Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Nsọ, Nsọ, Nsọ Ka Jehova Dị’

‘Nsọ, Nsọ, Nsọ Ka Jehova Dị’

Bịaruo Chineke Nso

‘Nsọ, Nsọ, Nsọ Ka Jehova Dị’

Ọ BỤRỤ na a sị gị jiri otu mkpụrụ okwu kọwaa ụdị onye Jehova Chineke bụ, olee okwu ị ga-eji akọwa ya? Ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ asaa gara aga, Aịzaya onye amụma hụrụ ọhụụ. N’ọhụụ ahụ, ọ nụrụ ka ndị mmụọ ozi nọ na-eto Jehova, okwu ha ji na-eto ya gosiri otu n’ime ihe e ji mara Jehova, ya bụ, na ọ dị nsọ. Ihe ahụ Aịzaya hụrụ na ihe ọ nụrụ kwesịrị ime ka anyị tụọ egwu Jehova ma bịarukwuo ya nso. Ka anyị na-eleba anya n’ihe e dere n’Aịzaya 6:1-3, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ na-eme.

Gịnị ka Aịzaya hụrụ? Aịzaya kwuru, sị: “Ahụrụ m Jehova ka ọ nọ n’ocheeze dị elu, nke e bulikwara elu.” (Amaokwu nke 1) Aịzaya ejighị anya nkịtị na-ahụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova. Anya nkịtị enweghị ike ịhụ onye nọ n’eluigwe. Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Ọ dịghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla.” (Jọn 1:18) Ihe ahụ Aịzaya hụrụ bụ ọhụụ. * Ma, ọ dị Aịzaya ka ihe ahụ ọ na-ahụ ọ̀ bụ n’ìhè nke na ọ mawara jijiji n’ihi na ọ dị ya ka ọ̀ na-ahụ Jehova.

Aịzaya hụziri ihe o nwere ike ịbụ na mmadụ ọzọ ahụtụbeghị n’ọhụụ. O dere, sị: “Ndị seraf guzo n’elu [Jehova]. Nke ọ bụla nwere nku isii. Ọ na-eji abụọ ekpuchi ihu ya, jiri abụọ na-ekpuchi ụkwụ ya, jirikwa abụọ na-efegharị.” (Amaokwu nke 2) Ndị seraf bụ ndị mmụọ ozi ọkwá ha dị nnọọ elu. Ọ bụ naanị Aịzaya bụ onye kwuru banyere ndị seraf na Baịbụl. Ndị seraf guzo n’ihu Jehova mgbe niile ma dị njikere ime ihe ọ bụla Jehova chọrọ ka ha mee. Ha ji nku ha kpuchie ihu ha na ụkwụ ha, nke gosiri na ha na-akwanyere Jehova ùgwù ma na-asọpụrụ ya, bụ́ Onye ha nọ n’ihu ya na-eje ozi.

Ihe mere Aịzaya ji mawa jijiji abụghị naanị ihe ọ hụrụ, ihe ọ nụrụ mekwara ka ọ maa jijiji. Ọ nụrụ ka ndị seraf ahụ niile nọ na-abụ abụ n’olu dara ụda. Aịzaya dere, sị: “Ha na-etiku ibe ha, sị: ‘Nsọ, nsọ, nsọ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha dị.’” (Amaokwu nke 3) Okwu Hibru a sụgharịrị “nsọ” na-egosi na onye a na-ekwu okwu ya bụ onye dị ọcha na onye na-enweghị ntụpọ. Okwu ahụ na-egosikwa na onye a na-ekwu okwu ya “enweghị mmehie ọ bụla.” O yiri ka otú ndị seraf ahụ si na-agụ abụ ahụ ọ̀ bụ ndị gụọ ndị ọzọ ekwechie. Ihe ha na-agụ bụ nsọ, nsọ, nsọ. Ihe mere ha ji agụ ya ugboro atọ bụ iji gosi na otú Jehova dịruru nsọ enweghị atụ. (Mkpughe 4:8) Nke a pụtara na ịdị nsọ bụ ihe e ji mara Jehova. N’eziokwu, Jehova enweghị ntụpọ ọ bụla, o nweghịkwa ihe a ga-eji taa ya ụta.

Ịmara na Jehova dị nsọ kwesịrị ime ka anyị bịarukwuo ya nso. N’ihi gịnị? Jehova adịghị ka ndị ọchịchị bụ́ ndị nwere ike imegbuwe ndị ha na-achị ma rụsawa ha arụrụala. Jehova emekataghị mee ihe ọjọọ. Ebe ọ bụ na ọ dị nsọ, ọ ga-anọgide na-abụ ezigbo Nna, ezigbo Onye ọchịchị, na Onye na-ekpe ikpe ziri ezi. Obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke, bụ́ onye dị nsọ, agaghị emekata mee anyị ihe ọjọọ.

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na baịbụl n’ọnwa Disemba:

Aịzaya 1-23

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures kwuru, sị: “Ọ bụrụ na Chineke mere ka mmadụ hụ ọhụụ mgbe onye ahụ mụ anya, ọ na-adị onye ahụ ka ihe ọ hụrụ ò mere eme n’eziokwu. E mechazie, onye ahụ na-echeta ya ma detuo ya ma ọ bụkwanụ kọwaa ya n’okwu nke aka ya.”—Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ a.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 26]

Ịmara na Jehova dị nsọ kwesịrị ime ka anyị bịaruo ya nso