Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Olee Otú M Ga-esi Kwusalie Ozi Ọma?’

‘Olee Otú M Ga-esi Kwusalie Ozi Ọma?’

‘Olee Otú M Ga-esi Kwusalie Ozi Ọma?’

N’ụwa niile, e nwere ụmụnna anyị ndị anyị ji ama atụ, bụ́ ndị na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na ha dara ezigbo ọrịa. Otu onye n’ime ha bụ Dalia, onye bi na Vilnius, nke bụ́ isi obodo Lituenia.

Dalia bụ nwanna nwaanyị dị ihe dị ka afọ iri atọ na ise. Kemgbe a mụrụ ya, ọ na-arịa ọrịa strok na-eme n’ụbụrụ. Ọrịa a mere ka akụkụ ahụ́ ya kpọnwụọ, meekwa ka ọ ghara ịna-ekwu okwu nke ọma. N’ihi ya, ọ bụ naanị ndị ezinụlọ ha nwere ike ịghọta ya nke ọma. Dalia na mama ya bi. Ọ bụ mama ya, onye aha ya bụ Galina, na-elekọta ya. Ọ bụ eziokwu na Dalia ahụsiela anya ná ndụ, obi siri ya ike na ahụ́ ga-emecha dị ya mma. Gịnị mere obi ji sie ya ike?

Galina sịrị: “N’afọ 1999, nwa nwanne mama m aha ya bụ Apolonija bịara leta anyị. Anyị chọpụtara na Apolonija, onye bụ́ Onyeàmà Jehova, ma Baịbụl nke ọma, Dalia jụkwara ya ọtụtụ ajụjụ. O teghị aka, a malite ịmụrụ Dalia Baịbụl. Mgbe ụfọdụ, m na-anọ ya mgbe ha na-amụ ihe ka m nwee ike na-akọwa ihe Dalia na-ekwu. Ma, m chọpụtara na ihe niile ọ na-amụ na-abara ya uru. Obere oge, mụ ekwuokwa ka a mụwara m Baịbụl.”

Ka Dalia ghọtawara eziokwu ndị dị na Baịbụl, otu ihe bịara na-enye ya nsogbu n’obi nke na obi anaghị ezu ya ike. O mechara kwuo ihe ọ bụ. Ọ jụrụ Apolonija, sị: “Olee otú onye dị ka m akụkụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ ga-esi kwusalie ozi ọma?” (Mat. 28:19, 20) Apolonija medara obi mee ka obi sie Dalia ike. Ọ gwara Dalia, sị: “Ụjọ atụla gị. Jehova ga-enyere gị aka.” Jehova nyekwaara ya aka n’eziokwu.

Oleezi otú Dalia si ekwusa ozi ọma? O nwere ụzọ dị iche iche o si ekwusa ya. Ụmụnna nwaanyị na-enyere ya aka ede akwụkwọ ozi ndị o ji agwa ndị ọzọ ihe Baịbụl na-akụzi. Ihe Dalia na-eme bụ ịgwa ụmụnna nwaanyị ndị ahụ ihe ọ chọrọ ka ndị ahụ mara. Hanwa edezie ihe ọ gwara ha n’akwụkwọ ozi. Otú ọzọ Dalia si ezikwa ndị mmadụ ozi ọma bụ izigara ha ozi n’ekwe ntị. Ụbọchị ihu igwe dị mma, ndị ọgbakọ ya na-akpọ ya aga n’ogige ntụrụndụ dị iche iche nakwa n’okporo ámá ka o nwee ike izi ndị ha ga-ahụ ebe ahụ ozi ọma.

Dalia na mama ya na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Ha abụọ raara onwe ha nye Jehova, e mekwara ha baptizim na Nọvemba 2004. Na Septemba 2008, e hiwere ìgwè na-eji asụsụ Polish amụ ihe na Vilnius. Ebe ọ bụ na ndị nkwusa Alaeze nọ n’ìgwè ahụ ehighị nne, Dalia na mama ya sonyeere ha. Dalia sịrị: “E nwere ọnwa ụfọdụ m na-echegbu onwe m maka na agabeghị m ozi ọma. Ma, ọ na-abụ m gwachaa Jehova banyere ya n’ekpere, obere oge, otu nwanna abịa ka mụ na ya yie agba mgbe ọ ga-akpọrọ m ka anyị gaa ozi ọma.” Olee otú ezigbo nwanna anyị nwaanyị bụ́ Dalia si ele nsogbu ya anya? Ọ sịrị: “Ọrịa a emeela ka akụkụ ahụ́ m kpọnwụọ, ma o mebeghị ka uche m kpọnwụọ. Obi dị m ezigbo ụtọ na m na-akọliri ndị ọzọ banyere Jehova!”