Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Mụ Onwe M, Bụ́ Jehova Chineke Gị, Sekpụ Gị n’Aka Nri Gị”

“Mụ Onwe M, Bụ́ Jehova Chineke Gị, Sekpụ Gị n’Aka Nri Gị”

Bịaruo Chineke Nso

“Mụ Onwe M, Bụ́ Jehova Chineke Gị, Sekpụ Gị n’Aka Nri Gị”

Ị̀ HỤTỤLA ebe nna na obere nwa ya chọrọ ịgafe okporo ụzọ, nna ahụ asị nwa ya, “Nye m aka gị”? Ụjọ agaghịzi atụ nwa ahụ n’ihi na papa ya ejidela ya aka. Ò nwetụla mgbe ọ dị gị ka ya bụrụ na o nwere onye ga-esekpụrụ gị n’aka duru gị gafee nsogbu niile ị na-enwe? Ọ bụrụ na ọ dịtụla gị otú ahụ, ihe Aịzaya dere ga-eme ka obi sie gị ike.Gụọ Aịzaya 41:10, 13

Ọ bụ ndị Izrel ka Aịzaya gwara ihe ahụ dị n’Aịzaya 41:10, 13. Chineke weere mba Izrel ka ‘ihe onwunwe ya pụrụ iche,’ ma mba Izrel nwere ọtụtụ ndị iro gbara ya gburugburu. (Ọpụpụ 19:5) Ndị Izrel hà kwesịrị ịtụwa ụjọ? Jehova si n’ọnụ Aịzaya gwa ha ihe ga-eme ka obi sie ha ike. Ka anyị na-eleba anya n’ihe ndị ahụ Aịzaya gwara ụmụ Izrel, anyị kwesịrị iburu n’obi na ihe ndị ahụ gbasakwara ndị na-efe Chineke taa.—Ndị Rom 15:4.

Jehova gwara mba Izrel, sị: “Atụla egwu.” (Amaokwu nke 10) Jehova kwuru ihe mere o ji sị ha atụla egwu. Ọ sịrị: “N’ihi na m nọnyeere gị.” Chineke agaghị esi n’ebe dị anya gbatara ha ọsọ enyemaka ma ha nọrọ ná nsogbu. Kama, ọ chọrọ ka ha mata na ya nọnyeere ha, ma ọ bụ, na ya kwụ ha n’azụ, nke gosiri na ọ ga-enyere ha aka mgbe ọ bụla ihe siiri ha ike. Ọ̀ bụ na nke ahụ ekwesịghị ime ka obi sie anyị ike?

Jehova gwakwara ndị Izrel ihe ọzọ mere ka obi sie ha ike. Ọ sịrị ha: “Elegharịla anya n’ụjọ.” (Amaokwu nke 10) Okwu Hibru a sụgharịrị “elegharịla anya n’ụjọ” pụtara “mmadụ ịchakasị anya, ya lee ebe a ya elee ebe a, ka ọ mara ma ò nwere onye na-abịa imerụ ya ahụ́.” Jehova kwuru ihe mere ndị ya na-ekwesịghị ilegharịwa anya n’ụjọ. Ọ sịrị: “N’ihi na abụ m Chineke gị.” Ò nwere ihe nwere ike ime ka obi sie mmadụ ike karịa nke ahụ? Jehova bụ “Onye Kasị Elu” na “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” (Abụ Ọma 91:1) Gịnị mere ha ga-eji tụwa ụjọ ebe ọ bụ na Jehova, onye ike ya na-enweghị atụ, bụ Chineke ha?

Gịnịzi ka ndị na-efe Jehova taa ga-atụwa anya na Jehova ga-emere ha? Jehova kwere nkwa, sị: “M ga-eji aka nri m nke ezi omume jidesie gị ike.” (Amaokwu nke 10) O kwukwara, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị.” (Amaokwu nke 13) Gịnị ka ihe ndị a Jehova kwuru na-echetara gị? Otu akwụkwọ kwuru na “amaokwu abụọ a na-eme ka mmadụ cheta otú nna na-esi enyere nwa ya aka. [Nna] anaghị anọrọ n’ebe dị anya na-enyere nwa ya aka, kama ọ na-abịa nwa ya nso, ọ chọghị ka e nwee ihe ga-ekewa ya na nwa ya.” Chebagodịrị nke a echiche. Jehova agaghị ekwe ka ihe ọ bụla kewaa ya na ndị ya, ọ sọgodị ya ya bụrụ mgbe ihe kacha siere ha ike ná ndụ.—Ndị Hibru 13:5, 6.

Ihe a Aịzaya dere nwere nnọọ ike ime ka obi sie ndị na-efe Jehova n’oge a ike. Ebe ọ bụ na anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, nke tara akpụ,’ mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị anyị ka ike ụwa ọ̀ gwụla anyị n’ihi nsogbu ndị anyị na-enwe. (2 Timoti 3:1) Ma naanị anyị ekwesịghị iburu nsogbu ndị ahụ. Jehova dị njikere isekpụrụ anyị n’aka. Anyị nwere ike ijide aka Jehova otú ahụ nwatakịrị si ejide aka papa ya, nwee obi ike na ọ ga-eduga anyị ebe dị mma ma nyere anyị aka mgbe anyị nọ ná nsogbu.—Abụ Ọma 63:7, 8.

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Jenụwarị:

Aịzaya 24-42