Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebreham Nwoke Hụrụ Ndị Ọzọ N’anya

Ebreham Nwoke Hụrụ Ndị Ọzọ N’anya

Ebreham Nwoke Hụrụ Ndị Ọzọ N’anya

Ebreham nọ n’oké mwute. Sera bụ́ nwunye ya ọ hụrụ n’anya anwụọla. Ugbu a ọ na-eli ya, o nwere ọtụtụ ihe ọ na-echeta. Ihe ndị ahụ ọ na-echeta mekwara ka o bewe ákwá. (Jenesis 23:1, 2) Ma, ákwá a Ebreham na-ebe emenyeghị ya ihere, o gosighịkwanụ na ọ bụghị dimkpa, kama ọ na-egosi anyị na Ebreham hụrụ nnọọ nwunye ya n’anya. Ịhụnanya bụkwa otu n’ime àgwà ndị kacha mma Ebreham nwere.

GỊNỊ BỤ ỊHỤ MMADỤ N’ANYA? Onye hụrụ mmadụ n’anya anaghị eji onye ọ hụrụ n’anya egwuri egwu, obi ya na-adịkwa n’ebe onye ahụ nọ. Ọ ga na-emere onye ahụ ọ hụrụ n’anya ihe ndị na-egosi na ọ hụrụ ya n’anya, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ọ na-esiri ya ike ime ihe ndị ahụ.

OLEE OTÚ EBREHAM SI GOSI NA YA HỤRỤ NDỊ ỌZỌ N’ANYA? Ebreham gosiri na ya hụrụ ndị ezinụlọ ya n’anya. O doro anya na Ebreham nwere ọtụtụ ihe ọ na-eme n’ụbọchị. Ma nke ahụ emeghị ka o leghara ndị ezinụlọ ya anya. Jehova chọpụtadịrị na Ebreham na-enyere ndị ezinụlọ ya aka n’ihe gbasara ofufe Chineke otú onyeisi ezinụlọ kwesịrị ịna-eme. (Jenesis 18:19) Jehova kwukwara ihe gosiri na Ebreham hụrụ ndị ọzọ n’anya. Mgbe Jehova na-agwa Ebreham okwu, o kwuru na Aịzik bụ ‘onye Ebreham hụrụ n’anya nke ukwuu.’—Jenesis 22:2.

Ihe ọzọ na-egosi anyị na Ebreham hụrụ ndị ọzọ n’anya bụ ihe o mere mgbe nwunye ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Sera, nwụrụ. Ebreham beere nwunye ya ákwá. N’agbanyeghị na Ebreham bụ dimkpa obi kara, ihere emeghị ya ibere nwunye ya ákwá. Ákwá ahụ o bere gosiri na obi akpọghị ya nkụ.

Ebreham gosiri na ya hụrụ Chineke ya n’anya. Ihe niile o mere ná ndụ ya gosiri na nke a bụ eziokwu. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na Baịbụl kwuru na 1 Jọn 5:3, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu.” Ebreham mere nnọọ ihe a Baịbụl kwuru.

Mgbe ọ bụla Jehova gwara Ebreham ihe ọ ga-eme, Ebreham na-eme ya ozugbo. (Jenesis 12:4; 17:22, 23; 21:12-14; 22:1-3) Ebreham anaghị echewe ma ihe ahụ Jehova gwara ya mee ọ̀ ga-esiri ya ike ime ka ọ̀ ga-adịrị ya mfe, ọ naghịkwa achọwa ka ya burugodị ụzọ mata ihe mere Jehova ji gwa ya mee ihe ahụ. Ihe ndị ahụ abụghị mkpa ya. Ihe bụ́ mkpa ya bụ ka ya mee ihe Chineke ya gwara ya. Ebreham weere ya na mgbe ọ bụla ya mere ihe Jehova gwara ya mee, na ya na-egosi na ya hụrụ Jehova n’anya.

GỊNỊ KA ANYỊ NA-AMỤTA N’AKA YA? Anyị nwere ike ime ka Ebreham ma ọ bụrụ na anyị na-egosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya, karịchaa ndị ezinụlọ anyị. Anyị ekwesịghị ikwe ka otú ihe si dịrị anyị ná ndụ mee ka anyị ghara ịna-ewepụta oge ka anyị na ndị anyị hụrụ n’anya na-anọrị.

Anyị kwesịkwara ịgbalị mụta iji obi anyị niile hụ Jehova n’anya. Ime otú ahụ ga-abara anyị ezigbo uru. Dị ka ihe atụ, ọ ga-eme ka anyị na-akpa àgwà ma na-ekwu okwu otú Chineke chọrọ.—1 Pita 1:14-16.

N’eziokwu, irubere Jehova isi anaghị adị mfe mgbe niile. Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na Onye ahụ nke nyeere Ebreham aka, nke kpọkwara Ebreham ‘enyi ya,’ ga-enyekwara anyị aka. (Aịzaya 41:8) Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, kwere anyị nkwa, sị: “Ọ ga-eme ka unu guzosie ike, ọ ga-eme ka unu sie ike.” (1 Pita 5:10) Nkwa a Jehova, bụ́ Enyi Ebreham, kwere anyị bụ nkwa na-eme obi ụtọ.

[Igbe dị na peeji nke 11]

Nwoke Ibe Ákwá Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ?

Ọtụtụ ndị ga-asị na ọ bụ ihe ọjọọ. O nwere ike iju ha anya ma ha nụ na ọ bụghị naanị Ebreham ka Baịbụl kwuru na o bere ákwá, kama na e nwekwara ọtụtụ ụmụ nwoke ndị ọzọ bere ákwá n’oge ha nọ ná nsogbu n’agbanyeghị na ha nwere okwukwe na Chineke, bụrụkwa ndị obi siri ike. Ụfọdụ n’ime ha bụ Josef, Devid, Pita onyeozi, ndị okenye e nwere n’ọgbakọ dị n’Efesọs, nakwa Jizọs. (Jenesis 50:1; 2 Samuel 18:33; Luk 22:61, 62; Jọn 11:35; Ọrụ 20:36-38) O doro anya na Baịbụl anaghị akụzi na nwoke ibe ákwá bụ ihe ọjọọ.