Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Òtù Ndị Nchụàjà Bụ́ Ndị Eze Ndị Ga-abara Mmadụ Niile Uru

Òtù Ndị Nchụàjà Bụ́ Ndị Eze Ndị Ga-abara Mmadụ Niile Uru

Òtù Ndị Nchụàjà Bụ́ Ndị Eze Ndị Ga-abara Mmadụ Niile Uru

“Unu bụ ‘agbụrụ a họọrọ, òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ, otu ndị pụrụ iche.’”—1 PITA 2:9.

1. Olee ihe mere e ji akpọ “nri anyasị nke Onyenwe anyị” Ncheta Ọnwụ Jizọs, oleekwa ihe e kwo eme ya?

N’UHURUCHI nke Naịsan 14 nke afọ 33 O.A., Jizọs Kraịst na ndịozi ya iri na abụọ mere Ememme Ngabiga nke ikpeazụ ha. Mgbe Jizọs gwachara Judas Iskarịọt, bụ́ onye chọrọ ịrara ya nye, ka ọ pụọ, ọ malitere ihe ọhụrụ ndị na-eso ụzọ ya ga na-eme. E mechara kpọọ ihe ahụ ọ malitere “nri anyasị nke Onyenwe anyị.” (1 Kọr. 11:20) Jizọs kwuru ugboro abụọ, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” A na-akpọkwa ya Ncheta Ọnwụ Jizọs. (1 Kọr. 11:24, 25) Ndịàmà Jehova nọ n’ụwa niile na-eme ihe a Jizọs kwuru, ha na-echeta ọnwụ Kraịst kwa afọ. N’afọ 2012, Naịsan 14 nke kalenda Baịbụl ga-amalite mgbe anyanwụ dachara na Tọzdee, Eprel 5.

2. Olee ihe Jizọs kwuru banyere achịcha na mmanya e ji echeta ọnwụ ya?

2 Luk onye na-eso ụzọ Jizọs ji okwu ndị dị mfe nghọta kọwaa ihe Jizọs mere na ihe o kwuru n’oge ahụ. Ọ sịrị: “O wee were otu ogbe achịcha, kelee Chineke, nyawaa ya, ma were ya nye ha, sị: ‘Nke a pụtara ahụ́ m nke a gaje inye n’ihi unu. Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.’ O bukwaara iko ahụ n’otu ụzọ ahụ mgbe ha risịrị nri anyasị, sị: ‘Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke dabeere n’ọbara m, bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi unu.’” (Luk 22:19, 20) Olee otú ndịozi Jizọs si ghọta ihe a Jizọs kwuru?

3. Olee otú ndịozi Jizọs si ghọta ihe achịcha na mmanya ahụ pụtara?

3 Ebe ndịozi Jizọs bụ ndị Juu, ha ma banyere àjà ndị nchụàjà ji ụmụ anụmanụ achụrụ Chineke n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ihe e kwo achụ àjà ndị ahụ bụ ka onye wetara ya na Jehova dịrị ná mma, e jikwa ọtụtụ n’ime àjà ndị a na-achụ ekpuchi mmehie. (Lev. 1:4; 22:17-29) N’ihi ya, ndịozi Jizọs ghọtara na mgbe Jizọs kwuru na ‘a ga-enye ahụ́ ya ma wụpụ ọbara ya n’ihi ha,’ ihe ọ na-ekwu bụ na ọ ga-eji ndụ ya zuru okè chụọ àjà. Àjà a ga-aka nnọọ àjà ahụ e ji ụmụ anụmanụ na-achụ baa uru.

4. Olee ihe Jizọs bu n’obi mgbe ọ sịrị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke dabeere n’ọbara m”?

4 Gịnịkwanụ ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ sịrị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke dabeere n’ọbara m”? Ndịozi Jizọs maara amụma ahụ e buru banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ, bụ́ nke e dere na Jeremaya 31:31-33. (Gụọ.) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na ọ na-amalite ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, bụ́ nke ga-anọchi ọgbụgba ndụ iwu ahụ nke Jehova na ndị Izrel si n’aka Mozis gbaa. È nwere ihe jikọrọ ọgbụgba ndụ abụọ ahụ?

5. Olee uru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ ga-abara ụmụ Izrel?

5 Ee, ihe ha abụọ na-arụ yiri otu. Mgbe Jehova na mba Izrel gbara ndụ, ọ gwara ha sị: “Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-erube nnọọ isi n’ihe m kwuru ma debe ọgbụgba ndụ m n’ezie, unu ga-aghọ ihe onwunwe m pụrụ iche n’etiti ndị niile ọzọ, n’ihi na elu ụwa dum bụ nke m. Unu onwe unu ga-aghọrọ m alaeze nke ndị nchụàjà na mba dị nsọ.” (Ọpụ. 19:5, 6) Olee otú ndị Izrel si ghọta okwu ndị a?

NDỊ E KWERE NKWA NA HA GA-ABỤ NDỊ NCHỤÀJÀ BỤ́ NDỊ EZE

6. Olee nkwa e kwo gbaa ọgbụgba ndụ Iwu ahụ?

6 Ndị Izrel ghọtara ihe okwu ahụ bụ́ “ọgbụgba ndụ” pụtara n’ihi na Jehova na ndị nna nna ha bụ́ Noa na Ebreham agbatụla ndụ. (Jen. 6:18; 9:8-17; 15:18; 17:1-9) Mgbe Jehova na Ebreham na-agba ndụ, o kwere Ebreham nkwa, sị: “Site ná mkpụrụ gị ka mba niile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.” (Jen. 22:18) Ọ bụ nkwa a mere Jehova na ndị Izrel ji gbaa ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. Ọgbụgba ndụ a ga-eme ka mba Izrel ghọọrọ Jehova ‘ihe onwunwe pụrụ iche n’etiti ndị niile ọzọ.’ Olee ihe mere ha ji ghọọrọ ya ihe onwunwe pụrụ iche? Ọ bụ ka ha wee ‘ghọọrọ Jehova alaeze nke ndị nchụàjà.’

7. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “alaeze nke ndị nchụàjà” pụtara?

7 Ndị Izrel ma ihe banyere ndị eze na ndị nchụàjà. Ma, n’ime ndị niile dịrị ndụ n’oge ochie, ọ bụ naanị Melkizedek ka Jehova kwere ka ọ bụrụ eze na onye nchụàjà. (Jen. 14:18) Ugbu a, Jehova na-agwa mba ahụ na ha nwere ike ịghọ “alaeze nke ndị nchụàjà.” E mechara kwuo n’Akwụkwọ Nsọ na nke a pụtara na e nyere ha ohere ịghọ òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, ya bụ, ndị eze ndị ga-abụkwa ndị nchụàjà.—1 Pita 2:9.

8. Olee ọrụ ndị nchụàjà Chineke họpụtara na-arụ?

8 Ọrụ eze bụ ịchị obodo. Ma, gịnị bụ ọrụ onye nchụàjà? Ndị Hibru 5:1 kwuru, sị: “Nnukwu onye nchụàjà ọ bụla nke e si n’etiti ụmụ mmadụ họrọ bụ onye a họpụtara ijere Chineke ozi n’ihi ụmụ mmadụ, ka o wee na-eche onyinye n’ihu ya, na-achụkwa àjà maka mmehie.” N’ihi ya, Jehova na-ahọpụta onye nchụàjà ka ọ na-anọchite anya ndị mmehie. Otú o si anọchite anya ha bụ ịchụrụ ha àjà a chọrọ ka a chụọ na ịrịọchitere ha arịrịọ. Onye nchụàjà na-anọchitekwa anya Jehova. Otú o si eme ya bụ ịkụziri ndị Jehova iwu Chineke. (Lev. 10:8-11; Mal. 2:7) Ndị nchụàjà Chineke họpụtara si ụzọ ndị dị otú a eme ka ndị mmadụ na Chineke dịghachi ná mma.

9. (a) Olee ihe ụmụ Izrel ga-eme ka ha ghọọ “òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze”? (b) Olee ihe mere Jehova ji mee ka e nwee ndị nchụàjà n’Izrel? (ch) Olee ihe mere ndị Izrel aghọghị òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze” n’oge ha na Jehova ka nọ n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ?

9 Otú a ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ si mee ka ụmụ Izrel nwee ohere ịghọ òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, ndị ga-abara “ndị niile ọzọ” uru. Ma, e nwere ihe ha ga-eme tupu ha enwee ike inweta ihe ùgwù a pụrụ iche. A gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na unu ga-erube nnọọ isi n’ihe m kwuru ma debe ọgbụgba ndụ m n’ezie.” Ndị Izrel, hà nwere ike ‘irube nnọọ isi n’ihe Jehova kwuru’? Ee, ma ha agaghị erubeliri ya isi mgbe niile. (Rom 3:19, 20) Ọ bụ nke a mere Jehova ji họpụta onye nchụàjà n’Izrel, bụ́ onye ọrụ ya dị iche na nke onye eze, ka ọ na-eji ụmụ anụmanụ na-achụ àjà maka mmehie ndị Izrel ga-eme. (Lev. 4:1–6:7) Mmehie ndị nchụàjà n’onwe ha mere sokwa ná mmehie ndị e kwo achụ àjà. (Hib. 5:1-3; 8:3) N’agbanyeghị na Jehova na-anabata àjà ndị ahụ, ha anaghị ewepụcha mmehie ndị na-achụ ha mere. Ndị nchụàjà e nwere mgbe ahụ enwedịghị ike ime ka Chineke na ndị Izrel nwere ezi obi dịghachi n’ezigbo mma. Pọl kwutere ya mgbe ọ sịrị: “Ọbara ụmụ oké ehi na ọbara ewu apụghị iwepụ mmehie.” (Hib. 10:1-4) Ụmụ Izrel ghọrọ ndị a bụrụ ọnụ n’ihi na ha emeghị ihe e dere n’Iwu ahụ. (Gal. 3:10) N’ihi ya, ha agaghị abụliri ụwa niile òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze.

10. Olee ihe ọgbụgba ndụ Iwu ahụ rụzuru?

10 Nke a ọ̀ pụtara na nkwa Jehova kwere ndị Izrel na ha nwere ike ịghọ “òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze” enweghị isi? Mbanụ. Ha ga-enwe ihe ùgwù a ma ọ bụrụ na ha ejiri obi ha dum rubere Chineke isi, ma, ọ gaghị abụ mgbe ha ka na-edebe Iwu ahụ. Gịnị mere ọ gaghị abụ mgbe ahụ? (Gụọ Ndị Galeshia 3:19-25.) Iwu ahụ mere ka ndị gbasiri mbọ ike debe ya nọsie ike na-efe Jehova. O mere ka ndị Juu mara na ha bụ ndị mmehie, marakwa na ọ dị mkpa ka a chụọ àjà karịrị nke nnukwu onye nchụàjà ha na-achụrụ ha. Iwu ahụ bụ onye nduzi nke ga-eduru ha gakwuru Kraịst, ma ọ bụ Mesaya, nke bụ́ utu aha ndị pụtara “Onye E Tere Mmanụ.” Ma, mgbe Mesaya bịara, ọ ga-amalite ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ Jeremaya buru n’amụma. A gwara ndị nabatara Kraịst ka ha bịa soro n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ma ghọọ “òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze.” Ka anyị hụ otú nke a ga-esi mee.

ỌGBỤGBA NDỤ ỌHỤRỤ AHỤ EMEE KA E NWEE ÒTÙ NDỊ NCHỤÀJÀ BỤ́ NDỊ EZE

11. Olee otú Jizọs si mee ka o kwe omume ndị ọzọ iso n’òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze?

11 N’afọ 29 O.A., Jizọs onye Nazaret ghọrọ Mesaya ahụ. Mgbe ọ dị afọ iri atọ, e mere ya baptizim iji gosi na o wepụtala onwe ya ime ihe pụrụ iche Jehova chọrọ ka o mee. Jehova kpọrọ ya “Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya,” jirikwa mmụọ nsọ, ọ bụghị mmanụ nkịtị, tee ya mmanụ. (Mat. 3:13-17; Ọrụ 10:38) Nke a mere ka ọ bụrụ Nnukwu Onye Nchụàjà nke ụmụ mmadụ ndị kwere na ya. Ọ ga-abụkwa Eze ha n’ọdịnihu. (Hib. 1:8, 9; 5:5, 6) O meziri ka o kwe omume ndị ọzọ iso n’òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze.

12. Olee ihe ndị àjà Jizọs mere ka ha kwe omume?

12 Olee àjà Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Jizọs nwere ike ịchụ nke ga-ekpuchicha mmehie ndị kwere na ya ketara eketa? Ihe Jizọs kwuru mgbe ọ na-ehiwe ihe a ga-eji na-echeta ọnwụ ya gosiri na àjà a ga-achụ bụ ndụ ya zuru okè. (Gụọ Ndị Hibru 9:11, 12.) Malite mgbe e mere Jizọs, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà, baptizim na 29 O.A., e lere ya ule, zụọkwa ya ruo mgbe ọ nwụrụ. (Hib. 4:15; 5:7-10) Mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, ọ rịgoro eluigwe, ma gosi Jehova uru àjà ọ chụrụ bara. (Hib. 9:24) Si mgbe ahụ gawa, Jizọs nweziri ike ịrịọchitere ndị niile nwere okwukwe n’àjà ọ chụrụ arịrịọ ka Jehova gbaghara ha mmehie ha, o nwekwara ike inyere ha aka ijere Chineke ozi ruo mgbe ebighị ebi. (Hib. 7:25) Àjà ọ chụrụ mekwara ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nwee isi.—Hib. 8:6; 9:15.

13. Gịnị ka a ga-emere ndị a kpọrọ ka ha soro n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?

13 A ga-ejikwa mmụọ nsọ ete ndị a kpọrọ ka ha soro n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ mmanụ. (2 Kọr. 1:21) E bu ụzọ kpọọ ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi, mechaa kpọọ ndị Jentaịl. (Efe. 3:5, 6) Olee ihe a ga-emere ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? A ga-agbaghara ha mmehie ha. Jehova kwere nkwa, sị: “M ga-agbaghara ha njehie ha, agakwaghị m echeta mmehie ha.” (Jere. 31:34) Ebe ọ bụ na Jehova agbagharala ha mmehie ha, ha nweziri ike ịghọ “alaeze nke ndị nchụàjà.” Pita gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ, sị: “Unu bụ ‘agbụrụ a họọrọ, òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ, otu ndị pụrụ iche nke Chineke, ka unu wee kwusaa n’ebe niile ịdị mma’ nke onye ahụ kpọpụtara unu n’ọchịchịrị wee kpọba unu n’ìhè ya dị ebube.” (1 Pita 2:9) N’ebe a, Pita kwughachiri ihe Jehova gwara ụmụ Izrel mgbe ọ na-enye ha Iwu ahụ ma gosi na ọ gbasara Ndị Kraịst so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ.—Ọpụ. 19:5, 6.

ÒTÙ NDỊ NCHỤÀJÀ BỤ́ NDỊ EZE EMEE IHE NA-ABARA ỤMỤ MMADỤ NIILE URU

14. Olee ebe òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze ga-eje ozi?

14 Ebee ka ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ga-eje ozi? Ha ga-abụ òtù ndị nchụàjà n’ụwa. Ha ga-anọchite anya Jehova n’ụwa, ‘na-ekwusa ịdị mma ya n’ebe niile,’ na-enyekwa ndị Jehova nri ime mmụọ. (Mat. 24:45; 1 Pita 2:4, 5) Mgbe ha nwụrụ, a kpọlite ha n’ọnwụ, ha ga-eso Kraịst bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe, nwezie ike ịrụ ọrụ abụọ ahụ ma rụruo ya n’isi. (Luk 22:29; 1 Pita 1:3-5; Mkpu. 1:6) Jọn onyeozi gosiri na nke a bụ eziokwu. Ọ hụrụ ọtụtụ ndị mmụọ ozi ka ha nọ ocheeze Jehova nso n’eluigwe. Ha nọ na-abụku “Nwa Atụrụ ahụ” abụ, sị: “I jikwa ọbara gị zụtara Chineke ndị mmadụ si n’ebo niile na asụsụ niile na ndị niile na mba niile, i mekwara ka ha bụụrụ Chineke anyị otu alaeze na ndị nchụàjà, ha ga-achịkwa ụwa dị ka ndị eze.” (Mkpu. 5:8-10) N’ọhụụ ọzọ Jọn hụrụ ka e mechara, o kwuru banyere ndị eze ndị a, sị: “Ha ga-abụ ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa ya chịa dị ka ndị eze ruo otu puku afọ ahụ.” (Mkpu. 20:6) Ọ bụ ha na Kraịst bụ òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, bụ́ ndị ga-emere ụmụ mmadụ niile ihe ga-abara ha uru.

15, 16. Olee otú òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze ga-esi abara ụmụ mmadụ uru?

15 Olee uru ozi otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ na-eje ga-abara ndị nọ n’ụwa? Mkpughe isi 21 kwuru na ha bụ obodo dị n’eluigwe, ya bụ, Jeruselem Ọhụrụ, nke a kpọrọ “nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpu. 21:9) Amaokwu nke 2 ruo nke 4 kwuru, sị: “Ahụkwara m obodo nsọ ahụ, bụ́ Jeruselem Ọhụrụ, ka o si n’eluigwe, n’ebe Chineke nọ, na-agbadata. A kwadebekwara ya dị ka nwaanyị a na-alụ ọhụrụ nke a chọrọ mma maka di ya. M wee nụ ka otu oké olu si n’ocheeze ahụ na-asị: ‘Lee! Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.’” Nke a bụ ngọzi na-enweghị atụ! Ọnwụ, bụ́ ihe bụ́ isi na-akpata iru uju, mkpu ákwá, ihe mgbu, na anya mmiri na-agba ndị mmadụ, agaghị adịkwa. A ga-emezi ka ụmụ mmadụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi zuo okè, ha na Chineke adịrịkwa n’ezigbo mma.

16 Mkpughe 22:1, 2 kọwakwuru ngọzi òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze ga-ewetara ụmụ mmadụ. Ọ sịrị: “O wee gosi m osimiri nke mmiri nke ndụ, nke na-egbuke egbuke dị ka kristal, ka o si n’ocheeze Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ na-asọpụta, na-asọda n’etiti mbara okporo ámá [Jeruselem Ọhụrụ]. E nwere osisi nke ndụ n’otu akụkụ nke osimiri ahụ nakwa n’akụkụ ya nke ọzọ. Ha na-amị mkpụrụ ugboro iri na abụọ n’afọ, ha na-amị mkpụrụ ha kwa ọnwa. Akwụkwọ nke osisi ndị ahụ bụ maka ịgwọ mba niile.” Ọhụụ a na-egosi anyị na a ga-eme ka ezughị okè “mba niile,” ma ọ bụ ụmụ mmadụ, ketara n’aka Adam hapụ ha aka. N’eziokwu, mgbe ahụ, “ihe mbụ niile agabigawo.”

ÒTÙ NDỊ NCHỤÀJÀ BỤ́ NDỊ EZE ARỤCHAA ỌRỤ HA

17. Olee ihe òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze ga-arụzu?

17 Ka otu puku afọ òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze ga-eje ozi na-agwụla, ha ga-eme ka ụmụ mmadụ zuo okè. Kraịst, onye bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà na Eze, ga-enyefezi Jehova ụmụ mmadụ zuru okè. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:22-26.) Nke a ga-egosi na òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze arụchaala ọrụ ha.

18. Mgbe òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze rụchara ọrụ ha, olee ihe Jehova ga-eji ndị ha na Kraịst so n’òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze na-arụ?

18 Oleezi ọrụ Jehova ga-enye ndị a ha na Kraịst so n’òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze? Mkpughe 22:5 kwuru na “ha ga-achịkwa dị ka ndị eze ruo mgbe niile ebighị ebi.” Ole ndị ka ha ga na-achị? Baịbụl agwaghị anyị. Ma ụdị ndụ ha nwere na ihe ha mụtara n’aka ha nyeere ụmụ mmadụ na-ezughị okè ga-eme ka ha ruo eruo ịbụ ndị eze, Jehova ejirikwa ha na-arụ ọrụ ruo mgbe ebighị ebi.

19. Olee ihe a ga-echetara ndị niile ga-aga Ncheta Ọnwụ Jizọs?

19 Ihe ndị a anyị tụlere ugbu a ga-adị anyị n’obi mgbe anyị zukọrọ na Tọzdee, Eprel 5, 2012, icheta ọnwụ Jizọs. Ndị Kraịst e tere mmanụ ndị ka nọ n’ụwa ga-eso ata achịcha ahụ na-ekoghị eko ma ṅụọ mmanya ahụ na-acha ọbara ọbara, nke na-egosi na ha so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Ihe ndị a na-anọchi anya àjà Kraịst chụrụ na-echetara ha ihe ùgwù pụrụ iche ha nwere nakwa ọrụ pụrụ iche ha ga-arụ iji mezuo nzube ebighị ebi nke Chineke. Ka anyị niile gaa mgbe a ga-echeta ọnwụ Jizọs iji gosi na obi dị anyị ụtọ na Jehova mere ndokwa ka e nwee òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, bụ́ ndị na-abara ụmụ mmadụ niile uru.

Ì NWERE IKE ỊKỌWA?

․․․․․

Olee mgbe mbụ e kwere nkwa na a ga-enwe òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze?

․․․․․

Olee otú ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ si mee ka e nwee òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze?

․․․․․

Olee uru òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze ga-abara ụmụ mmadụ?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 29]

Òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze ga-abara ụmụ mmadụ uru ruo mgbe ebighị ebi