Diaries as a Source for Achaemenid and Seleucid History,” nke R. J. van der Spek dere, peeji nke 94, 102.

16. Akwụkwọ bụ́ Astronomical Diaries and Related Texts From Babylonia, Nke 1, nke Abraham J. Sachs dere peeji nke 47. Hermann Hunger dezigharịrị ya ma dechaa ya. E bipụtara ya n’afọ 1988.

17. Akwụkwọ bụ́ Babylonian Eclipse Observations From 750 BC to 1 BC, nke Peter J. Huber na Salvo De Meis dere, peeji nke 186. E bipụtara ya n’afọ 2004. Ụrọ bụ́ VAT 4956 kwuru na mgbe ọchịchịrị ahụ kpuchiri ọnwa bụ n’ụbọchị nke iri na ise nke ọnwa nke atọ na kalenda ndị Babịlọn. Nke a pụtara na mkpụrụ ụbọchị iri na ise agaala n’ọnwa Simanu mgbe ihe ahụ mere. Ọ bụrụ na ọchịchịrị ahụ kpuchiri ọnwa n’ụbọchị nke iri na ise n’ọnwa Julaị n’afọ 588 T.O.A. na kalenda Julian, ihe ọ pụtara bụ na ụbọchị mbụ nke ọnwa Simanu bụ Jun 30/Julaị 1, 588 T.O.A. na kalenda a. Ebe ọ dị otú ahụ, ọnwa mbụ (ya bụ, Nisanu) na kalenda ndị Babịlọn bidoro afọ ọhụrụ na Mee 2/3, ya bụ, ọnwa abụọ tupu mgbe ahụ. Ọ bụ ezie na afọ ahụ ọchịchịrị kpuchiri ọnwa kwesịrị ibido n’Eprel 3/4, e dere n’ụrọ bụ́ VAT 4956, n’ahịrị ya nke isii, na a gbakwụnyere otu ọnwa n’afọ nke bu ya ụzọ mgbe ọnwa nke iri na abụọ (ọnwa Addaru nke bụ́kwa ọnwa ikpeazụ) gwụrụ. (E dere n’ụrọ ahụ, sị: “Ụbọchị nke asatọ nke ọnwa XII2 [ọnwa nke iri na atọ].”) N’ihi ya, ọ bụ na May 2/3 ka afọ ọhụrụ ahụ malitere. Nke a na-egosi na ikwu na ọchịchịrị ahụ kpuchiri ọnwa n’afọ 588 T.O.A. dabara nnọọ n’ihe e dere n’ụrọ ahụ.

18. Akwụkwọ bụ́ Berichte über die Verhandlungen der Königl. Sächsischen Gesellschaft der Wissenschaften zu Leipzig (nke kọrọ ihe ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwurịtara n’obodo Leipzig); Nke 67; Mee 1, 1915; n’isiokwu bụ́ “Ein astronomischer Beobachtungstext aus dem 37. Jahre Nebukadnezars II” (Ihe Ndị Na-enyocha Mbara Igwe Dere Banyere Afọ nke Iri Atọ na Asaa nke Ọchịchị Nebukadneza nke Abụọ), nke Paul V. Neugebauer na Ernst F. Weidner dere, peeji nke 67-76. Akwụkwọ a kwuru na e nwere ugboro iri na atọ a hụrụ ọnwa, hụkwa ebe kpakpando ma ọ bụ ìgwè kpakpando nọkwa n’otu mgbe ahụ ọnwa nọ n’ebe ahụ. Ha dekwara ugboro iri na ise a hụrụ ihe ndị ọzọ dị n’eluigwe. (Peeji nke 72-76) N’ụrọ ahụ, a na-amata ebe ọ bụla e kwuru na ọnwa dị, ma a naghị amatacha ebe e kwuru na ụfọdụ ihe ndị ọzọ dị n’eluigwe dị. (Akwụkwọ bụ́ Mesopotamian Planetary Astronomy—Astrology, nke David Brown dere, peeji nke 53-57. E bipụtara ya n’afọ 2000) N’ihi nke a, ọkà mmụta nke ọ bụla na-akọwa ihe ndị ahụ e dere banyere ebe ihe ụfọdụ ndị dị n’eluigwe dị otú ọ bụla o si ghọta ya. Ebe ọ bụ na ọ naghị esi ike ịmata ebe ọnwa nọ n’oge ọ bụla, e nwere ike iji ya mata ebe ihe ndị ọzọ dị n’eluigwe, bụ́ ndị e kwuru okwu ha n’ụrọ bụ́ VAT 4956, dị nakwa oge ha dị n’ebe ndị ahụ.

18a. Otú e nwere ike isi gbakọọ oge a a na-ekwu okwu ya bụ na a na-amalite n’oge anyanwụ dara gụrụ ya ruo mgbe ọnwa lakpuru n’ụbọchị mbụ n’ọnwa, a na-agbakọkwa ya otú ahụ ugboro abụọ ọzọ n’ọnwa ahụ. Ndị ọkà mmụta amatala ebe oge nke ọ bụla n’ime ha dabara na kalenda nke oge a. (Akwụkwọ bụ́ “The Earliest Datable Observation of the Aurora Borealis,” nke F. R. Stephenson na David M. Willis dere, n’isiokwu bụ́ Under One Sky—Astronomy and Mathematics in the Ancient Near East, nke John M. Steele na Annette Imhausen dezigharịrị, peeji nke 420-428. E bipụtara ya n’afọ 2002) N’oge ochie, ndị na-enyocha mbara igwe na-eji ihe dị ka klọọkụ agbakọ oge a. Ma, mmadụ agaghị ewere ya na ha gbakọtara oge ahụ niile nke ọma. (Akwụkwọ bụ́ Archimedes, Volume 4, New Studies in the History and Philosophy of Science and Technology, “Observations and Predictions of Eclipse Times by Early Astronomers,” nke John M. Steele dere, peeji nke 65-66. E bipụtara ya n’afọ 2000.) Ma, ha na-agbakọtali nnọọ ebe ọnwa dị, nakwa ebe ihe ndị ọzọ dị ya nso dị n’eluigwe.

19. Ndị na-enyocha mbara igwe ji ọkpọka kọmputa a rụnyere ihe a na-akpọ TheSky6™ mee nnyocha ahụ. Ihe ọzọkwa ha ji mee nnyocha ahụ bụ ihe a na-akpọ Cartes du Ciel/Sky Charts (CDC) nakwa ihe e ji agụkọ oge nke Ndị Agha Ụgbọ Mmiri Amerịka nyere ha. Ebe ọ bụ na ọkà mmụta ọ bụla na-akọwa ihe ndị e dere n’ụrọ banyere ebe ihe ụfọdụ ndị dị n’eluigwe dị otú o si ghọta ya, ndị ahụ mere nnyocha ahụ elekwasịghị anya n’ebe ndị ahụ e kwuru na ụfọdụ ihe ndị dị n’eluigwe dị mgbe ha chọrọ ịmata kpọmkwem afọ ihe ahụ e dere n’ụrọ ahụ mere.

20. Akwụkwọ bụ́ Berichte über die Verhandlungen der Königl. Sächsischen Gesellschaft der Wissenschaften zu Leipzig (nke kọrọ ihe ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwurịtara n’obodo Leipzig); Nke 67; Mee 1, 1915; “Ein astronomischer Beobachtungstext aus dem 37. Jahre Nebukadnezars II, (-567/66)” (Ihe Ndị Na-enyocha Mbara Igwe Dere Banyere Afọ nke Iri Atọ na Asaa nke Ọchịchị Nebukadneza nke Abụọ), nke Paul V. Neugebauer na Ernst F. Weidner dere, peeji nke 41.

21. Ihe e dere n’ụrọ bụ́ VAT 4956 kwuru n’ahịrị nke atọ, sị: “Ọnwa nọ otu kubit n’ihu kpakpando a na-akpọ ß Virginis.” Nnyocha ahụ e ji ọkpọka kọmputa mee gosiri na n’ụbọchị nke itoolu n’ọnwa Nisanu, ọnwa nọ 2°04ʹ n’ihu kpakpando a na-akpọ ß Virginis, nọrọkwa 0° n’okpuru ya. Ihe a chọpụtara ná nnyocha ahụ na ihe ahụ e dere n’ụrọ dabara nnọọ.

[Chaatị dị na peeji nke 25]

 (Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

OLEE AFỌ ỤRỌ BỤ́ VAT 4956 GOSIRI NA E BIBIRI JERUSELEM​—Ọ̀ BỤ AFỌ 587 T.O.A. KA Ọ̀ BỤ AFỌ 607 T.O.A.?

▪ N’ụrọ ahụ, a kọrọ ihe dị iche iche ndị na-enyocha mbara igwe kwuru na ha hụrụ n’afọ nke iri atọ na asaa nke ọchịchị Eze Nebukadneza nke Abụọ.

▪ Nebukadneza nke Abụọ bibiri Jeruselem n’afọ nke iri na asatọ nke ọchịchị ya.—Jeremaya 32:1.

Ọ bụrụ na afọ nke iri atọ na

na asaa nke ọchịchị Nebukadneza

nke Abụọ bụ 568 T.O.A., ọ pụtara

na e bibiri Jeruselem n’afọ

587 ← ← 587 T.O.A.

610 T.O.A. 600 590 580 570 560

607 ← ← Ọ bụrụ na afọ nke iri atọ na asaa nke

ọchịchị ya bụ 588 T.O.A., ọ pụtara na

e bibiri Jeruselem n’afọ 607 T.O.A., nke

bụ́kwanụ afọ Baịbụl gosiri na e bibiri ya.

▪ VAT 4956 gosiri nnọọ na ọ bụ n’afọ 607 T.O.A. ka e bibiri Jeruselem.

[Okwu nkọwa dị na peeji nke 22]

Photograph taken by courtesy of the British Museum