Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Napụtara Ha n’Oké Ọkụ!

A Napụtara Ha n’Oké Ọkụ!

Maka Ndị Na-eto Eto

A Napụtara Ha n’Oké Ọkụ!

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị a, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere, werekwa ya na ị na-ahụ ka ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

Ndị a kọrọ akụkọ ha: Shedrak, Mishak, Abednego, na Nebukadneza

Ihe a kọrọ: A nwara ụmụ okorobịa atọ bụ́ ndị Hibru ka ha nupụrụ Chineke isi.

1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ DANIEL 3:1-30.

Kọwaa ụdị ụda ndị ọ dị gị ka ị̀ na-anụ mgbe ị na-agụ amaokwu nke 3-7.

․․․․․

Kọwaa otú i chere oké ọkụ ahụ a kwanyere dị.

․․․․․

Olee ụdị olu i chere Nebukadneza ji nye iwu ka e mee ka oké ọkụ ahụ a kwanyere dịkwuo ọkụ okpukpu asaa karịa otú ọ na-adịbu? (Gụgharịa amaokwu nke 19 na nke 20.)

․․․․․

Kọwaa otú i chere onye nke anọ a hụrụ n’oké ọkụ ahụ dị. (Gụgharịa amaokwu nke 24 na nke 25.)

․․․․․

Olee àgwà ndị ị chọpụtara Shedrak, Mishak, na Abednego gosiri mgbe ha na-agwa Nebukadneza okwu n’amaokwu nke 16-18?

2 LEBAKWUO YA ANYA.

Jiri ihe e ji eme nchọnchọ ndị i nwere chọpụta otú otu kubit na-aha, jirizie ya gbakọọ otú ihe oyiyi ahụ Nebukadneza kpụrụ hà. (Gụgharịa amaokwu nke 1.)

․․․․․

Ọ bụrụ na ị gụọ amaokwu nke 19 na nke 20 ma gụọkwa amaokwu nke 28 na nke 29, olee ụdị onye ị ga-asị na Nebukadneza bụ?

․․․․․

3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .

Ịkwanyere ndị ọchịchị ma ọ bụ ndị nọ n’isi ùgwù.

․․․․․

Ihe mere o ji dị mkpa ka ị kwụsie ike n’ihe i kweere.

․․․․․

Otú Jehova si enyere ndị ya aka mgbe ọnwụnwa bịaara ha.

․․․․․

ỤZỌ NDỊ ỌZỌ Ị GA-ESI MEE IHE Ị MỤTARA.

Olee mgbe e nwere ike ịnwa gị ọnwụnwa ka i nupụrụ Chineke isi?

․․․․․

Olee otú akụkọ Shedrak, Mishak, na Abednego ga-esi enyere gị aka ka ị nọgide na-eme ihe Chineke chọrọ?

․․․․․

4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤKWA MAKA GỊNỊ?

․․․․․

Ọ bụrụ na i nweghị Baịbụl, gwa ndịàmà Jehova ka ha nye gị otu, ma ọ bụ gị agụọ ya n’asụsụ bekee na www.watchtower.org na www.pr418.com