Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Na-ata Anyị Ahụhụ?

Chineke Ọ̀ Na-ata Anyị Ahụhụ?

Chineke Ọ̀ Na-ata Anyị Ahụhụ?

Mgbe otu nnukwu ala ọma jijiji mere na Japan na Mach afọ 2011, otu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị a ma ama na Japan kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na m na-emetere ndị ọdachi a dakwasịrị ebere, ma, ọ dị m ka Chineke ò ji ya taa ha ahụhụ.”

Mgbe ala ọma jijiji mere na Heiti na Jenụwarị afọ 2010 ma gbuo narị puku mmadụ abụọ na puku mmadụ iri abụọ, otu pastọ a ma ama, nke na-ekwukarị okwuchukwu na tiivi, kwuru na ihe kpatara ya bụ na ndị mmadụ na ‘Ekwensu gbara ndụ,’ o kwukwara na ọ dị mkpa ka ha ‘kpewere Chineke.’

Mgbe e nwere otu nnukwu ọgba aghara n’obodo Manila, nke dị ná mba Filipinz, bụ́ nke mmadụ iri asaa na itoolu nwụrụ na ya, otu ụkọchukwu ndị Katọlik kwuru, sị: “Chineke chọrọ iji ihe a merenụ mee ka akọnuche anyị nwụrụ anwụ rụwakwa ọrụ.” Otu akwụkwọ akụkọ nke e nwere n’obodo ahụ kwuru na ‘ọtụtụ ndị torola eto kweere na Chineke ji ajọ ifufe, ala mbize, na ọdachi ndị ọzọ ndị na-emekarị ná mba ahụ, na-ata ndị mmadụ ahụhụ.’

Ọ BỤGHỊ taa ka ndị mmadụ bidoro ikwu na Chineke na-eji ọdachi ndị na-emere onwe ha ata ndị mmadụ ahụhụ. N’afọ 1755, mgbe otu nnukwu ala ọma jijiji na ọkụ ọgbụgba gburu ihe dị ka puku mmadụ iri isii n’obodo Lisbọn, nke dị na Pọchụgal, otu ọkà mmụta a ma ama, nke aha ya bụ Voltaire, jụrụ, sị: “Ọ̀ pụtara na ndị Lisbọn na-eme mmehie karịa ndị Paris, bụ́ ndị ihe nke ụwa na-atọgbu atọgbu?” N’eziokwu, ọtụtụ nde mmadụ na-eche ma ọ̀ ga-abụ na Chineke ji ọdachi ndị na-emere onwe ha ata ndị mmadụ ahụhụ. N’ọtụtụ mba, ndị mmadụ na-ekwu na ọdachi ndị ahụ bụ aka ọrụ Chineke.

Ebe ọ dị otú ahụ, ihe anyị kwesịrị ịjụ bụ: Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke ji ọdachi ndị na-emere onwe ha ata ndị mmadụ ahụhụ? Chineke ò ji ọtụtụ ọdachi ndị mere na nso nso a taa ndị mmadụ ahụhụ?

Ndị na-ekwu na ọ bụ Chineke na-akpata ọdachi ndị na-emenụ na-asị na e nwedịrị ebe dị iche iche Baịbụl kwuru na Chineke ji ihe ndị o kere eke bibie ndị mmadụ. (Jenesis 7:17-22; 18:20; 19:24, 25; Ọnụ Ọgụgụ 16:31-35) Ma, ọ bụrụ na anyị eleba anya na nke ọ bụla n’ime ha, anyị ga-achọpụta na e nwere ụzọ ihe atọ gbara ọkpụrụkpụ mere ha ji dị iche n’ọdachi ndị na-eme taa. Nke mbụ bụ na Chineke dọrọ ndị ajọ omume o bibiri aka ná ntị tupu ya ebibie ha. Nke abụọ bụ na ndị Chineke bibiri n’oge ndị ahụ bụ naanị ndị ọjọọ, ma ọdachi ndị na-eme taa na-egbu ma ndị ọma ma ndị ọjọọ. Ọ bụ naanị ndị kpọrọ ekwo nkụ na-eme ihe ọjọọ nakwa ndị jụrụ ime ihe Chineke kwuru ka e bibiri n’oge ndị ahụ. Nke atọ abụrụzie na Chineke gwara ndị ezi omume ihe ha ga-eme ka a ghara ibibi ha.—Jenesis 7:1, 23; 19:15-17; Ọnụ Ọgụgụ 16:23-27.

O nweghị ihe gosiri na ọ bụ Chineke na-akpata ọdachi ndị na-akpa ọtụtụ nde mmadụ aka ọjọọ taa. Oleezi ihe mere ọdachi ndị a ji na-eme ugbu a karịa otú ha na-emebu? Olee ihe anyị ga-eme ma ọdachi ndị a mee n’ebe anyị bi? Ò nwere mgbe a na-agaghị enwekwa ọdachi ndị na-emere onwe ha? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu ndị na-esonụ.