Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwaanyị Obi Kara, nke Na-achọghịkwa Naanị Ọdịmma Onwe Ya

Nwaanyị Obi Kara, nke Na-achọghịkwa Naanị Ọdịmma Onwe Ya

Ṅomie Okwukwe Ha

Nwaanyị Obi Kara, nke Na-achọghịkwa Naanị Ọdịmma Onwe Ya

ESTA ji nwayọọ nwayọọ na-agaru nso n’ebe eze nọ n’ocheeze ya. Obi nọ na-akụ ya kpum kpum kpum ka ọ na-aga. Ebe niile dara jụụ n’obí eze ndị Peshia ahụ dị na Shushan, naanị ihe Esta na-anụ bụ ụda ụkwụ ya na mkpọtụ uwe ya na-eme. Uche ya niile dị n’ebe ahụ ọ na-aga. Ọ ma na ihe a abụghị oge ọ ga-eji kiriwe obí eze ahụ mara mma, ọmarịcha ogidi ndị e ji rụọ ya, nakwa osisi sida ndị e ji chọọ elu ya mma. Anya ya dị naanị n’ebe ahụ eze nọ n’ihi na ọ ma na ọnwụ ya na ndụ ya dị eze n’aka.

Eze nọ nnọọ na-ele Esta ka ọ na-abịa, o setịkwaara ya mkpanaka ọlaedo ya. O nwere ike ịdị ka ihe a eze mere abụghị oké ihe, ma a sị na o meghị ya, a gaara egbu Esta n’ihi na eze akpọghị ya akpọ tupu ya abata n’obí ya. Mgbe Esta rutere n’ebe ahụ eze nọ, o metụrụ aka n’isi mkpanaka ahụ iji gosi na obi dị ya ụtọ na di ya azọọla ya ndụ.—Esta 5:1, 2. *

Naanị anya i lere Eze Ahazuirọs, ị ga-amata na ọ bụ nnukwu eze nke bara ọgaranya. E kwuru na uwe ndị eze Peshia na-eyi ga-eru ọtụtụ nde dọla taa. Mgbe Esta lere di ya anya n’ihu, ihu di ya gosiri ya na ihe ya dị di ya mma, di ya gosikwara ya na ọ hụrụ ya n’anya. Ọ sịrị ya: “Ọ̀ bụ gịnị, Esta nwunye m, gịnịkwa ka ị chọrọ ka m meere gị? Ọ bụrụgodị ọkara alaeze m, a ga-enye gị ya!”—Esta 5:3.

Ebe ọ bụ na Esta agaala n’ihu eze ka ọ gbachitere ndị obodo ya, o gosila na ya nwere okwukwe, gosikwa na obi kara ya. Ọ bụ eziokwu na eze anabatala Esta, ma ọ bụghị ebe ahụ ka okwu biri. Ọ dị mkpa na ọ ga-eme ka eze mata na onye ndụmọdụ ya ọ tụkwasịrị obi abụghị ezigbo mmadụ, nakwa na ọ ghọgburu ya mgbe ọ gwara ya ka ọ bịanye aka n’akwụkwọ ka e gbuchapụ ndị obodo Esta. Olee otú ọ ga-esi mee ka eze kweta ihe ndị a, oleekwa ihe okwukwe Esta na-akụziri anyị?

Ọ Chọtara ‘Oge Dị Mma Ikwu Okwu’

Esta ọ̀ ga-akọrọ eze ihe ahụ ọ chọrọ ịkọrọ ya n’ihu ndị ọzọ ha na eze nọ mgbe ahụ? O mee otú ahụ, ọ ga-emechu eze ihu, meekwa ka Heman nwee ohere ọ ga-eji gọwa agọ. Gịnị ka Esta mere? Ọtụtụ narị afọ tupu oge ahụ, Sọlọmọn bụ́ eze maara ihe si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla, . . . oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.” (Ekliziastis 3:1, 7) O doro anya na mgbe Esta na-eto, Mọdekaị, bụ́ nwoke na-atụ egwu Chineke, kụziiri ya ihe a Sọlọmọn kwuru. O dokwara anya na Esta mụtara na ọ dị mkpa ka mmadụ mara ‘oge o kwesịrị ikwu okwu.’

Esta sịrị: ‘Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka eze na Heman bịa taa n’oriri m kwadebeere eze.’ (Esta 5:4) Eze kwetara na ya ga-abịa, gwakwa Heman ka ọ bịa. Ị̀ hụrụ otú Esta si gosi na ya maara ihe? O mechughị di ya ihu, kama ọ chọrọ ka e nwee oge ga-adaba adaba ọ ga-eji gwa di ya mkpa ya.

O doro anya na Esta kpachapụrụ nnọọ anya kwadebe oriri ahụ, o siri ihe ndị ọ ma na ha ga-amasị di ya. O nyekwara ha mmanya dị ụtọ ka obi wee tọọ ha ụtọ. (Abụ Ọma 104:15) Ahazuirọs rijuru nnọọ afọ, ọ jụkwara Esta ihe ọ chọrọ ka o meere ya. Ọ̀ bụ ugbu a ka Esta ga-agwa ya ihe ahụ?

Mba, Esta achọbeghị ịgwa ya ya ugbu a. Kama nke ahụ, ọ gwara eze na ya ga-achọ ka ya na Heman bịakwa oriri ọzọ n’echi ya. (Esta 5:7, 8) Gịnị mere Esta agwaghị di ya ihe ahụ mgbe ahụ? Cheta na a na-achọ igbukpọ ndị obodo Esta n’ihi na eze enyela Heman ikike ka e gbuo ha. Ebe ọ bụ na okwu a bụ ihe ọnwụ na ndụ, Esta kwesịrị ịgwa eze ihe ahụ mgbe ọ ma na obi dị eze ezigbo ụtọ. Ọ bụ ya mere o ji nwee ndidi ma kpọọ di ya oriri ọzọ iji gosi na ya ejighị di ya egwu egwu.

Ọ dị mma inwe ndidi, ma ọtụtụ ndị anaghị enwe ndidi. N’agbanyeghị na e nwere ihe na-enye Esta nsogbu n’obi, ya ana-achọkwa otú ọ ga-esi kọọrọ ya di ya, o nwere nnọọ ndidi, na-eche oge ga-aka daba adaba. E nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta na ndidi a Esta nwere. O nwere ike ịbụ na o nweela mgbe anyị hụrụ ihe a na-emetaghị nke ọma, bụ́kwa nke e kwesịrị imezi emezi. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka onye nọ n’isi dozie ihe anyị chọpụtara na e kwesịrị idozi, anyị kwesịrị inwe ndidi otú ahụ Esta nwere. Ilu 25:15 sịrị: “Ndidi ka a na-eji akpali ọchịagha ime ihe, ire dị nro pụkwara ịgbaji ọkpụkpụ.” Ọ bụrụ na anyị enwee ndidi, ma chọta oge ga-adaba adaba anyị ga-eji kwuo ihe dị anyị n’obi, jirikwa olu ọma kwuo ya, ndị na-emegide anyị nwere ike ịkwụsị imegide anyị otú ọ sọkwara obi kpọọ ha nkụ. Jehova bụ́ Chineke Esta ọ̀ gọziri Esta maka ndidi ya na amamihe ya?

Ndidi Esta Rụpụtara Ihe Ọma

Ndidi ahụ Esta nwere mechara baa ezigbo uru. Heman ji “ọṅụ na obi ụtọ” laa n’ụbọchị mbụ ahụ eze na nwunye ya kpọrọ ya oriri. Ma, ka Heman na-agafe n’ọnụ ụzọ ámá obí eze, ọ hụrụ Mọdekaị, bụ́ onye Juu na-anaghị ekwe akpọrọ ya isiala. Ihe mere Mọdekaị anaghị akpọrọ ya isiala abụghị n’ihi na ọ chọghị ịkwanyere ya ùgwù, kama ọ bụ n’ihi na ọ chọghị ihe ga-emebi akọnuche ya, ọ chọghịkwa ime ihe ga-ewe Jehova Chineke iwe. Ma, ‘ọnụma juru Heman obi ozugbo ahụ.’—Esta 5:9.

Mgbe Heman gwara nwunye ya na ndị enyi ya na Mọdekaị ekweghị akpọrọ ya isiala, ha gwara ya ka ọ rụọ osisi dị mita iri abụọ na abụọ n’ogologo, gwakwa ka ọ gwa eze ka o nye ya ikike ka ọ kwụgbuo Mọdekaị n’elu osisi ahụ. Ihe a ha gwara Heman tọrọ ya ụtọ, ya ekwuokwa ozugbo ka a rụọ osisi ahụ.—Esta 5:12-14.

Baịbụl kwuru, sị: “N’abalị ahụ, ụra gbafuru eze n’anya.” N’ihi ya, o kwuru ka a gụọrọ ya ihe ndị e dere n’akwụkwọ e dekọrọ ihe ndị mere n’ọchịchị ya n’oge gara aga. Mgbe a nọ na-agụ ya, a hụrụ ebe e dere banyere nkata a kpara igbu eze. Ahazuirọs chetara mgbe ihe ahụ mere, chetakwa na e jidere ndị ahụ kpara nkata ahụ, gbuo ha. Eze jụziri ndị na-ejere ya ozi ihe e meere Mọdekaị, bụ́ onye mere ka a mata banyere nkata ahụ a kpara igbu ya. Ha gwara ya na ọ dịbeghị ihe e meere ya.—Esta 6:1-3.

Iwe were eze, ya ajụọ ndị na-ejere ya ozi ma è nwere onye ọ bụla n’ime ndị o mere ndị isi nọ nso. Ka ihe si adị, ọ bụ Heman nọ nso. O yikwara ka ihe mere o ji bịa n’isi ụtụtụ ahụ ọ̀ bụ ka ọ nata eze ikike ịkwụgbu Mọdekaị. Ma tupu Heman agwa eze ihe mere o ji bịa, eze jụrụ ya ihe a ga-emere nwoke nke ihe ya masịrị eze. Heman chere na ọ bụ ya ka eze bu n’obi. N’ihi ya, o kwuru ihe dị iche iche a ga-emere onye ahụ. Ọ sịrị na e kwesịrị iyiwe onye ahụ uwe eze na-eyi, nakwa na ọ ga-anọkwasị n’ịnyịnya eze, a ga-agwakwa otu n’ime ndị isi a ma ama ka ọ kpọgharịa nwoke ahụ n’obodo Shushan, onye ahụ ga na-etokwa nwoke ahụ ka ndị mmadụ mara na ihe ya masịrị eze. Chegodị otú ihu Heman dị mgbe eze gwara ya na ọ bụ Mọdekaị ka a ga-emere ihe a niile! Ònyekwanụ ka eze gwara ka o meere Mọdekaị ihe ndị ahụ? Ọ bụ Heman!—Esta 6:4-10.

Heman jisiri ike gaa mee ihe ahụ eze gwara ya, ma gbara lawa ozugbo. Nwunye ya na ndị enyi ya gwara ya na ihe a merenụ gosiri na ihe ọjọọ na-aga ime ya, nakwa na o nweghị ihe ọ ga-emeli Mọdekaị onye Juu.—Esta 6:12, 13.

Otú ahụ Esta si nwee ndidi chere ka otu ụbọchị gafekwuo tupu ya agwa eze ihe ọ chọrọ ịgwa ya mere ka Heman jiri aka ya gbapuo onwe ya afọ. Í cheghị na ọ ga-abụ Jehova Chineke mere ka ụra pụọ eze n’anya n’ụbọchị ahụ? (Ilu 21:1) Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị ‘na-echere’ Jehova. (Maịka 7:7) Ọ bụrụ na anyị echere Chineke, anyị ga-achọpụta na otú ọ ga-esi doziere anyị nsogbu anyị ga-aka mma karịa otú anyịnwa gaara esi edozi ya.

Ọ Katara Obi Kwuo Okwu

Esta agaghị anwa anwa hapụkwa ịgwa eze ihe ahụ ọ chọrọ ịgwa ya n’oriri nke abụọ a ọ kpọrọ ya. Ma olee otú ọ ga-esi agwa ya ya? Ọ dabara na eze jụkwara ya ọzọ ihe ọ chọrọ ka e meere ya. (Esta 7:2) Oge eruola ka Esta kwuo okwu!

O doro anya na Esta kpere ekpere n’obi ya tupu ya agwa eze, sị: “Ọ bụrụ na ihe m dị gị mma, eze, ọ bụrụkwa na ọ dị eze mma, m na-arịọ ka e nye m mkpụrụ obi m, m na-arịọkwa ka e nye m ndị m.” (Esta 7:3) Ị̀ hụrụ na o mere ka eze mara na ya ma na ọ bụ eze ga-ekpebi ihe ga-emenụ? Esta gosiri na ya adịghị ka Vashtaị bụ́bu nwunye eze, onye kpachaara anya menye eze ihere! (Esta 1:10-12) Ihe ọzọ bụ na Esta abịaghị tawa eze ụta maka na o weere Heman ka ezigbo mmadụ. Kama, ihe o mere bụ ịrịọ eze ka o chebe ya ka a ghara igbu ya.

O doro anya na ihe ahụ Esta rịọrọ juru eze anya. Olee onye ga-anwa anwa chọọ igbu nwunye eze? Esta gwakwara eze, sị: “E rewo anyị, mụ na ndị m, ka a laa anyị n’iyi, gbuo anyị ma bibie anyị. A sị na e rere anyị ka anyị ghọọ ndị ikom na-agba ohu na ndị inyom na-eje ozi, m gaara agbachi nkịtị. Ma ọdachi a ekwesịghị ekwesị ma ọ bụrụ na o mebiere eze ihe.” (Esta 7:4) Ị̀ hụrụ na Esta gwara eze hoo haa ihe bụ́ nsogbu ya, ma o kwukwara na ya gaara agbachi nkịtị ma a sị na naanị ihe e kwuru bụ na ha ga-aghọ ndị ohu. Ọ bụrụ na eze agbachi nkịtị n’okwu a, ọ ga-emebiri ya ihe.

Otú Esta si kwuo okwu na-akụziri anyị otú anyị nwere ike isi gwa mmadụ okwu ya eruo onye ahụ n’obi. Ọ bụrụ na e nwere nsogbu ị chọrọ ịkọrọ onye ị hụrụ n’anya ma ọ bụdị nsogbu ị chọrọ ka onye nọ n’isi leba anya na ya, inwe ndidi, ịkwanyere onye ahụ ùgwù na ikwu hoo haa ihe dị gị n’obi nwere ike inyere gị ezigbo aka.—Ilu 16:21, 23.

Ahazuirọs jụrụ nwunye ya, sị: “Ònye bụ onye ahụ, oleekwa ebe onye obi kara ime otú ahụ nọ?” Weregodị ya na ị na-ahụ ka Esta na-atụ Heman aka na-asị: “Nwoke ahụ, onye mmegide ahụ na onye iro ahụ, bụ Heman ọjọọ a.” Mgbe Esta kwuru ihe a, ebe niile dara jụụ. Ezigbo ụjọ jidere Heman. Olee otú i chere ihu eze ahụ, bụ́ onye na-ewe iwe ọkụ, dị n’oge ahụ mgbe ọ chọpụtara na onye ndụmọdụ ya ọ tụkwasịrị obi ghọgburu ya ya abịanye aka n’akwụkwọ ka e gbuo nwunye ya ọ hụrụ n’anya? Ihe a were eze ezigbo iwe nke na o si n’ebe ahụ pụọ gaa n’ubi dị n’obí ya ka obi ya jụrụ.—Esta 7:5-7.

Mgbe Heman hụrụ na a gbapuola ya afọ, ọ dara n’ala n’ebe nwunye eze nọ na-arịọ ya ka ọ rịọ eze ka ọ gbaghara ya. Mgbe eze bataghachiri n’ime ụlọ, ọ hụrụ ka Heman nọ n’ebe nwunye ya dina na-arịọ ya arịrịọ. O jizi iwe ahụ bo Heman ebubo na ọ chọrọ ịnọ n’ụlọ ya dinaa nwunye ya n’ike. Ihe ahụ o kwuru gosiri na nke Heman agwụla. A kpọpụrụ Heman ozugbo ahụ, kpuchie ya ihu. Otu n’ime ndị na-ejere eze ozi gwaziri eze na e nwere nnukwu osisi Heman rụrụ ọ ga-eji kwụgbuo Mọdekaị. Ozugbo ahụ, Ahazuirọs nyere iwu ka a kwụgbuo Heman n’osisi ahụ.—Esta 7:8-10.

Ebe ọ bụ na ihe ọjọọ juru ụwa taa, o nwere ike ịdị anyị ka ihe agaghị emecha dị mma. Ò nwetụla mgbe ọ dị gị otú ahụ? O nweghị mgbe Esta weere ya na olileanya adịghịzi, o nweghị mgbe o bidoro gbakasịwa ahụ́ ma ọ bụ kwụsị inwe okwukwe na Chineke. Mgbe oge ruru, ọ katara obi kwuo okwu, obi sikwara ya ike na Jehova ga-eme ka ihe ka mma. Anyị kwesịrị ịmụta ime otú ahụ. Jehova agbanwebeghị. Ọ ka nwekwara ike ime ka ndị ajọ mmadụ daba n’olulu ha gwuuru ndị ọzọ otú ahụ Heman dabara.—Abụ Ọma 7:11-16.

Ọ Gbachiteere Jehova, Gbachitekwara Ndị Jehova

Eze mechara chọpụta na ọ bụghị naanị na ọ bụ Mọdekaị mere ka a mata nkata a kpara igbu ya, ọ bụkwa ya zụrụ nwunye ya bụ́ Esta. Ahazuirọs nyeziri Mọdekaị ọkwá ahụ o nyeburu Heman. O nyekwara Esta ụlọ Heman na ihe niile Heman nwere. Esta nyefekwara Mọdekaị ihe ndị ahụ.—Esta 8:1, 2.

Esta ọ̀ ga-agbachizi nkịtị ugbu a ihe dịịrịla ya na Mọdekaị mma? Ọ gaghị eme otú ahụ n’ihi na ọ naghị achọ naanị ọdịmma onwe ya. A ka na-ezipụ akwụkwọ ozi ahụ Heman dere, nke kwuru na a ga-egbu ndị Juu bi n’ebe niile eze Ahazuirọs na-achị. Heman fere nza, ma ọ bụ Pua, nke nwere ike ịbụ ịgba afa, iji mata oge ga-akacha daba adaba igbu ndị Juu niile. (Esta 9:24-26) Ọ ka fọrọ ọtụtụ ọnwa tupu ụbọchị a ga-egbu ndị Juu eruo, ma ụbọchị ahụ ji ọsọ na-abịa. Ò nwere ihe a ka nwere ike ime ka a ghara igbu ndị Juu?

Esta gakwara n’ihu eze ọzọ mgbe eze na-akpọghị ya ka ọ bịa n’agbanyeghị na ọ ma na e nwere ike igbu ya. Na nke ugbu a, ọ bịaziri ịrịọ di ya ka o tigharịa iwu ahụ e tiri ka e gbuo ndị Juu. Ma, a naghị agbanwe iwu ọ bụla ndị eze Peshia bịanyere aka na ya. (Daniel 6:12, 15) N’ihi ya, eze nyere Esta na Mọdekaị ikike ka ha tie iwu ọzọ. Ha tiziri iwu ka ndị Juu lụso ndị ọ bụla bịara igbu ha ọgụ. E zipụkwara ndị na-agba ịnyịnya ka gaa zie ndị Juu ozi ahụ na-eme obi ụtọ. Ozi a mekwara ka obi sie ndị Juu ike. (Esta 8:3-16) Ndị Juu bi n’ebe niile Ahazuirọs na-achị bidoro kwadowe maka agha. O doro anya na ha agaraghị enwe ike ime otú ahụ ma ọ bụrụ na e tighị iwu ọhụrụ a. Ma, ihe kazi mkpa ugbu a bụ ma “Jehova nke ụsụụ ndị agha” ọ̀ ga-enyere ndị ya aka n’agha a?—1 Samuel 17:45.

Mgbe ụbọchị ahụ a ga-egbu ndị Juu ruru, ndị Juu niile ejikerela. Ugbu a, ọtụtụ ndị isi ndị Peshia na-agbachiteziri ndị Juu n’ihi na ha nụrụ na e meela Mọdekaị, bụ́ onye Juu, onye ndụmọdụ eze. Jehova mere ka ndị ya merie n’agha ahụ. O mere ka ha sụọ ndị iro ha akwụ, ka a gharakwa inwe mgbe ha ga-enye ha nsogbu ọzọ. *Esta 9:1-6.

E gbukwara ụmụ iri Heman n’ihi na ọ bụrụ na e gbughị ha, ha agaghị ekwe ka Mọdekaị weghara ihe niile ahụ bụ́bu nke nna ha. (Esta 9:7-10) Ihe a mezuru otu amụma e buru na Baịbụl nke kwuru na a ga-egbuchapụ ndị Amalek, bụ́ ndị iro ndị Chineke. (Diuterọnọmi 25:17-19) O yiri ka ụmụ Heman hà bụ ndị Amalek ikpeazụ fọrọnụ.

N’agbanyeghị na Esta ka bụ nwa agbọghọ, ọ rụrụ nnukwu ọrụ, dị ka iso tie iwu gbasara otú a ga-esi gbuo ndị iro Chineke. O doro anya na ihe ndị ahụ Esta mere adịghị mfe. Ma, Esta katara obi mee ha n’ihi na Jehova achọghị ka e bibie ndị ya bụ́ ndị Izrel. Ihe mere na ọ chọghị ka e bibie ha bụ na ọ bụ ná mba Izrel ka Mesaya ahụ e kwere ná nkwa ga-esi bịa, ọ bụkwa Mesaya ahụ ga-azọpụta ụwa niile. (Jenesis 22:18) Ndị na-efe Chineke taa nwere obi ụtọ na mgbe Mesaya ahụ, ya bụ, Jizọs, bịara n’ụwa, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha gharazie ịna-alụ agha.—Matiu 26:52.

Ma, e nwere agha Ndị Kraịst na-alụ taa, ọ bụ agha ime mmụọ. Ihe mere ha ji alụ agha a bụ na Setan ka na-achọ ime ka anyị kwụsị inwe okwukwe na Jehova Chineke. (2 Ndị Kọrịnt 10:3, 4) Obi dị anyị ụtọ na anyị nwere onye dị ka Esta, onye anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’aka ya. Ka anyị gbaa mbọ na-eme ka ya, ya bụ, ka anyị na-akpa àgwà ka ndị maara ihe, na-enwe ndidi, na-agwa ndị ọzọ okwu otú ọ ga-eru ha n’obi, na-akata obi eme ihe, ma na-agbachitere ndị anyị na ha so na-efe Chineke.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 N’Ụlọ Nche Ọktoba 1, 2011, a kọrọ otú Mọdekaị si kpọrọ nwa nwanne nna ya bụ́ Esta mgbe nne na nna Esta nwụrụ nakwa otú Esta si mechaa ghọọ nwunye Ahazuirọs, eze ndị Peshia. Heman, bụ́ onye ndụmọdụ eze, kpara nkata ọjọọ igbu ndị Juu, bụ́ ndị obodo Mọdekaị. Mọdekaị gwara Esta ka ọ gaa rịọ eze ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka.—Gụọ isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha—Ọ Gbachiteere Ndị Chineke.”

^ par. 32 Eze nyedịrị ndị Juu ikike ka ha lụkwuo agha otu ụbọchị ọzọ ka ha nwee ike gbuchaa ndị iro ha. (Esta 9:12-14) Ruo taa, ndị Juu ka na-echeta mmeri ahụ ha meriri ndị iro ha. Ha na-echeta ya afọ ọ bụla n’oge opupu ihe ubi, ha na-akpọkwa ememme ha ji echeta ya Purim. Ebe e si nweta okwu ahụ bụ́ Purim bụ na nza ahụ a na-akpọ Pua nke Heman fere mgbe ọ na-akpa nkata igbu ndị Juu.

[Igbe dị na peeji nke 28]

Ajụjụ Ndị A Jụrụla Banyere Esta

Gịnị mere Mọdekaị ji kwere ka Esta lụọ onye na-anaghị efe Chineke?

Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na ihe mere Mọdekaị ji kwere ka Esta lụọ eze ahụ bụ n’ihi na ọ chọrọ ka ya bụrụ onye a ma ama. Ma ihe a ha na-ekwu abụghị eziokwu. Ebe Mọdekaị bụ onye Juu nke na-erubere Chineke isi, o doro anya na ọ gaghị achọ ka Esta lụọ onye na-anaghị efe Chineke. (Diuterọnọmi 7:3) N’akụkọ ndị Juu oge ochie, e kwudịrị na Mọdekaị gbalịrị ime ka eze ahụ ghara ịlụ Esta. Ma, o yiri ka Esta na Mọdekaị enweghị ihe ha ga-emeli n’okwu ahụ ebe ọ bụ na ha bụ ndị mbịarambịa n’obodo nke eze na-achị ya bụ o kwuchaa o bie. O mechara doo anya na Jehova ji ọlụlụ ahụ eze ahụ lụrụ Esta mee ka a zọpụta ndị ya.—Esta 4:14.

Gịnị mere na e nweghị ebe aha Chineke bụ́ Jehova dị n’akwụkwọ Esta?

O doro anya na ọ bụ Mọdekaị dere akwụkwọ Esta. Tupu e wega akwụkwọ ahụ Jeruselem, ọ dị ka ebe mbụ e debere ya ọ̀ bụ n’ebe ndị Peshia na-edebe akwụkwọ ndị ha dere ihe ndị mere n’obodo ha. Ọ bụrụ na e dere aha Chineke bụ́ Jehova n’akwụkwọ ahụ, o nwere ike mee ka ndị Peshia, bụ́ ndị na-efe arụsị, tụfuo ya. Ma o doro anya na aka Jehova dị n’ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ ahụ. Ọ dị mma ịmara na aha Chineke dị n’akwụkwọ ahụ n’asụsụ Hibru, bụ́ asụsụ mbụ e ji dee ya. Otú o si dịrị na ya bụ na e nwere mkpụrụ okwu anọ sochiri ibe ha ndị a ma ụma jiri mkpụrụ akwụkwọ anọ e ji asụpe aha Chineke n’asụsụ Hibru malite ma ọ bụ mechie.

Ihe a kọrọ n’akwụkwọ Esta ò mere eme n’eziokwu?

O nwere ndị na-ekwu na ihe a kọrọ n’akwụkwọ Esta emeghị eme. Ma, ụfọdụ ndị ọkà mmụta achọpụtala na onye dere akwụkwọ ahụ ma nnọọ ihe banyere ọchịchị ndị Peshia, omenala ha, nakwa otú ha si arụ ụlọ. Ọ bụ eziokwu na e wezụga Baịbụl, e nwebeghị ebe ọzọ a hụrụ e dere aha Esta n’ihe ndị mgbe ochie dere. Ma Esta abụghị onye mbụ n’ime ndị chịrị achị a na-ahụbeghị aha ha n’ihe ndị mgbe ochie dere. E nwekwara ihe ndị e dere n’oge ochie ndị kwuru na otu nwoke a na-akpọ Mardukâ, nke bụ́ otú ndị Peshia si ede Mọdekaị, jere ozi n’obí eze dị na Shushan n’otu oge ahụ akwụkwọ Esta kọrọ na Mọdekaị jere ozi n’obí eze.

[Igbe dị na peeji nke 29]

Ha Mezuru Ihe E Buru n’Amụma

Ọgụ ahụ Esta na Mọdekaị lụụrụ ndị Chineke mezuru amụma ọzọ e buru na Baịbụl. Ihe karịrị otu puku afọ na narị afọ abụọ tupu oge ahụ, Jehova ji ike mmụọ nsọ ya mee ka Jekọb buo amụma banyere otu n’ime ụmụ ya, sị: “Benjamin ga na-adọgbu anụ dị ka anụ ọhịa wolf. N’ụtụtụ ka ọ ga-eri anụ o jidere, n’anyasị ka ọ ga-eke ihe ọ kwatara akwata.” (Jenesis 49:27) “N’ụtụtụ,” ya bụ, mgbe ndị Izrel malitere inwe ndị eze, e nwere ndị si n’ebo Benjamin, dị ka Eze Sọl na ndị dike ndị ọzọ, ndị lụụrụ ndị Jehova agha. “N’anyasị,” ya bụ, mgbe ndị Izrel na-enwekwaghị eze, Esta na Mọdekaị, bụ́ ndị si n’ebo Benjamin, lụsoro ndị iro Jehova agha ma merie ha. E nwekwara ike ikwu na ha kere ihe ha kwatara n’agha ebe ọ bụ na ihe niile Heman nwe ghọrọ nke ha.

[Foto dị na peeji nke 25]

Esta gosiri na obi dị ya ụtọ na di ya meere ya ebere

[Foto dị na peeji nke 26, 27]

Esta katara obi mee ka a mata na Heman bụ onye ọjọọ

[Foto dị na peeji nke 28, 29]

Esta na Mọdekaị zigaara ndị Juu bi n’ebe niile Ahazuirọs na-achị ozi