Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Ọ̀ Na-ekwu Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu?

Baịbụl Ọ̀ Na-ekwu Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu?

Mụta Ihe n’Okwu Chineke

Baịbụl Ọ̀ Na-ekwu Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu?

N’isiokwu a, a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla. E dekwara ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ka ị hụ azịza ha. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Baịbụl ò kwuru otú amụma ndị e dere na ya ga-esi mezuo?

Ọ bụ naanị Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile maara ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu na otú ha ga-esi mee. (Emọs 3:7) Dị ka ihe atụ, ọtụtụ afọ tupu Mesaya, ma ọ bụ Kraịst, abịa n’ụwa, Chineke mere ka e buo amụma na ọ ga-abịa. E kwuru na Mesaya ahụ ga-esi n’agbụrụ Ebreham, bụ́ nwoke nwere okwukwe na Chineke. Mesaya ahụ ga-aghọ eze, meekwa ka ụmụ mmadụ ndị na-erubere Chineke isi ghọọ ndị zuru okè na ndị na-agaghị arịakwa ọrịa. (Jenesis 22:18; Aịzaya 53:4, 5) E kwukwara na a ga-amụ Mesaya ahụ n’obodo Betlehem.—Gụọ Maịka 5:2.

O mechara bụrụ Jizọs bụ Mesaya ahụ. Ihe karịrị narị afọ asaa tupu a mụọ ya, Baịbụl kwuru na ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ga-amụ ya nakwa na ndị mmadụ ga-eleda ya anya. Ọ ga-eji ndụ ya chụọ àjà maka ndị ọzọ, a ga-elikwa ya n’ili ndị ọgaranya. (Aịzaya 7:14; 53:3, 9, 12) Ihe karịrị narị afọ ise tupu Jizọs abịa, Baịbụl kwukwara na ọ ga-anọ n’elu ịnyịnya ibu banye Jeruselem nakwa na a ga-ere ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ. Amụma niile a e buru banyere ya mezuru.—Gụọ Zekaraya 9:9; 11:12.

2. Chineke ọ̀ na-ekwu oge amụma ya ga-emezu?

Ihe karịrị narị afọ ise tupu Mesaya ahụ abịa, Baịbụl kwuru kpọmkwem afọ ọ ga-abịa. Baịbụl kwuru na tupu Mesaya ahụ abịa, a ga-enwe izu asaa nakwa izu iri isii na abụọ, nke pụtara izu iri isii na itoolu ma ọ bụ narị ụbọchị anọ na iri asatọ na atọ. Ụbọchị nke ọ bụla bụ otu afọ. N’ihi ya, izu iri isii na itoolu ahụ bụ narị afọ anọ na iri afọ asatọ na atọ. Olee mgbe narị afọ anọ na iri afọ asatọ na atọ ahụ malitere? Baịbụl gosiri na ọ malitere mgbe Nehemaya, bụ́ onye na-ejere Chineke ozi, gara Jeruselem ma bido iwughachi Jeruselem. Ihe ndị Peshia dere n’oge ochie gosiri na ọ bụ n’afọ 455 Tupu Oge Anyị ka ọ malitere iwughachi ya. (Nehemaya 2:1-5) Ọ bụ n’afọ 29 Oge Anyị ka narị afọ anọ na iri afọ asatọ na atọ ahụ gwụrụ, nke bụ́ kpọmkwem mgbe e mere Jizọs baptizim ya aghọọ Mesaya.—Gụọ Daniel 9:25.

3. Ihe ndị Baịbụl kwuru na ha ga-eme n’oge anyị a hà na-eme?

Jizọs buru amụma na e nwere ihe dị iche iche ga-eme n’oge anyị a. O kwuru na a ga-ekwusa ozi ọma alaeze Chineke, nke ga-akasi ndị hụrụ Chineke n’anya obi. Ọ bụ Alaeze Chineke ga-eme ka ihe ọjọọ niile na-eme n’oge anyị a kwụsị.—Gụọ Matiu 24:14, 21, 22.

Amụma ndị e buru na Baịbụl kwuru ihe dị iche iche ga-eme n’oge anyị a. Baịbụl gosiri na kama ihe ga na-aka mma n’ihi otú ụwa sirila mepee anya, ụmụ mmadụ ga na-emebi ụwa. Nsogbu dị iche iche agha, ụkọ nri, ala ọma jijiji, na ọrịa na-akpata ga na-aka njọ. (Luk 21:11; Mkpughe 11:18) Omume ọjọọ na arụrụala ga-akakwa njọ. Ka ihe ndị a na-eme, ndị na-eso ụzọ Jizọs ga na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile.—Gụọ Matiu 24:3, 7, 8; 2 Timoti 3:1-5.

4. Gịnị ka Chineke ga-emere ndị mmadụ n’ọdịnihu?

Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nwere ọtụtụ ihe ọma ọ ga-emere ndị na-efe ya. Jizọs Kraịst, bụ́ Mesaya ahụ, na ndị ya na ha ga-eso chịa, ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa. Ha ga-achịkwa otu puku afọ. A ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ihe ndị ha mere mgbe ahụ ga-ekpebizi ma hà ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ka ọ̀ bụ na ha agaghị adị. Alaeze ahụ ga-emekwa ka ọnwụ na ọrịa gharazie ịdị.—Gụọ Mkpughe 5:10; 20:6, 12; 21:4, 5.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 23-25 nakwa peeji nke 197-201 n’akwụkwọ a e sere ebe a.