Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebreham Nwoke Nwere Obi ike

Ebreham Nwoke Nwere Obi ike

Ebreham Nwoke Nwere Obi ike

Mgbe Ebreham na ndị ezinụlọ ya na ndị ohu ya na-achọ ịgawa Kenan, Ebreham lere ha niile anya. (Jenesis 12:1-5) Ebreham ma na ọ bụ ya ga-akpa afọ ndị a niile ya na ha so, ọ makwa na nke a abụghị obere ọrụ. Olee otú ọ ga-esi egboro ndị a niile mkpa ha n’ala ọ na-amaghị? Ọ̀ bụ na ọ gaghị akara ya mfe ilekọta ha ma ha nọrọ n’obodo Ọọ bụ́ ala na-eme nri nke ọma, ebe e nwekwara mmiri na ahịhịa ga-ezuru ìgwè anụ ụlọ ya? Ọ bụrụkwanụ na ọ daa ọrịa ma ọ bụ nwụọ n’ebe ahụ ha na-aga, ònye ga-elekọta ndị ezinụlọ ya? Ya bụrụ na ihe ndị a nọ na-abata Ebreham n’obi, o kweghị ka ha kụda ya mmụọ. O kpebisiri ike na ihe ọ sọkwara ya mee, na ya ga-erubere Chineke isi. Nke a gosiri na Ebreham nwere nnọọ obi ike.

GỊNỊ BỤ INWE OBI IKE? E kwuo na mmadụ nwere obi ike, ọ pụtara na obi kara onye ahụ nakwa na onye ahụ abụghị onye ụjọ. Na mmadụ nwere obi ike apụtakwanụghị na e nweghị mgbe ụjọ na-atụ onye ahụ. Kama nke ahụ, onye nwere obi ike nke si n’aka Chineke na-eme ihe o kwesịrị ime n’agbanyeghị na ụjọ na-atụ ya.

OLEE OTÚ EBREHAM SI GOSI NA YA NWERE OBI IKE? Ebreham mere ihe Chineke chọrọ n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị anaghị eme otú ahụ. Ebreham toro n’obodo ebe ọtụtụ ndị na-ekpere arụsị dị iche iche. Ma o kweghị ka ụjọ ihe ndị mmadụ ga-ekwu mee ka ọ ghara ime ihe ọ ma na ọ dị mma. Kama nke ahụ, obi ike o nwere mere ka o fewe naanị Jehova bụ́ Chineke, “Onye Kasị Elu.”—Jenesis 14:21, 22.

Ebreham ji ofufe Chineke kpọrọ ihe karịa akụnụba. Ọ hapụrụ ihe niile o nwere n’obodo Ọọ gawa n’ala ịkpa, obi sikwara ya ike na Jehova ga-egboro ya mkpa ya niile. O doro anya na e nwere oge ụfọdụ Ebreham chetara ihe ndị o nwere mgbe ọ nọ na Ọọ, ma obi siri ya ike na Jehova ga-elekọta ya na ndị ezinụlọ ya. Ebe ọ bụ na Ebreham weere Jehova ka Onye kacha mkpa ná ndụ ya, obi kara ya ime ihe Chineke kwuru.

GỊNỊ KA ANYỊ NA-AMỤTA N’AKA YA? Anyị nwere ike ime ka Ebreham ma ọ bụrụ na anyị amụta iji obi ike na-erubere Jehova isi, ọ sọkwa ya ya bụrụ na ndị ọzọ achọghị ime otú ahụ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na mmadụ efewe Jehova Chineke otú Baịbụl kwuru, ndị enyi ya ma ọ bụ ndị ikwu ya nwere ike imegidewe ya. (Jọn 15:20) Ma, ọ bụrụ na obi siri anyị ike na ihe anyị na-amụta banyere Jehova bụ eziokwu, anyị ga na-agwa ndị mmadụ ihe ndị anyị kweere, na-akwanyekwara ha ùgwù mgbe anyị na-agwa ha ya.—1 Pita 3:15.

Obi kwesịkwara isi anyị ike na Chineke ga-egboro anyị mkpa anyị dị ka o kwere nkwa na ya ga-emere ndị niile nwere okwukwe n’ebe ọ nọ. Nke a ga-eme ka obi sie anyị ike iji ndụ anyị niile na-efe Chineke karịa ịna-achụ akụnụba. (Matiu 6:33) Ka anyị hụ otú otu ezinụlọ si mee nke a.

Doug na nwunye ya bụ́ Becky nwere ụmụ abụọ ka dị obere. N’agbanyeghị nke ahụ, ha chọrọ ịkwaga mba ebe a na-enweghị ọtụtụ ndị na-ekwusa ozi ọma, ka ha kwusawa ozi ọma n’ebe ahụ. Mgbe ha chọpụtachara ihe ụfọdụ banyere ebe ahụ ha chọrọ ịkwaga ma kpesie ekpere ike banyere ya, ha kpebiri na ha ga-aga. Doug sịrị: “A sị na anyị enweghị obi ike, anyị agaraghị akata obi kwakọta ngwongwo anyị, kpọrọ ụmụ anyị gawa ebe ahụ n’agbanyeghị na anyị amaghị otú ihe ga-adịrị anyị n’ebe ahụ. Ihe nyeere anyị aka bụ na mgbe anyị chọrọ ikpebi ịga ebe ahụ, anyị bu ụzọ gụọ akụkọ Ebreham na Sera. Anyị chetara otú ha si tụkwasị Jehova obi nakwa otú Jehova si lekọta ha. Ihe a anyị chetara nyeere anyị aka.”

Doug kọrọ otú ihe si dịrị ha n’ebe ahụ ha gara ikwusa ozi ọma ná mba ọzọ. Ọ sịrị: “Chineke agọziela anyị nke ukwuu. Ebe ọ bụ na o nweghịzi ihe ndị na-erikpọ oge anyị, ezinụlọ anyị na-emekọzi ọtụtụ ihe ọnụ, ma ịga ozi ọma, ma ịkparịta ụka, ma igwuri egwu. Obi atọgbuola anyị, anyị agaghịkwa akọchali uru nke a na-abara ezinụlọ anyị.”

O doro anya na ọ bụghị onye ọ bụla ga-akwagali obodo ọzọ gaa kwusawa ozi ọma. Ma, anyị niile nwere ike ime ka Ebreham ma ọ bụrụ na anyị ebute ofufe Chineke ụzọ ná ndụ anyị ma tụkwasị ya obi na ọ ga-egboro anyị mkpa anyị. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru nke bụ́, “Ka anyị nwee obi ike wee sị: ‘Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu.’”—Ndị Hibru 13:5, 6.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]

Onye nwere obi ike nke si n’aka Chineke na-eme ihe o kwesịrị ime n’agbanyeghị na ụjọ na-atụ ya

[Igbe/Foto dị na peeji nke 8]

Nwaanyị nke Na-atụ Egwu Chineke na Ezigbo Nwunye

Di Sera bụ nwoke nwere ezigbo okwukwe na Chineke. Ma Sera bụkwa nwaanyị na-atụ egwu Chineke nke anyị ga-amụta ọtụtụ ihe n’aka ya. Baịbụl kpọdịrị ya aha ugboro atọ ma kwuo na ụmụ nwaanyị ndị na-efe Chineke kwesịrị ịna-eme ka ya. (Aịzaya 51:1, 2; Ndị Hibru 11:11; 1 Pita 3:3-6) Ọ bụ eziokwu na o nweghị ọtụtụ ihe Akwụkwọ Nsọ kọrọ banyere Sera, ma obere ihe ọ kọrọ banyere ya mere ka anyị mata na o nwere ọtụtụ àgwà ọma.

Dị ka ihe atụ, olee ihe i chere Sera mere mgbe Ebreham gwara ya na Chineke chọrọ ka ha si n’obodo Ọọ kwapụ. Sera ọ̀ nọ na-eche ihe mere ha ga-eji kwapụ, na ebe ha na-aga, nakwa otú ihe ga-adịrị ha n’ebe ahụ? Obi ọ̀ nọ na-ajọ ya njọ na ọ na-aga ịhapụ ndị enyi ya na ndị ezinụlọ ya nakwa na ọ maghị mgbe ọ ga-ahụ ha ọzọ, ma ọ bụrụdị na ọ ka ga-ahụ ha? O doro anya na ihe ndị a batara ya n’obi. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, o ji obi ya niile soro di ya kwapụ ma nwee okwukwe na Jehova ga-agọzi ya maka na ya rubeere ya isi.—Ọrụ 7:2, 3.

Ọ bụghị naanị na Sera rubeere Chineke isi, ọ bụkwa ezigbo nwunye. Kama ịzọwa ka ọ bụrụ ya ga na-atụ ihe na-eme n’ezinụlọ ha, Sera mụtara iji obi ya niile na-asọpụrụ di ya, na-enyekwara ya aka n’ilekọta ezinụlọ ha. Sera ji àgwà ọma ndị a o nwere chọọ onwe ya mma, nke mere o ji bụrụ nwaanyị e ji ama atụ.—1 Pita 3:1-6.

Àgwà ọma ndị ahụ Sera nwere hà nwere ike ịbara ụmụ nwaanyị lụrụ di uru taa? Otu nwaanyị aha ya bụ Jill, onye ya na di ya birila ihe karịrị iri afọ atọ, sịrị: “Amụtala m n’aka Sera na m kwesịrị ịna-agwa di m ihe bụ́ obi m n’ihe ọ bụla anyị chọrọ ime. Ma, ebe ọ bụ ya bụ onyeisi ezinụlọ, m na-echeta na ọ bụ ya ga-ekpebi ihe a ga-eme. O kpebihaala ihe a ga-eme, ihe m na-emezi bụ ime ike m niile ka ihe ahụ o kpebiri nwee isi.”

Ihe kacha mkpa anyị nwere ike ịmụta n’aka Sera bụ na n’agbanyeghị na ọ mara ezigbo mma, o kweghị ka mma ya buwe ya isi. (Jenesis 12:10-13) Kama nke ahụ, o wedara onwe ya ala nyere di ya aka, ma mgbe ihe dịịrị ha mma ma mgbe ihe siiri ha ike. O doro anya na Ebreham na Sera bụ di na nwunye hụrụ ibe ha n’anya, ndị nwere okwukwe, ma dịrị umeala n’obi. N’eziokwu, ha baara ibe ha uru.