Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nne Na Nna Hà Kwesịrị Ịkụziri Ụmụ Ha Banyere Mmekọahụ?

Ndị Nne Na Nna Hà Kwesịrị Ịkụziri Ụmụ Ha Banyere Mmekọahụ?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Ndị Nne Na Nna Hà Kwesịrị Ịkụziri Ụmụ Ha Banyere Mmekọahụ?

▪ Ọtụtụ ndị nne na nna na-eme ihe niile ha nwere ike ime ka ụmụ ha ghara ibute ọrịa ọjọọ. Ndị nne na nna kwesịkwara ịgbalị ike ha niile ka ụmụ ha ghara ịmụta omume rụrụ arụ. Otu ụzọ ha nwere ike isi mee nke a bụ ịkụziri ha ihe ndị ha kwesịrị ịma banyere mmekọahụ. (Ilu 5:3-23) Ihe mere nke a ji dị mkpa bụ na omume rụrụ arụ juru ebe niile taa. Ụmụaka nwere ike ikiri omume rụrụ arụ na tiivi ma ọ bụ n’Ịntanet, gụọ ha n’akwụkwọ ma ọ bụkwanụ nụ ebe e ji okwu rụrụ arụ eme ihe ọchị.

Otu prọfesọ nke aha ya bụ́ Diane Levin kwuru, sị: “Nsogbu e nwere taa abụghị na ụmụaka anyị na-amụta banyere mmekọahụ. Ihe bụ́ nsogbu bụ ihe ha na-amụta banyere ya, afọ ole ha dị na-amụta ya, nakwa ndị ha si n’aka ha na-amụta ya. Ebe ụmụaka na-esikarị amụta ihe ndị na-adịghị mma banyere mmekọahụ bụ na tiivi nakwa n’ihe ha na-ahụkarị ndị ọzọ na-eme.”

Ndị nne na nna kwesịrị ichebe ụmụ ha ka ha ghara ịmụta ihe ọjọọ ndị a na-akụzi taa banyere mmekọahụ. (Ilu 5:1; Ndị Efesọs 6:4) Ọ dị mkpa ka ụmụaka mara otú ahụ́ ha si arụ ọrụ, otú ha ga-esi na-elekọta ahụ́ ha, na ihe ndị ha kwesịrị ime ka ndị na-emetọ ụmụaka ghara imebi ha. Tupu ụmụaka ahụwa mgbanwe n’ahụ́ ha, ndị mụrụ ha kwesịrị ịkọrọ ha banyere mgbanwe ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, nwatakịrị nwaanyị kwesịrị ịghọta ihe nwaanyị ịhụ nsọ ya bụ na ihe mere ụmụ nwaanyị ji ahụ nsọ. Tupu ọbara ọcha apụtawakwa nwatakịrị nwoke n’ahụ́, e kwesịrị ịkọwara ya ihe bụ́ ọbara ọcha na ihe mere o ji apụta ụmụ nwoke n’ahụ́ ma ha hiwe ụra. Ndị nne na nna nwere ike ibido mgbe ụmụ ha ka dị obere kụziwere ha ezigbo aha a na-akpọ ihe ha ji bụrụ nwoke ma ọ bụ ihe ha ji bụrụ nwaanyị. O nwere ihe atọ dị mkpa ndị nne na nna kwesịrị ịkụziri ụmụ ha banyere ihe ha ji bụrụ nwoke ma ọ bụ ihe ha ji bụrụ nwaanyị: (1) Ọ bụ ebe pụrụ iche n’ahụ́ ha. (2) Ha ekwesịghị iji ya na-ekwu okwu ọjọọ ma ọ bụ na-ama njakịrị. (3) Ha ekwesịghị igosi ya ndị ọzọ ma ọ bụ kwe ka ndị ọzọ metụ ya aka. Ka ụmụaka na-etolitekwu, ndị mụrụ ha kwesịrị ịma mgbe ha ga-akọwara ha otú nwaanyị si atụrụ ime. *

Olee mgbe ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ibido kụziwere ụmụ ha ihe ndị a? Ha kwesịrị ibido n’ezigbo oge. Nwatakịrị nwaanyị nwere ike ibido ịhụ nsọ ya mgbe ọ dị afọ iri, ma ọ bụ tupu ya eruodị afọ iri. Mgbe nwatakịrị nwoke dị afọ iri na otu ma ọ bụ iri na abụọ, ọbara ọcha nwere ike ibido ịpụta ya n’ahụ́ ma o hiwe ụra. Mgbanwe ndị a nwere ike ime ka ahụ́ ghara iru ụmụaka ala ma ọ bụrụ na ha aghọtaghị ihe na-eme n’ahụ́ ha. Tupu ụmụaka ahụwa mgbanwe ndị ahụ, e kwesịrị ịkọwara ha na o nweghị ihe dị njọ ná mgbanwe ndị ahụ ha ga-ahụ n’ahụ́ ha. Ọ bụkwa n’oge a ka ndị nne na nna kwesịrị ịkụziri ụmụ ha na ọ dị mkpa ka ha na-ebi ndụ otú Baịbụl kwuru, meekwa ka ha mata uru ha ga-erite ma ha mee otú ahụ. O nweghị ebe ọzọ ụmụaka ga-esi amụta ihe ndị a otú a.—Ilu 6:27-35.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ndịàmà Jehova nwere akwụkwọ ndị na-enyere ndị nne na nna aka ịkụziri ụmụ ha ihe ndị a kọwara n’isiokwu a. Ụfọdụ n’ime ha bụ: Teta! October 2006, isiokwu bụ́ “Ịkwadebe Nwa Gị Nwanyị Maka Ịhụ Nsọ Ya,” nke dị na peeji nke 10-13; Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, isi nke 6 nke isiokwu ya bụ, “Gịnị Na-eme Ahụ́ M?”; nakwa Ụlọ Nche Nọvemba 1, 2010, isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ—Na-agwa Ụmụ Gị Okwu Banyere Mmekọahụ,” peeji nke 12-14.