Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Achọrọ M Ịdị Ka Ada Jefta

Achọrọ M Ịdị Ka Ada Jefta

Achọrọ M Ịdị Ka Ada Jefta

DỊ KA JOANNA SOANS SI KỌỌ

Mgbe m na-etolite, ọ gụwara m agụụ ịdị ka ada Jefta. Ka m kọọ ihe ịdị ka ada Jefta pụtara na otú m si mechaa dị ka ya.

N’AFỌ 1956, agara m mgbakọ Ndịàmà Jehova e nwere n’obodo Bọmbee (bụ́ ebe a na-akpọzi Mumbaị), nke dị n’India. Ọ bụ mgbakọ Ndịàmà Jehova mbụ m gara, ọ gbanwekwara ndụ m. Otu okwu e kwuru ná mgbakọ ahụ banyere ada Jefta ruru m n’obi.

O nwere ike ịbụ na ị gụọla banyere ada Jefta na Baịbụl. Mgbe ada Jefta ka na-eto agbọghọ, o kwetara na ya agaghị alụ di. Nke a mere ka nna ya nwee ike imezu nkwa o kwere Chineke. Ada Jefta ji ndụ ya niile jeere Jehova ozi n’ụlọ nsọ ya, ọ lụghịkwa di.—Ndị Ikpe 11:28-40.

Ọ gụrụ m nnọọ agụ ịdị ka ya! Ma, o nwere otu nnukwu nsogbu m nwere. Nsogbu ahụ bụ na mmadụ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye abụghị omenala ndị India.

Ezinụlọ A Mụrụ M na Ya

Nne na nna m bụ Benjamin na Marcelina Soans. Ha mụrụ ụmụ isii, abụkwa m nwa ha nke ise. Anyị bi n’obodo Udipi, nke dị n’ụsọ oké osimiri, n’ebe ọdịda anyanwụ India. Asụsụ anyị bụ Tulu, ihe dịkwa ka nde mmadụ abụọ na-asụ ya. Ma, asụsụ e ji akụziri ọtụtụ ndị bi n’obodo Udipi ihe n’ụlọ akwụkwọ bụ asụsụ Kannada.

Ịlụ di ma ọ bụ nwunye na ịmụ ụmụ bụ ihe e ji kpọrọ ihe n’obodo anyị. Mgbe m na-eto, enweghị m ike icheta ma m̀ nụtụkwara otú e si ekwu n’asụsụ Tulu na mmadụ alụghị di ma ọ bụ nwunye, na mmadụ nọ naanị ya, ma ọ bụ na ọ na-agụ mmadụ agụụ ịhụ ndị ezinụlọ ya. O yiri ka ihe ndị a adịghị n’obodo anyị. Dị ka ihe atụ, anyị na ndị mụrụ papa m na ndị mụrụ mama m, ụmụnne papa m, ụmụnne mama m, na ụmụ ha bi.

Ndị obodo anyị na-eri ala ná nne, nke pụtara na a na-ewere ụmụ a mụrụ ka ndị ezinụlọ mama ha. A gụwa ezinụlọ mmadụ si, a na-esi ná nne agụ ya, ụmụ nwaanyị na-eketakwa òkè ka ukwuu n’ezinụlọ ebe a mụrụ ha. N’ụfọdụ obodo ndị Tulu, nwaanyị lụọ di, ọ na-ebi n’ụlọ nne ya, di ya alakwuru ya n’ebe ahụ.

Ebe ọ bụ na ndị ezinụlọ anyị na-aga chọọchị, anyị anaghị emecha ihe ka ndị ọzọ. Ná mgbede ọ bụla, papa ukwu m na-akpọkọta anyị niile ka anyị kpee ekpere. Ọ na-edu anyị n’ekpere, gụọkwa Baịbụl n’asụsụ Tulu. Mgbe ọ bụla ọ sapere Baịbụl ya dọkachara adọka ka ọ gụọrọ anyị, ọ na-adị m ka ò mepere igbe nke akụ̀ juru n’ime ya. Ọ na-atọgbu m atọgbu ịnụ ka ọ na-agụ ya. Abụ Ọma 23:1 na-atọgbu m atọgbu. Ebe ahụ, sịrị: “Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ. Ọ dịghị ihe ga-akọ m.” Ihe m na-ajụ onwe m bụ, ‘Ònyedị bụ Jehova a, gịnịkwa mere e ji akpọ ya Onye na-azụ atụrụ?’

“Akpịrịkpa” Si n’Anya M Dapụsịa

N’ihi ihe isi ike Agha Ụwa nke Abụọ kpatara, ezinụlọ anyị kwagara Bọmbee, bụ́ ebe dị ihe karịrị narị kilomita itoolu ma e si n’ebe anyị bi gawa ya. Ọ bụ n’ebe ahụ ka Ndịàmà Jehova abụọ bịara zie papa m ozi ọma n’afọ 1945, ma nye ya otu akwụkwọ e ji amụ Baịbụl. Papa m gụchapụrụ akwụkwọ ahụ ozugbo ma bido ịkọrọ ndị ọzọ na-asụ asụsụ Kannada ihe ọ gụtara. N’ihe dị ka afọ 1950, e nweela otu obere ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke na-amụ Baịbụl n’asụsụ Kannada na Bọmbee.

Papa m na mama m kụziiri anyị otú anyị ga-esi na-amụsi Baịbụl ike ma na-akụziri ya ndị ọzọ nke ọma. Kwa ụbọchị, ha na-ahụ na anyị kpekọrọ ekpere ọnụ ma mụkọọ Baịbụl ọnụ. (Diuterọnọmi 6:6, 7; 2 Timoti 3:14-16) Otu ụbọchị mgbe m nọ na-agụ Baịbụl, o yiri ka akpịrịkpa ò si n’anya m dapụsịa. (Ọrụ 9:18) Amụtara m na ihe mere e ji kpọọ Jehova Onye na-azụ atụrụ bụ na ọ bụ ya na-edu ndị na-efe ya, na-enye ha nri ma na-echebe ha.—Abụ Ọma 23:1-6; 83:18.

Jehova Nyeere M Aka

E mere m baptizim obere oge anyị si mgbakọ ahụ e nwere na Bọmbee n’afọ 1956 lọta. Ka ọnwa isii gara, ebidoro m ikwusa ozi ọma oge niile otú nwanne m nwoke nke tọrọ m, bụ́ Prabhakar, na-eme. Ọ bụ eziokwu na ọ na-enu m enu n’obi izi ndị mmadụ ozi ọma, ụjọ na-ejide m mgbe ọ bụla m chọrọ izi ozi ọma. Ana m ebido sụwa nsụ, ọnụ ana-amakwa m jijiji. Ihe m na-agwa onwe m bụ, ‘Ihe ga-eme ka m rụọ ọrụ a bụ naanị ma Jehova ò nyeere m aka.’

Jehova ji di na nwunye si Kanada bịa ikwusa ozi ọma ná mba anyị nyere m aka. Aha ha bụ Homer na Ruth McKay. Ọ bụ n’afọ 1947 ka ha gara otu ụlọ akwụkwọ dị n’Amerịka, bụ́ ebe Ndịàmà Jehova na-azụ ndị na-aga mba ọzọ ekwusa ozi ọma. Enwere m ike ikwu na ha seere m n’aka mgbe ahụ na-akụziri m otú e si ezi ozi ọma. Ruth na-akụziri m ihe m ga-ekwu ma m ruo n’ụlọ ndị mmadụ. Ọ ma nnọọ ihe ọ ga-eme ka ahụ́ ruo m ala. Ọ na-ejide m n’aka ma ahụ́ mawa m jijiji, sị m: “Nne, ụjọ atụla gị. Ị ga-emeta ya ma anyị gaa n’ụlọ nke ọzọ.” Otú ahụ o si agwa m okwu na-eme ka obi sie m ike.

Otu ụbọchị, a gwara m na onye mụ na ya ga na-esozi ekwusa ozi ọma bụ Elizabeth Chakranarayan. Nwanna nwaanyị a ji ọtụtụ afọ tọọ m, ọ dịkwala anya o kwusawara ozi ọma. Ihe mbụ gbatara m n’obi mgbe ahụ bụ: ‘Olee otú mụ na nwanna nwaanyị a ga-esi ebi? O ji ọtụtụ afọ tọọ m.’ Ma, o mechara nyere m ezigbo aka.

‘O Nweghị Mgbe Anyị Nọ Naanị Anyị’

Ebe mbụ a gwara anyị gaa kwusaa ozi ọma bụ n’obodo Ọrangabad, nke dị narị kilomita anọ ma e si Bọmbee gawa ya. Anyị bịara chọpụta na anyị abụọ bụ naanị Ndịàmà Jehova e nwere n’obodo ahụ, bụ́ ebe e nwere ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu nde mmadụ. Ihe ọzọkwa bụ na m ga-amụrịrị asụsụ Marati, bụ́ asụsụ ọtụtụ ndị na-asụ n’obodo ahụ.

Mgbe ụfọdụ, owu na-ama m, m na-anọrọkwa ka nwa na-enweghị nne na-ebe ákwá. Ma otú Elizabeth si agwa m okwu ka ọ̀ bụ ya bụ mama m na-agba m ume. Ọ na-asị m: “O nwere ike ịdị anyị ka ànyị nọ naanị anyị mgbe ụfọdụ, ma naanị anyị anọghị. Ọ bụ eziokwu na ndị ezinụlọ unu na ndị enyi gị anọghị gị nso, Jehova nọnyeere gị mgbe niile. I mete ya enyi, ị ga-ahụ na owu agaghịzi na-ama gị.” Echefubeghị m ihe a ọ gwara m ruo taa.

Mgbe anyị na-enweghị ego ụgbọ, anyị na-eji ụkwụ aga ihe ruru kilomita iri abụọ kwa ụbọchị n’okporo ụzọ pọtọpọtọ na uzuzu juru, ma anwụ ọ̀ na-acha ma oyi ọ̀ na-atụ. N’oge okpomọkụ, ezigbo anwụ na-acha, ebe niile ana-ekpokwa ọkụ. N’oge udu mmiri, nnukwu mmiri na-ezo nke na a na-enwe ebe pọtọpọtọ na-adị ruo ọtụtụ ọnwa. Ma ihe ka nye anyị nsogbu bụ omenala ndị obodo ahụ.

Ụmụ nwaanyị anaghị agwa ụmụ nwoke okwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ọ gwụla ma hà bụ ndị ikwu ha. Ọ na-esikwa ike ịhụ ebe ụmụ nwaanyị na-akụziri ụmụ nwoke ihe. Nke a mere ka e jiri anyị na-eme ihe ọchị ma na-akparị anyị. N’ime ọnwa isii mbụ anyị gara ebe ahụ, ọ bụ naanị anyị abụọ na-ezukọ n’ebe anyị na-anọ amụ Baịbụl. Ka oge na-aga, ụfọdụ ndị sooro anyị. Ọ dịghịkwa anya anyị aghọọ otu obere ìgwè. Ụfọdụ ndị sodịịrị anyị kwusawa ozi ọma.

“Jisie Ike Na-amụtakwu Ọrụ A”

Mgbe ihe dị ka afọ abụọ na ọkara gara, e zighachiri anyị Bọmbee. Elizabeth nọkwa na-ekwusa ozi ọma, ma a gwara m gaa nyere papa m aka n’ọrụ ịsụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ọ bụ naanị ya na-asụgharị akwụkwọ ndị ahụ n’asụsụ Kannada n’oge ahụ. Obi tọrọ ya ụtọ na m bịara n’ihi na o nwere ọtụtụ ọrụ ọ na-arụ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova.

N’afọ 1966, ndị mụrụ m kpebiri na ha ga-alaghachi Udipi, bụ́ ebe anyị bibu. Mgbe papa m na-ahapụ Bọmbee, ọ sịrị m: “Nwa m, jisie ike na-amụtakwu ọrụ a. Na-asụgharị ihe ọ bụla e nyere gị sụgharịa otú ga-adị mfe nghọta ma doo anya. Ya enwekwala mgbe ọ ga-adị gị ka ị̀ ma ihe niile, na-adị umeala n’obi mgbe niile. Tụkwasị Jehova obi.” Ihe a bụ ndụmọdụ ikpeazụ o nyere m n’ihi na ọ nwụrụ obere oge ọ laghachiri Udipi. M ka na-eme ihe ahụ ọ gwara m n’ọrụ nsụgharị m na-arụ.

“Ị́ Chọghị Ịlụ Di?”

N’India, ndị nne na nna na-achọtara ụmụ ha onye ha ga-alụ ma ọ bụ onye ga-alụ ha mgbe ụmụ ha ka dị obere, ha na-agbakwa ha ume ka ha mụọ ụmụ. N’ihi ya, ndị mmadụ na-ajụkarị m: “Ị́ chọghị ịlụ di? Ònye ga-ele gị nká? Ọ̀ bụ na owu agaghị amawa gị ma ị kaa nká?”

Mgbe ụfọdụ, ihe a a na-ajụkarị m na-egbu m mmụọ. Ọ bụ eziokwu na anaghị m eme ka ndị mmadụ mara otú obi dị m, m na-akọrọ Jehova obi m ozugbo m nọ naanị m. Ihe na-akasi m obi bụ na m maara na Jehova ewereghị m ka onye ihe kọrọ ná ndụ. Ihe na-enyere m aka ịnọsi ike ná mkpebi m mere ịnọ n’alụghị di bụ na m na-echeta ada Jefta, bụ́ onye na-alụghị di, nakwa Jizọs, bụ́ onye na-alụghị nwunye. Ha abụọ ji obi ha niile jeere Chineke ozi.—Jọn 4:34.

Onyinye Si n’Aka Jehova

Mụ na Elizabeth bụ enyi ruo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri ise. Ọ nwụrụ n’afọ 2005 mgbe ọ dị afọ iri itoolu na asatọ. Mgbe o mere agadi, ọ naghị agụlizi Baịbụl n’ihi na ọ naghị ahụchazi ụzọ, ihe ọ na-emezi bụ ikpegara Chineke ekpere mgbe niile n’ụbọchị. Mgbe ụfọdụ, ana m eche na o nwere onye ya na ya na-ekwurịta ihe e dere na Baịbụl n’ime ụlọ ya, ma m bata, m na-achọpụta na ọ nọ naanị ya na-agwa Jehova okwu n’ekpere. O weere Jehova ka ezigbo enyi ya, ọ na-emekwa ka ọ̀ nọ n’ihu Jehova mgbe niile. Amatala m na ọ bụrụ na m chọrọ iji ndụ m niile jeere Jehova ozi otú ahụ ada Jefta mere, ekwesịrị m iwere onwe m ka m̀ nọ n’ihu Jehova mgbe niile. Ana m ekele nnọọ Jehova maka inye m ezigbo nwanna nwaanyị ahụ, bụ́ onye nyeere m aka ná nsogbu ndị m nwere n’oge m na-eto.—Ekliziastis 4:9, 10.

Enwetala m ọtụtụ ngọzi n’ihi ijere Jehova ozi otú ada Jefta mere. Ịnọ n’alụghị di na ime ihe Baịbụl kwuru enyerela m aka ibi ndụ obi ụtọ na “ijere Onyenwe anyị ozi mgbe niile n’enweghị ndọpụ uche.”—1 Ndị Kọrịnt 7:35.

[Foto dị na peeji nke 28]

Mgbe papa m na-agwa ọhaneze okwu Baịbụl na Bọmbee n’ihe dị ka afọ 1950

[Foto dị na peeji nke 28]

Mụ na Elizabeth, obere oge tupu ya anwụọ

[Foto dị na peeji nke 29]

Mgbe anyị na-akpọsa okwu Baịbụl a ga-agwa ọhaneze na Bọmbee n’afọ 1960

[Foto dị na peeji nke 29]

Mụ na ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ nsụgharị