Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . . Gịnị Mere Chineke Ji Gwa Ebreham Ka O Jiri Nwa Ya Nwoke Chụọrọ Ya Àjà?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . . Gịnị Mere Chineke Ji Gwa Ebreham Ka O Jiri Nwa Ya Nwoke Chụọrọ Ya Àjà?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . . Gịnị Mere Chineke Ji Gwa Ebreham Ka O Jiri Nwa Ya Nwoke Chụọrọ Ya Àjà?

▪ Na Baịbụl, n’akwụkwọ Jenesis, Jehova Chineke gwara Ebreham ka o jiri nwa ya nwoke bụ́ Aịzik chụọrọ ya àjà. (Jenesis 22:2) Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ịghọta ihe mere Chineke ji gwa Ebreham ka o mee ihe ahụ. Otu prọfesọ aha ya bụ Carol sịrị: “Mgbe mbụ m nụrụ akụkọ a n’oge m dị obere, iwe bịara m. Ihe gbatara m n’obi bụ, Gịnị mere Chineke ga-eji gwa mmadụ ka o mee ụdị ihe a?” Ọ bụ eziokwu na mmadụ nwere ike iwe iwe ma ọ nụ akụkọ a, ma e nwere ihe ndị anyị kwesịrị iburu n’obi.

Ihe mbụ anyị kwesịrị iburu n’obi bụ na Jehova ekweghị ka Ebreham jiri nwa ya Aịzik chụọrọ ya àjà, n’agbanyeghị na Ebreham chọrọ ime otú ahụ. Kemgbe ahụkwa, o nwebeghị onye ọzọ Chineke gwara ka o jiri nwa ya chụọrọ ya àjà. Jehova chọrọ ka ndị niile na-efe ya, ma ndị toro eto ma ụmụaka, nọrọ ndụ na-efe ya ma na-enwe obi ụtọ.

Ihe nke abụọ anyị kwesịrị iburu n’obi bụ na ihe e dere na Baịbụl na-egosi na e nwere otu ihe dị mkpa mere Chineke ji gwa Ebreham ka o jiri Aịzik chụọ àjà. Chineke maara na ya ga-emecha zite Ọkpara ya, * bụ́ Jizọs, ka ọ nwụọ maka anyị. (Matiu 20:28) Jehova chọrọ iji àjà ahụ ọ gwara Ebreham ka o jiri nwa ya chụọ mee ka anyị mata otú ọ ga-adị ya mgbe ọ ga-ezite Ọkpara ya ka ọ nwụọ maka anyị. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

Chebagodịrị ihe a Jehova gwara Ebreham echiche. Ọ sịrị ya: “Biko, kpọrọ nwa gị nwoke, nwa ị mụrụ naanị ya, onye ị hụrụ n’anya nke ukwuu, bụ́ Aịzik . . . chụọ ya dị ka àjà nsure ọkụ.” (Jenesis 22:2) Ị̀ hụrụ na Jehova sịrị na Ebreham ‘hụrụ Aịzik n’anya nke ukwuu’? Jehova maara na Ebreham ejighị Aịzik egwuri egwu. Chineke makwaara otú yanwa si were Ọkpara ya, bụ́ Jizọs. Ọ hụrụ Jizọs n’anya nke ukwuu nke na o nwere ugboro abụọ o si n’eluigwe kpọọ Jizọs ‘Ọkpara ya, onye ọ hụrụ n’anya.’—Mak 1:11; 9:7.

Ị̀ hụrụ na mgbe Jehova na-agwa Ebreham okwu na ọ sịrị ya “biko”? Otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru na ihe mere Chineke ji sị ya “biko” bụ maka na “ONYENWE ANYỊ ghọtara na ihe ahụ ọ na-agwa ya mee agaghị adịrị ya mfe ime.” O doro anya na o wutere nnọọ Ebreham na nwa ya na-aga ịnwụ. Anyị nweziri ike iji otú ahụ ọ dị Ebreham ghọtatụ otú o si wute Jehova mgbe ọ nọ na-ele Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ka ọ na-ata ahụhụ, mechaakwa nwụọ. O doro anya na ihe ewutetụbeghị Jehova otú ọnwụ Ọkpara ya si wute ya, o nwekwanụghị ihe ga-ewute ya otú ahụ ọzọ.

N’ihi ya, ọ bụ ezie na o nwere ike iwe anyị iwe na Jehova gwara Ebreham ka o jiri nwa ya chụọrọ ya àjà, anyị kwesịrị icheta na Jehova ekweghị ka Ebreham chụọ nwa ya n’àjà. O kweghị ka Ebreham gbuo Aịzik ma gbarazie aka nwa. Ma, Jehova azọghị ‘Ọkpara nke ya kama o nyefere ya maka anyị niile.’ (Ndị Rom 8:32) Gịnị mere Jehova ji mee ihe ahụ wutere ya nke ukwuu? Ọ bụ ka “anyị nwee ike inweta ndụ.” (1 Jọn 4:9) Ihe a na-egosi anyị na Chineke hụrụ anyị n’anya nke ukwuu! Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị igosi Chineke na anyị hụkwara ya n’anya? *

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Baịbụl ekwughị na Chineke mụrụ Jizọs otú ahụ mmadụ si amụta nwa. Kama nke ahụ, Jehova kere Jizọs eke ma mechazie zite ya n’ụwa, nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Meri amụọ ya. Ebe ọ bụ Chineke kere Jizọs, Chineke bụ Nna ya n’eziokwu.

^ par. 8 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe mere o ji dị mkpa ka Jizọs nwụọ nakwa otú anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ na ọ nwụrụ maka anyị, gụọ isi nke 5 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?